Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,149,692 members, 7,805,846 topics. Date: Tuesday, 23 April 2024 at 07:12 AM

Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People (11519 Views)

Interesting Facts About The Igbo People / Common Beautiful Names From The Igbo Tribe / Marriage between Yoruba And Igbo people On The Rise (2) (3) (4)

(1) (2) (Reply) (Go Down)

Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:32am On Feb 06, 2012
It is the wish of every Igbo to attain a good health (AHUIKE). Umu Igbo, gbakotanu ka anyi kowa ma tule kwa ihe bu ahuike, udi oria di iche iche makwa ihe ndi ozo gbasara ahu ike.
Odoro m anya na ahuike bu mgbe mmadu no ahu ya niile ezuo ya oke. O dighi oria obula di ya n'ahu. Mgbe obula mmadu enweghi ahuike o putara na o daala n'oria.
Gini bukwanu oria?. Na obim, oria bu ihe ndi na-eme ka anyi ghara inwe ahuike. Mgbe anyi enweghi ahuike, o putara na anyi adaala n'oria. Ike agaghikwa adi anyi. Anyi agaghi enwe ike ruo oru obula.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:46am On Feb 06, 2012
Udi oria di iche iche. E nwere udi oria di iche iche bido na ndi anyi nwere ike kpoo obere oria dika etuto, isi owuwa, afo oruru na umu ahuoku ndi ozo. Biko, unu deputa ndi ozo.
E nwekwara oria ndi nwere agba. Udi ndia bu ha jide mmadu, e bido gbaghariwa ozigbo ka e wee jide ya meminaa ya. E gbuwe oge n'udi ndi a, mata na nsogbu di. Udi a bu udi dika obaramgbalilielu (high blood pressure), , taifoid na kwa ndi ozo. Nsi nwanyi na sifilisi, na ndi ozo si na mmekorita nwoke na nwaanyi. Onwekwara obiara ohuu a na akpo HIV/AIDS,
Mgbe mbu oria biara, onye obula butere ya ga-ebido kewe ekpe maka o doro ya anya na ya ga-anwuriri. O ga ebiriri n'ajo ohia ma obu na aja ocha.
Gini bu HIV/AIDS?.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:59am On Feb 06, 2012
HIV/AIDS: Oria bu ajo oria na-ano otutu afo n'ahu mmadu tupu ya egosi onwe ya. Ihe o jiri jokaria njo bu na ya bata; o na-ebu uzo gbuchapu umu nje di mmadu n'ahu nke na-aru oru nche. Nje ndi a na-alukwasi oria obula batara mmadu n'ahu ogu. Nje HIV/AIDS bata, ya e eburu uzo were nwayoo nwayoo gbuchapu umu nje ndi ahu Mgbe ahu, ahu niile egherela oghe nye umu oria ndi ozo dika ukwara nta (TUBERCULOSIS), ajo iba, afo osisa na oria ndi ozo.
Biko Umu Igbo, bianu kowaa ihe imaara gbasara oria ma obukwa oria ndi ozo no na ala Igbo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by HighChief4(m): 2:53am On Feb 06, 2012
^^^Nwanne otekwala, kedu ebe itinyere isi ke mgbe.

@OP---Onwekwara oya n'egbu mmadu ana akpo oya oniinu(liver), ndi okacha mara kowara na ihe kacha ebute oyaa bu oke mmanya. Oyaa na egbufu mmadu n'ike maka na onweghi mgbanwe, soso ofu di n'ime aru mmadu.

Mana oya kacha di njo bu oya ogori na aja-ocha(HIV/AIDS) maka ona aminwu mmadu aru, tinyekwa na onweghi ngwota. Obukwa oya ifere, ya mere oji adi mma ka ndi mmadu nyocha onwe ha, ma jisie ike na eyichi ahu mgbe ana eme mmeko nwoke na nwanyi.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:01am On Feb 06, 2012
@High Chief, emerem njem ya meere anoghi m ya.
Ihe idere amaka. Oria oniinu (liver) bu kwa oria ojo. O ga adi oke mkpa ka goomenti Alaigbo bulie ahia onu (price) mmanya elu. Nkea ga enye aka gbosite oke mmanya na egbu mmadu, ma gbosikwa ihere nke na eso ya.
Ihe idere maka oria HIV/AIDS di m obi uto. Imeela.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 2:33pm On Feb 06, 2012
Olee etu e siri ebute HIV/AIDS: Umuigbo biko bia kuziere oha na eze bu Igbo ka e si ebute oria HIV/AIDS.
ka m malite: E si n'uzo ndi a ebute ya. (i) Mmekorita nwoke na nwaanyi. (ii) Ijiri ntutu (needle) e jiri gbaa onye o na-aria gbaa onye ahu di mma ogwu.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by HighChief4(m): 11:49pm On Feb 06, 2012
^^^Ndi na anwu ogwu ike (drugs)na esikwa na ntutu ha ji agbanye onwe ha ogwu ebute ya. Mana adighi ebute ya site na isusu onu.

Agam acho inu ihe inwere ikwu maka oria ukwara nta,
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:15am On Feb 07, 2012
High_Chief:

^^^Ndi na anwu ogwu ike (drugs)na esikwa na ntutu ha ji agbanye onwe ha ogwu ebute ya. Mana adighi ebute ya site na isusu onu.

Agam acho inu ihe inwere ikwu maka oria ukwara nta,
Oria ukwara nta ma influenza bu oria ndi na esi n'ikuku abia. Ka esi egbochi oria bu site na itinye onye na aria oria na ime ulo nke ya (isolation room). Ya cho i puta ezi, o ga kpuchi onu ya na imi ya. Onye choo kwa i ga hu onye na aria oria ukwaranta, ga emesi onu ya ma imi ya (wear mask).
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 7:41pm On Feb 07, 2012
Anwunta (mosquito) na atanye mmadu oria iba n'ahu. Biko nu Igbo Ndi Oma, daa nu nso bia nye atumatu ihe na-ebute oria di iche iche na Ala Igbo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by odumchi: 1:23pm On Feb 08, 2012
Ihe kachasi ihe na ebute uwasi wu mmiri unyiginyi. Mmiri unyiginyi na ebute typhoids, malaria, high fever, ma otutu ihe odo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by ifyalways(f): 4:52pm On Feb 08, 2012
Owu ide ya n'Igbo ka nma?

Umu nwanyi na acho nma ga akpachara anya maka nje AIDS,HIV.
Ndi na akwanye isi ndi ocha(weave on) o kacha na bee anyi,Nigeria ebe ufodu ndi oru isi(salon) na-eji otu aga/ntutu(needle) akwanye isi,ha anaghi etufu aga(needle) ma ha kwanyecha otu onye.O buru n'adighi ama ama,ha emeruo otu onye ahu mgbe a na_akwaye ha isi,obara n'atapara(sticks) n'aga.O buru na ha jirikwa otu aga ahu kwanye onye ozo ma merukwa onye ahu ahu,obara abuo ahu metu,nje AIDS,noro n'ahu otu onye(onye nke mbu),onye abuo e butele ya Fiam.

Otu ihe dikwa na 'manicure na pedicure'.O buru na i choo ime ya,jiri cutter,nail file,razor etc,nke gi.Ejila nke onye ozo.Ma iga ikpu isi na nke ndi barber,clipper adighi onu,zuru nke gi.

Ndi na-enye ndi awusa mbo(nails) ka ha gba,o putara na ha amaghi na o kwesighi ekwesi?Nje AIDS,na ebi na scissors,na ihe ndi ozo eji agbo mbo.

oria Sickle cell.Oge mgbe ochie,ufodu umuaka akporo Ogbanje bu ndi na aria sickle cell anaemia.Tupu alum di na nwanyi,o di nkpa iga test Genotype
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:41pm On Feb 08, 2012
odumchi:

Ihe kachasi ihe na ebute uwasi wu mmiri unyiginyi. Mmiri unyiginyi na ebute typhoids, malaria, high fever, ma otutu ihe odo.
Nna imeela, ihe i kwuru bu eziokwu.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:44pm On Feb 08, 2012
ifyalways:

Owu ide ya n'Igbo ka nma?

Umu nwanyi na acho nma ga akpachara anya maka nje AIDS,HIV.
Ndi na akwanye isi ndi ocha(weave on) o kacha na bee anyi,Nigeria ebe ufodu ndi oru isi(salon) na-eji otu aga/ntutu(needle) akwanye isi,ha anaghi etufu aga(needle) ma ha kwanyecha otu onye.O buru n'adighi ama ama,ha emeruo otu onye ahu mgbe a na_akwaye ha isi,obara n'atapara(sticks) n'aga.O buru na ha jirikwa otu aga ahu kwanye onye ozo ma merukwa onye ahu ahu,obara abuo ahu metu,nje AIDS,noro n'ahu otu onye(onye nke mbu),onye abuo e butele ya Fiam.

Otu ihe dikwa na 'manicure na pedicure'.O buru na i choo ime ya,jiri cutter,nail file,razor etc,nke gi.Ejila nke onye ozo.Ma iga ikpu isi na nke ndi barber,clipper adighi onu,zuru nke gi.

Ndi na-enye ndi awusa mbo(nails) ka ha gba,o putara na ha amaghi na o kwesighi ekwesi?Nje AIDS,na ebi na scissors,na ihe ndi ozo eji agbo mbo.

oria Sickle cell.Oge mgbe ochie,ufodu umuaka akporo Ogbanje bu ndi na aria sickle cell anaemia.Tupu alum di na nwanyi,o di nkpa iga test Genotype
Ify, Ndumodu gi amaka. Umu Igbo biko nuru kwanu ihe ify kwuru ebea.
Ndi na aga ebe ana eme isi, unu kpachara anya unu ooo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:56pm On Feb 09, 2012
Let us discuss the symptoms of HIV in Igbo language.
Onye bute oria HIV, ya ebido nwewe oko na akpukpa na-atasi ya ahu niile.
Oga-enwe nke a na-akpo kansa na-ata ya n'egbugbere onu.
Onye ahu ga-ebido tawa ahu n'udi na-atu egwu. O ga-amikpocha dika mpuru aziza. O bu ya mere eji akpo ya oria mminwu n'oge mbu.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by ifyalways(f): 2:27pm On Feb 11, 2012
Kinda curious,gini mere ejiri kpo oria AIDS "Obiri na-aja ocha" ?
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 3:46pm On Feb 11, 2012
ifyalways:

Kinda curious,gini mere ejiri kpo oria AIDS "Obiri na-aja ocha" ?
Means, the carrier will not survive it. Aja ocha is grave yard. You know, when you dig up a grave yard, you will see Aja ocha.
Oria AIDS enweghi ngwota. O na amikpo ma gbu kwe onye butere ya.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 2:29am On Feb 12, 2012
IHE NA-EBUTE ORIA DI ICHE ICHE NA ALAIGBO (causes of ill health).
Adighi ocha anu ahu:Mmadu iru inyi n'ahu, iru inyi n'uwe o na eyi na-ebute oria dika uko, ululoo, nakwa oria akpukpa ahu ndi ozo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 2:31am On Feb 12, 2012
Ajo mmiri: ajo mmiri na-ebute oria dika afo osisa, otororo, afo obara na oria afo ndi ozo.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by HighChief4(m): 2:32pm On Feb 12, 2012
Ajo mmiri na ebutekwa oya ukwala, ajo mmiri adighi mma cha cha. Ana m ekpe ekpele ka ndi ochichi obodo anyi nwe ike itinyelu ndi be anyi ezigbo mmiri
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 3:49pm On Feb 12, 2012
High_Chief:

Ajo mmiri na ebutekwa oya ukwala, ajo mmiri adighi mma cha cha. Ana m ekpe ekpele ka ndi ochichi obodo anyi nwe ike itinyelu ndi be anyi ezigbo mmiri
High_Chief, Obi di uto na ilotana. Kedu ihe imere, i dara iwu?.
Ihe ikwuru di mma. Odumodu gi amaka. Onweghi ihe kariri mmiri di ocha. Ndi gomenti alaIgbo ga eleba anya na ime ka mmiri di ocha ruo ezin'ulo obula.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by HighChief4(m): 6:34pm On Feb 12, 2012
Nwanne ndi a si na mu dara iwu, were nyemu opipia site na igbochim.

Gomenti Enugu state na agbakwa mbo itinye mmiri ebe nile na Enugu ugbua. Obi juru mu afo mgbe mu huru nke a.

Oria ozo dikwa njo bu oria "sickle cell", okwa ya mere eji asi ndi mmadu ka ha jee nyochaa obara tupu aluo di na nwunye
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:14am On Feb 13, 2012
High_Chief:

Nwanne ndi a si na mu dara iwu, were nyemu opipia site na igbochim.

Gomenti Enugu state na agbakwa mbo itinye mmiri ebe nile na Enugu ugbua. Obi juru mu afo mgbe mu huru nke a.

Oria ozo dikwa njo bu oria "sickle cell", okwa ya mere eji asi ndi mmadu ka ha jee nyochaa obara tupu aluo di na nwunye
Ebum na uche gi di mma. Ifyalways rutukwara udi ihea aka. O si kwa na mbu, ana eche na ogbanje butere oria.
Obi di m uto na goomenti nke Ala Igbo no na emepe ndi mmadu anya maka ihe gbasara sickle cell. Enwekwere sickle cell centre na Owerre, Imo stetii. Ogbako anyi bu Igbo Youths U.K (ICSN) meekwara agbam onya ego na afo gara aga (Feb 2011, Highbury, London). Ego anyi nwetara ka anyi zigara ulo a na elete ndi na aria ya bu oria.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 11:06pm On Feb 14, 2012
Ise siga na Ise anwuru ike (marijuana). A na esi n'ise siga enweta oria dika kansa di iche iche, na ajo ukwara. Ise anwuru ike na agbakwa mmadu ara.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 12:14pm On Feb 16, 2012
Oke echiche. Nke a na-ebutere mmadu obara mgbali elu (high blood pressure).
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 10:47pm On Feb 20, 2012
Iribiga nnu oke (excess salt intake). Nke a nwere ike ibutere mmadu obara mgbalielu.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by HighChief4(m): 6:20pm On Feb 21, 2012
^^^Ihe a ikwuru obu ezi okwu? Amaghi kwam na oke nnu na eme mmadu obala mgbalielu
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:51pm On Mar 08, 2012
Mmekorita nwoke na nwanyi bu uzo kachasiri esi ebute oria HIV/AIDS. Ana ebute kwa oria nsi nwanyi na mmekorita nwoke na nwanyi.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:05pm On Mar 10, 2012
KA ESI EGBOCHI ORIA DI ICHE ICHE.
Anyi kwesikwara ina-ebechasi mbo anyi; ina-akpu isi anyi nke oma mgbe obula o rutere.
Ina-asuchasi uwe, okpu nakwa akpukpo ukwu anyi (hats and shoes) nke oma mgbe obula ha ruru unyi.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 9:06pm On Mar 10, 2012
UmuIgbo, unu nokwa ebea.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by odumchi: 11:12pm On Mar 10, 2012
Andre anyi nowa

Ihe a i n'ekwu ebe a wu eziokwu nke kachasi nke iti ohe-okpa. Ihe ozo na ebuta oria wu oriri ihe di unyiginyi. M'na avuje na ihe da na ali ndi nmadi aburu ya tiachikwa na onu ha. Odighi nma.

Ihe ozo wukwa okwukwo aka. Ndi nmadi ga anyu nsi ha nyugba, ha ewere aka olu ha riekwa ofe. Nke onhu adighikwa nma.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 11:04am On Mar 18, 2012
Odumchi, Eziokwu ka ikwuru. Biko, umuIgbo, ka onye obula gbalia na akwo aka ya ma oga nkposhi.
Re: Health And Health Promotion Patterns Of The Igbo People by AndreUweh(m): 10:02am On Oct 04, 2012
Ka esi egbochi oria di iche iche.
Anyi kwesikwara ina-ebechasi mbo anyi; ina-akpu isi anyi nke oma mgbe obula o rutere.
Ina-asuchasi uwe cloth); okpu(hat) nakwa akpukpo ukwu (foot wears) anyi nke oma mgbe obula ha ruru unyi.
I na-asuchasi, abochasi na-azachasi gburugburu anyi ocha mgbe niile.
Anyi kwesiri ijiri ulo anwunta na-echedo onwe anyi, ya na ka anyi ghara ikwe ka anwunta nwee ebe nchedo na gburugburu anyi.
O kwesiri ka anyi wee na-enweta ezigbo ikuku mgbe niile.

(1) (2) (Reply)

What Does Mahinmi Mean In Yoruba? / New Member From The Land Of The Ancient People. / Do You Consider Somalis Black?

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 57
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.