Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,013 members, 7,817,986 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 01:57 AM

Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 (631 Views)

Rivers APC Reacts To Supreme Court Judgment, Calls It Mere Academic Exercise / Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em / Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by iKnowevents(m): 10:59am On Jan 08, 2018
In our bid to promote the reading and writing of our indigenous Nigerian languages, we present this.


Ekele dịrị Chukwu na onye ọ bụla na-agụ ihe nke a batara n’afọ 2018. Ndụ bụ isi, ihe nile ndị ọzọ ga-eso ya. Taata iji nabata onwe anyị n’afọ ọhụrụ, anyị ga-elekwasị anya n’ihe ise dị nnukwu mkpa mere n’afọ gara aga, ọ kachasị ndị bụ ude asụrụ na mba nụ ya na mba. Ndị ụzụ ha ga-emetụtakwa anyị n’ụzọ pụrụ iche n’afọ 2018. Ka anyị gbapụ ọsọ, ogologo okwu adịghị n’ụka mgbede.


www.odeniigbo.com

1 Like 1 Share

Re: Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by iKnowevents(m): 11:03am On Jan 08, 2018
1. USA Kwupụtara Na Jerusalem Bụzi Isi Obodo Izrel, Na Echiche UN Gbasara Ya.

Ka ọnwa gara aga gbara ụbọchị nke isii, Trump onye isi obodo Amerịkà, mara ọkwa nke wetere ọmajijiji n’ụwa ndị ụka Alakụba na n’obodo dị iche iche. Ya bụ ọkwa bụ na ha ga-ebido ịhụ Jerusalem dị ka isi obodo Izrel, na ha ga-egosipụtakwà nkwenye ha site na ịrụ embasi ha na Jerusalem nso nso a. Ọkwa ahụ tupu ọ na-apụsị Trump n’ọnụ, wetere ngagharị iwe n’ọtụtụ mba ndị Arab. Nke a bụ maka na ndị Ụka Alakụba na-ekwupụta na Jerusalem bụkwu obodo nsọ ha. UN na nzukọ ha mere n’afọ 1947, kwupụtara na o nweghị mba ụwa nwe Jerusalem, mana ndị Izrel ekwenyeghị na nke a ma ọlị.

N’ihi ọkwa a Trump mara, ndị UN kpọrọ nzukọ ha n’ọkụ n’ọkụ iji tụọ votu maka ọnọdụ UN gbasara ime Jerusalem isi obodo Izrel. Na ya bụ nzukọ, obodo otu narị na iri abụọ na asatọ (128) kwụnyere UN n’ikwupụta na Jerusalem agaghị abụ isi obodo Izrel, Naijiria so na ya, ebe obodo itoolu kwụ Amerịkà n’azụ, obodo iri atọ na ise atụghị ya votu. Ka emechara nke a, Netanyahu onye ọchịchị Izrel kwuru na emere elu, emere ala na Jerusalem bụ isi obodo ha, na ha agaghị ege ntụziaka UN ntị. Mba Amerịkà ji ikikere ha nwere na UN, we katọọ mbinye aka obodo ndị ahụ agbasoghị ha n’azụ. Ya bụ na ha na-aga n’ihu na nkwenye ha ime Jerusalem isi obodo Izrel.

Ọtụtụ obodo ndị Arab, gụnyere Tọkị, Iran, Palestain foro ntutu taa kwuo na ha ga-agba ya bụ atụmatụ mgba n’ụzọ abụla ụzọ iji gbochie ya. Ndị ụka Alakụba nwekwaziri nkwenye nke ahụ, obodo Maleshia na-eme ngagharị iwe kwa ụbọchị maka nke a. Atụmatụ a nwere ike ịbụ n’afọ a ka anyị ga-ahụ isi ya, ma mara amala na ọ ga-ata isi ọtụtụ ndị.
www.odeniigbo.com
Re: Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by iKnowevents(m): 11:05am On Jan 08, 2018
2. Mba Dị n’Afrịka Gbara Ndị Ọchịchị Aka Ike Ha Ụgbọ Nwa Mkpi

O nwere onye na-amaghị Mugabe? Ọchịchị ya na Zimbabwe tọrọ ọtụtụ ndị na-agụ edemede a ugbu a, nke a bụ maka na ọ chịala obodo ahụ ihe ruru afọ iri atọ na asaa (37). Echiche ya bụ na ọ ga-achịgide ganye n’ọnwụ, nwunye ya eweghara mgbe ọ nwụrụ. O nweghị onye na-agbayasi echiche ya a, ganye mgbe nchụpụ ya mere onye ọ bụla voom n’anya, amaghị m na Mugabe aghọtala ihe mere mgbe ahụ we ruo ugbu a.

Na Gambia, ndị obodo ji mbinye aka gbaa Yayaha Jammeh ụgbọ nwa mkpi, ma o fere isi kpakakpaka na o naghị apụ, ganye na ihe ka nte abịakwute nte n’ụlọ. Nke a bụ na ọnọdụ ndị ECOWAS iji ndị agha ha nye ya ọsọ. Adama Barrow, onye nwere mgbe ọ bụ onye nche ụlọ ahịa weghara ọchịchị obodo. Nke ahụ mere ya afọ iri abụọ na abụọ kemgbe e mere nhọpụta onye ọchịchị obodo na Gambia n’ụzọ kwesiri ekwesi.

N’Angola, Jose Dos Santos nyere ogbo ya bụ Joao Luorenco ike ọchịchị ka o wee nwe ike ịla ezumike nka ka ọ chịsịrị obodo ahụ ihe ruru afọ iri atọ na asatọ! Joao tụgharịrị napụ ezi na ụlọ ya ike nile ha nwere n’obodo ahụ.

N’afọ a, ka anyị ga-ama na ihe nile ndị ahụ a ga-abara Afrika uru, ka ọ bụ ịnapụ oke azụ, nye ya busu ka o chekwa.

www.odeniigbo.com
Re: Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by iKnowevents(m): 11:07am On Jan 08, 2018
3. Anapụrụ ISIS Alaeze Ha, Ma Chụpụ Ha N’obodo Nile Ha Ji Ọchịchị.

N’afọ anọ gara aga, ka ISIS sepụtara isi ya iji we yie ụwa egwu. N’afọ ahụ ha kere obodo abụọ ọkara; Siria na Irak, ma weghara ọchịchị obodo ahụ. Ebe ahụ ka ha si wee gbasa aka iji memina ọtụtụ ndị n’aha “Allah”.

Bido n’afọ 2016, ha bidoro inwete ihe mgbu dị iche iche, mgbe ndị agha obodo Siria, USA na Kod jikọrọ aka ọnụ igbuso ha agha. N’etiti afọ a gara aga, anapụrụ ha ebe ha ji mere isi obodo bụ Mosul n’Irak. N’ọnwa Ọktọba, isi obodo ha di na Siria bụ Rakaa, pụnarịrị ha n’aka. N’ọnwa ahụ kwa ka a chụpụrụ ha kpamkpam na Irak. N’ọnwa Nọvemba, a napụrụ ha obodo ikpeazụ ha ji na Siria bụ Albu Kamal. Ka ọ dị ugbu a, e tiela ha mmanwụ n’isi.

Anyị kwetere na ha na-agbazi rịkọrịkọ ọnwụ ugbu a, ma nnukwu nsogbu na-esepụta isi na mba Arab maka mmeri a emeriri ISIS, nsogbu ga-adị egwu na 2018. Mba Siria na Irak, na-akwado igbuso onwe ha agha ugbu a ISIS nyere ha efe. Ọ bụrụ na-akpachaghị anya, ya bụ agha ga-eri isi ọtụtụ ndị ma tikọọ ọtụtụ obodo isi ọnụ, ọ kachasị mba Saudi Arabia na-achọ ibe Irak ọdụdụ.

www.odeniigbo.com
Re: Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by iKnowevents(m): 11:08am On Jan 08, 2018
4. Chaina Gosiwapụtara Ike Ha N’ụwa Dum

Ụdị ike Chaina na-akpa ugbu a, agwa gị na ha nwere ike ime ya n’afọ iri atọ gara aga, i gaghị ekweta ma ọlị. Ya bụ obodo na-agbanwe dị ka obodo nwere ike ime ihe ọ bụla na mba ụwa dum, site n’atụmatụ ha ji eso mba ụwa dum ugbu a. Ya bụ mbọ ịbụ ejesịaọgwụ na mba ụwa bụ nke ha na-eme na ngalaba nile.

N’afọ gara aga, ha jikere ịkpọga mmadụ n’ọnwa, nanị mba Amerịkà mere nke ahụ ihe karịrị afọ iri anọ gara aga. Kemgbe ahụ o nweghị ndị ọzọ nwere ike ya. Ha gara n’ihu tinye onyokomita iji chọpụta na o nwere ndụ ọzọ dị n’okpuru anyanwụ anyị (Aliens). Iji hụ na azụmahịa ha na ihe ha na-arụpụta zuru mba ụwa dum ọnụ, ha rụrụ ụzọ okporo igwe si obodo ha ruo mba London, ama m na i ghọtara ihe nke a pụtara?

Abịa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo, anyị hụkwaziri ike ha. Ịmā na ọ bụ Chaina nyere nkwado iji chụpụ Mugabe n’ọchịchị na Zimbabwe? Jiri nke a mara ike ha nwere n’Afrika. Ego ha tinyegolu n’Afrika karịrị ijeli kwuru ijeli dọlà, nke a na-enyezi ha ike n’Afrika.

Ugbu a, ha bụzi obodo nwere ike itinye mba Amerịkà aka n’ọnụ, n’atụghị ụjọ, Amerịkà itabi ha aka. N’afọ a, anyị ga-ahụ ka ike ha ga-abawanye, ọ kachasị n’Afrika na mba Eshia.

www.odeniigbo.com

1 Like 1 Share

Re: Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 by zendy: 11:38am On Jan 08, 2018
Nke Ise buru gini?

1 Like

(1) (Reply)

What Do You Think Is The Biggest Threat Nigeria Is Facing? / "No Politician's Ambition Is Worth The Blood Of Any Nigerian" -- GEJ / Why Abians Stand With Dr Uche Ogah By Dominic Barcity

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 20
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.