Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,255 members, 7,807,880 topics. Date: Wednesday, 24 April 2024 at 09:25 PM

Gọvanọ Willie Obianọ Akatọọna Mkpamkpa Ahụ Kpara N'ọzụbụlụ. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Gọvanọ Willie Obianọ Akatọọna Mkpamkpa Ahụ Kpara N'ọzụbụlụ. By Izunna Okafor (462 Views)

Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): / Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Gọvanọ Willie Obianọ Akatọọna Mkpamkpa Ahụ Kpara N'ọzụbụlụ. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 7:20am On Aug 13, 2017
Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akatọọna kpamkpam, mkpamkpa ahụ dị oke egwu nke kpara n'Ọzụbụlụ n'ubọchị ụka gara aga ma foro ntutu ya taa ime oke nnyocha miri emi banyere ya bụ ajọ ọnọdụ iji nwụchikọọ  ndi obi kpọnkụ ahụ kpara ya bụ arụ. Gọvanọ Obianọ kwuputara nke a ma mee mkpebi ahụ oge ọ gbaruru n'ebe ahụ ya bụ njiịji nọrọ wee jie, bụ ụlọ ụka (Katọlik) St. Philips  nke dị n'Ọzụbụlụ dị  n'okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti ahụ. Ya bụ Gọvanọ gosiputakwara obi mwute ya banyere ya bụ mwakpo ọnụ ụtụtụ nke were ihe karịrị ndụ mmadụ iri, ebe ọtụtụ bụkwa ndi natara mmerụ ahụ dị iche iche.
          Na mbụ n'okwu ya banyere
mwakpo  ahụ, onye ụkọchukwu nke ụlọ ụka ahụ, bụ Rev. Fr. Jude Ọnwụasọ sịrị na ya bụ mkpamkpa kpara n'ọnụ ụtụtụ n'ụka aja mass dị nsọ ka o jiri ọkara gata elekere isii nke ụtụtụ ahụ. Ọ sịrị na oge aja mass ahụ na-aga n'ihu, ka otu nwoke a na-amaghị onye ọ bụ batara n'ime ụlọ ụka ahụ, gaa waa n'otu akụkụ ka nwamkpi ma ụzọ ọba wee gbaa otu onye a na-akpọ maazị Akụnwafọr Ikegwụọnwụ egbe gbagbuo ya, wee malitezie gbanyebe ya bụ egbe aghara aghara n'ebe ndi mmadụ ndi ọzọ  nọ, n'ime ụlọ ụka ahụ.
          Otu onye aka ebe, bụkwa onye nọ n'ụlọ ụka ahụ oge ihe ahụ mere sịrị na ndi ahụ bu ụgbọ ala abụọ wee bata ma kwụsịdebe n'ọnụ ụzọ ama nke ụlọ ụka ahụ, ebe ndi nọ n'ime ha rịtusịrị ma bụrụkwa ndi yikọsi uwe ndi agha ala anyị (Army Uniform), kpuchie ihu ha ma burusikwa ihe dịka egbe n'aka. Ọ sị na ihu eluigwé gbara ọchịchịrị oge ahụ, nke mere na ahụchaghị ihe ha bu anya nke ọma, ma sịkwa na ihe ọzọ a hụrụ bụ ka ndi ahụ wụbatara n'ebe ahụ a na-achụ aja mass dị nsọ wee kwughepu egbe, ngbọ wee daba aghara aghara.
Onye ọzọ kọwara onwe ya dịka onye ọbụ abụ sịkwara na ụgbọ ala ahụ ndi ahụ dochiri n'ọnụ ụzọ ama mezịrị ka ndi mmadụ ghara inwe ike ịbata abata ma ọ bụ ịpụ apụ, nke mere na ha gbutere ọtụtụ ndi mmadụ, ebe ọtụtụ bụkwa ndi natara mmerụ ahụ. Ọ kwukwara na ndi omekoome ahụ makpurusiri n'ime ụgbọ ala ha ma nyaa ọnwụ ọnwụ ma fee ka nnụnụ, ngwa ngwa ha kpachara arụ ahụ.
       N'okwu nke ya, onye isi ndi uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Garba Umar, onye kpọrọ ndi ọrụ ya wee wucha n'ebe ahụ ka ọ gachara ihe dịka otu awa ndi ahụ ji wee pụọ, katọkwara ya bụ agwa ọjọọ ma sịkwa na ozi ha natagoro na nnyocha ha mere na-egosi na ọ bụ esemokwu dapụtara n'etiti ụfọdụ ụmụ afọ si obodo ahụ si n'ime ogbe Ụmụezekwe Ofufe Amakwa bụ ndi bi na mba ofesi butere ya bụ mwakpo. O kwukwara na ọ dịghị onye ọbụla abụghị nwa afọ obodo ahụ nke ga enwe ike ịkpanwu ụdị agwa ahụ, maka na ọ bụ naanị nwa afọ obodo ahụ pụrụ ịma onye bụ onye nke ha chọrọ bịa n'ụlọ ụka ahụ, nakwa n'akụkụ ebe onye ahụ na-anọ ma ọ bịa ụka, nke mere na onye ahụ batara ozigbo gaa waa ka nwamkpi ma ụzọ ọba wee ga buru ụzọ gbawanye egbe n'ebe ahụ onye ahụ na-anọ, tupuu kesabazie ya n'igwe mmadụ.
O kwukwara na aka  ga-akpatarịrị ndi ahụ aka ha dị na ya bụ akụmakụ ma were iwu nke ala anyi nyụchaa ha anya.
          Gọvanọ Willie Obianọ nọzịkwara n'oge ahụ kasie ndi niile nke ahụ metụtara obi ma nyekwa ha owuwe anya na a ga anwụchikọrịrị ndi kpara arụ ahụ n'oge adịghị anya. Oṅsikwa n'ebe ahụ ozigbo gbarakwara gaba n'ụlọ ahụike mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi ebe ọtụtụ n'ime ndi ahụ nwetara mmerụ ahụ nọ anara ọgwụgwọ, ma kwuokwa na gọọmenti steeti ahụ ga-akwụ ụgwọ niile e jiri nye ha ọgwụgwọ. Ọ sị na e zigawoorị ndi ọrụ nlekọta ahụ ike bụ dọkịnta dị iri ise n'ọnụ ọgụgụ n'ụlọ ọgwụ ahụ ozigbo maka inye aka n'inye ndi ahụ ọgwụgwọ. Gọvanọ ahụ sizịkikwa n'ebe ahụ wee gbara gaba na ụlọ ụka Our Lady of Assumption dị na Nnewi, ebe ọ nọrọ wee gwa igwe mmadụ nọ n'ulọ ụka okwu.
          Ọtụtụ ụmụ afọ steeti ahụ nakwa ndi ọzọ sitere n'ebe dị iche iche n'ụwa gbaa gburu gburu katọrọ kpamkpam ya bụ akparamagwa ọjọọ. Ndi ahụ gụnyere aka na-achị steeti Delta bụ Gọv. Ifeanyị Okowa, ogbo ya nke steeti Ekiti bụ Gọv. Ayodele Fayose, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado ndịda anyanwụ nke  steeti Anambra (Anambra South) n'ụlọ ọgbakọ ukwu sineetị bụ maazịAndy Uba, onye jibụ ọkwa onye isi ngalaba na-ahụ maka ọdụ ụgbọ elu n'ala anyị n'oge gara aga bụ maazị Osita Chidịọka, ode akwụkwọ ukwu nke steeti Anambra n'oge gara aga bụ maazị Henry Oseloka Ọbaze, nakwa ọtụtụ ndi ọzọ, bụkwa ndi kpọrọ oku ka e mee nnyocha miri emi maka ya bụ ajọ ọdachi.

1 Like

Re: Gọvanọ Willie Obianọ Akatọọna Mkpamkpa Ahụ Kpara N'ọzụbụlụ. By Izunna Okafor by LUGBE: 7:39am On Aug 13, 2017
Biko ogahi abu Chidoka, anyi bu umunee achohu ya acho.

Oga ebulu ulo diri umu Anambra steti nye ndi be ogo ya bu ndi Abia, nwoke bu chidoka melu ncha

Ogaghi achi Anambra oooh

(1) (Reply)

Healing The World Begins With Us / A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA / Why 'Man Up' Is One Of The Greatest Scams Of All Time

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 13
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.