Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,521 members, 7,808,899 topics. Date: Thursday, 25 April 2024 at 06:58 PM

Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture - Culture (4) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture (23252 Views)

The Importance Attached To The 2nd Child(orlu) In Igbo Culture. / Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. / Showcasing Igbo culture (2) (3) (4)

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply) (Go Down)

Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Torch1(m): 9:48am On Oct 15, 2011
Igbo bu Igbo! Ekele mu nuo! A bu m onye Ozubulu n'ime okpuru ochichi Ekwusigo L.G.A na Anambra steeti, Na be anyi bu Ozubulu anyi na asi "de eme" ma obu "ime la", Asusu Igbo ga-adi oo!

1 Like

Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by BiafranFirstSon(m): 9:57am On Oct 15, 2011
Igbo ndi oma m ji eme onu. Ekele mu unu. Obi di m ezigbo uto na ihe nwanne anyi nwoke Andre malitere iji were mee ka asusu igbo na aga na ihu, Abum nwa afo Isu nke di na Nwangele. Nkea bu otu anyi si ekene , Unu orukwa mma? Unu optala taa, Ka chi boonu! Igbo ndi oma nwem, Ka emesia nu!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by felucci(m): 10:03am On Oct 15, 2011
Ndigbo no Nigeria, Anam ekene.
Ndigbo no China, Anam ekene.
Ndigbo no America, Anam ekene.
Ndigbo no UK, Anam ekene.
Ndigbo no South Africa, Anam ekene.
Oga diri anyi mma
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by hbrednic: 10:34am On Oct 15, 2011
udo diri unu umu nnem
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by hbrednic: 10:42am On Oct 15, 2011
Igbo mma mma nu,ka chukwu gozie umuigbo nine ebe obula unu no.
Andrew uwe onye oma,udo dirigi.
nke onye anana eme,ya jisie ike.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by nadneth: 11:32am On Oct 15, 2011
Umu afo Igbo ana m ekene unu,nke onye chilu, ya zelu. Abu m nwa afo Oba nke di na Idemmili nke Anambra state. Anyi na asi Kee ka ime (how are u), daalu rinne (thank u very much), kachi foo (good night), Ndi Idemili nine na asu ofu asusu (Onitsha dialect).
@DRLulu, obi bu m so anuli ka isi ede asusu Igbo na agbanyeghi na i bu onye Ekpeye (Ahoada) na Rivers state. Nwanne jisie ike. Olisa bi na igwe gozie umu igbo nine ebe obuna fa no.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by chidyke77(m): 12:00pm On Oct 15, 2011
Galaxy7:

Nke onye chiri ya zerunu o!,owutesirim ike n'm abaghi na oge
galaxy7 nwa nne,daalu nke oma.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 12:43pm On Oct 15, 2011
Igbo ndi oma zara oku bia ebea na akwalite asusu Igbo, Chukwu nna gozie unu dum (ncha, niile). Ekelem.
Anam ejikwe oherea na echetara Umu Igbo bi na Obodo London na ndi ozo gbaraya gburugburu na taa bu ubochi emume iri ji Igbo Youths (ICSN). Nkea ga akpotu na 24 Haverstock Hill, Camden NW3 2BQ.
Onye na ekwuputa ihea bu Andrew, A bum onye isi ogbakoa na oge mbu. Abughi zim onye isi ma na anakwam na akwalite ogbako umu Igbo anyi.
Udo diri unu.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 12:44pm On Oct 15, 2011
Umunne m na umunna m, unu anwuchule anwuchu. Amaghi m na ndi Igbo no ebe a
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 12:48pm On Oct 15, 2011
ejikemeuwa:

Umunne m na umunna m, unu anwuchule anwuchu. Amaghi m na ndi Igbo no ebe a
Anwuchule nwannem, ndi Igbo juputara na nairaland karisia ndi ozo. Otua ka ndi Igbo si karisia ebe obula mana ndi iro gbara anyi gburugburu.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 12:52pm On Oct 15, 2011
Nna jisienu ike, o di mma otu unu si eme ka umu Igbo mara na ha bu ndi Igbo maka na O bughi ndi Igbo n'ile ma na ha bu ndi igbo
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 12:55pm On Oct 15, 2011
Nsogbu adighi, ihe obula o soro ndi iro ha gbaa anyi gburugburu, ogaghi anapu anyi ihe oma obula anyi bu, n'ihi na "aku fechaa o daara awo"
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by LordNaya: 9:04pm On Oct 15, 2011
@poster ihe mere taa na tómutó. K'anyi gbalia na asu ne ede asusu igbo eb'ówula anyi no. Awum onye ikenazizi na obowu lga no ime obodo imo state. Ndewo nwanna. Ka Chukwu gozie Ndi igbo nile. Isee
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by duke4ever: 10:41pm On Oct 15, 2011
Igbo bu Igbo ekele mu unu! Nuo nu! Rie nu!
Abu m nwa afo ala igbo si na Osumenyi na Nnewi south, Anambra steti.
Anyi n'asi, de eme, daalu olu oh!, muo nee, na muo nna.
Biko ka anyi jisie ike n'ikwalite asusu Igbo. Asusu anyi agaghi anwu. Odi ka aga asi na ndi no ebe a di ka Adrew Uwa na ndi ozo bu ndi okenye. Ma na anyi bu ndi ntorobia(okorobia) bu odi-n'iru(future) asusu Igbo. Oburu na iji umuntakiri, gbalisie ike inye ha ozuzu na ome-na-ala anyi ya na asusu Igbo. Ka ha ra bu ndi n'eme m'obu g'eme nka, Chineke gozie unu mmaji-kwulu-mmaji.
Ndi Igbo kwenu! Yaa
Kwenu! Yaa!
Kwezuonu!!!! Eeeeeeeeeeee!!!!!!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by duke4ever: 11:22pm On Oct 15, 2011
biko nu umu Igbo, ka anyi ghara i na ede 'etc'- et cetera, kama ka anyi na ede 'wdg' - Wee Diri Gawazie, mgbe obula anyi na ede edemede Igbo. Igbo di uso ma oburu na anyi sua ya nke ome. Ka chi fooooonuooo!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by opribo(m): 8:33am On Oct 16, 2011
Igbo kwenu,
Nigeria Kwenu,
Nairaland kwezue nu,
Ekelem onye maa li tere, is okwu a, maka unu lezie anya unu ga chuta si ndigbo and chefu la ihe ejiri mara anyi nu wa nile. Odiri ihe na eme na al ibo ajuka obu odiri ihe na nwute anyi, ni hi na obi nwanne afu'e la. Anyaukwu, oke ochichi, ohi, ebirebe, itoro nmadu na umu njo ihe juru na ala ibo.
Oga dinma oburu na ndi okemadu anyi wenre gaa aputa jikota aka kaa anyi chu pu omume oju na kwa ndi oju bata ra na ala anyi.
Ihe ejiri mara anyi nambu bu eziukwu, imara Chineke nakwa ntukwasa obi, onru. Biko nu omumna kanyi lowa alowa.
Ndigbo eji eme onu ndewu nu. Ya ga zie
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by freecocoa(f): 9:25am On Oct 16, 2011
toboy:

iwe ayaro ewe m,asusu ndi anambra?,eziokw ka ikwuru,igbo na-asu n'olu n'olu mana akwa ukwara oburu otu.soso asusu igbo mu anaghi anu bu igbo abakiliki. Soso asusu ahu nyiri mu ighota
De Mee nwa nna,Asusu Akwa ka'm na asu,nne ne oku(ezioku)ka ikuru,asusu abakaliki fiara alu ighota,mana onwelu nke fa ya su,m'ghota ife fa na ekwu.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 10:41am On Oct 16, 2011
duke4ever:

biko nu umu Igbo, ka anyi ghara i na ede 'etc'- et cetera, kama ka anyi na ede 'wdg' - Wee Diri Gawazie, mgbe obula anyi na ede edemede Igbo. Igbo di uso ma oburu na anyi sua ya nke ome. Ka chi fooooonuooo!!
Nwanne, eziokwu ka ikwuru. Anam amuta otutu ihe ebea.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Abagworo(m): 12:16pm On Oct 16, 2011
I think what the OP wanted to get is the salutations and not these kinds of greeting.
For example in Oguta,we hail "Aje",In Ikwerre its "Meka" in Ngwa it is "Mazi" in Ohafia it is "Kawo",in Afikpo it is "jokwa" ,in Orsu it is "ooni", in Ozubulu it is "deme",in Etche it is "chika".
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 12:29pm On Oct 16, 2011
Abagworo:

I think what the OP wanted to get is the salutations and not these kinds of greeting.
For example in Oguta,we hail "Aje",[/b]In Ikwerre its "Meka" in Ngwa it is "Mazi" in Ohafia it is "Kawo",in Afikpo it is "[b]jokwa" ,in Orsu it is "ooni", in Ozubulu it is "deme",in Etche it is "chika".
O dika ndi Abiriba, Abam Ohafia na ekele kwa jokwa.
Odi mma imata na ndi Oguta na ekelekwa Aje. Ndi Kwale na ekele kwa otu aha.
@ABAGWORO, i bu nna n'ebe Omenaala NdiIgbo noo.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by koolJ1(f): 1:04pm On Oct 16, 2011
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by MMM2(m): 1:16pm On Oct 16, 2011
otu nne gi angry
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by duke4ever: 3:31pm On Oct 16, 2011
M M M:

otu nne gi angry
Nkita rifolu gi Nsi, gi bu nwa na anughi ara nne gi nke oma. Chukwu mere gi ebere EFULEFU
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 8:24pm On Oct 16, 2011
@iIfyalways. Obi di m uto ka gi na di gi sii eme na ihe gbasara nri oriri. Di gi bu Igbo bu Igbo makwara omenaala, ma marakwa uru ekele bara.
Igbo amaka.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by odumchi: 11:32pm On Oct 16, 2011
Ekene ekene ndi anyi no na Nairaland
Igbo nmanmannu
Aro nmanmannu
Umunwanyi ori ihe ori ihe!

Is that what you mean by greetings? lol
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by udezue(m): 5:55am On Oct 17, 2011
Anyi na a si na Awka "Unu a futakwa vha?"

A maghim' ka ndi be nnem ndi Aro-Ajali(Ujari) sikwa ekwu nke fa.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by odumchi: 5:59am On Oct 17, 2011
Udeze ibu onye Ujari na Aro?
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by ChinenyeN(m): 6:41am On Oct 17, 2011
I wonder if Awka is related to Isu.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 1:23pm On Oct 17, 2011
Biko Igbo ndi nwem, gbalia nu n'ede na asusu Igbo.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Onlytruth(m): 1:03am On Oct 18, 2011
Igbo mma mma nu!
Zuo nu!
rie nu!
Kwezuo nu!

Isee!!
Owu unu ka ayi ji aba mba na Nairaland. cool

Nnewi (Anaedo) na asi "de eme" -well done or thank you.
"Inyona" -welcome (or have you come or returned), we also say "nnoo".
"nya du" -see you later, or later.
"nne omoo" -greetings to an old woman (anytime of the day). Omoo is like pronouncing "Omo detergent" grin expect that the suffix o is dragged a bit.
" nna om" " -greetings to an old man (anytime of the day as well) . "um" is pronounced like pronouncing an umbrella. grin
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by amia: 11:29pm On Oct 18, 2011
Ndi be anyi mma mma noo! Obi na-ato muto ifu na ihe na-eche m na-eche ndi igbo ibe m. Anyi negharia anya, anyi ga-afu na otutu ndi igbo ibe anyi anayi ma obu amayi asu asusu igbo. E gosiri na onyonyo TV n'ubosi uka abuo gara aga na asusu ndi igbo ga-efunari ha maka na ha anayi ma obu amayi asu asusu igbo.N'ezie ihea bu ezi okwu. Amaghi m ma ifere a na-eme otutu ndi igbo isu asusu anyi ma o bu n'ina egosiputa omenaala anyi.
Na onyonyo DSTV, e nwere channel maka Awusa nwee maka Yoruba mana e nweghi maka Igbo. M wee kpoo ndi ulo oru DSTV wee juo ha ihe mere e jighi nwee nke Igbo,ha wee si na ndi Igbo enweghi ihe nkiri ga-ezu iji wee kenye anyi oke na DSTV.
Ndi be anyi, e kwesiri ka ndi Igbo ibe anyi no na Nollywood kulie n'ura bidokwa imeputa ihe nkiri a na-asu sooso Igbo, ndi di ka Zack Orji,Bob-Manuel Udokwu,Pete Edochie, Patience Ozorkwo, Onyeka Onwenu, m ga-agu ole ghara ole.
Ndi be anyi, ka anyi jikoo aka onu ka anyi bulie asusu na omenaala anyi elu.
Ndi be anyi, e kelee m unu.
N'ututu ndi be anyi (Ndikelionwu,Orumba North)na-asi 'unu afutakwara ula'.
N'efifie anyi na-asi 'efifie oma'.
N'abali anyi na-asi 'ka chi fo' onye nke ozo ga-aza si 'ka o boo'.

Daalunu
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by ak47mann(m): 8:32pm On Oct 21, 2011
Onlytruth:

Igbo mma mma nu!
Zuo nu!
rie nu!
Kwezuo nu!

Isee!!
Owu unu ka ayi ji aba mba na Nairaland. cool

Nnewi (Anaedo) na asi "de eme" -well done or thank you.
"Inyona" -welcome (or have you come or returned), we also say "nnoo".
"nya du" -see you later, or later.
"nne omoo" -greetings to an old woman (anytime of the day). Omoo is like pronouncing "Omo detergent" grin expect that the suffix o is dragged a bit.
" nna om" " -greetings to an old man (anytime of the day as well) . "um" is pronounced like pronouncing an umbrella. grin

cool cool ANaedo

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply)

Ghanaian King, Céphas Bansah Rules Via Skype From Germany, Builds Jail For Women / Eze Ndigbo Title Remains Banned – Deji Of Akure / Edo Colonized Yorubaland Not Vice Versa.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 38
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.