₦airaland Forum

Welcome, Guest: RegisterLoginWith GoogleTrendingRecentNew

Stats: 3,324,984 members, 8,419,824 topics. Date: Thursday, 04 June 2026 at 12:11 AM

Toggle theme

Myklangelo's Posts

Nairaland ForumMyklangelo's ProfileMyklangelo's Posts

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 (of 26 pages)

PoliticsRe: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(op): 12:04pm On Aug 12, 2017
3. Ụfọdụ Ndị Mgbago Ugwu Bidoro Iwepụta Abụ Nkọcha, Nkwutọ Na Akpọmasị Maka Ndị Igbo

N’izu a, anyị hụrụ abụ ndị Awụsa na-ekesasị nke ha ji akọcha ma na ekwụtọ ndị Igbo nile. Na ya bụ ajọ abụ, ha na-agwa onwe ha na nsogbu nile dị n’ime ndụ ha bụ ndị Igbo kpatara ya. Ha gwakwaziri ndị be ha ka gbuo ndị Igbo nile nọ n’akụkụ ha. Ọbụghị tata ka ndị Igbo hụbara Awụsa na ụta, ọbụghị tata ka anyị mara maka akpọmasị abụrụ dị iche iche na Naijiria nwere n’ebe ibe ha nọ, mana ugbu a, mmanụ peturol ka ana-awụnyezi n’ọkụ ikuku gasị. Ama m na ha ji nke ahụ akwado maka ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktọba.

Kedu ihe ndị ọzọ dị nnukwu mkpa mere n’izu a nke m agụnyeghị? Depụta ha ka anyị nile mara maka ya. Tinyekwuzie olu gị na nke anyị kwuru maka ya.
Ka izuụka ọhụrụ kara nke gara aga mma n’ụzọ nile.

www.odeniigbo.com
PoliticsRe: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(op): 12:03pm On Aug 12, 2017
2. Charlie Boy Tetere Ụra Ụtụtụ Wee Mara Na Buhari Bụ Ekwu Ọzọ Eme Ọzọ.

Charlie Boy bụ okenye ama ama maka ikwu ihe ọ bụla dị ya n’obi, o sokwazi na ndị nyere ọchịchị Buhari nnukwu nkwado, ndị hụrụ ya na mbu dị ka onye nzọpụta nke obodo Naijiria. Mana ikuku kupụrụ ya akwa mgbochi dị ya n’ihu n’izu a. O bidoro otu na atụmatụ, “Our Mumu Don Do” na mbido afọ a, mana o ji ya bụ atụmatụ bido ngagharị iwe nke ọ kpọrọ, “Resume or Resign” nke o ji agwa Buhari na ọ bụ nanị ihe abụọ bụ ihe cheere ya n’ihu. Ya bido ọrụ mà ọ bụ ya rituo n’ọchịchị. Kedu kwanụ ka imi na anya dị ya kemgbe o bidoro ya bụ ngagharị iwe? Ndị ụlọ omebe iwu ukwu kwuru na o jighị onwe ya aka, ndị uwe ojii a gbara ya ikuku ike ma gbaa ụfọdụ ndị otu ya egbe, ndị ji ike ọchịchị na-akọchasị ya, bọpụta ihe ọjọọ nile o megoro kemgbe nne mụrụ ya iji mebie ma kwụsị ya bụ atụmatụ inwuru ọkụ.


www.odeniigbo.com
PoliticsO Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(op): 12:02pm On Aug 12, 2017
Ọtụtụ ihe mere n’izu a, ọ kachasị ihe mwute na ihe akụkọ enweghị ọgwụgwụ, ka anyị lebanye anya n’ụfọdụ n’ime ha anya, ma kpakwazie maka ha.

1. Ogbugbu E Gburu Ọtụtụ Ndị Bịara Ụka N’ụlọ Ụka Ndị Katọlik n’Ọzụbụlụ.
Nke a enyeghị ọnụ okwu, mgbe m nụrụ maka ya, ọ dara m na ntị ka ihe na-eme na steeti Bọrọnụ. N’ụtụtụ ụbọchị ụka ka anyị nụrụ na ndị osochiegbu gara n’ụlọ ụka ịchọ otu nwa amadi a kpọrọ “Bishọpụ”, ka ha ruru na ya bụ ebe, ha ahụghị ya, ha wee kpoghe ọnụ egbe ha, were ajọ ọnụma dulaa ihe ruru mmadụ iri na ise mmụọ. Ihe mgbo egbe tụrụ karịrị iri ise. N’ezie ekwensu gara ụka ụbọchị ahụ... nkịta nyụrụ nsi n’elu ekwu aja. Wee ruo ugbu a, anyị amabeghị ndi mere ya bu ihe, nanị akụkọ karịrị otu narị di iche iche nke na-akọwa ihe kpatara ya bụ ihe ka anyị ji aka.


www.odeniigbo.com

PoliticsRe: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(op): 9:34pm On Aug 03, 2017
5. Mba Amerịkà Kwuru Na Oge Okwu Agaala Na Ugbu A Bụzi Oge Ọgụ Nyere Ndị Nọt Koria Na Ndị Na-Akwado Ha.

Nọt Koria bụ obodo nke ihe nile gbasara ya dị n’aka otu onye, Kim Jong. Otu onye ahụ bụkwazi onye omume ya ọtụtụ mgbe bụ nke na-adị ka nke onye nwetụrụ nsogbu, ị ga-amata nke a site n’ọtụtụ iwu o wepụtara na-achị obodo ya, otu o si egbufu onye ọ bụla ọ dị ya ka ọ bụ onye iro ya, na omume ‘ezeonyeagwalam’ jupụtara ya ahụ. Anyị dere maka ogbunigwe nke ọ rụpụtara ma nwalee na mbido ọnwa Julaị, okwu ọ bụla nwere ọsịsa, ugbu a onye isi obodo mba Amerịkà enyela ya ọsịsa.

Trump na ngwụsị ọnwa Julaị, mere ka anyị mara na ọ dị nkwadobe ikpochapụ obodo Nọt Koria, ma wepụta ntaramahụhụ nye obodo ndị na-akwado ya. O mere ka ndị UN mata na oge okwu agaala n’ihe gbasara otu a ga-esi wee meso Nọt Koria omume. O kwuru na nanị ihe ya bụ onye ọchịchị obodo ahụ ga-anụ ugbu a bụ agha. Iji gosi nkwado Amerịkà dị maka nke a, ha na ndị Japan na Saut Koria ejikola aka ọnụ inwalee ike ha maka agha na-abịanụ. Ndị agha ha na-eme ihe omụmụ dị iche gasị ugbu a iji gosi nkwadobe ha dị ịza oku agha ọ bụla nke ndị Nọt Koria ga-akpọ ha.

Ndị agha nke ụgbọ elu Amerịkà na Japan na-efegharị n’akụkụ obodo Nọt Koria, ha kwukwaziri na ha dị nkwadobe ịtụ ogbunigwe n’akụkụ obodo ahụ ebe masịrị ha. Ihe eji ejide ogbunigwe agbapụrụ n’ikuku nke ndị mba Amerịkà dikwaazi nkwadobe imebisi ogbunigwe ọ bụla nke si na mba Nọt Koria. Ha anwalela ngwa ọgụ ahụ ma hụ na ha zuru ka e mee na ngwụsị ọnwa Julaị. Ha kwukwaziri na ha dị nkwadobe ime ihe ọ bụla iji gbochie mba Chaina inyere mba Nọt Koria aka.

Ọ gwụkwana ka ọ ha m n’ọnụ. Ka anyị cheta ụwa nile n’ekpere anyị ọ kachasị ihe ga-ebute agha na oke ụnwụ. Chetakwazie Naijiria.


Kwado asụsụ Igbo; kwado Odeniigbo

www.odeniigbo.com

PoliticsRe: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(op): 9:31pm On Aug 03, 2017
4. WHO Chọpụtara Ọrịa Nke Esi Na Mmekọrịta Nwoke Na Nwanyị Ebute, Nke Ọgwụ Ọ Bụla Enweghị Ike Na Ya.

Ọrịa ọgwụ mgbochi enweghị ike n’ebe ha nọ bụ nnukwu ajọ ihe chere anyị n’ihu n’ụwa kịta. N’ọdị nso a, a chọpụtara ụfọdụ ihe na-ebute ọrịa nke enweghị ọgwụ ọ bụla nwere ike n’ebe ha nọ, ka a ka na-ekwu, ụzọ anyị si arụpụta ma gwọkọ ọgwụ mgbochi njepeka (antibiotics) eruola n’isi njedebe. Nke a pụtara na ụdịrị ngwọtọ ọgwụ mgbochi njepeka enwere ike ime, na anyị eruola n’isi mmiri maka ya ugbu a. N’izuụka gara aga ndị WHO wụnyere mmanụ n’ọkụ na-agba ụlọ site na ịma ọkwa gbasara ụdịrị ọrịa gonoria pụtara ọhụrụ.

Gonoria ọhụrụ a, siri nnukwu ike karịa nke anyị nwere na mbụ. O nweghị ọgwụ ọ bụla dị n’ụwa ugbu a nwere tụmadị otu mkpụrụ ike n’ebe ọ nọ. Abịakwuzie nwa ọhụrụ ka nọ n’afọ na-ebute ya site na nne ya bụ ya bụ ọrịa. A hụla ya bụ ọrịa n’ọtụtụ obodo gụnyere, Frans, Japan, Spen wdg.

Ihe ụjọ dị na nchọpụta a bụ na ndị WHO kwuru na nke ahụ dị ka obere ihe na nchọpụta ọhụrụ ha na-enweta ugbu a. Ha na-ekwu na o nwere ike inwe ọrịa ọhụrụ ga-abata nke bụ dike na agha, ma bụrụkwazie nke esi na mmekọ nwoke na nwanyị ebute. Oge eruola mgbe mmadụ ga-akwa onwe ya nga, ị lụta nwanyị mara nanị sọ nwunye gị, o nweghị onye ma ọrịa ọhụrụ na efegharị ugbu a.

www.odeniigbo.com

PoliticsRe: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(op): 9:30pm On Aug 03, 2017
3. Obodo Nọt Koria Rụrụ Ogbunigwe Nwere Ike Isi N’obodo Ha Ruo Amerịkà

Mgbe ọ bụla anyị kwuru maka mba Nọt Koria, o doro ewu na ọkụkọ anya na o nweghị ezigbo ihe a na-ekwu maka ya bụ obodo. Nke a bụ maka na onye ọchịchị ya bụ ebe na-eme ka nwata ọgụ na-agụsi ike karịa nri. Mbido ọnwa Julaị ka ha gosiri na ọ bụghị nanị ọnụ okwu ka ha nwere kama na ike ọgụ dikwaazi ha. Ha nwalere ogbunigwe nwere ike isi na be ha ruo Rọchịa, Ọstrelia, Kanada, na Amerịkà. Ogbunigwe ọ bụla si mba ọ bụla ruo Amerịkà, na-akpa nwa agụ aka n’ọdụ. Anyị makwazi ụdị mmadụ na-achị Amerịkà ugbu a.

Ka ha mechara ya bụ nwalee, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu gbasara ogbunigwe na-agate aka na-ekwu na ya bụ nwalee ndị Nọt Koria mere enyeghị ha n’ezie ihe ha chọrọ. Ha na-ekwu na ogbunigwe ahụ enweghị ike ilaghachite n’ime ụwa na-agbapụ ya n’elu igwe. Ụfọdụ na-ekwu na mgbe o ruru ebe atụrụ ya na o nweghị ike ịrụ ọrụ ya dị ka ogbunigwe nke a bụ maka na teknụzụ ndị obodo ahụ erubeghị ime nke a.

Ihe egwu n’ihe nile a bụ na anyị amaghị nke bụ eziokwu n’ikpeazụ. Ndị Nọt Koria rụpụta ụdịrị ogbunigwe ahụ, mara amara na agwọ nọ n’akịrịka, ajọ agwọ. Ndị Nọt Koria mechara mekwa nwalee ọzọ, nke gosipụtara na ogbunigwe ha ga-erunwu Wọshintin na Niu Yọk nke Amerịkà...

www.odeniigbo.com

PoliticsRe: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(op): 9:27pm On Aug 03, 2017
2. Anyị Chọpụtara Na Maz (Mars) Enweghị Ndụ Ọ Bụla N’ime Ya

Kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ ka mmadụ nwere olileanya na ndụ dị na ụwa Maz, ọtụtụ ndị nnyocha e kwuọla na oge n’adịghị anya na mmadụ ga-arụ ebe obibi ma nwee ike ibi na ya bụ ụwa. Mana n’ọnwa Julaị ka nchọpụta pụrụ iche gosiri na nke ahụ abụghị ezie.

O nwere ihe dị ka mmiri nke jupụtara n’ụwa ahụ nke mmadụ chere na ihe ọ pụtara bụ na ndụ nọ ebe ahụ, ka e mechara nyocha na mbido ọnwa Julaị, ka a chọpụtara na ya bụ ihe dị ka mmiri jupụtara na kemikal a na-akpọ “Perchlorates” . Ya bụ kemikal ihe eji wee mara ya bụ na ọ dị nnukwu ike n’igbu ihe ọ bụla di ka ndụ. O nweghị ihe ọ bụla na-adị ndụ ebe ọ bụla ahụrụ ya. N’ụwa nke Maz o juru n’elu ya nile etu ahụ aja si jupụta n’elu ụwa nke anyị. Ya bụ, na mmadụ ibi n’ụwa ọzọ karịa ụwa nke anyị ugbu a, ka tere nnukwu aka, nchọpụta nke a weghachiri aka elekere azụ. Anyị ka na-ele anya n’ọnwa.

www.odeniigbo.com

PoliticsIhe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(op): 9:25pm On Aug 03, 2017
MODS, please do not delete as usual. I think it is high time we start promoting our different native languages using all necessary platform especially online. Nairaland is big enough to contain the linguistics diversity. Thanks, nothing here is in any minute way tribalistic, rather it is a brief summary of all the major global happenings last month, in the Igbo language. Welcome

1. Mba Poland Chọrọ Isi N’ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya Banye Na Nke Ọchịchị Aka Ike

Ebe anyị kwesiri ina-anụ ụdị akụkọ a bụ na mba Afrika mà ọ bụ na nke ndị Arab, o nwere otu o si ada na ntị na ọ bụrụ ihe anyị ga na-anụ maka obodo dị na Yurop. Mana nke ahụ bụ otu o si gbata kwụrụ na Poland ugbu a. Nke a bụ kemgbe otu pati nke na-achọ igbanwe ọchịchị ala Poland weghaara ọchịchị. Onye isi obodo ahụ na-ewebata atụmatụ nke ga-eme ka ike nile dịrị n’aka otu pati ya ahụ. Otu ihe ha mere bụ ime ka ọ bụrụ nanị n’aka pati ha ka nhọpụta ndị ọka ikpe nke ụlọ ikpe ukwu nke obodo ahụ dị n’aka.

Ihe ọzọ ha mekwaziri bụ na ha tinyere ike nhọpụta ndị ọchịchị dị iche iche ka ọ dịrị n’aka pati nke onye isi obodo. Ya bụ ndị nile ga na-ahụ maka nhọpụta, ibinye aka votu, na otu nhọpụta ndị ọchịchị ga na-esi aga dị n’aka otu pati ahụ. Ha gakwara n’ihu tinye ike imepụta iwu ọhụrụ nke karịrị iwu ji obodo n’aka onye isi obodo ahụ. Ya bụ, kama a ga na-eso ihe dị n’akwụkwọ iwu, onye isi obodo nwere ike karịrị ya bụ akwụkwọ iwu, o nwere ike imebe iwu ọ bụla masịrị ya. Ha gakwara n’ihu chọọ ụzọ a ga-esi mee ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi nile dịrị n’aka otu pati ahụ ji ọchịchị.
Ka ihe nile a na-eme, ndị obodo a gbachịrị nkịtị? Mba, kemgbe otu ọnwa ka ndị obodo nile nọ na ngagharị iwe. Ihe ruru mmadụ puku iri ise nọ n’isi obodo ugbu a maka ya bụ ngagharị iwe, rụọ ebe obibi gbanye mkpọrọgwụ na ha agaghị apụ ganye n’obodo ha agachigha azụ n’ọchịchị onye kwuo uche ya n’abụghị obodo ha ịnọ n’aka nanị otu pati. Ka anyị na-ele anya mara ihe ya bụ okwu ga-apụta.

Source: www.odeniigbo.com

PoliticsRe: Army Claims 39 Not 83 Soldiers Are Missing After Boko Haram Attack by myklangelo(m): 10:17am On Oct 27, 2016
omenka:
They gave their lives in service to country- we appreciate their sacrifice.

I hope the enemies of this country would be happy with this since they've been posting things like "I feel so excited whenever I hear a Nigerian soldier is killed by Boko Haram".

May their souls rest in peace- amen.
Are they dead? Did you kill them? They are missing and you are telling them to "rest in peace". We are hopeful they should be found and you are here wishing them death!
Too bad.
PoliticsRe: We Fought Corruption Without Making Noise – jonathan by myklangelo(m): 8:30am On Oct 25, 2016
omenka:
I have no doubt he must have soaked his brain in some of that liquid that makes it function erratically before making out this statement.

Are we to quickly forget such statements which serve as reminders of how he fought corruption like:

1. Stealing is not corruption.

2. How much did Jim Nwobodo stole that he had to be jailed? (The bold portion is enough to pass him off as a stark illiterate he is, and is typical among a particular set of people around here).

3. If you put a goat close to yams, the goat must eat the yams.

4. People will come after me if I expose corrupt individuals.

5. They can insult me from head to toe, I don't give a damn. (When the oaf was questioned about his reluctance to declare his assets).

Etc.

That man was and will remain one of the worst mistakes ever to be made by a sovereign state.
Nigeria is actually with our worst mistake now. We pray it doesn't get worse than it is now.
CultureRe: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(op): 8:22am On Oct 23, 2016
soonest:
1. Gwam gwam gwam ihe kuru aka baa ohia

2. Gwam gwam gwam oti nwata ihe n'ihu nne ya

3. Gwam gwam gwam Ihe kuru mmiri laa elu

4. Gwam gwam gwam ihe were nsi ewu ria elu

5. Gwam gwam gwam Ibe ji zuru oha onu

Ngwa, myklangelo puta n'ogbo
Hahaha i gbaniri nke oma, Herringbone zara nke oma.
Ibe ji zuru uwa onu bu ONWA.
Kedu ihe nrite m?
CultureRe: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(op): 8:09pm On Oct 22, 2016
AjaanaOka:
Ka m nwaa.

1. Aso/Onu mmiri

2. Aha gi.

4. Asusu

7. Akpi.
Onye nna ka i bu! Iji ha.
CultureIgbo Folktale: Mbe Na Chukwu Mara Aka! by myklangelo(op): 7:32pm On Oct 22, 2016
Tata anyị ga-akọ akụkọ ifo. Akụkọ ifo na-ànwụ ànwụ n’ala Igbo. O dizie ka a ga-asị na ndị ọ bụ oke na ọrụ ha ịhụ na ihe dị otu a emeghị, amaghịzị ọrụ ha. Ndị ga-emenwu ka ịkọ akụkọ ifo werekwa ọnọdụ n’omenala anyị bụ ndị nne na nna. Ha ka ọ dịrị, ọ nọkata ha akpokuo ụmụaka ha, nọdu ha ala, ma kọọrọ ha akụkọ ifo. Mgbe ha mesiri nke a, ha ga-ajụ ajụjụ ma hụ na ụmụaka ha nwere ihe ha mụtara. Mana ndị nne na nna ole ka ma akụkọ ifo Igbo ma ya fọdụzie ịkọ ya akọ?

Nanị akụkọ ọtụtụ ndị nna ma maka ya ugbu a bụ maka nke egwuregwu futubọọlụ na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ obodo. Nke ndị nne ma maka ya ugbu a bụzi nanị maka ihe mere na Afrika Majiki na nke ọzọ mụ amaghị ihe ha na-akpọ ya. Odeniigbo ga na-akọ akụkọ ifo na ọ dịkata ebe a. Ebumnobi m bụ, i gụsịa ya, i kọọrọ ya ụmụaka gị. Ebumnobi m bụkwazi ka anyị bido kọbara ụmụ anyị akụkọ ifo, ihe di mma kwesiri ka a na-eme ha.

Ka anyị gbapụ ya ọsọ...

MBE NA CHUKWU MARA AKA!
Ifo dee!........................................... i dee
O nwere otu ụbọchị...........................Otu ụbọchị eruo
Nkịta nyara akpa?................................ nsị agwụ n’ọhịa!

Mgbe gboo, mgbe ụzọ esi aga na nke Chukwu bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya. Mbe kwadoro gaa na be Chukwu dị ka o si eme kwa afọ. Ka o rutere, Chukwu tinyere aka n’akpa wepụta nkume choo ya n’ihu, sị ya were waa ọjị. Hmmm Mbe lelie anya elu, ma ledekwa anya n’ala. O kwuo sị, “onye ekoteghi, ọgọdọ ekotere ya”.

Ọ pụọ n’ilo were gwọta ajụ, mgbe ọ batara n’ụlọ, o nye ya Chukwu were sị ya, “Ọga m, were ajụ a buru ala buga ya ebe ọzọ”. Chukwu akpọọ n’ubu, jụọ Mbe sị, “mmadụ a na-ebu ala ebu, ọ bụ ibu?”. Mbe amụrịa were jụọ Chukwu, “Nna m biko a na-awa nkume awa, ọ bụ ọjị?”. Chukwu kpọọ n’ubu maka n’ihe onye ma ka ibe ya ma.

Chukwu bara n’ime ụlọ ya pụta, sị mbe, “nwa m biko o nwere ozi m chọrọ ka i jere m”. O were otu akpa nye mbe sị ya, were ego a gbatara m ńkwụ enu ndị Nsude. Ọ gara n’ihu gwa ya ka ọ ghara ịgbanye ya bụ mmanya n’ite màọbụ n’ekpe mmanya. Hmmm o gwụbeghịkwa oh! Ọ sịrị mbe na ọ na-abịa ya e sikwara n’ụzọ màọbụ n’ọhịa; ka mmanya ahụ ghara iju eju, ka ọ ghara idi n’ọkara màọbụ n’ike ihe o ga-agbanye ya! Ọ gwakwara ya, “biko nwa m, abịakwara n’ụtụtụ, mà ọ bụ n’ehihie màọbụ abalị”. Ihe nke a dịkwa egwu! Ọ bụrụ gị kedu ihe i ga-eme?

Mbe nara Chukwu ego ahụ were pụọ. Anyị maara nke ọma na “eee” anaghị ese okwu. I hụ Mbe ụbọchị ahụ i mara na nwoke n’ihe na-eme. O chere echiche miri emi, were cheta ihe o ga-eme. Mbe abụghị nwata n’ihe gbasara aghụghọ. Ọ gara gbanye mmanya ahụ n’ikwe o ji asụ akpụ. Mgbe ụbọchị dị na etiti ndeeli, o gburu mmanya ahụ, si mpio dị na be, gara n’apịtị ruo na nke Chukwu. Mbe rutere sị, “Chukwu Abịama lekwa mmanya i tụrụ m n’ahịa”. Chukwu lesịa mbe were sị ya, “nwoke m, ọ na ịdịghị anụ ihe? A gwara m gị ejila ụtụtụ were bịa”. Mbe aza ya sị, “ugbu a, ọ bụ ụtụtụ? Ka ọ bụ ehihie?”

Chukwu ajụkwa ya, “kama ọ kwa m gwara gị, esila ọhịa màọbụ ụzọ were bịa?” Okwu anaghị akọ Mbe n’ọnụ, ọ zaa Chukwu, “ Nna m, esighi m ebe ndị a, ebe m si were bịa bụ na mpio nke were ọwa mmiri ideyi”. Okwu abụghị obere ihe. Oke ebuli abụọ na-akụkọ mpi. Chukwu jụrụ Mbe, “ọ kwa m gwara gị ka mmanya ahụ ghara iju eju ma ghara ịdị ugwu?”. Mbe were nwayọọ ga, kpọghute ya bụ ikwe, mmanya juru n’otu akụkụ ma pee mpe n’akụkụ nke ọzọ. O kwuru sị na nwunye di chọba ibe ya okwu o sị ya, ya nye ya mmanụ ka o were taa akwụ. Chukwu kwere n’isi were sị na taata bụ taata, onye gbaa ọsọ, ka ukwu kwaa ya!

Ka Mbe richara nri na be Chukwu, o were ọkụkọ; oke na nwunye nye Mbe. Mbe kene Chukwu, ma tupu Mbe atụpụ ụkwụ ụna, Chukwu gwara ya na tupu otu afọ agasịa, na ya nwụtara ya ya bụ ọkụkọ, na mgbe ahụ na okeọkpa ahụ ga-eyi akwa ma nnekwu ọkụkọ ahụ ga na-akwazi ka okeọkpa. Hmmm ihe nke a ihe kwo! Mbe nara Chukwu ya bụ ọkụkọ. Ọbụghị taata ka ahụbara Aụsa na ụta.

Ka otu afọ n’elu. Agha akara aka, anaghị eri nwa ngwọrọ. N’otu ụbọchị Mbe gara n’ahịa, nọkata tibe nnukwu mkpù, na-ebe akwa, na-akpụtọsị onwe ya n’ala. Mgbe ndị mmadụ jụrụ ya kedu ihe na-emenụ? Mbe were nwayọọ chịkọnata onwe ya ọnụ were kwuo, “ ndi nke m, papa m nwụrụ n’ime mgbe o na-amụ nwa; ka nne m nụrụ akụkọ a n’ihu agha, ebe ọ bụ ọchịagha ọ dara n’ala ọ bụrụ ọnwụ!”.
Hahahaha!

Chukwu nọrọ ebe ọ nọ were nụ ihe nke a, were tikpuo Mbe nnukwu mkpù dara ka egbiigwe, jụọ Mbe si, “nwoke a na-amụ nwa? Mbe!, nwaànyị a na-aga agha?”. Mbe amụrịa nnukwu amụ, were jụọ Chukwu. “Oke ọkụkọ, o na-eyi akwa? Nne ọkụkọ o na-akwa akwa?”.

Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ enyie ya. Iko onye ji akpanyere ndị ọzọ ka a ga-eji were kpanyere ya. Anụ gbaa ajọ ọsọ, a gbaa ya ajọ egbe. Nke a bụ etu Mbe siri were gosi ụwa nile ụdị amamihe dị ya n’isi. Mbe abụghị onye ụjọ na-atụ na ọ bụrụ ihe eji isi were echepụta. Uche bụ akpa, onye ọbụla nya nke ya.
Chakpiiii....... wọọọ!


Onye ọbụla o masiri nwere ike ịkwado nkọrọ a maka asụsụ Igbo.


To read more, visit www.odeniigbo.com . Do not copy without acknowledging and notifying, to reproduce and type this is not a child's work.
PoliticsRe: Femi Fani-kayode's Life Is In Danger - Aide Says Over EFCC Arrest by myklangelo(m): 5:15pm On Oct 22, 2016
AntiWailer:
There is no political affiliation

You dnt just say some one is corrupt cos every politician in the whole world is corrupt.

You need to add evidence of what they did.

For every single person EFCC arrested or is questioning. They showed account number, witnesses, transfer details and some even confessed.

Some have promised to return some funds (why return if it legitimately belong to u).

So what I am saying is that , coming up with silly allegations just to discredit the authenticity of the current war against corruption without evidence does not make sense.

It is easy to make allegations.


Just wake up and say something. Datz all
Remember we are all still talking of allegations. Anyone can provide any evidence to buttress their allegations.
FFK in this instance is corrupt based on allegations which have not been proven to show corruption. We term him corrupt simply because EFFC is probing him, the way we can term let's assume Amaechi incorrupt because EFCC is not probing him despite alleged allegations.

Buhari is incorrupt too because he told us he is not corrupt. Despite the amount stolen under him in PTF. He wasn't corrupt and he believed and preached that Abacha never stole. He wasn't corrupt, remind me of how much he said he had in his account during campaign? A liar is not corrupt. He isn't corrupt and we had the saga of a budget we had. Maybe he is not corrupt but ignorant.

I carry no one's portfolio. I criticise all governments. All politicians are not corrupt, but Buhari is corrupt too. And most not many, in his government is highly corrupt too.

If they are corrupt and active, it would have been a blessing, but no, this present government is corrupt and inept.

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 (of 26 pages)