ION1's Posts
Nairaland Forum › ION1's Profile › ION1's Posts
1 (of 1 pages)
Hey folks,I know this post is old, but this is the best I could do: ![]() SODOM NA GOMORRAH by Onyeka Onwenu Ilota go n'ani Sodom na Gomorrah Na fa ba n'ilo oku nwanne Abraham Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Njo obodo ndia wee tiwe nkpu Amulu njo fa wee kulo igwe Chineke we kudo ndi mkpulu ya Wee zido ndi mmuozi ya site n'okwa Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah (ewo) Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah … (interlude) … Oge mmuozi je k'imebi Sodom Fa baalu bee Abraham Abraham na Sarah nwunye ya Melu ndi mmuozi obia nke oma Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ndi muozi kwelu Sarah nkwa Na O g'enwe nwa nwoke m'afa naba Fa gwazie Abram ije fa bu maka imebi Sodom na Gomorrah site n'oku Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah (interlude) Hmmmmmmmmmmmm Abraham kwalu "Alu eme!" O yolu ndi mmuozi si Bikozie afu mmadu ise n'aso doo K'agbaghalu Sodom na Gomorrah Enenebe nebesia galu bee Sodom Afuro ya mmadu ise (ma ncha!) Enenebe nebesia galu bee Sodom Afuro ya mmadu ise Mmuozi gwa Abraham si Anulum akwa nke I n'akwa Biko rapu Sodom na Gomorrah Na fa n'abo g'eji anya fa fu m'oge lue Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah (interlude) Mmuozi nye Lot iwu si Gi na nwunye gi g'agbanaba Biko rapu ife nkitinki uwa Unu weelu ndi di oke onu wee gbanaba Gbaba oso ndu gi Aghana anya n'azu Gi na nwunye gi gbanaba Gbaba oso ndu gi Aghana anya n'azu Gi na nwunye gi gbanaba Lot na nwunye ya wu panike Oputa nku ututu wee chapiaba Nwunye Lot cheta ife uwa g'anya Gholu okiti nnu ezigbo n'ike Gbaba oso ndu gi Aghanya n'azu Gi na nwunye gi gbanaba Gbaba oso ndu gi Aghana anya n'azu Gi na nwunye gi gbanaba Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah (don't look back, don't look back) Ani Sodom na Gomorrah Sodom na Gomorrah |
1 (of 1 pages)


