Igbos come show your proverbs skills

A Member? Please Login  
type your username and password to login
Date: July 06, 2008, 12:07 PM
216363 members and 122103 Topics
Latest Member: yau
Nairaland [Nigerian Forum] Home Help Search Who is currently online? Login Register
Nairaland Forum  |  General Discussion  |  Culture  |  Igbos come show your proverbs skills
Pages: (1) ... (28) (29) (30) (31) (32) (33) (34) (35) (36) (37) (38) (39) (40) ... (46) Go Down Send this topic Notify of replies
Author Topic: Igbos come show your proverbs skills  (Read 11945 views)
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1056 on: March 10, 2008, 08:18 PM »

lol.
Mortiple i kowara d thing nke oma.egwu Bongo di uto.funny enough a maghim maka egwu be nna m  Embarrassed o ga adicha nma.
echelon,i biakwa ozo.dalu nwoke oma.
youngies na Kashiff udo o dikwa?

@topic,eme ngwa,emeghara odachi.
       awo anaghi agba oso ehihie na efu.

ya gazie !
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1057 on: March 11, 2008, 11:18 AM »

@Mortiple

Ihe n'ile ikwuru bu ezi okwu gbam!

Mana odi m ka onwere ihe mere upcoming umu igbo ejighizi eti egwu igbo. O di m ka obu n'ihi na ego adaghi ya dika nke tim-tim yom-yom ndi onyibo. Obukwazi ihe a mere even na nollywood umu igbo adighizakwa act film igbo bu ihe ha jiri bido nollywood.

It calls for concern of all.

Ihe dara n'ala eburula aja
Whatever fall on the ground is already soiled with sand
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1058 on: March 11, 2008, 11:22 AM »

Ify yes udo di  Grin just that na oku na agba mana nwa awo ka na atu

The fire is raging and the toad is still leaping  Wink

echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1059 on: March 11, 2008, 11:57 AM »

Onye ekwughi ka oha, e bufee ya ama nna ya
If you don't tell your social status, your visitors will walk/drive right past your abode
Ujujoan (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1060 on: March 11, 2008, 12:59 PM »

Nwata a tuolo Ilu kowalu, mara na ego eji lu nne ya lara na iyi - A child you tell a proverb to and explains the meaning, know that the money you used to marry the mother is wasted!!!!

Onye asi 'jide ka e ji', mara na ka oji di mma - If someone says 'well done' to you, know that your are doing the  right thing!!!
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1061 on: March 11, 2008, 04:25 PM »

Youngies ,nsogbu a noghi.lol
ihe ihe kwuru is not far from eziokwu.onye o bula na achozi ego.n'oge na adighi anya,m ga try iti egwu nke m. unu a ga azukwa?  Cheesy

@topic,aka aja aja na ebute onu mmanu mmanu.
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1062 on: March 11, 2008, 04:27 PM »

Hmmmmm,
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1063 on: March 11, 2008, 04:35 PM »

Ihu ka nwa oke na achi nwa ologbo ochi, mara na onu di nso ebe ono

When you see the mouse laughing at the cat, know there's a hole nearby.
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1064 on: March 11, 2008, 06:02 PM »

hmmmmm a putara na i gaghi azu egwu m?  Grin nke ahu gbasara gi .

@topic,eto dike na nke o mere,o mekwa ozo.
when one is praised for any deed,he sure does greater ones.
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1065 on: March 12, 2008, 07:52 AM »

Elo siri na nwata buo ya ije, ya abuo ya ozi
The mushroom said that if the child prevents it from walking, it will prevent the child from doing his chores

Okuko siri na a zaa azaa, ya anyuchie ma e tie ya aka, ya anwuo
The chicken said that if a place is swept, it will defeacate there but if it's beaten, it will die

Nkita siri onye o turu oche weletara ya ego ya na ntukwu amarala ya ahu
The dog told the person it sent to buy chair for it to bring back its money because he's used to squatting

Wherever is cute-ass? Ada Igbo ji ilu eme ogo? I'm missing her in this thread ooo
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1066 on: March 12, 2008, 06:56 PM »

lol
juo TroOE maka cute ass  Tongue

@topic, e zuo ka agha eri udele,a totuo ngiga
     when the assembly is complete,the discussion starts.
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1067 on: March 13, 2008, 07:56 AM »

Udara siri na o bughi naani ya mutara nwa a na-apiwa onu
The african apple said that it's not only it that gave birth to a child whose mouth is to be pressed-in

Akpa si n'elu nkwu daa n'ala, okuko gbara bia tuo ya onu, o wee juo okuko si ya "Enyi m, o lee mgbe o bidoro sewere anyi?"
A bag fell from the palm tree and a hen rushed and pecked at it, the bag asked the hen, "My friend, since when have we become enemies?"

Mkpi ka dibia gwara ka o gbaara ya afa uto ma o siri ya hapu afa uto gbara ya afa ndu na onye di ndu ga-etoriri eto
The medicine man told the he-goat he'll concoct a growth medicine for it but the he goat replied that he shouldn't bother, rather he should concoct a medicine for long life for him, that a living person must grow

Kee kwanu onye bu TroOE?
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1068 on: March 13, 2008, 12:01 PM »

Igbo ndi oma!

Yes Cute ass has been greatly missed. she is well and good, but busy at the moment. I spoke to her a while ago, she sends her regards.

Usu enwero onu!  Cool
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1069 on: March 13, 2008, 04:27 PM »

Ok Youngies.o di nma.anyi na ekele ya too.
@Echelon,TroOE bu ezigbo enyi Cutie  Wink

@topic,ihe were oru bu oru.
what takes the place of work is work.
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1070 on: March 14, 2008, 08:09 AM »

*clears throat*

Ulili siri na onye ya zuru n'uzo na mgbachi adighi achu ihe na ihe na-achu ya
The squirrel said that whosoever it meets on the road just before noon is not pursuing anythiny rather it's being pursued.animals can talk

Agadi nwanyi na-ere ogili ma ijiji anya kporo
An old woman selling "ogili"igbo maggiknows house flies that are blind

Ebe a na-adu nwa amadi odu ka oru na-amuta ihe
It's where the citizen is instructed that the slaves learn

Ya gazie Igbo bu Igbo
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1071 on: March 14, 2008, 10:16 AM »

Quote from: ifyalways on March 13, 2008, 04:27 PM
Ok Youngies.o di nma.anyi na ekele ya too.
@Echelon,TroOE bu ezigbo enyi Cutie Wink

Yes I guess na Echelon ghotara na onwere ihe di iche na capital B na ukwu ehi zuro na'ala  Wink
There is huge difference between a capital B and the foot print of a cow
Kashif (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1072 on: March 14, 2008, 02:12 PM »

Quote from: echelon on March 13, 2008, 07:56 AM
Udara siri na o bughi naani ya mutara nwa a na-apiwa onu
The african apple said that it's not only it that gave birth to a child whose mouth is to be pressed-in

Akpa si n'elu nkwu daa n'ala, okuko gbara bia tuo ya onu, o wee juo okuko si ya "Enyi m, o lee mgbe o bidoro sewere anyi?"
A bag fell from the palm tree and a hen rushed and pecked at it, the bag asked the hen, "My friend, since when have we become enemies?"

Mkpi ka dibia gwara ka o gbaara ya afa uto ma o siri ya hapu afa uto gbara ya afa ndu na onye di ndu ga-etoriri eto
The medicine man told the he-goat he'll concoct a growth medicine for it but the he goat replied that he shouldn't bother, rather he should concoct a medicine for long life for him, that a living person must grow

Kee kwanu onye bu TroOE?

Echelon, ilu gi na-eme m kaa m n'echeta mgbe ezi ka di n'ukwu ukwa;  mgbe m bu afo ime a suru oha nri Wink Ndewo. I na-akpa ihe ewu n'eri mgbe nile. Nna, jide k'iji!

Nna, ewekwala iwe mana a chorom ihazi ihe n'okwu ahu m sijiri (boldened) n'ilu nke abuo gi na iberibe a.

Akpa dika osi wee di n'ilu a bu oti (larva) a na ahu na nkwu (palm tree). Oti a na-acha ocha (cream white in colour and measures around 1 - 1 1/2 inches). Oge gboo, ana eji ya ata abacha (it is usually roasted or fried) LOL!. Ndi diochi n'eweta ya ma ha gaa na nkwu. Cheesy

Ya mere, echeghi m n'obu akpa (bag) ka ilu ahu n'ekwu maka ya. Amaghi m ka m gesi tinye akara olu ya (phonetics or abi syllabus?) ka i wee hu otu esi akpo ya.

Igbo mma mma nu o. Nke onye chiri, ya zere.

@topic,

Otu ogaranya nwere inyinya ibu o ji eme njem. Otu ubochi, nwoke a wee choo ka o mee njem; ya na nwa odibo ya.

O wee were obere i bu onwere kee n'elu inyinya ahu, ya na nwa odibo ya wee rigoro n'elu inyinya ahu wee malite njem ha.

Oge ha rutere obodo nke mbu, ndi ahu wee tie mkpu wee si "afo tara nwoke a mmiri! Lekwa otu osi wee buru ibu nile wee bo anumanu a, ya na odibo ya wee rigokwara. N'ezie, O mere ya maka na inyinya ibu ahu adighi ekwu okwu!". Nwoke ahu wee si odibo ya ka ya bu odibo rituo, ka ya na ibu soso norozia n'elu inyinya ahu.

Oge ha rutere obodo nke abua, ndi ahu wee tie mkpu si "Nwoke nke a bu ajo mmadu! Lekwa otu osi wee rigoro n'elu inyinya soso ya wee si nwata a ka o were ukwu na-aga. O mere ya maka na obughi ya muru nwa ahu!". Nwoke a wee si odibo ya rigoro ka ya bu ogaranya were ukwu wee na-aga.

Oge ha rutere obodo nke ato, ndi obodo wee tie mkpu si "Nezie, nwata a bu onye isi ike! Lekwa otu osi wee chutuo nna ya n'ala wee magoro inyinya ibu!. Nwoke ahu wee si odibo ya rituo ka ha abua were ukwu wee n'eso inyinya ahu.

Oge ha rutere obodo nke ano, ndi ahu wee chia nwoke ahu ochi si "I bu onukwu! Kedu ka isi wee nwee inyinya ibu, gi na odibo gi wee were ukwu n'aga?"


One wealthy merchant had a horse he used whenever he travelled.

One day when he wanted to embark on a journey, he loaded the horse with small effects he was travelling with and mounted the horse with his servant.

When they got to the first town, they all shouted "See, this man is wicked! He loaded this horse with all this and still mounted it with his servant! He did so because the beast does not talk! The man asked the servant to alight so that he alone could ride the horse.

On getting to the second town, they screamed "See this heartless man! He is riding alone on the horse while this boy trekked. Surely, that is not his son!" This man now volunteered to alight so that the servant could mount the horse.

The third town complained "This boy lacks respect and is very stubborn! Look at how he is riding and his father is trekking! God forbid!. The merchant now asked the servant to join him on foot.

The fourth town yelled "This man must be a fool! You have a horse and you are trekking with your son while the horse enjoyed. Fool!


Moral - You can never satisfy the world, no matter how you try!
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1073 on: March 14, 2008, 04:24 PM »

@Kashif
Ihe i kwuru bu ihe mere eme. Akpa ahu bu oti (worm). Uda olu ya na ada ka akpa(to dribble).

Thanks for the correction.

Youngies anula ngwo na nkwu na-abia. Cute-ass gbara oso na thread maka ihe merenu oge gara aga
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1074 on: March 14, 2008, 04:30 PM »

Quote from: echelon on March 14, 2008, 04:24 PM
Youngies anula ngwo na nkwu na-abia. Cute-ass gbara oso na thread maka ihe merenu oge gara aga

I beg to disagree, Cute-ass is certainly not the type ga agba oso for anything.

Egwu anaghi atu afo, oburu uzo
The stomach is never afraid, that's why it is always in front
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1075 on: March 14, 2008, 04:56 PM »

Quote from: youngies on March 14, 2008, 04:30 PM
I beg to disagree, Cute-ass is certainly not the type ga agba oso for anything.

Egwu anaghi atu afo, oburu uzo
The stomach is never afraid, that's why it is always in front

At the risk of being proud
Mara na Ogaranya bu omume omume, adighi abu ogaranya abu
Wealth is shown by the things you do, it's not just in the name  Wink

Cute-ass bia zara onu gi ooo, I nwekwaala advocate   Lips sealed
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1076 on: March 14, 2008, 05:10 PM »

Quote from: echelon on March 14, 2008, 04:56 PM
At the risk of being proud

Osisi huru ibe ya na adu nkwa, ufere ga amapu ya onu
The tree that sees another and become envious, ufere the wild wind will cut it off

Cute-ass is well represented  Cool
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1077 on: March 14, 2008, 05:31 PM »

Nna,

Ubochi nta ka anyi chuo n'owerre nchi
Let's hunt in the grasscutter's premises on the hunting day

Marakwa amara na

Mmanya hu onye o mara, o bee ugwu
When the palm wine sees who it's familiar with, it will shorten

youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1078 on: March 14, 2008, 05:38 PM »

Quote from: echelon on March 14, 2008, 05:31 PM
Nna,

Mmanya hu onye o mara, o bee ugwu
When the palm wine sees who it's familiar with, it will shorten

Yes, E nwere m idea na ihu okenye na anyu mma nko
The face of an old man makes a rather sharp knife go blunt
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1079 on: March 14, 2008, 05:45 PM »

Quote from: youngies on March 14, 2008, 05:38 PM
Yes, E nwere m idea na ihu okenye na anyu mma nko

Ebe i nwere idea di otu a,

Gbanu gbanu rie ede n'ihi na ede bu oke mmuo
Eat the cocoyam with caution because it's a great spirit
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1080 on: March 14, 2008, 05:52 PM »

Quote from: echelon on March 14, 2008, 05:45 PM
Ebe i nwere idea di otu,

Gbanu gbanu rie ede n'ihi na ede bu oke mmuo
Eat the cocoyam with caution because it's a great spirit

But remember na onye chi ya esoghi gba izu, ihe adighi eme ya
He who his god did not conspire against, he has no reason to fear anything
echelon (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1081 on: March 14, 2008, 05:59 PM »

Nna,

Mmadu jiri ukwu ya zotoo akpana, ihe ato mebiri: Ukwu ya zotoro akpana, aka ya o jiri mete akpana ahu wee sie na imi, nke ikpe azu bu imi ya.
When someone steps on chicken feaces, three things have been smeared: the foot, the fingers he used to take the feaces to smell and the nose that smelt the feaces.

Ka chi foo, Nwanna
youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1082 on: March 14, 2008, 06:12 PM »

Ngwanu ka oboo.

ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1083 on: March 14, 2008, 06:32 PM »

lol.
unu abuo dikwa egwu.olenu mgbe m ga eji ilu were na emebi ihe like this  Sad
Ok nwayo nwayo ,ihe ga adi nma.

Kashiff,i di egwu na atu oyi.i bu onye nkuzi igbo na Mahadum?ya gaziere gi

unu a tuchala ilu ndi m choro itu  Grin ka o di echi mana onye anula ngwo na nkwu na abia. Tongue

youngies (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1084 on: March 14, 2008, 06:34 PM »

Ify gi onwe gi dikwa egwu na udi gi nke gi.

Ihe agu ji eme ire di ya na mbo
What make a lion scary is in it's claws
Kashif (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1085 on: March 15, 2008, 04:23 PM »

Quote from: youngies on March 14, 2008, 06:34 PM
Ify gi onwe gi dikwa egwu na udi gi nke gi.

Ihe agu ji eme ire di ya na mbo
What make a lion scary is in it's claws

N'ezie, Ify adighi atu ilu dika anyim kama, O n'atu dika mbe n'onwe ya! Ahubeghi m onye ntorobia nwanyi n'atu ilu dika gi o! Nne, jisie ike. Echekwala na umu ndi ikom no ebe a na-ama gi aka n'ihu, okachasi Youngie na Echelon. Nku di na mba na-eghere mba nri. Awo si na oburu na ya agbanwughi oso, mbara nwanne ya agbaara ya (If the frog cannot run, the toad will stand in for him).

@topic,

Arusi kpakaria ike, egosi ya osisi ejiri pia ya
If an oracle forments too much trouble, it will be shown the wood it was carved from

Okenye ruo ala, utari agwu n'ohia
If an elder misbehaves, there will be no cain in the bush

Onwere k'odi na mmadu adighi ata oke, mana o ji eze eke ya umu ntakiri
Its odd that somebody does not eat rats but uses his teeth to share if for the children

Udele si na ime nwunye ya di di ya mma - O diri, ekele chukwu; O nwuo, oburu anu
The vulture said he is indifferent about his wife's pregnancy - if the baby survives fine; if it dies, it becomes meat

Ma nwa mbu ejeghi ije, nke abua agaghi agba oso
If the first child does not walk, the second would not run
ifyalways (f)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1086 on: March 16, 2008, 07:17 PM »

hmmmn,a sim na unu di egwuuuuuu.ekele m unu niile  Cool

@topic,anu gba ajo oso,a jujuo ya/gba ya ajo egbe. 
(i like the jujuo ya ajo egbe  Cheesy ,uda ya di iche )
when a game runs anyhow/somehow,he would be shot at anyhow/somehow

  Ngwere si na o buru na osi na elu da ma o nweghi onwe toro ya,ya eto onwe ya.
when a lizard falls from a wall and there is no one to praise him,he would praise himself

onye a kpala agu aka n'odu ma o di ma o nwuru anwu   nkea a bu ilu sef  Huh
Dead or asleep,the tigers/lions tail is not meant to be touched.
Kashif (m)
Re: Igbos come show your proverbs skills
« #1087 on: March 18, 2008, 09:39 AM »

Hmmmm,

A choro m ikwenye na oku a dara ibube; obughi onyunyu ka O nyuru,  Undecided
 Are You Proud To Be A Nigerian?  Nigerian Men, Sex And Affairs: Non-nigerian Women Speak  Is The Nigerian Accent Sexy?  Page 2
Pages: (1) ... (28) (29) (30) (31) (32) (33) (34) (35) (36) (37) (38) (39) (40) ... (46) Go Up Send Topic to Friend by E-mail Reply 
Google
 
Web www.nairaland.com
Sections: TV/Movies (2) Music/Radio (2) Celebrities Jobs (2) Career Romance Books Politics Sports Fashion Travel
Health Schooling Religion General(2) Business Webmaster Programming Computers Phones Cars & Trucks

Links: Page1 Page2 Page3 Page4 Page5 Page6 Page7 Page8 Page9 Page10

Nairaland is owned by Oluwaseun Osewa
Nairaland Forum | Powered by SMF 1.0.12.
© 2001-2005, Lewis Media. All Rights Reserved.