Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,147,921 members, 7,799,123 topics. Date: Tuesday, 16 April 2024 at 03:37 PM

Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! (5701 Views)

Mrs Dike An Igbo Citizen To Become The First Female OBA In Yoruba / Laws Of Igboland (Iwu Obodo) / Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? (2) (3) (4)

(1) (2) (3) (Reply) (Go Down)

Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 12:49pm On Sep 13, 2012
Umunnem ndi anambra amam na anyi enwego threadi ndiigbo,mana obu ihe kwesiri ezie na azo ndu na anyi ga-enwe threadi nke anyi. Mmadu nwere ike isite na threadi a malu onye obodo ya no na nairaland maobu nwanne ya maobu onye umunna ya. Onye bia okwuo afa obodo ya,lokal govument. Umu anambra ka anyi kwuo na onu anambra.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 12:51pm On Sep 13, 2012
Munwa bu onye oraukwu na okpuru ochichi idemili nootu lokal govumenti eria nke anambra. Ndi baanyi dalu nu.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 1:04pm On Sep 13, 2012
Ndi banyi megharia nu ahu! Unu ano mmadu mmadu na-esi mmuo mmuo?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Afam4eva(m): 3:23pm On Sep 13, 2012
Anam ekele Ndi Anambra nile no na obodo nairaland. Odinma na Antivirus meyere thread a ka unu jiri ya koba ife ne ye Anambra nsogbu. Maka ihe na e ye Anambra nsogbu bu ihe ne ye Ndigbo nsogbu. Anambra ekelem.

Kam mepe nke Enugu
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 4:43pm On Sep 13, 2012
afam4eva: Anam ekele Ndi Anambra nile no na obodo nairaland. Odinma na Antivirus meyere thread a ka unu jiri ya koba ife ne ye Anambra nsogbu. Maka ihe na e ye Anambra nsogbu bu ihe ne ye Ndigbo nsogbu. Anambra ekelem.

Kam mepe nke Enugu
afam nwanne daalu. Akwum gi n'azu imepe nke enugu.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by odumchi: 8:23pm On Sep 13, 2012
Ndi Anambra, ndaa aga inyinde mere? Azaa m Anambra, m za Abia. M si ka m juoteri: ndaa ihe anyinde nde awuu nde Anambra ma eme?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by otele(m): 11:31pm On Sep 13, 2012
Anambra kwenu!!
Ka m ga mepere nke ndi mbaitoli local govt.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by NRIPRIEST(m): 11:59pm On Sep 13, 2012
otele: Anambra kwenu!!
Ka m ga mepere nke ndi mbaitoli local govt.

Oga akamma ma imepee threadi nke ezi n'ulo gi....Kedu ife I loo ?

1 Like

Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by NRIPRIEST(m): 12:21am On Sep 14, 2012
Antivirus nwune,daalu maka ebe nkwukolita iweputalu Umu-Omanbala iji bia gbakota onu,kpaa nkata,suo onu Omanbala sogbulu onwie,wekoka ebum n'uche ayi banyelu etu ayi ye eji mee obodo nkea Umu-Igbo ji anya isi ka obulu kpakpando n'igwe. Ife dim n'uche m cholu ikwe erika,mana nma akwusigodi ebea kam kenee ife na ejelu Omanbala ozi.
Onu m akpokuo isi afulu wee kwaba okpu bu Eze Nri,Obi Onicha agbogidi Ado,Okpoko n'Oba,Ana Nri ani nso ebe n'enwero atu na okpulu anyanwu,Umu Idenmili ebe enweli ndi Igbo ji aba nba ndi si agboro Nri bia wee wuo nkpologwu na Ide nnaa,Anaedo ndi olisa ji amamife na aku n' uba wee choo mma,Onicha Ado Umuezechima ndi ekike na ngala,Ogbaru,Oyi,Orumba,Oka na Okuzu ndi kpulu uzu mgbe gboo,Ihiala na Okija,Umu-Anam na Ayamelum,Agulueri na Umuleri oke ebo, Nzam Umu-Igala,Ani Igboukwu ebe ogidigada Nri ghanyelu. Oji n'ani,Umu Nteje ndi nwelu nze 'ozo di ebube.....to be continued.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by otele(m): 1:02am On Sep 14, 2012
NRI PRIEST:

Oga akamma ma imepee threadi nke ezi n'ulo gi....Kedu ife I loo ?
Iji okwu
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 7:41am On Sep 14, 2012
NRI PRIEST: Antivirus nwune,daalu maka ebe nkwukolita iweputalu Umu-Omanbala iji bia gbakota onu,kpaa nkata,suo onu Omanbala sogbulu onwie,wekoka ebum n'uche ayi banyelu etu ayi ye eji mee obodo nkea Umu-Igbo ji anya isi ka obulu kpakpando n'igwe. Ife dim n'uche m cholu ikwe erika,mana nma akwusigodi ebea kam kenee ife na ejelu Omanbala ozi.
Onu m akpokuo isi afulu wee kwaba okpu bu Eze Nri,Obi Onicha agbogidi Ado,Okpoko n'Oba,Ana Nri ani nso ebe n'enwero atu na okpulu anyanwu,Umu Idenmili ebe enweli ndi Igbo ji aba nba ndi si agboro Nri bia wee wuo nkpologwu na Ide nnaa,Anaedo ndi olisa ji amamife na aku n' uba wee choo mma,Onicha Ado Umuezechima ndi ekike na ngala,Ogbaru,Oyi,Orumba,Oka na Okuzu ndi kpulu uzu mgbe gboo,Ihiala na Okija,Umu-Anam na Ayamelum,Agulueri na Umuleri oke ebo, Nzam Umu-Igala,Ani Igboukwu ebe ogidigada Nri ghanyelu. Oji n'ani,Umu Nteje ndi nwelu nze 'ozo di ebube.....to be continued.
odenigbo ikwusigo ha nine. Ihe nine aga-ekwu ekwu ma ndi aga-ekene ekene imesigo ha nine. Daalu nke oma nwannem.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 7:44am On Sep 14, 2012
odumchi: Ndi Anambra, ndaa aga inyinde mere? Azaa m Anambra, m za Abia. M si ka m juoteri: ndaa ihe anyinde nde awuu nde Anambra ma eme?
odumchi nwanne daalu. Hapu ihe nine m na gi na- aga na threadi ndi ozo,ha nine bu egwuriegwu. NWANNE MA NWANNE YA. Daalu nnukwu onowu!
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by pazienza(m): 7:55am On Sep 14, 2012
Muwa si Ogidi-inwelle,abu m nwa afo idemili.Asi na agbakwuru oke dibia,oke dibia agbakwuru oke nmuo! Ogidi ebo itenani ekene mu unu! Idemili kee ka unu mee!umunri anyi ga adi o!
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 8:12am On Sep 14, 2012
pazienza: Muwa si Ogidi-inwelle,abu m nwa afo idemili.Asi na agbakwuru oke dibia,oke dibia agbakwuru oke nmuo! Ogidi ebo itenani ekene mu unu! Idemili kee ka unu mee!umunri anyi ga adi o!
nwanne daalu. Ogidi ndi agbatobi m. Nri muru igbo ekene!
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by NRIPRIEST(m): 3:02pm On Sep 14, 2012
pazienza: Muwa si Ogidi-inwelle,abu m nwa afo idemili.Asi na agbakwuru oke dibia,oke dibia agbakwuru oke nmuo! Ogidi ebo itenani ekene mu unu! Idemili kee ka unu mee!umunri anyi ga adi o!

Nwa Ide nnaa,okwa asii na akpasia n'ama ebulu naa n'obi; Ogidi Inwele bu oke mba,ebe Walter Ofonagoro na Chinua Achebe si puta uwa. Nwanne nna-nna mu nukwalu di n'Ogidi,nya bu na mu bu nna ochie gi. Nbosi ayi bialu akwamozu nwanne ayi nwanyi,Ogidi maalu na Umuoji bialu. Malukwa na Ogidi na Umuoji gbalu n'oke,solukwuo na ayi ncha bu UMU-NRI. Umuoji boys high school used to rival Ogidi boys in football and we usually beat them up,whenever we lose to them. grin
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 3:15pm On Sep 14, 2012
NRI PRIEST:

Nwa Ide nnaa,okwa asii na akpasia n'ama ebulu naa n'obi; Ogidi Inwele bu oke mba,ebe Walter Ofonagoro na Chinua Achebe si puta uwa. Nwanne nna-nna mu nukwalu di n'Ogidi,nya bu na mu bu nna ochie gi. Nbosi ayi bialu akwamozu nwanne ayi nwanyi,Ogidi maalu na Umuoji bialu. Malukwa na Ogidi na Umuoji gbalu n'oke,solukwuo na ayi ncha bu UMU-NRI. Umuoji boys high school used to rival Ogidi boys in football and we usually beat them up,whenever we lose to them. grin
nri e be like say una dey carry john cena go the match?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by pazienza(m): 10:42pm On Sep 15, 2012
NRI PRIEST:

Nwa Ide nnaa,okwa asii na akpasia n'ama ebulu naa n'obi; Ogidi Inwele bu oke mba,ebe Walter Ofonagoro na Chinua Achebe si puta uwa. Nwanne nna-nna mu nukwalu di n'Ogidi,nya bu na mu bu nna ochie gi. Nbosi ayi bialu akwamozu nwanne ayi nwanyi,Ogidi maalu na Umuoji bialu. Malukwa na Ogidi na Umuoji gbalu n'oke,solukwuo na ayi ncha bu UMU-NRI. Umuoji boys high school used to rival Ogidi boys in football and we usually beat them up,whenever we lose to them. grin
NRI PRIEST:

Nwa Ide nnaa,okwa asii na akpasia n'ama ebulu naa n'obi; Ogidi Inwele bu oke mba,ebe Walter Ofonagoro na Chinua Achebe si puta uwa. Nwanne nna-nna mu nukwalu di n'Ogidi,nya bu na mu bu nna ochie gi. Nbosi ayi bialu akwamozu nwanne ayi nwanyi,Ogidi maalu na Umuoji bialu. Malukwa na Ogidi na Umuoji gbalu n'oke,solukwuo na ayi ncha bu UMU-NRI. Umuoji boys high school used to rival Ogidi boys in football and we usually beat them up,whenever we lose to them. grin

Eziokwu ka ikwuu,Ogidi ani na umuoji gbalu agbataobi,otutu ndi nne anyi si umuoji.

Umuoji boys iti Ogidi boys ife? Nnaa idikwa sure? Umu boys ogidi na akpa ike o! Jekwa juo ndi nkpor ka fa na umu boys ikenga ogidi si wee chipu ya, jukwaa ndi umudioka na umunnachi ka fa na umu boys uru ogidi si wee chipu ya na afor igwe.
Nna m ochie jeelu akwukwo na ogidi boys,oge obuna ona eto ogidi boys,chelugodi kam fukenu ya ozo,nya eji ife ikwuu maa ya njakiri,hehe!

Onicha ana n'inyi,mana ogidika!
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 12:26pm On Sep 16, 2012
pazienza:

Eziokwu ka ikwuu,Ogidi ani na umuoji gbalu agbataobi,otutu ndi nne anyi si umuoji.

Umuoji boys iti Ogidi boys ife? Nnaa idikwa sure? Umu boys ogidi na akpa ike o! Jekwa juo ndi nkpor ka fa na umu boys ikenga ogidi si wee chipu ya, jukwaa ndi umudioka na umunnachi ka fa na umu boys uru ogidi si wee chipu ya na afor igwe.
Nna m ochie jeelu akwukwo na ogidi boys,oge obuna ona eto ogidi boys,chelugodi kam fukenu ya ozo,nya eji ife ikwuu maa ya njakiri,hehe!

Onicha ana n'inyi,mana ogidika!
ina akowazi na ndi ogidi bu ndi getafe?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by pazienza(m): 3:15pm On Sep 16, 2012
Antivirus92: ina akowazi na ndi ogidi bu ndi getafe?

Nnaa,kee kwa nke bu getafe? Kedu isi nkowa ya?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 6:38pm On Sep 16, 2012
pazienza:

Nnaa,kee kwa nke bu getafe? Kedu isi nkowa ya?
ndi na-agbasi boolu ike.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by odumchi: 6:43pm On Sep 16, 2012
Antivirus92: odumchi nwanne daalu. Hapu ihe nine m na gi na- aga na threadi ndi ozo,ha nine bu egwuriegwu. NWANNE MA NWANNE YA. Daalu nnukwu onowu!

O ugbua ka I ma guma anyi wu umunne o kwa ya? Nsogbu adii. Ya diri kwa aga I za kwuo ya.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by pazienza(m): 11:01pm On Sep 16, 2012
Antivirus92: ndi na-agbasi boolu ike.
odinma. Mana akama alike barca karia getafe.Getafe oro ndia na agho ada na spanish league?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by ACM10: 11:21pm On Sep 16, 2012
pazienza: Muwa si Ogidi-inwelle,abu m nwa afo idemili.Asi na agbakwuru oke dibia,oke dibia agbakwuru oke nmuo! Ogidi ebo itenani ekene mu unu! Idemili kee ka unu mee!umunri anyi ga adi o!
wow! Ooooyyi
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by ACM10: 11:37pm On Sep 16, 2012
Ndi be anyi ekele mu unu o! A nam ekelekwa Antivirus maka iweputa omaricha atumatu a. Obi dim uso nke ukwu mgbe mu furu threedi a maka ogbako ndi Anambra. A bum nwa afo Ogidi nke di na Idemili(Ide nnaa). A gaghi ekwu karia otua maka ndi osu imi. grin A nam asi umu Igbo ibe mu na anyi nabatara unu na threedi a. Igbo bu otu! Igbo na-asu na onu na onu, mana akwaa ukwara, o buru otu. Udo diri ndi Anambra, udo diri ndi Igbo. Igbo ka enyi. Daalu nu. cool
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 2:10am On Sep 17, 2012
ACM10: Ndi be anyi ekele mu unu o! A nam ekelekwa Antivirus maka iweputa omaricha atumatu a. Obi dim uso nke ukwu mgbe mu furu threedi a maka ogbako ndi Anambra. A bum nwa afo Ogidi nke di na Idemili(Ide nnaa). A gaghi ekwu karia otua maka ndi osu imi. grin A nam asi umu Igbo ibe mu na anyi nabatara unu na threedi a. Igbo bu otu! Igbo na-asu na onu na onu, mana akwaa ukwara, o buru otu. Udo diri ndi Anambra, udo diri ndi Igbo. Igbo ka enyi. Daalu nu. cool
ide nnaa nno nke oma.amam na udo di?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Nobody: 4:55pm On Sep 19, 2012
Ndi beanyi da'alu ni ooo. Afam bu Innocent Chukwunonso Okonkwo, abum onye Osumenyi na Nnewi south lokal government na Anambra state. Mana muna ndi bem bina sokoto. Mana anyi na'akwado e kwapu na obodo'a.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Afam4eva(m): 5:10pm On Sep 19, 2012
INNO18: Ndi beanyi da'alu ni ooo. Afam bu Innocent Chukwunonso Okonkwo, abum onye Osumenyi na Nnewi south lokal government na Anambra state. Mana muna ndi bem bina sokoto. Mana anyi na'akwado e kwapu na obodo'a.
Nno Nwanne, odinma ka gi na ndi bu unu si sokoto puo maka ebe a wa adiro ndigbo mma.

NNewi Mmanu...Anambra Kwezuenu
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 7:06am On Sep 20, 2012
INNO18: Ndi beanyi da'alu ni ooo. Afam bu Innocent Chukwunonso Okonkwo, abum onye Osumenyi na Nnewi south lokal government na Anambra state. Mana muna ndi bem bina sokoto. Mana anyi na'akwado e kwapu na obodo'a.
nwanne mee nu ngwa ngwa si obodo boko haram ahu puo. Udo diri gi.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 7:07am On Sep 20, 2012
afam4eva:
Nno Nwanne, odinma ka gi na ndi bu unu si sokoto puo maka ebe a wa adiro ndigbo mma.

NNewi Mmanu...Anambra Kwezuenu
afam nwanne udo diri gi. Kedu imepego threadi nke ndi enugwu?
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by achi4u(m): 11:11am On Sep 20, 2012
INNO18: Ndi beanyi da'alu ni ooo. Afam bu Innocent Chukwunonso Okonkwo, abum onye Osumenyi na Nnewi south lokal government na Anambra state. Mana muna ndi bem bina sokoto. Mana anyi na'akwado e kwapu na obodo'a.
INNO18
Nwannaa meenu ngwa ngwa ka unu mehara odachi.Chukwu chekwa unu na ndiigbo ndi ozo bi na ugwu awusa.
Ndi Anambra ekele m unu oo!cheesy
Umuiigbo nile udo diri unu!!

Abu m onye Ebonyi steti
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by Antivirus92(m): 12:54pm On Sep 20, 2012
achi4u: INNO18
Nwannaa meenu ngwa ngwa ka unu mehara odachi.Chukwu chekwa unu na ndiigbo ndi ozo bi na ugwu awusa.
Ndi Anambra ekele m unu oo!cheesy
Umuiigbo nile udo diri unu!!

Abu m onye Ebonyi steti
achi nwanne chukwu gozie gi. Igbo ga-adi.
Re: Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! by redsquare(m): 11:00pm On Sep 20, 2012
Umu Anambra daalu nu rinne. Oo munwa bu Ezennia, abum onye Oba na Idemmili. Anam ekene nwanne ayi nwoke Antivirus onye nke mepelu threadia. Chukwu gozie i. Nri Priest nwa Igwulube Okodu anam ekene i rinne maka etu isi wee na akwanite omenana ndi igbo na Nairaland a, Pazienza na Ogidi, Ezennia kenekwai. Umu igbo nine, daalu nu.

(1) (2) (3) (Reply)

Lagos Belongs To Awori, The Bini Met Them There- Akintoye / The Origin Of The Popular Yoruba Saying :D / Origin Of Ubulu-uku Kingdom

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 52
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.