|
faketan (m)
|
@echelon. . . iseeee
Ome mma na mma yi ana, ome njo na yi ana, ikwu amaghi ibe ezi ya nke onye metara o buru.
Di ka m si kwu na mbu, na egbe nkanka nku abughizi nwata egbe.
Itapia ilu igbo n' oyibo na-ewepu uto ya. iwere anya okeny lee ya i mata amaghi etu a ga-sei kworo onye ukwu wara.
Ogaghi ekwe m omume. Daalu maka inabata m etu m siri di.
Okwa ihe di be oke di be ogini, okwanu oke no n'ulo gwara oke no n'ohia na azu di na ngiga.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndi be anyi na-atu ilu si na,
Onu akoro mmadu bu chi ya ka akoro ya Insults to a person also goes to his God
Ife di onye mkpa ka o na-ekwu Everyone says what is important to him/her
Uche ofu onye anaghi ezucha One person's wisdom is not always enough
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Iseeeeeeeeeeee
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndi be anyi na-atu n'ilu si na
Onye wetalu oji, wetalu ndu He who brings kolanut, brings life
Onye riri anu udene erigo ajo nri He who eats the vulture's meat has eaten a bad food
Oje na nwayo anaghi emeru aru He who takes it easy does not get injured
but sometimes you've gotta take it hard sha
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Onye na-eri awo ya rie nke gbara agba nke oga-abu akpoo ya ori awo ya aza. maka na onye na-amaghi ebe mmiri bidoro mawa ya apughi i matakwa ebe okwusiri ima ya. Ana agwa Ochi nti na-agha esula. Mbanunu, agha akara aka adighi eri ngwuro. Maka na ekwe kuo ama agba. Anu gbana taa echi bu nta. mbosi nta ka chia na owere nchi. Onye si na ndi Igbo agaghi adi, ya bukwara okuko uzo lakpuo ura. Ka chi foo
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
@faketan
Ka chi boo
Igbo bu Igbo ka I bu
|
|
|
|
|
|
lovemajek (f)
|
we want proverbs,
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
@lovemajek Ka o di echi (till 2moro) 
|
|
|
|
|
|
lovemajek (f)
|
car see phone.
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Lovemajek, onye kworo ka ilu igbo si ato, otabiri aka. Ebe onye oso ruru ka onye ije ga-eru, mgbada gbala ihu echi bu nta. Oke n'ohi ngwere n'uzo, anyi ncha bu ofu. . . .Onye lee ka ozu dewere ihu, o begbue onwe ya na akwa. . . .Ukwa rue oge ya o daa. onye huru ukwa di n'elu, o were osis dutue ya, ogaghi aka aka wee daa, mgbe ahu chi ojo ariwa ibe ya elu.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndi nwe m na ndi m nwe mma mma nuoo
A na asi na
Onye ajuju anaghi efu uzo The inquisitive person never misses his/her way
Achusia aja ma ahughi udene, i mara na ihe mere n'ala ndi moo If after sacrifices the vulture is not seen, know that something happened in the land of the spirits
Ndi be anyi na-asikwa na
Onye kwe n'ihe otu kwuru, O laa n'oge Anyone that agrees to what the "Otu" (Onitsha main market) prices, will go home on time
Noro nu juu
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndi be anyi na-asi na
Onye were ngongo nua iyi, iyi ewere ngongo gbuo ya He that drinks the "iyi"please translate with abandon, the "iyi" will kill him with abandon too. o di kwa ka ihe faketan na-ekwu bu eziokwu
Aku bu ilo Wealth brings Envy/Enemies
Ogologo ndu na eziokwu yi aga Long life goes with truth
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Nna Mbe si na ejighi ehi akwa nne di na nso ma asikwanu ya weta ya bu ehi, ya enweghi ya.
Agwo omeghi ihe ojiri buru agwo umu azi ewere ya kee nku. . . Okenye adighi ano n,ulo, ewu amuo n'ogbiri. Obu ihe ojoo I so mmuo gbuo mmadu soro ndi mmadu bia akwam ozu.
Egbuo dike na ogu ulo, erue na ogu ama elote ya.
Nke onye na-eme ya gaziere yaoo
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndi Igbo si na
Ukwu okuko zoro nwa ya anaghi egbu ya The stepping-on on a chick by its mum does not kill it
Ebe onye no ka chi ya no Where a person is, his god is there too
Ebe onye bi ka o na-awachi Where a person lives is where he maintains
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
*clears throat* Mmadu anozikwa ebe a?
O di mma, a na-asi na
Gbara agbara rie ede, maka na ede bu oke mmuo! Eat Cocoa yam with caution, because cocoa yam is a great spirit
Aturu makpuru n'ala makpu kwa na elu okpukpu ya. The sheep that is lying on the ground is lying on its bones
Anyi we na-asikwa na
Ososo mmiri ji banye n'ime olulu, o gbajie ukwu When the flood runs into a ditch, it brakes its legs
Nodunu juu ndi be anyi
@Faketan M ga-acho ka i nwuru okwa n'aka wee bia ebe a echi o
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Nze buna nwa abiala m choo gi eri ututu ma ahughi m ichere aki.
Okenekwa. Amara m ugwu muta mgbaji ukwu, agadi nwanyi amuta agakata akwuru. Nihi agadi nwanyi daa nda ada n'abo, agukoo ihe o bu n'ukpo onu. Okuko si na ihe ya ji anu mmiri ele anya nigwe bu na ihe na-egbu ya na-esi n'elu abia.
Okuko egbe buru siri na ihe ji etiri mkpu abighi ka ihe ji ya aka hapu ya aka, kama ka igwe nuru, kala nuru.
uhuruchi omanu ndi nze ibe m.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Onye biri ka ibe ya biri, anokebeghi m n'ulo unyahu.
Ndi be anyi na-asi na
Uwa abu nke onye? Who owns the world?
Nwanyi choba nwunye di ya okwu, o si ya nye ya mmanu ka o wee taa akwu When a woman wants to make trouble for her co-wife she asks for palm oil to use to eat palm fruits
Anyi na-asikwa na Achou onye n'ikwu nna, o naa n'ikwu nne ya When someone is pursed from his father's house, he goes to his mother's house
Ndi be anyi ekelekwa mu unu, Noronu juu
|
|
|
|
|
|
Kashif (m)
|
echelon,
I na acho ikpa mu bu agu aka n'odu. Okwa i ma na agadi nwanyi adighi aka nka n'egwu o ma agba? Chere ka m nozie ka m we gosi gi na kama egbe ama efe chaa, ya fee ka udene. Ihe di woro ogori azuola n'ahia.
Udo diri umu ibe.
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Nkita nyara akpa nsi agwu n'ohia. Ikwuikwui nyuru aru si umu nna ya kwere ya egwu. ha si ya tufuakwa, na anaghi ekwere ihe ojoo egwu. Ewu nwuru n'oba ji abughi aguu gburu ya. Onye si na igbo erijughi afo? O bu n'imaghi na achuo aja ma ahughi udele, a mara na ihe mere be ndi muo. Maazi Kashif, kedu ebe i no eri oge? I mana diochi a dighi ekwucha ihe ohuru na elu nkwu. Nwunye awo si na di atogbugo ya ya jiri luta nke ya kworo ya na azu.
I gatakwa I chete ulo, nno diike.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
@Kashif Asi na mgbe onye ji teta ula obulu ututu ya, n'ihi nke a, nnoo
Ma mara amara na ogaranya bu omumue omume maka na adighi abu ogaranya abu.
Ndi be anyi si kwa na
Onye malu na odi ofele, ya puta ka o mee
Ekenekwa m gi,
*readers forgive me this is a personal msg*
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndị be anyị sị na achụkata onye, achụnye ya n`ụwa ọmaWhen an individual is pursed, after sometime, he is pursed into a world of good. Ife kwụlụ, ife akwụdebe yaWhen something stands, another stands beside it (normally used to talk about a man and his wife)Anyụsịa nsị ma akapịrị ya ọnụ, ọ bụrụ otoroAfter pooing if the feaces is not pointed, it becomes dysentery *the word of elders are words of wisdom*
|
|
|
|
|
|
HUMPHERY
|
IGBO NASI , ERIRI OTUONYE HURU NA AHO AGWO![i][/i] 
|
|
|
|
|
|
HUMPHERY
|
ECHI EBUKA[i][/i]  !
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ndị be anyị sị na
Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri If the right hand washes the left, the left will as well wash the right hand
Anya mmanwụ adịghịzị ebe akpọpụrụ oghere The masqurade`s eyes are nolonger where the holes are made for it this is used to talk of hard times
Ezi nwanyị dị ukọ Good women are scarce
Okenekwa
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
@topic
Kama ntu ahia ga-anyụ m ahia, m wenegara ya onye ziri m Instead of losing my market due to "buy requests" by those at home, I'll send the requests back to them
Mmiri ugo jiri kwọ aka ka ụgbana jiri wụ arụ The water the eagle used to wash hands is the same that the cattle egret used to bath. used to say that you can not satisfy the world no matter how you try
Ajụ na-ewona mmanwụ n'isi The carrying pad/cloth is sinking on the masqurades head*warning: meaning not exactly this. this is used to talk of hard times*
Daalụnụ
|
|
|
|
|
|
presido1
|
ndigbo si na nwanyi di ime si na ihe na eme ya ihere abughi na odi ime kama o bu ya gafee ndi mmadu amara ihe omere were di ime.
Igbo na asi kwa na egbe oku da na ala nwayi aria ya elu.(when the long palm tree fell that a woman can climb it.) but why should we be translating ebe ndi igbo na ekwu si na onye aturu ilu kowara ya ego ejiri lu nne ya furu ohia.
Let me go and read my igbo text book(Ome Na Uko) will be back tomorrow. Igbo ekene m onu ncha. ka chi fo nu.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
but why should we be translating ebe ndi igbo na ekwu si na onye aturu ilu kowara ya ego ejiri lu nne ya furu ohia.
Translate equals Kowara Translate is just to render it in another language, literally, not to explain the meaning.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Unu a saala chi?
@topic
Naanị anụ ji eze ari enu osisi mara nke na-enu inu It's only the animal that climbs the tree with its teeth that knows which one is bittersimilar to english proverb: he that wears the shoe knows where it pinches
Ana ekwu na okuku gbanyere aja, ọ chịrị okpa naabọ wụnye Complaint is being made that the chicken put some sand in the dish, it then walked into the dish.
Nkịta dina n'uche ọ dị ka ọ nọ n'ụra When the dog is lying down meditating, it appears as if it's sleeping
Ya gazie
|
|
|
|
|
|
faketan (m)
|
Asiri m unu na Ikwikwi nyuru aru si umu nna ya kwere ya egwu, ha asi ya mbakwa na adighi ekwere ihe ojoo egwu. Okwa unu ma na o na abu ahu ihe ka ubi eree oba. Unu amakwa na-agadi nwanyi a naghi aka nka n'egwu O mara agba? mgbe aka kpaara ezekudele. Okwuo Onye chiri ya ozo.
Unu makwa na-anaghi atu otu ukwu egwu maka n'obughi yanwa ga-ara onwe ya.
Ndeewonu.
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
@topic Mmadụ anaghị agbalụ ife bia na be nna ya ọsọNobody runs for something that comes into his father's compound Ka ife esina sie ike, o nwelu ife sikarịrị ya n ikeHowever strong something is, there is always something stronger Asị onye ara bia kere oke ihe nna ya nwuru anwu, ọ sị na nke o ji ka  When the mad man is asked to come and take his share of his late dad's property, he says that what he has is better Okenekwaa
|
|
|
|
|
|
+osisi
|
daalu so echelon.
loved all your ilus
|
|
|
|
|
|
echelon (m)
|
Ọ ife anyị na-emelụ onwe anyị glad you enjoy them
|
|
|
|
|
|