Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,149,767 members, 7,806,112 topics. Date: Tuesday, 23 April 2024 at 11:37 AM

Uka Alakoba N'ime Ala Igbo - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Uka Alakoba N'ime Ala Igbo (2720 Views)

Oge Ndi Igbo. Umu Igbo Bianu Ka Anyi Kparita Uka. Udo Di!!! / Nrurita Uka (debate In Igbo Language). / Ala Igbo Di Mma [Igbo Speaking Thread] (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by odumchi: 4:03pm On Oct 03, 2013
Ndi Igbo, na ndi mba na anu olu Igbo, ekele o.

Ubochi gara aga elere m onyonyoo gbasara otu Eze si Ugwuta na stati nke Imo na otu ya bu Eze si gbanwuo okwukwe na buru onye uka Alakoba. Asi m ka m juonu unu: o nwere onye ma otu udiri ihe a si mee? Asighi m na Uka Alokoba bu ajo uka, mana o di m ihe itunanya na otu onye isi omenala Ndi Igbo nwere ike igbanwu okwukwe otu ahu.

Kedu ka obodo ya si eme ihe omenala ha? Kedu ka ndi okwukwe ya na okwukwe omenala ndi obodo ya si ebikota? Bikonu, onye nwere ike isa mu ajuju mu a bia saa. Onye nwekwanu ihe ozo o mara o ga ekwunye bia kwuo.

2 Likes

Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by AndreUweh(m): 11:25pm On Oct 03, 2013
^^^
Ụjọ atụla gị. Eze Oguta abụghị onye mbụ mere ya, mana onweghị ihe omere na ala Igbo. Ala Igbo bụ nke ndị ụzọ krịstị. Onweghị ihe ndị alakụba nwere ike ime.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by ChinenyeN(m): 2:47am On Oct 04, 2013
Onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye "Christ", o di iche la onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye Alakuba? Odii. Hne ha abuo mere bu ifu l'omelala. O gwula.

2 Likes

Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by odumchi: 6:09am On Oct 04, 2013
Andre Uweh: ^^^
Ụjọ atụla gị. Eze Oguta abụghị onye mbụ mere ya, mana onweghị ihe omere na ala Igbo. Ala Igbo bụ nke ndị ụzọ krịstị. Onweghị ihe ndị alakụba nwere ike ime.

O nwere ka o di, ma I juokwa m o. Ka m koro gi akuko m nuru gbasara udiri ihe a: na afo 1940, otu nze gara obodo Senegal. Mgbe o no obodo ahu ya gbanwuo okwukwe, banye uke Alakuba. Mgbe o lachitere ala ya, o biara gosi ndi obodo ya uka Alakuba mee kwa ka otutu ha gbanwuo. Ya bu nze chodiri ka obodo ya nile gbanwuo okwukwe, mana ha ekweghi. Ihe a biara kpatara ha esemokwu. Udiri ihe a o nwere ike ime na Ugwuta (ka o bu Oguta)?

ChinenyeN: Onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye "Christ", o di iche la onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye Alakuba? Odii. Hne ha abuo mere bu ifu l'omelala. O gwula.

I lee ya anya otu ahu, ha bu otu ihe. Mana o bughi ka ihe si di. Ugbua na ala Igbo, ndi Uka na ndi omenala na ebikota n'enweghi oke nsogbu na mkpotu nihi ndi Uka Kristi ekwerela na ndi Uka omenala nwere ike ikpe otu masiri ha. Eze bia banye Uka Alakuba, o kwa o g'eme ha ewufuo omenala ha ndi Ndi Uka Kristi mebiforo kpam kpam?
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by EzePromoe: 11:42am On Oct 04, 2013
Uka alakuba agaghi enwe onodu n'ala Igbo, maka na ndi n'ekpere uka ahu n'aburu ndi Arab oru. Imakwanu na ndi Igbo agaghi agbaru mba ndi ozo oru kama ha ewere onwu.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by Nobody: 3:56pm On Oct 04, 2013
Baibul si na Nzuko nke kristi na eguzosi ike,onu ama nile nke hades agaghi aba ya.
Ndi igbo abughi ndi alakuba,chukwu agaghi ekwe ka ha baa uba.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by oboy3(m): 5:16pm On Oct 04, 2013
o di na iwu na ndigbo niine ga bu ndi uka christi?

1 Like

Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by AndreUweh(m): 1:07am On Oct 05, 2013
o'boy:
o di na iwu na ndigbo niine ga bu ndi uka christi?
Ndị nke Krịstị agbago ngbọrọgụ na ala Igbo. Ha kwụ chịm chịm kwụsie ike. Ha chọghị ịna akpọ isia ala nye onye ọbụla.
Ndị alakụba enweghị ọnọdụ na ala Igbo.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by Dibiachukwu: 1:21am On Oct 05, 2013
ChinenyeN: Onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye "Christ", o di iche la onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye Alakuba? Odii. Hne ha abuo mere bu ifu l'omelala. O gwula.
Eziokwu bu ndu.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by Dibiachukwu: 1:27am On Oct 05, 2013
Na ala igbo, I nwere ndi na agwo mmo, Nde na efe alusi, Ndi na efe jesos ocha, Ndi na efe mary ocha. Kedu ihe foziri nu. Biko unu ga zuru ike.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by ChinenyeN(m): 4:07pm On Oct 05, 2013
odumchi: I lee ya anya otu ahu, ha bu otu ihe. Mana o bughi ka ihe si di. Ugbua na ala Igbo, ndi Uka na ndi omenala na ebikota n'enweghi oke nsogbu na mkpotu nihi ndi Uka Kristi ekwerela na ndi Uka omenala nwere ike ikpe otu masiri ha. Eze bia banye Uka Alakuba, o kwa o g'eme ha ewufuo omenala ha ndi Ndi Uka Kristi mebiforo kpam kpam?

Eze Promoe: Uka alakuba agaghi enwe onodu n'ala Igbo, maka na ndi n'ekpere uka ahu n'aburu ndi Arab oru. Imakwanu na ndi Igbo agaghi agbaru mba ndi ozo oru kama ha ewere onwu.

Andre Uweh:
Ndị nke Krịstị agbago ngbọrọgụ na ala Igbo. Ha kwụ chịm chịm kwụsie ike. Ha chọghị ịna akpọ isia ala nye onye ọbụla.
Ndị alakụba enweghị ọnọdụ na ala Igbo.

O bu kwhu o ji nu unu l'erne (your notions/conceptions) la unu si kwuo otua. Alakuba enwee onodi l'uche unu maka hne Boko Haram. Ma unu amaa, nde Alakuba anorola l'Aba-Ngwa (la Ndegoro) okengba ohu afo isne (100 years). Ha si la ha agaa ala Bauchi (obe ha si). Unu ng'ichufu we? Ha emebeghi nde Aba hne ojoo. Unu ng'ikwhafu we? Ufo nde Ngwa bu nde Alakuba. O di hne o mere?

L'ezi, i leba hne kena anya, hne o bu agwula "nde furula l'omelala nnanna, kpe l'omelala k'odo".
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by OdenigboAroli(m): 11:52pm On Oct 05, 2013
Nke masilu onye nya mee,mana ayi achoro ife ga ebutelu ayi esemokwu. Udo!
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by odumchi: 3:54am On Oct 06, 2013
Ihe bu mkpa m bu odinanma omenala anyi. Ndi okwukwe Kristi emebiela otutu ihe gbasara omenala anyi (ma ndi di nma ma ndi di njo). Okwukwe Alakuba, o bu na o gaghi emebipu nke na foro?

Na uwa ugbua anyi no n'ime ya, ndi Kristi na anabata ufodu ihe omenala: di ka onye Kristi nwere ike ichi Nze ma o bu Ichie; onye Kristi nwere ike ibanye otu Nmanwu; onye Kristi nwere ike ibanye Ekpo na Ekpe. Uka Alakuba o ga ekwere ka umu ihe a diri? Ka o g'eme ka omenala anyi fuchaisia? Umu Igbo ana ga bia muwa asusu Arabic (yekwa ya n'elu Asusu Bekee n'acho iri Igbo?)

O ya bu ajuju m.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by AndreUweh(m): 11:54pm On Oct 06, 2013
Onwe ghị onye mechiri ụzọ ka ndị alakụba hapụ ịbata na alaIgbo. Ha bịa, mana okwukwe ha agaghị anọ rue na ebighị ebi.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by pazienza(m): 2:27am On Oct 07, 2013
Okwu chinenye di nma.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by ifyalways(f): 4:31am On Oct 08, 2013
o'boy:
o di na iwu na ndigbo niine ga bu ndi uka christi?

ChinenyeN: Onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye "Christ", o di iche la onye isi omelala gbanwe okwukwe buru onye Alakuba? Odii. Hne ha abuo mere bu ifu l'omelala. O gwula.
Okwu unu abuo sara ajuju a n'uju.
Okwukwe na ekpere bu ihe "Onye na uche ya" .Ihe kacha nkpa bu ka onye obula na-ebi n'udo with ndi agbata obi ya.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by Odinaka00(m): 2:27pm On Oct 08, 2013
Munwa amaghi ihe jikooro ndi Igbo na ndi uka alakuba, ebee ka ha siri bata n'alaigbo? Onye mepeere ha uzo? Unu amakwa na ndi Yoruba na arigret ihe mere ha jiri nabata uka alakuba n'ala ha? Uka alakuba bata n'alaigbo, imara na agam ebudo sowe ndi nairalanders tiwe end ┼iϻe tins...tufia!

2 Likes

Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by Ngbokwu: 10:26pm On Oct 08, 2013
ụka alakụba gbakwa ọkụ.
Re: Uka Alakoba N'ime Ala Igbo by ChinenyeN(m): 11:09pm On Oct 08, 2013
Odumchi, anula m ajuju ghi. O dii hne ojoo di la ya bu ajuju ghi. O bu l'ezi la hne ke Kristi emetosiala omelala, ma kaa bu mgbe ahu. Ugbua anyi no la ya di iche. Ugbua, otutu nde Igbo avoola chi ututu la ke gbasara omelala wo. Ya eme, ufodi nde Igbo bia gbanwe okwukwe wo buru nde Alakuba, mara la o gagh adi ka otu o ji mee la ke Kristi. Marakwa la i ga-ahukwa nde Igbo Alakuba ebe hne omelala masiri wo. Wo ga-eso la ya. Kaa bu otu o ji di m l'uche.

Nde na-ele anya hne Boko Haram, na-ewe iwe (ma o bu na-atu ujo) Alakuba.. kaa gbasara wo.

1 Like

(1) (Reply)

Meet New Ooni Of Ife's Only Daughter [photos] / Myth On The Four Market Days In Igbo Land : How It Started / My Iwa Akwa (wearing Of Cloth) Experience In Obowo LGA, Imo State.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 25
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.