₦airaland Forum

Welcome, Guest: RegisterLoginWith GoogleTrendingRecentNew

Stats: 3,325,079 members, 8,420,183 topics. Date: Thursday, 04 June 2026 at 01:10 PM

Toggle theme

Myklangelo's Posts

Nairaland ForumMyklangelo's ProfileMyklangelo's Posts

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 (of 26 pages)

CultureThe First Poem I Wrote In The Igbo Language... What Do You Think Of It? by myklangelo(op): 12:08pm On Aug 21, 2015
The aim is to promote our languages. Not just to promote it by talking about it, but by talking with it, writing with it and reading it. Our Mother tongues are getting dead little by little, we speak them quiet alright but can we comfortably read and write them? I hope to see language promotion in this forum that brings Nigerians together.



EZI NWADA
Ụmụada Igbo bụkwanụ elelebe eje ọrụ
Olisa gozichaalụ ha ma nee ha ọrụ
Ezi nwada Igbo bụ mkpụrụ akwụ
Mkpụrụ akwụ dugara mbe be ndị mmụọ

Ezi nwada bụ mgba olaedo
Omume ya adịghị igbazi n'ego
Nwoke ọbụla ọ nyere aka ya na-atụ mmamma
Ụtụtụ ya niile bụ ụtụtụ abụọma

Mma ya bụ ilelekata ịgbanye aka n'ukwu
Ukwu e ji chọọ ya mma dịka udu
Ọ na-akwọ mụrụ mụrụ ka etele ete
Ije ya na-adanye Dịkà elekele

Ọchị ihu ya na-anyụ nma nkọ
Ọ ga-eme obi ọkụ gị ọ nyụọ dịka ọkụ
Olu o ji agụ egwu dịkwa egwu
Onye ụjọ nụ ya ọ mee ihe egwu

Ezi nwada onwe gị ju gị afọ
Ka okwu gị kwụrụ ebighiebi ka orie, nkwọ, eke na afọ
Mma kacha mma niile bụ omume gị
Omume gị ga-enye gị ezinụlọ nke gị

Asụsụ Igbo ga-adịrịrị

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 (of 26 pages)