Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,865 members, 7,817,562 topics. Date: Saturday, 04 May 2024 at 02:25 PM

Igbos come show your proverbs skills - Culture (39) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbos come show your proverbs skills (277011 Views)

Nigeria Pidgin Proverbs & Their Meanings / Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) / Yorubás come show your proverbs skills (2) (3) (4)

(1) (2) (3) ... (36) (37) (38) (39) (40) (41) (42) ... (101) (Reply) (Go Down)

Re: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 11:16am On Apr 25, 2008
Kashif:

Kashif is just a screen name; neither an acronym nor my name wink Can I know your reason for asking darling?

Kashif na Echelon, ajuju na osisa unu a di ka nke Nkakwu na agbisi (the Shrew and the ant).

Ha na abuo bu ezi enyi. Otu ubochi, Nkakwu acho iji Agbisi eme ihe egwuru egwu.

Nkakwu: "Agbisi enyim, ibu okenye ka ibu nwata?" (Are you an adult or a child?)
Agbisi: "Abum okenye." Kedu ihe mere iji na aju?" (An adult of course! Why did you ask?)
Nkakwu: "Oburu na ibu okenye we ha obere otua, kedu otu umu unu na ha?" (If as an adult, you are as small as this, of what size then are babies in your domain?)
UBOSI OZO (ANOTHER DAY)
Agbisi: "Nkakwu, emere ajuju nchoro iju gi." (I want to ask you a question.)
Nkakwu: "Juo m!" (Go ahead and ask!)
Agbisi: "Obu onye di ndu, ka ibu onye nwuru anwu?" (Are you dead or alive?)
Nkakwu: "Adim ndu." Kedu ihe mere ijiri juo?" (I am alive, why did you ask?)
Agbisi: "Ya buru na ndi di ndu na esi isi otua na obodo unu, agaghi na eku ume, ma oburu na otu na ime unu nwuo. (If the living beings smell so badly in your kingdom, I wonder if people would breath, should one of you smelly things die there.)

[/color][color=#990000]

kashif (Di ka Chief) and Echelon (Ekele-onu), biri kwe nu! grin
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 11:54am On Apr 25, 2008
Kashif:

Kashif is just a screen name; neither an acronym nor my name wink Can I know your reason for asking darling?

The name sounds "Hausa". So I was thinking you have some links there.

But come to think of it, something must have made u choose the name, even if it's a nickname?

For example, echelon was my nickname in school, which friends started calling me after our year 2 maths that dealt with "matrices".

For Mortiple:  grin  tongue . Nke ahu gbasara gi ebe ahu.
Re: Igbos come show your proverbs skills by Kashif(m): 2:18pm On Apr 25, 2008
@Mortiple, I choro I kwu na mu na Echelon gbare onye lawa, onye lawa? grin grin Aka m adighi ya sam sam. Echelon bu dimkpa biko. Onye na-amaghi onye kariri ya bu onye iberibe grin Echelon, okpu m di n'ala o!

Echelon, Enweghi m mpaka obula n'Hausa chaa chaa; A madighi m ihe obula gbasara ebe ahu. I have seen where you were blowing Hausa language and was shocked Kadam kadam wink

About the screen name, just random sampling. I think it might have a link with the middle east rather. grin Not a terrorist o

Cheers pals. kiss

@topic
Onye a na-eduga mposi na-ebu uzo
He who is being accompanied to the toilet leads the way
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 3:42pm On Apr 25, 2008
Umu ibe, o di m ka anyi e treat bugo this "iro anya" issue na page 28 of this thread.


Ihe di mma na anya gbara ndu
There is a covenant between the eyes and what is pleseant
Re: Igbos come show your proverbs skills by Nobody: 4:16pm On Apr 25, 2008
UKWU NA GA WARAWARA,YE'CHEFUKWANA NA ANYA NA GA KWA WARAWARA NA FU KWA YA

LEG WEY SABI WAKA TOO MUCH,MAKE E NO FORGET SAY EYE WEY SABI WAKA DEY SEE AM
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 4:32pm On Apr 25, 2008
cheei
Mortiple na akuko.is this another Mike ejeagha na etiti anyi? Jisie Ike nwanne.
Jenny ndeewo. kiss
Yougies,Echelon na Kashiff,ekele m.

@topic,ede na e ruru onye na e weghi eze(e chere m na o kara aburu ube and not ede undecided )
the cocoyam always gets done/ripe for the toothless ones

Nkita si na ndi nwere ike a maghi ano odu.
the dog said that those with nyash cheesy no sabi siddon
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 5:02pm On Apr 25, 2008
Kashif:

I have seen where you were blowing Hausa language and was shocked Kadam kadam wink
E mere m NYSC na Minna. Besides, O di m ka o nwere nwanne m nwoke choro ilu onye fulani  grin. - Ka m na-asunu obere ka m we mara mgbe e ji choo ile anyi ma anyi gaba ihu onu nwanyi. grin

ifyalways:

@topic,ede na e ruru onye na e weghi eze(e chere m na o kara aburu ube and not ede undecided )

"ruru" as used here means "does well" as in grows big tubers/seeds and not "gets soft" which applies to ube (pear)

@topic
Oji anaghi aga ije ihere
The kolanut does not embark on a shameful journey

Okwu di mma, nze ataa oji, okwu adighi mma, nze ataa oji
Regardless of whether the issue is good or bad, the elders must eat kolanut

Ejighi ihere ata oji nsi
You should not, because of shame, eat a poisoned kolanut

anyi abanyeela domain by domain for Oji
Re: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 5:29pm On Apr 25, 2008
Ifyalways, Mike Ejeagha indeed! grin grin
Youngies, Kashif, Echelon, Jenny, ma mma nu!

Umu nwanyi Igbo (umu-agboo na ndi iyom) na Nairaland,
Biko, unu ewela iwe maka Ilu ndia nchoro ituru unu.  Apology in advance.

Ndigbo si na, nwanyi na enweghi nwa, ahuru ya na ada ala-fuu!
The farting of a barren woman has a peculiar sound: to hell with the universe!

Ndigbo si na, Mgbe oso suru ka nwanyi ike ukwu na ama na ihe Chi ya nyere ya bu ibu aru.
It is during the time of anarchy that a woman with big booty realises that her god has given her a great responsibility.

Ndigbo si na, Ogori (Nwanyi) kaba nka, odi ka eji ego we luo ya.
When age begins to catch up with a married woman, it would seem as if dowry/bride price was not paid on her.

Ndigbo si kwa na, nwa-agboghobia ga fe na onye muruya, ya eruo na onye luru ya!

Onye si nani ya biri, ya chetakwa ngbe nka ya.
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 5:44pm On Apr 25, 2008
Echelon dalu.
Mortiple ilu ndia kpukwa oku na onu.o nweghi onye ga ata gi uta,Okwu ka i kwuru ! cool

@Topic,okwu e kpebiri na awaghi oji,echi a ga ekwughari ya.
if you conclude a talk/issue with out breaking the kolanut,d next day,the same talk wud be repeated.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 5:53pm On Apr 25, 2008
Oso abubeghi oso bu oso nwanyi na-agba achido ala ya aka
It's that the race is not yet serious that a woman is running and cupping her breasts with her hands
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 5:59pm On Apr 25, 2008
lmao
Echelon,heheeeeeee nke gi a dikwa egwu.Mortiple tinyere obere "rikom" na nke ya,nke gi a di without "kpom na elu ma obu rikom" lol
o nwere ihe umu nwanyi mere unu abuo tata?  cheesy

@Topic,ebe nwata na ebe akwa na atu aka,nne ya anoghi ebe ahu,nna ya anoro ya.
where a crying child is pointing at,if the mum is not there,the dad is there.

Echelon na Mortiple,unu were eze unu guo ire unu onu  cheesy ole ihe umu agbogho mere unu recently?ude akwa unu abuo yitere  cheesy
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 6:08pm On Apr 25, 2008
Ify, rikom na kpom niile Mortiple tinyere, a na m eche na o kpuchitere mu na ya?  grin

Okwa asi na ede ruelu nwanyi nne, o chezoo ndi sooro ya wee kuo?
It's said that when a woman's cocoyams do well, she forgets those that cultivated with her

Onweghi ihe umu nwanyi mere m. O domain by domain ka na-aga grin
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 11:23am On Apr 28, 2008
Ngwanu, since echelon na mortiple siri ka anyi tuba ilu umu nwanyi, ka m tunye kwa nke m:

Asi na ejighi amu enyi ashawo egwu
You can't scare a prostitute with a huge dickson


sorry Ify, this one seem not to contain neither "rikom" nor "kpom"
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 4:32pm On Apr 28, 2008
Ochi front na back.lol
O gini na eme?d worst part is that amaghim ilu m ka eji zaghachi unu.
@Topic,otu onye a naghi emeri oha
an individual cannot stand a crowd
agadi nwanyi si na nwoke na achi ya ochi na ara ya a dala chetakwa na mkpuru amu ga emecha lakpuo na afo.

Echelon,Mortiple na Youngies,unu a kabeghi ihe meganu cheesy
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 5:18pm On Apr 29, 2008
O zuwa ezighi ibe na-azu ihe ahia juru
A person that doesn't consult people before purchasing buys what the market has abandoned

Nkita jepuru ejepu na-eri nsi mmanu turu
A well-travelled dog eats well-oiled feaces

Onye onya tara, O mata na ijiji nwere eze
Whosoever gets a wound will know that flies have teeth
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 5:44pm On Apr 29, 2008
Echelon dalu.

Mgbe onye jiri tete ura bu ututu ya.
whenever one wakes up becomes his morning
Chukwu a gaghi ekwe ka anyi tete ura mgbe ibe anyi na anaba ura.
Nwa nnunnu bere na ngige,ngige a na egwuru nwa nnunnu egwu.
when a bird perches on a tree,the tree plays with the bird
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 6:00pm On Apr 29, 2008
ifyalways:

Nwa nnunnu bere na ngige,ngige a na egwuru nwa nnunnu egwu.
when a bird perches on a tree,the tree plays with the bird

Let me get you right. You meant:

Nwa nnunu bere na ngige no n'egwu, ngige na onye ya nokwa n'egwu
As the bird that perched on the rope/line is dancing, the rope itself is dancing  wink

This proverb was used in the media to describe the Chris Uba/ Chris Ngige Saga in Anambra State. Chris Uba was the "Nwa nnunu" while Chris Ngige, of course, was the "Ngige"
Re: Igbos come show your proverbs skills by Kashif(m): 10:34am On Apr 30, 2008
echelon:

Let me get you right. You meant:

Nwa nnunu bere na ngige no n'egwu, ngige na onye ya nokwa n'egwu
As the bird that perched on the rope/line is dancing, the rope itself is dancing wink

This proverb was used in the media to describe the Chris Uba/ Chris Ngige Saga in Anambra State. Chris Uba was the "Nwa nnunu" while Chris Ngige, of course, was the "Ngige"

True talk.
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 3:06pm On Apr 30, 2008
Echelon dalu.E tinyeghim nti n'ala ofuma mgbe ndi Okenye na ekwu okwu.e kwufele m onu,fiakwa ! grin

one amaghi,ibe ezi ya.when one is ignorant,his kinsmen enlightens/educates him

Eriri ma ngwugwu,ngwugwu ma onye kere ya the rope knows the package,the package knows who packaged it.
Re: Igbos come show your proverbs skills by Kashif(m): 11:07am On May 02, 2008
Onye bu igu ka ewu na-eso
The person with palm leaves is same the goat follows

Ihe anu na-eri ka-e ji amata anu
What a game/prey eats is used as a bait to catch it.

Uno adighi ada hapu uko
A house does not collapse without its roof
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 11:28am On May 05, 2008
Ole ihe na eme nu?truly oku di over,nsogbu adighi.
@Topic,ndi m na azo ndu,ndi na azom ndu
ilua e kweghim nghota ma o bu nkowa,unu nyere m aka. embarassed
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 2:30pm On May 05, 2008
Ify,

Onwe ji ego kwa nna na o bughi di okpara gburu ya!
He who has money should perform the burial rites for the dad as the dad was not killed by the first son!
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 12:42pm On May 06, 2008
Echelon,heheeee o dikwa egwu.okwu ka i kwuru. cool

@Topic,onye na achu nkita na nsi,o choro i ri nsi
he whos chasing the dog from eating shyte wud he eat the shyte?

Ala a dighi nma bu uru ndi nze grin
nke a bunu ilu ka o bu akpalaokwu?
Kashiff,Youngies,Mortiple na ndi ozo. . . .iyi a gaghi eri anyi kiss
Re: Igbos come show your proverbs skills by Kashif(m): 1:38pm On May 06, 2008
Ify nne, eriri adighi okuko mma n'olu chaa chaa. Mgbe obula m biara n'ala a, o dika obuzi soso ngalaba odinala ka m n'ebu uzo abia. Ka m bia hu otu ndi nke m si eme.

Ka anyi nile gbalisie ike ka oku a gunyere nwata n'aka ghara inyunahu ya.

Anyusia nsi ma atukwubaghi ya onu, o buru otoro
If after defeacating and the feaces does no have a dome then there is diarrhoea (this spelling na wa o )
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 12:55pm On May 07, 2008
Mmu nwe juo si, dibia na agwo otolo, odebere ike ya ebe ole

The herberlist that is reputed to be curing diarrhoea, where did he keep his anus?
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 2:07pm On May 07, 2008
lmcao.
o bala na nsi na otele? cheesy domain by domain indeed.

@Topic,okirikiri ka a na agba ukwu ose,a naghi ari ya elu.
you dont go climbing to pick/pluck peppers,you go round it
Onye e jidere na ukwu ose bu onye oshi ose.
i cant translate this. . .he whos caught red handed at the pepper farm is the real thief undecided
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 2:50pm On May 07, 2008
ifyalways:

lyou don't go climbing to pick/pluck peppers,you go round it
Onye e jidere na ukwu ose bu onye oshi ose.
i can't translate this. . .he whos caught red handed at the pepper farm is the real thief undecided

Whoever that is caught by the pepper tree is a pepper thief wink
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 3:37pm On May 10, 2008
ole ebe ndi okenye no nga a gara oooooh embarassed
@topic,anu gbala taa,echi bu nta.
if the game escapes today,tomorrow is yet another day.
onye ahuho/awuwo nwuo,onye ahuho/awuwo elie ya.
cunny man die,cunny man go bury am

happy weekend all kiss
Re: Igbos come show your proverbs skills by Nobody: 6:40pm On May 10, 2008
o'ne wete mu,na ama mu atu'ilu, cry cry cry amakwamu asuigbo ofuma ,ma na i tu ilu ne nye mu nsogbhu
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 3:39pm On May 12, 2008
@Jenny ndo.o dibeghi late,you can still pick up from threadia a wink n'ihi na "mgbe onye ji teta bu ututu ya" when one wakes becomes his/her morning

@Topic,onye kpatara nku ahuhu si ngwere biara ya oru.
he who gathers the ant infested firewood is inviting the lizards

Ole maka Youngies na Echelon?
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 4:31pm On May 12, 2008
Ify girl, biko iwe gi adina oku. N'ihi na mgbe adigh anyi anya gi amara why cheesy

Ihe nwoke na nwunye ya zoga, ga aputa ihe na onwa iteolu
The secret between a man and his wife is always revealed at the ninth month.
Re: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 4:43pm On May 12, 2008
Aburu na eri ekpe adighi agwo onye oria
A people (clan) that take pleasure in sharing  the estate of their dead relative do not take any sick one among them to a healer.

(1) (2) (3) ... (36) (37) (38) (39) (40) (41) (42) ... (101) (Reply)

African Weddings From All Over! / Yoruba Idioms: Owe Yoruba, Itunmo Re Ati Lilo Re / Keggites Members : Introduce Yourself & Ilya

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 62
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.