Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,332 members, 7,808,132 topics. Date: Thursday, 25 April 2024 at 07:35 AM

National Light Ewere Oke Mmemme Cheta Ọgbụgba Ahọ Anọ Onyeisi Ha N'ọkwa - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / National Light Ewere Oke Mmemme Cheta Ọgbụgba Ahọ Anọ Onyeisi Ha N'ọkwa (516 Views)

Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr / UGIE EWERE Festival, Please Lovely Edo Brethren,what Does It Signify / On Culture: Ebalu Aluụ - Cheta Nwanze (2) (3) (4)

(1) (Reply)

National Light Ewere Oke Mmemme Cheta Ọgbụgba Ahọ Anọ Onyeisi Ha N'ọkwa by IzunnaOkafor(m): 11:49am On Jul 07, 2018
Igbo News Written By Izunna Okafọr

Obodo bụ nnọọ ụwa bịa kirie ụbọchị ụka gara aga dịka ndị ụlọ ọrụ "Anambra Newspaper Printing Corporation", bụ ndị mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa merubere oke mmemme pụrụ iche n'iji cheta na o meela ahọ anọ kpọnkwem maazị Chuka Nnabụife jiri bata n'ọkwa dịka onyeisi ụlọ ọrụ ahụ.
Oke mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumezu isi ụlọ ọrụ ahụ dị n'Awka bụ nke dọtara imirikiti mmadụ dị iche iche, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị ọrụ mgbasa ozi, ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na mahadum, ndị na-ede akwụkwọ, tinyere ndị enyị na ọhanaeze ndị ọzọ ndị juputara n'ebe ahụ n'ebe ahụ isoro ha ñụrịa na ijikwa anya ha gbara ekeresimeesi.
N'okwu ya, otu onye ọbịa pụrụ iche na mmemme ahụ, bụ ọkammụta Dennis Aribọdọr nke mahadum Nnamdị Azikiwe kọwara ọgbakọ ahụ dịka nke magburu onwe ya, ọbụnadị n'ịgbakwasa ụkwụ n'ebumnobi na ụzọ e siri chịkọba ya, bụ nke o kwuru na o nwere ọtụtụ ihe mmụta dị iche ọ pụrụ ikụnye n'ime mmadụ, ọ bụnadị dịka ọ toro ya bụ nwa amadi na-emerube mmemme ahụ maka ịgba mbọ ya dara ụda o tigoro n'ụlọ ọrụ ahụ iji mee ka ọ bụrụ eji ama atụ, ma kpọkuokwa ya ka o jide ka o ji.
Na mbụ n'ozi nnọọ ya na, ya bụ agụ nwoke bụ isi a hụrụ kwaba na mmemme ahụ, bụ maazị Chuka Nnabụife, onye obi jupụtara n'ọñụ kwuru na ha agaala n'ụlọ ụka ga tụọ mmamma, too Chineke maka oke ụbọchị ahụ, ma sịkwazie na mmemme ahụ bụzị iji mee ndị mmadụ obi ụtọ n'ụzọ dị iche iche dịka o si kwesi ekwesi maka ụbọchị ọma ahụ.
O toro Chineke nna, ma keleekwa gọvanọ Willie Obianọ, onye nyere ya ohere ahụ ma nyekwa ya ezi ọnọdụ dị larịị ka o mee ntụnye nke ya n'iji ọgụgụ isi na ọnatarachi o nwere jeere steeti ahụ ozi, ya na ala Nigeria n'izugbe. Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ọrụ ọma dị iche iche ọ rụpụtogoro n'ụlọ ọrụ ahụ kemgbe ahọ anọ ọ batara n'ọkwa, nke gụnyere ịhụ na ụlọ ọrụ ahụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ oge ọbụla na-esepughị aka, ime ka ụlọ ọrụ ahụ malite ibipụta akwụkwọ akụkọ n'asụsụ igbo (Ka Ọ Dị Taa), nakwa ibipụta akwụkwọ akụkọ egwuregwu (National Light Sports Xtra), tinyere iguzobe akara ọnyanwududo (website) maka ụlọ ọrụ ahụ bụ ebe a na-ebipụta akụkọ n'ikuku, na ịhụ na ha na-ebipụta akwụkwọ akụkọ zuru ka e mee n'ogoogo mba ụwa.
O mekwara ka a mara na e wezuga ibipụta akwụkwọ akụkọ na ọrụ mgbasa ozi, na ụlọ ọrụ ahụ na-abagidezịkwa n'amamà ịchịkọlọta ụmụ na-eto eto, ịnụcha ha na inye ha nkuzi, iji mee ka ọnatarachi ha wee pụtawaga ìhè ma bakwa uru n'obodo, bụkwa nke mịtagoro ọtụtụ ezi mkpụrụ.
N'okwu ha n'iche n'iche na mmemme ahụ, bụ nke ndị otu a kpọrọ National Light Art House nọrọ na ya wee mee ọtụtụ ihe ngosi dị iche iche; dọkịnta Christopher Chinweụba nke ụlọ mmụta Nwafọr Orizu, Nsugbe; onyeisi ngalaba akụkọ ụwa na okwu a kpụ n'ọnụ nke ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, bụ maazị Gab Ọkpaleze; ògbò ya n'ụlọ ọrụ ahụ, nke na-ahazi ihe mmemme maka ndị nwere ọ natarachi dị iche iche nke a kpọrọ "Creative Forum", bụ maazị Eze Ọnwụji; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n'ịkwalite ndị ntorobịa, bụ maazị Ifeanyị Aniagọ, ọkammụta Clifford Nwanna nke mahadum Unizik, tinyere onye nọgodi ugbu a dịka onye ndezi akụkụ n'ụlọ ọrụ National Light, bụ oriakụ Rose Ọranye, toro nnọọ ozuzu oke na ịma mma nke oke mmemme ahụ, ọ kachasị n'ihi ọtụtụ ihe mmụta o nwere nye ụmụ na-eto eto, ma kpọkuokwa ndị ntorobịa ka ha jisie ike chọpụta ma gbasokwa ọnatarachi ha iji baara onwe ha uru n'obodo.
Ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ gụnyere ịgụpụta abụ (poetry performance) nakwa ihe ngosi ejije dị iche iche, bụ nke e mere site n'aka ndị otu National Light Art House, nke gụnyere nwaada Ojima Juliet, Ugochukwu Anịgbọgụ, Añụlịka Mgbakọgụ, Chịdịmma Ikedịanya, Ugochukwu Obi, Chisom Nweke, Okoro Williams, Izunna Okafọr, Godwin Okoye na Jedidiah-Jọrdan Ọnụzulike

(1) (Reply)

The Wodaabe Wife Stealing Festival / Ooni To Host African International Art And Craft Festival In America / Please Help With Any Android Application For Writing In Yorùbá

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.