|
Mortiple (m)
|
Ify Nneoma, birikwe o!
Asi na obu mere mere mere nadighi ekwe umu nwanyi gba aji-onu (afu-onu) (Over labouring is responsible for women's inability to grow beard like their men counterparts). Nsogbu adighi.
Abatalam na ogba (court).
Ndebe edebere dike adighi mma, ewepu dike, obodo ajuo oyi (many do not appreciate the existence of the village warrior, yet his eventual demise has turn the village into a sleepy one)!
Orimiri atala, ma azu anwu la!
Deme deme!
|
|
|
|
|
|
ifyalways (f)
|
Ok,o foro Youngies . . . ezuo ka aha eri udele,a totue ngiga
@topic . . .kama ite mmanya ga ebutere enyi na enyi esemokwu,ya kuwa. the pot of palm wine that would bring quarrel between 2 friends should better break
|
|
|
|
|
|
webdezzi (m)
|
bravo Ify, I sent the stuff to her phone number and she loved it  maybe you need to give me more of such
|
|
|
|
|
|
ifyalways (f)
|
@web "a huru m gi na anya" + " a choro m ilu gi" dude you are OYO oooh  @topic,a tufue aziza na abali,mgbe chi boro a chowa ya if the broomstick is thrown away in the night,in the morning,it would be neededlol a dichaghim sure na atutara m ilu a  onye zakoo,ya kpoo he who sweeps and gathers dirt should also throw it away ka abia,ka abia mere mbe o pughi nku(wings) a dighikwa m sure of ilu nke a too 
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Ok,o foro Youngies . . . ezuo ka aha eri udele,a totue ngiga
Youngies n'ihe na eme - Mkpakara ga ama ozo, mana ozo ga alaTrying times for Youngies - the trap might catch the gorilla, but he must eventually get home 
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Ify thanks for holding forth 
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Youngies n'ihe na eme
Nwanna, I hope all is well
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
All is well, everything is under control Ewelo ife n'eme (Onitsha brand) - nothing dey happen
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ekene diilu chukwu maka na
O nweghi ihe akika puru ime okwute There is nothing termites can do to a stone
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Word!!! Echelon
Egbe ana agba igwe bu nsi-egbe ka ana ala n'iyi The gun that is being shot at the sky is a waste of gun powder
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Yo, i makwa na-asi na
Agwo na-atu mbe, eze ga-agwu ya n'onu A snake that is bitting a tortoise will eventually loose its teeth
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Moreso, because na
Agwo turu mbe, turu okpokoro The snake that bites the tortoise is wasting time on a hard shell
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
I marozi na asi na
Ohia juru gi nku bu onu ka o zere gi A bush that denies you of firewood is only being lenient to your neck
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Yes I know, and I also know that na
Mmiri riri onye ka ya ogbu The river that drowns a man is deeper than that man
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
Okwa anu nkanka mpi ka ibu nwa eze adighi efu na mba
A prince never get lost in a strange land
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
Utara mmiri na eme ala ncha
drop of rain that dig ground
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
Okwa anu nkanka mpi ka ibu nwa eze adighi efu na mba
A prince never get lost in a strange land
Mana ebe ana akuziri nwa eze ihe, ka nwa ohu na amuta iheWhen the prince is being taught, the servant learns also
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Utara mmiri na eme ala ncha
drop of rain that dig ground
This is better experienced than narrated  Maka na o na-ebuta apiti.
|
|
|
|
|
|
youngies (m)
|
True talk 
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
oke nduri na achu enwe oso A strong bird that chase away monkeys
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
ofu nkpuru ukpo na ekwe ofe
I can't get this in english
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
Akwuna na kawa nka ma olutaghi di ya asi na ogbu mmiri na mege ya. if a prostitute is getting old without getting married she will claim that water spirits are disturbing her.
|
|
|
|
|
|
3viso (m)
|
Ndi ba anyi ka odiba nu otua, asi ubochi nta ka anyi chuo na owere nchi.
Ka m je na ROMANCE thread mara ma mga agba aka ahia. Mara ma umu akwuna ofe mmanu ma ha putara tata.
|
|
|
|
|
|
ifyalways (f)
|
lmao. Youngies deeje.mberede ka eji ama dike  gi na Echelon e bidola iji ilu e mere m iyanga.  @Topic,ogbu opi ga ehicha imi he who blows the flute would also wipe/clean his noseBottomline:he who works hard,enjoys ! arua na anwu,eri e na ndo toil at noon,enjoy at dawn onye gba oso,o racha oroma work hard . . . .enjoy
|
|
|
|
|
|
Kashif (m)
|
@Ify, I am really touched by the way you have always kept this thread alive  Amaghi m ka o ji wee buru ubochi nta m ka mgbada ji ari elu. Oge obula Echelon na Youngie na-aso mpi ilu, A gaghi m ano ya  . Amaghi m nke bu mgbe obula, a kwoo m aka tiere okuko aki  . Ka osina di, ka m dibe maka na nkita si onye o turu ahia ute weletara ya ego ya maka na idina n'ala amarala ya ahu The dog is reversing the purchase order he placed for a mat because he has gotten used to lying on bare floorIfy, biko marakwa udi ntuzi I na-enye oyi anyi choro imuta asusu anyi tupu I tinye ya na nsogbu  Nkea bu maka na O si nwa agbogho ahu na O choro ilu ya ma obughi ihe obu n'obi, katakata nwekwara ike iso ya. Onye ga egbo ogu gbokwa ya mgbe a na-aru aka maka na ndi be anyi siri na oka egbo adighi egbote nke mbu (Super mediator can never stop the first blow)  @Echelon, I makwa na 'Stock Market Tips For Nigerians' na nairaland apuola? Eji m n'aka na I ma ebe ha no ugbua? Oburu na I maghi, mee ka m mara. Udo diri umu Igbo.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ya Kashif, ama m. I've seen the new addy don't really know why they had to move it
|
|
|
|
|
|
Kashif (m)
|
Poor moderation and inability to post analysis pictures. Please all, sorry for this digression. Unu egbukwala m biko ! 
|
|
|
|
|
|
ifyalways (f)
|
Kashiff deeje.! ama kwam ebe ndi stock ahu gara ugbua.hehe,esonyekwara m ya unyahuana m amu sha,o nweghi ihe m ma ebe ahu(stocks buying).N'ezie okwu,onye nwe ala a na eche na obuzi obere arusi,heheeeeeeeeeeee ochi ka m na achi ya n'ihi na o maghi na promotion na ngozi bu nani n'aka Chukwu ka o si abia.i hope na iwe ya agaghi ewe Chukwu. . . .ebe ahu ka o ga ahu nke toro biati.  Onye choro igba enyi ya nwayi TT bia sim tinyere ya onu. .ihe onye cho ka o fu  anugom ihe i kwuru,uche m ga adiya now.  @Topic,nwata erughi eru wara ogodo,ikuku kue,o bara ya na ogodo ya tuba ohia. If a kid(not old enough to ) ties a wrapper,the breeze would sweep both him and the wrapper into the bush Anaghi akwo aka etiri okuko aki you don't wash your hands to break kernels for the fowl/chicken
|
|
|
|
|
|
Kashif (m)
|
N'ezie, ngala buru uzo, odida e soro ya. A chukata nwa ogbenye, a chunye ya n'ala di mma. Ya mere, E chere m na ihe seun kara ime bu i kowara oha na eze ihe mere o jiri wee kwusi itunye ihe osise (pictures). Ejim n'aka na ihe kpatara ya bu maka uburu (storage) igwe komputa ya mana mmachi ahu n'enweghi nkowa gbagwojuru mmadu nile anya.
Echeghi m na obu onye mpako kama, ufodu oge, O kpaa agwa dika eze-onye-agwana m.
@topic
Ogazi amaka mana ejighi ya ago mmuo The guinea fowl is beautiful but it is cannot be used to appease the gods
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
O di ka o maghi na
Uche otu onye anaghi ezucha One person's wisdom is never enough
i assume he was asked to rethink
|
|
|
|
|
|
techzone
|
Here is one:
Were anya ihe chuwa ewu ojii - Start searching for a black goat while there is still day time. Once it is dark, ,
Meaning - Don't procrastinate. Do what you have to do when there is still time and opportunity left.
|
|
|
|
|
|
ifyalways (f)
|
O di ka o maghi na
Uche otu onye anaghi ezucha One person's wisdom is never enough
i assume he was asked to rethink
Eziokwu. . . . .i hope na odibeghi late  .Gini mere na o kwaghi ndi mmadu ihe bu nsogbu ya tupu o mechie d thread?o kara a kowara ha akowa tupu o mechie ya.well,i hope na ihe niile ga adi nma. . . .atleast for ndi dika anyi. . . .we learn from ebe ahu. anyuko amiri onu,o gba ofufu there is strenght in unity ozokwa otu onye anaghi emeri oha one person can never stand/win a crowd
|
|
|
|
|
|