Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,143,435 members, 7,781,272 topics. Date: Friday, 29 March 2024 at 11:33 AM

Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) - Culture (5) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) (30884 Views)

Nigeria Pidgin Proverbs & Their Meanings / Yorubás come show your proverbs skills / Igbos come show your proverbs skills (2) (3) (4)

(1) (2) (3) (4) (5) (6) (Reply) (Go Down)

Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by youngies(m): 7:28am On Oct 05, 2011
Hmmm, ndi Igbo birikwa nu!

Oku da ibube odi ka onyuru anyu
When the fire is still smothering it appears to be out
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 12:24am On Oct 09, 2011
Ndigbo sili na elili kelu ngwugwu mana ngwugwu maalu onye kelie.
Ndigbo sikwaa na aku fechaa odalu awo.
Fa sikwazili na ukwu jie agu mgbada abialia olu.
Ndibeanyi sili na anaghi ekwuchi afo ime aka.
ekeneen Eze Nri na Igbo ndi oma mu ji eme onu!!
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by aljharem3: 7:42pm On Oct 09, 2011
m chọrọ iri ihe moin moin, dey m chọrọ iri ihe akara


moin moin no dey, dey chop akara dey go
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 2:40pm On Oct 10, 2011
^Ofeke Nsugbe.

@Nri priest.E chekwa m ma o bu "Ukwu jie agu,mgbada abia ya ugwo" ?

Ndi Igbo nma nma nu.Nke onye chiri ya zelu.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 8:46am On Oct 15, 2011
Igbo si na onye isi anaghi aza "Anene".

Nna m kwuru si na Onye a kpolu "Rufus" ga agbo mbo tinye akirika ma o bu zinc n'elu ulo nna ya.

A naghi eji azu ndu akpari onye bi na ikpele mmiri.

Onye jere ebe a na aboli aja elu,ikuku kue, aja aba ya anya.

Nke onye chiri,ya zelu.Igbo amaka.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 9:39am On Oct 16, 2011
Igbo si na onye ngbo tugburu nna ya n'eji ite ona eme okpu.

Nna m si na kama ngbo ga e buru isi mmadu,ya buru okpu ya.

Aka jere i jide ire ga-agho nri nye eze.

Uche dika akpa,onye o bula nya nke ya.

Igbo biri nu.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by AndreUweh(m): 2:46pm On Oct 16, 2011
Uba zuo oke, iro ala. When wealth is equally distributed, there will not be envy, greed or jelousy.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 7:01am On Oct 19, 2011
Igbo si na ihe gburu dike kpalu ofeke aka,o dosa ma ozu na opkukpu ya.

Nna m gwa m na mmiri zolu be Ogalanya bu ajo ide nye nwa Ogbenye.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 3:13am On Oct 20, 2011
Ifyalways,daalu adaoma. U are correct. It is "ukwu jie agu mgbada abialia ugwo".
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 3:32am On Oct 20, 2011
Ndigbo sili na onye ekwelu ka oha ebulu ya gafee ama nnia.
Igbo kwukwalu na nwata bunie nnia enu ngwo ngwo na ngwo ngwo ayochie ya anya.
Ilu Igbo kwulu si na nwata kwochaa aka osolu ogalanya lie ife.
Fa kwukwazia na agadi nwanyi kaba nka odi ka ejighi aku luo ya.
Igbo wee si na oji ututu tutuba na atutuju akwa.
Ekeneem his royal highness,late michael nweze, anummili na Umuoji and the current Igwe, cyril enweze, ochiliozua na Umuoji.
Ekenekwazili mu eze Nri enwelana hrh onyesoh na obi of Onitsha.
Umuigbo,lie nu,nuo nu ma kachakwaa nu.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 8:50am On Oct 20, 2011
NRI PRIEST:

Ifyalways,daalu adaoma. U are correct. It is "ukwu jie agu mgbada abialia ugwo".
I di Ok,nwa.

Igbo si na agupe uzo/emeghe uzo,agupe/meghe onu.

Nna m gwa na chi folu efo bu olile anya ka o fotere onu.

Ndi Igbo ga adi.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 9:30pm On Oct 21, 2011
Ndigbo sili na agbawo dike izu agbaa ya mgba nabo.
Nnam wee si na abado nwoke aja izuzu nwoke zulu agwu.
Ilu Igbo sikwazili na oji onye na ala ji onwe ya.
Flavour nabania, wee si na ala dalu ada adasigo.
Ifyalways,over to you. Welu ya bia(bring it on),ka anyi malu onye bu ezi nwafo umuigbo.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by adaide1: 12:54pm On Nov 23, 2011
nwa nze na ele-oku, o si na ya na-aha nmanu
nwata na ata akara na ata ego ya,
onye ogazi elu, o si na ibe ya na agho ara
okwu nri ego, o daa mmiri

o ga adiri igbo nma!
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by AndreUweh(m): 2:28pm On Dec 17, 2011
Okuko nyuo ahu, ala achuo ya oso.
Igbo ekelem unu.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 3:11pm On Dec 18, 2011
Ikpe adi ama nwa nze,ebe nnia no na ogbo okwu.
Igbo sili na ama ka mmili malu ogazi,akikia ka ga adililia na aru.
Igbo kwukwazili si na ara afusia ebe ana echi ozo jebe ebe ana aru agwu.

Obele nwa si Idenmili puta kenelu unu ncha.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 3:17pm On Dec 18, 2011
Igbo sili na ezi oyi ka ajo nwanne.
Fa sikwazili na ugo gbuzuo ochakee.

Umuigbo, ite ego akokwana na obi nna unu!
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by AndreUweh(m): 4:26pm On Dec 18, 2011
Igbo na asi kwa na mmiri doro na ejuju dokwara nwa nkita.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 11:30pm On Dec 18, 2011
Andre, nwannem daalu maka ilu Igbo ina atuputasi ebea makana Ndigbo sili na onye nwelu mmadu ka onye nweli ego.
Igbo sikwazili na ezi afa ka ego.
kwukwazia na uzo di mma agaa ya nga nabo.
fa kwukwalu na ana ayo ego ana ayokwa ndu.
onye uwa na ekili ekili adiro mma ikpo ntu.

Umuigbo ekeneem unu rinne.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 8:32pm On Feb 29, 2012
Udo di umunne m!

Nwa ologbo si na ihe oji anyu nshi a kpogide ya aja bu maka na odighi aria ahu,nshi onye ozo agho nke ya.

Translation:Pussy cat claimed he covers his excreta with sand once he's done to avoid anyone mistaking his own for theirs or vice versa.

Meaning:Good fences/landmarks makes good neighbours.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 6:02pm On Mar 01, 2012
Obu sili na ike di na awaja na awaja,nya melu obu ji egbu agwo mana agwo na egbu nmadu. . .Ify,inu ikpeazu nkea itulu mee ka nsi bido sibem na ebe m'no.
Umuigbo,asim unu kasia !
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by nedu210(m): 8:34pm On Mar 03, 2012
UMU IGBO EKENE'M UNU.   _____ ndi be anyi  na ekwu okwa na asi,  mgbada dalu ibi bu ulu dinta.  ____ okuku hafulu mma gbulu ya na atugolu ite onu. ____ubochi nwa mbaa ga esi n' ulo kwapu, ubochi ahu ka umu oke ga enwe onu.   INU NTUHGARI UCHE.     Onye mu na ya so gaa nta si na okpa mu di ka okpa anu.  __ nwa nne'm mu na ya na achu mmuo si na mu na esi mmuo mnuo. __chinchi gwara umu ya ka ha nwee ndidi na ihe di oku ga aju oyii. Umu igbo ka odi nu mgbe ozo. Oge nta ka anyi chuo na owelle nchi. cool
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by Brodafred(m): 5:04pm On Mar 05, 2012
1-Gbanu gbanu gwujie ji etukwuru ana cho odudu ya
2-Gidi gidi bu ugwu eze
3-Nkita sili si tuplu ya okpu-kpu n'ezi ma si hapuzie ogu ya n' ndi muo
4-Nwata bulie nna ya elu oyo-oyo ayochie ya anya
5-Mbughari mbughari ka eji ere mbekwu
6-Adighi ano out-ebe aza ezi
7-Adighi ano out-ebe ene-ne manwu/muo
8-Otu nmpkuru aka luta nmanu ozuo Uwa onu
9-Kpolu ghafuo kpolu ghafuo okwa obi ka ana agwa
10-Ndidi bu ije uwa
11- Ire-oma ka ejula ji aga n' ogwu
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by toshmann(m): 2:48am On Mar 08, 2012
Akwuna change-ia base, ya awuru chasis cool
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by AndreUweh(m): 8:51pm On Mar 08, 2012
Nkwu ogologo dasie uzo, onye ibi aria ya elu-a fallen palm tree affords a man with swollen scrutum to climb over it.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by odumchi: 3:15am On Mar 14, 2012
"Nsonso soro nsonso soro nsonso" - everything leads into something else.

"Onwee ebe uzo Aro za di nso, Ebe owula igasara anya" - the road to prosperity is not easy.

"Atuo nti na ali a nu opi ndanda" - you will learn more when you listen.

"Egbe si na umu Ugo agaghi ano ndu na egbukwa umu nke yo" - If you dont let your fellow human being live, you too will not live.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by NRIPRIEST(m): 4:05am On Mar 14, 2012
Nwa onye Igbo abialugo!
Ndi be anyi sili na adi ekpudo afor ime aka.
Ndi be anyi wee si na isi kota ebu ogbakasia ya.
Ndi we sikwazie na onye nya na nwannie na eli nni osi bute oke,si chubia maka na obu nnsi!
Nwa onye Igbo keneli u u rinne.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ACM10: 1:59pm On Jun 12, 2012
Ndi be anyi kwenu!

A si na ilu bu mmanu ndi Igbo ji eri nri. Obi di mu uso nke ukwu oge mu furu ogbako a. A nam ekele ChinenyeN. A siri na aka a nara dike bu ugo ka etubere ya.

A nam ekelekwa Eze OnlyTruth. A siri gi jide ka iji.

A nam ekelekwa Igbo ndi nwe mu. Igbo ga adi o. Igbo bu ugo. Ugo chara acha a naghi echu echu.

Chukwu gozie unu o!
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ifyalways(f): 2:43pm On Jun 12, 2012
Nna m si na a gbasia oso, a guo mile. (its never how far but how well)

Biri nu!
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ACM10: 4:45pm On Jun 12, 2012
E jighi amu eghi Akwuna egwu.

Egwu a naghi atu afo o bulu uzo
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ACM10: 4:49pm On Jun 12, 2012
Ngwere riri oji abughizi nwa ngwere.

Onye amu di mma a maghi ihe onye ibi na afu.

Okuko bata na ala o na amaghi, owere otu o ukwu kwuru
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ACM10: 4:54pm On Jun 12, 2012
Agbakata izu, onye nti ike anu ya.

E kwukalia ezi okwu, o di ka okwu asi.

A dighi m atu ujo ara nwanyi ajadu, maka na amam na di ya anoghi nso.

Awo siri na ihe o jiri kworo di ya na azu bu maka na di asoka.
Re: Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) by ACM10: 4:57pm On Jun 12, 2012
*

(1) (2) (3) (4) (5) (6) (Reply)

Nkiru Homann Dresses Kids In Germany In Local Outfits - Photos / Relationship Between Yoruba Language And Igala Language. / Ooni Ogunwusi's Gift To Symington, US Ambasador To Nigeria, They Met In Lagos

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 30
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.