Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,140,550 members, 7,770,423 topics. Date: Tuesday, 19 March 2024 at 10:31 AM

Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): (436 Views)

Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): / Obianọ Bụ Dịke N'ọrụ - Emeka Sibeụdụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): by IzunnaOkafor(m): 11:37pm On Aug 08, 2018
Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63):

Lee Ihe Iri Isii Na Atọ I Kwesiri Ịma Banyere Ya

Izunna Okafor Dere Edemede a

1. A mụrụ gọvanọ Willle Mmadụabụchukwu Obianọ n'Agụleri dị n'okpuru ọchịchị Anambra East na mkpụrụ ụbọchị atọ nke ọnwa asatọ ahọ 1955

2. Aha nne ya bụ oriakụ Christiana Obianọ, ebe aha nna ya bụ Maazị Philip Obianọ.

3. Willie Obianọ bụ nwa mbụ n'ime ụmụ anọ nne na nna ya mụrụ.

4. Willie Obianọ gụrụ akwụkwọ Praịma ya n'ụlọ akwụkwọ "Holy Trinity Primary School Onitsha"; gụọ akwụkwọ sekọndịrị ya n'ụlọ akwụkwọ Christ The King College Ọnịtsha.

5. N'ahọ 1974, Willie Obianọ tuuru ugo n'asọmpi edemede nke John F. Kenedy n'ụlọ akwụkwọ CKC.

6. Willie Obianọ gụchara mahadum ya na ngalaba ọmụmụ ihe mgbàkọ ego nke mahadum Legọọsị n'ahọ 1979, jiri nzere "Second Class Upper" pụta

7. Willie Obianọ fere ala nna anyị otu ahọ na steeti Benue n'ahọ 1980 na steeti Benue.

8. Willie Obianọ natara onyinye nkwanye ugwu "Best Youth Corper Award" n'ahọ 1980.

9. Willie Obianọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ọba ego "First Bank" dịka onye mgbàzi n'ahọ 1981.

10. Willie Obianọ rụrụ n'ụlọ ọrụ Chevron dịka onye ọgbàkọ ego

11. N'ahọ 1988, Willie Obiano lụrụ nwaanyị, Ebelechukwu Veronica Obianọ sitere Ogbunike dị n'okpuru ọchịchị Oyi na steeti Anambra.

12. N'ahọ 1989, Willie Obianọ jiri ọkwa n'ụlọ nsucha mmanụ Texaco dị na mba Netherlands dịka onye nnyocha akpa ego ụlọ ọrụ ahụ.

13. N'ahọ 1991, Willie Obianọ batara n'ụlọ ọrụ Fidelity Bank, jie ọkwa dị iche iche, rụọ ọrụ dịka osote onyeisi ngalaba nnyocha akpa ego ụlọ ọrụ ahụ n'ahọ 2002 , ma gbagoo n'ọkwa ozigbo ozigbo dịka onyeisi ụlọ ọba ego ahụ n'ahọ 2003.

14. Willie Obianọ nwetara ọtụtụ nzere dị iche iche ogologo oge ahụ ọ na-arụ ọrụ.

15. Willie Obianọ nwetara nzere Masters ya na mahadum Legọọsị n'ahọ 1993.

14. Willie Obianọ bụ onye otu "Institute of Chartered Accountants of Nigeria (ICAN)"

15. Willie Obianọ bụ onye nna ndị otu "Institute Of Chartered Accountants of Lagos (Mainland)"

16. Willie Obianọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ndị otu "AMP8 (Advance Management Programme) nke "Lagos Business School" ruo ahọ iri zuru ezu.

17. Willie Obianọ bụ onye otu 2006 Building New Ventures

18. Willie Obianọ bụ onye otu Harvard University, USA CLASS

19. Willie Obianọ bụ onye otu "Harvard Business School, Boston USA

20. N'ahọ 2012, Willie Obianọ natara onyinye nkwanye ugwu "Distinguished Banker of the Year 2012 Award"

22. N'ahọ 2013, Willie Obianọ hapụrụ ọrụ ụlọ ọba ego, bata n'igwù okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma sonyere otu ndọrọ ndọrọ APGA.

23. N'otu ahọ ahụ, Willie Obianọ soro zọọ ọkwa aka ga-achị steeti Anambra, n'okpuru ndọrọ ndọrọ APGA

24. N'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2013, Willie Obianọ nwetara mmeri na nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na steeti Anambra.

25. N'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2014, e duru Willie Obianọ n'ọrụ dịka aka na-achị steeti Anambra ka o jiri nkeji ztọ gata elekere iri na abụọ nke ehihie.

26. Ka ọ batara n'ọkwa, Gọvanọ Obianọ Tụpụtara ọkpụrụkpụ ide anọ nke ọchịchị ya ga-agbakwasa ụkwụ

27. Ihe mbụ Gọvanọ Willie Obianọ mepụtara na steeti Anambra bụ iweta ezi nchekwa site n'ịchụ ndị ohi na ndị ntọrị mmadụ ọsọ ọkpa erughị ala na steeti ahụ, iji nye ụmụafọ steeti ahụ na akụnụba ha ezi nchekwa ma mekwa ka ala steeti ahụ bụrụ ala dị larịị maka ndị ga-abịa iwunye akụnụba.

28. Ihe ọzọ pụrụ iche gọvanọ Obianọ mere bụ itute ngalaba dị iche iche na steeti ahụ.

29. Ka o tutechaara ngalaba ọrụ ugbo, Gọvanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Coscharis farm na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè otu narị Dọllar na iri ise ($150m)

30. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Coscharis Farm Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè otu narị Dọllar na iri ise ($150m) n'ọrụ ugbo n'Anakụ.

31. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ NOVTEC Farms Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè Dọllar iri ise ($50m) n'ọrụ ugbo n'obodo Ndikelionwu.

32. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Joseph Agro Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè otu narị Dọllar na iri isii ($160m) n'ọrụ ugbo n'Ọmọr dị n'okpuru ọchịchị Ayamelụm.

33. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Eckel Tomato Farm Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè narị Dọllar abụọ na ụma iri abụọ ($220) n'ọrụ ugbo n'Ọmasị.

34. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Songhai/Del farms Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè Dọllar iri ise ($50m) n'ọrụ ugbo n'Ịgbarịam.

35. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Grains & Silos, ha wunye ihe ego dị nde Dọllar iri anọ ($40m) n'ịrụnye akụrụngwa e ji echekwaba ihe a kọpụtara n'ugbo.

36. Govanọ Willie Obianọ dọtara ụlọ ọrụ Lynden Farms, he wunye ego dị nde Dọllar iri isii na otu ($61m) n'ịzụ ọkụkụ na anụ ụlọ ndị ọzọ n'Igbarịam.

37. N'okpuru ndú Gọvanọ Willie Obianọ ka e mepụtara osikapa a na-akpọ Anambra Rice.

38. N'okpuru ndú Gọvanọ Willie Obianọ ka steeti Anambra malitere ibupu ụgụ na akwụkwọ nri ndị ọzọ na mba ofesi.

39. Gọvanọ Willie Obianọ guzobere ụlọ ọrụ Anambra State Business Agency (ASBA)

40. Gọvanọ Willie Obianọ guzobere ụlọ ọrụ Anambra State Investment Protection and Promotion Agency (ANSIPPA) maka ichekwabe ndị na-abịa ewunye ihe mwunye na steeti ahụ.

41. N'iji mee ka Awka bụ isi obodl steeti Anambra magbuo onwe ya, Gọvanọ Willie Obianọ guzobere ụlọ ọrụ Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA).

42. Gọvanọ Willie Obianọ rụrụ nnukwu àkwà atọ n'Awka.

43. Gọvanọ Willie Obianọ bụ gọvanọ mbụ nyere obodo niile dị na steeti ya nde Naịra iri anọ n'otu n'otu ka ha wee họrọ ma rụọ ihe masịrị ha.

44. Gọvanọ Willie Obianọ eteela ma dozigharịa ụzọ karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ.

45. Gọvanọ Willie Obianọ mere ka ngalaba mmụta bụrụ ịgbà na steeti Anambra, nke mezịrị ka ụmụakwụkwọ steeti ahụ na-eturu ugo n'ule na asọmpi dị iche iche a na-eme n'ala Nigeria na mba ofesi.

46. Gọvanọ Willie Obianọ emeela ka ngalaba ahụike na steeti Anambra bụrụ e ji ama atụ.

47. Gọvanọ Willie Obianọ buliri ụgwọ ọnwa ndị ọrụ oyibo na steeti ahụ site n'ịtụkwasara ha pasenti iri na ise.

48. Gọvanọ Willie Obianọ na-akwụ ndị ọrụ oyibo ụgwọ n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa ọbụla.

49. Ndị ọrụ oyibo na steeti Anambra nyere Gọvanọ Willie Obianọ aha ọhụụ dịka 'Alert Gọvanọ" n'ihi otu ha si anata ụgwọ ọnwa ha kwa mgbe.

50. Na-agbanyeghị na ihe siri ike n'ala Nigeria, Gọvanọ Willie Obianọ adịghị eji ndị ọrụ oyibo ụgwọ ọnwa.

51. Gọvanọ Willie Obianọ kwụwhapụrụ ụgwọ niile e ji ha ndị niile lara ezumike nka n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light na n'ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, kwàlite ma nwogharịa ụlọ ọrụ abụọ ahụ ka ha dị n'ogoogo mba ụwa.

52. Gọvanọ Willie Obianọ akwalitela ọnụ ego a na-enweta n'ime steeti Anambra kwa ọnwa ọbụla.

53. Ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ azụọla ndị ntorobịa karịrị puku abụọ n'ọrụ aka ma nye ha ego nkwàdo.

54. Gọvanọ Willie Obianọ mere ka ọ ka n'ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ya bụrụ ndị ntorobịa.

55. Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndị ọrụsị na ụmụnwaanyị ohere ọrụ dị oke elu n'ọchịchị ya.

56. Gọvanọ Willie Obianọ etutela ngalaba njem nlegharị anya na steeti Anambra

57. Gọvanọ Willie Obianọ nwetara mmeri maka ịchị nke ugboro abụọ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017.

58. Gọvanọ Willie Obianọ bụ gọvanọ mbụ nwetara nturu ugo n'okpuru ọchịchị niile dị na steeti ya.

59. E duru Gọvanọ Willie Obianọ n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2018.

60.Gọvanọ Willie Obianọ ewetela udo tọrọ atọ na ọnọdụ mmepe, mee ka steeti Anambra bụrụ e ji ama atụ.

61. Ụbọchị ụka gara aga ka Gọvanọ Willie Obianọ na nwunye ya mere ncheta ọgbụgba ahọ iri atọ ha jiri lụọ di na nwunye.

62. Gọvanọ Willie Obianọ anatala echichi dị iche iche na onyinye nkwanye ugwu karịrị iri isii na atọ (63) n'ọnụ ọgụgụ

63. Taa ka Willie Gọvanọ Willie Mmadụabụchukwu Obianọ gbara ahọ iri isii na atọ (63).

Ọ kwụsịghị ebe a, maka na nke dị n'ihu karịrị nke dị n'azụ....

Ka Chineke were afọ ọma ya gọzie agụ nwoke a bụ gọvanọ Willie Gọvanọ Willie Mmadụabụchukwu Obianọ, gbaa ya ume, nye ya ọgụgụ isi n'elu ọgụgụ isi ma tụkwasara ya ogologo ndụ n'elu ogologo ndụ ka ọ o wee gaa n'ihu n'ọrụ ọma dị iche iche o ji n'aka na steeti ahụ, ọ bụnadị ka ọ na-emerùbe mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri isii na atọ ya taa.....

Iseeeee.

Ọñụ na ncheta ụbọchị ọmụmụ gị, Gọvanọ Willie Obianọ,
Odogwu ndị Anambra ji eme ọnụ.
Ya gaziere gị

Izunna Okafor Dere Edemede a

1 Like

Re: Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): by Fiaburnthem: 4:11am On Aug 10, 2018
[sup][/sup]i
IzunnaOkafor:

delete / It’s Shameful Seeing Almajiri Beg – Gwandu Emir / Learn Urhobo 1(uyono Urhobo Ovo)

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 109
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.