Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,589 members, 7,809,129 topics. Date: Friday, 26 April 2024 at 12:29 AM

Nrubeisi Na Ndebeiwu - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Nrubeisi Na Ndebeiwu (13498 Views)

Snake Na Oyibo Culture / "DURO" Na Yoruba Be Dis ??? / What Is 'traditional' To The Igbo? | Gịnị Bụ Omẹnàlà Na Ányá Ńdí Ìgbò? (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 12:35pm On Sep 26, 2012
NdiIgbo, please, come and discuss what you understand by nrubeisi (obedience) and ndebeiwu (law keeping).
Dee ma kowaa na asusu IGBO.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 12:42pm On Sep 26, 2012
Nrubeisi na obi m bu mmadu ime ihe a gwara ya mee. Enwere nrubeisi na ulo akwukwo, na ezinaulo ma o bu kwa na ama.
Na ezinaulo, anyi kwesikwara ina erubere nne na nna anyi isi n'ulo dika:
Izacha ezinaulo.
Ichu mmiri.
Iga kpata nku ma o di na mkpa.
Inyere nne ma obu nna aka n'oru ugbo ma obu azumahia.
Odikwa otutu.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 12:51pm On Sep 26, 2012
Ndebeiwu: N'ezinaulo obula, ma obu ulo akwukwo ma obu na ama, bu ezigbo ezinaulo, o nwere iwu na-achi ha dika:
Ha ga na arusi oru ike.
Ha agaghi na-ezu ohi.
Ha agaghi na-agba ama ugha.
Nwata agaghi eri ihe obula a sighi ya rie dika anu, nri na ihe ndi ozo.
Onye akpirikwala ego nne ya nnaya na nzuzo.
Biko, unu kwuputa ndi ozo.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 10:44pm On Sep 26, 2012
Nrubere nne na nna isi bu kwa inye aka sie erimeri a ga-eri n'ulo.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by odumchi: 11:58pm On Sep 26, 2012
Ha dicha otutu.

Na mgbe ochie, ana ekewa ndi mmadu na uke (age-grade). Uke obula nwechara oru o kwesiri iru na obodo. Ka m wee maa atu: mgbe ochie, na ubochi eke, umu okorobia ndi dicha afo iri-iri n'ise nwere ike iga aghota nku ha ga-eji emezi ulo nzuko obodo ha.

Ihe a niile socha wuru nrube isi.

1 Like

Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 9:33pm On Sep 30, 2012
Enwekwara otutu nrubeisi di na ulo akwukwo. I na erube isi bu ndi nkuzi si gi zaa klaasi, gi azaa yaa.
Agwa gi ruo oru e kere n'ulo akwukwo gi aruo ya.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by ifyalways(f): 8:00am On Oct 01, 2012
Dika nwata na-etolite etolite, Nne na nna m zuru m irubere ma sopuru ndi okenye nile isi. Nwata nme ihe ojoo, okenye obula no nso were ike iku ya ihe ma tuziere ya uzo oma. Nwa bu nke ora, otu onye a naghi azu Nwa.
Ugbu a, dika Nne umuaka, a na m agbakwa mbo i kuziri umu m ka ha na asopuru okenye obula biara n'uzo ha kama maka n'uwa a gbanwela, ndi okenye ome mpu juputakwara, a kuzikwara m ha na ha a gaghi ekwe maka na nmadu bu okenye mee ihe ojoo.

1 Like

Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 11:46pm On Oct 02, 2012
ifyalways: Dika nwata na-etolite etolite, Nne na nna m zuru m irubere ma sopuru ndi okenye nile isi. Nwata nme ihe ojoo, okenye obula no nso were ike iku ya ihe ma tuziere ya uzo oma. Nwa bu nke ora, otu onye a naghi azu Nwa.
Ugbu a, dika Nne umuaka, a na m agbakwa mbo i kuziri umu m ka ha na asopuru okenye obula biara n'uzo ha kama maka n'uwa a gbanwela, ndi okenye ome mpu juputakwara, a kuzikwara m ha na ha a gaghi ekwe maka na nmadu bu okenye mee ihe ojoo.

Ify, uka gi amaka. Na agbanye gi na ufodu ndi okenye na eme mpu, o di kwa mma ka ana akwanyere ndi okenye ugwu ruru ha, ma na erubekwara ha isi.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by Antivirus92(m): 6:06am On Oct 04, 2012
Ahize m buru onye igbo!
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 9:45am On Oct 04, 2012
Antivirus92: Ahize m buru onye igbo!
Kowaa.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by ifyalways(f): 9:59am On Oct 04, 2012
Andre Uweh:
Kowaa.

Isi okpukpu ahu n'ekele Chukwu na o kere ya dika Nwa afo Igbo. O jizi style ako ndi mba ndi ozo onu.
Lee anya na signature "otele"

Ufodu oge, m lecha anya na omenani ndi mba ozo, a nam asikwa aka kelu uwa "deme/dalu na i mere Nne na nna m ndi igbo"

Lol

1 Like

Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 10:05am On Oct 04, 2012
ifyalways:

Isi okpukpu ahu n'ekele Chukwu na o kere ya dika Nwa afo Igbo. O jizi style ako ndi mba ndi ozo onu.
Lee anya na signature "otele"

Ufodu oge, m lecha anya na omenani ndi mba ozo, a nam asikwa aka kelu uwa "deme/dalu na i mere Nne na nna m ndi igbo"

Lol
Ya dikwara gi mma. Onye nwe anyi gba gi ume.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 10:08am On Oct 04, 2012
Nrubeisi na ulo akwukwo bu kwa nwata mewe mkpotu na klaasi, a gwaya ya kwusi, ya akwusi.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by Antivirus92(m): 1:36pm On Oct 04, 2012
ifyalways:

Isi okpukpu ahu n'ekele Chukwu na o kere ya dika Nwa afo Igbo. O jizi style ako ndi mba ndi ozo onu.
Lee anya na signature "otele"

Ufodu oge, m lecha anya na omenani ndi mba ozo, a nam asikwa aka kelu uwa "deme/dalu na i mere Nne na nna m ndi igbo"

Lol
ify obu m bu onye isiokpukpu?
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by AndreUweh(m): 3:40pm On Oct 04, 2012
Antivirus92: ify obu m bu onye isiokpukpu?
Biko, do not derail this thread. KWANYERE ONWE GI UGWU.
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by Antivirus92(m): 5:14pm On Oct 04, 2012
Andre Uweh:
Biko, do not derail this thread. KWANYERE ONWE GI UGWU.
very childish!
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by ifyalways(f): 9:53pm On Oct 04, 2012
Emee obele,Virus asuba bekee.

Ka m jukwa,nmadu e nwelu ike i na-akwanyere ndi okenye ugwu(respect) mana o dighi erube isi(but disobeys) ? Owu onye o bula na erube isi na asopuru ndi okenye?
Re: Nrubeisi Na Ndebeiwu by odumchi: 10:07pm On Oct 04, 2012
Ikwanyere ndi okenye ugwu di ezigbote mkpa o. Na ala Igbo, ndi okenye bu ndi maara otu uwa si di ya mee, anyinwa ha toro kwesiri i na asopuru ha otu kwesiri ha.

O site na ndi okenye ka anyi si anata amamihe na umu ilu ha na akoro anyi. Kama ihe mere kita bu na ufodu umu okorobia na-eche na ha akala ndi okenye maka ego uwa ha kpatara; ufodu na-na aza aha di ka "okwu oto ekene eze". Biko nu, udi omume a adighi nma maka ihe e ji mara anyi wu ndi Igbo bu otu anyi si na akwanyere ndi ibe anyi ugwu.

Otu umu aka si akwanyere ndi ife ukwu dicha otutu. Ka m wee maa atu: ezi na ulo riwa ofe, o bu nna nwe ulo bu onye kwesiri ibu uzo ata anu. O werewa anu o were nke kacha nnukwu; umuaka ekwesighi iwere anu tutu ha ericha nri. Ha richa ha ekele nne na nna ha.

2 Likes

(1) (Reply)

Just Another Day At Mcdonalds-black Woman / The Aniomas of Delta State / President General Of Ohaneze Ndigbo, Obi Of Onitsha Set For Eastern Heritage

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 27
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.