₦airaland Forum

Welcome, Guest: RegisterLoginWith GoogleTrendingRecentNew

Stats: 3,330,948 members, 8,447,884 topics. Date: Sunday, 19 July 2026 at 08:43 AM

Toggle theme

Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland ForumNairaland GeneralCultureÙdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor (527 Views)

1 Reply (Go Down)

Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(op): 9:29pm On Apr 13, 2018
By Izunna Okafor

Otu ahụ na-ahụ maka gbanụ gbanụ na ihe ntụmadị n'ala, bụ "National Emergency Management Agency" (NEMA) adọọla ma kpọtụrụ ndị mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị ka ha mụrụ anya ka azụ n'oge udu mmiri a n'ihi iju mmiri na mkpamkpa ide mmiri na-akpagasị n'ebe dị iche iche na mpaghara ahụ.
Onyeisi otu ahụ na mpaghara na mpaghara ahụ, bụ maazị Walson Ibarakumo mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'isi ụlọ ọrụ ya dị na steeti Enugu. Ọ kọwara na okpuru ọchịchị iri na anọ na steeti Enugu, Ebonyi na Anambra bụ ndị na-enwkarị nsogbu idè mmiri, ma kpọkùziekwa onye ọbụla na mpghara ahụ, ka o kpochaa ọwà mmiri ya ma kwụsị ịwunye ahịha n'ebe mmiri si aga, iji wee belata ya bụ nsogbu iju mmiri.
Ọ kọwara na òtù NEMA na-ejikọ aka ọnụ, ha na òtù ndị ọzọ dị iche iche, iji wee kpaa ma jikere otu ha ga-esi buso ide mmiri nke ahọ a agha, nakwa otu ha ga-esi bagide n'amụmà nkụzi iji mee ka ọhanaeze mara ihe ha aghaghị ịma banyere oge udu mmiri a. Ọ gwakwara steeti ọbụla ka o mee ngwa kpọtụrụ ha oge ọbụla nsogbu iju mmiri bịabidoro ha, iji wee gbatara ha ọsọ enyemaka.
Re: Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor by Nobody: 9:39pm On Apr 13, 2018
Ọ bụ ihe ọjọọ maka gọọmenti etiti gọọmentị na-eleghara nsogbu ọ bụla nke mmebi iwu gburugburu ebe obibi na nchọpụta akụ na ụba nke mineral na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ. Ógbè ndịda ọwụwa anyanwụ nke mba Nigeria na-ekere òkè n'ọchịchọ nke mmepe mba, mana ha anaghị agbanwe agbanwe ma a bịa n'ihe banyere mmepe gburugburu ebe obibi.
Re: Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor by eezeribe(m): 9:40pm On Apr 13, 2018
Ọ dị mmạ... Daalụ
Re: Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor by Nobody: 9:42pm On Apr 13, 2018
lalasticlala, biko tinye isiokwu a n'ihu ihu.
Re: Ùdú Mmiri: NEMA Adọọla Aka Na Ntị Maka Idè Mmiri. By Izunna Okafor by Obainoneandonly(m): 11:16pm On Apr 13, 2018
givan:
lalasticlala, biko tinye isiokwu a n'ihu ihu.
e tirim aka ni yen ikwuru
1 Reply

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna OkaforOke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna OkaforNdị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor234

New Olota To Get Staff Of Office TomorrowPlanning A Traditional Igbo Funeral & A Traditional Igbo Remembrance?Pay For Your Subway Ride In Beijing By Recycling A Plastic Bottle