Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,006 members, 7,817,970 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 12:35 AM

'buhari Achụbeghị Emefiele Dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti' - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / 'buhari Achụbeghị Emefiele Dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti' (376 Views)

Awka-etiti Installs New Ichies At New Yam Feast / Exclusive:buhari, Okorocha, Lamido, Ambode, Emefiele Stunned By Hao Ge / Ndị Nando Eguzobela Emeneka Maka Ụlọ Ọgbakọ Etiti. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

'buhari Achụbeghị Emefiele Dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti' by KelChuks: 12:40pm On Mar 05, 2019
'Buhari achụbeghị Emefiele dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti'

Onye Isi Ala Muhammadu Buhari achụbeghị Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti Naijiria, Godwin Emefiele, dịka Online Portal, TheCable, sịrị chọpụta. 

Akụkọ agbasala na Social media na Emefiele nwetara akwụkwọ ozi site na Ụlọ Ọrụ Onye Isi Ala Muhammadu Buhari, ụnyaahụ, ka ọ hapụ ọkwa ya dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti. 

N'akụkọ anyị nwetara site n'ụlọ ọrụ Onye Isi Ala nke gbaruru ihu na ọ dịghị eziokwu dị n'akụkọ ahụ kwuru na: "Onye Isi Ala enweghị ike ịchụ Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti ala anyị ma ọ bụrụ na o nwetaghị nkwado nke Ndị Ụlọ Ome Iwu nke ala anyị. O kwuru na ya bụ akụkọ bụ asị."

Oge TheCable tụlere ya bụ akụkọ dịka otu esiri kwụsị Muhammad Sanusi II, onye jiburu ọkwa dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti n'ọrụ, ozi anyị nwetara sịrị: "Nkwụsinaọrụ dị iche na Nchụpụnaọrụ, na Emefiele emebeghị ihe ọ bụla nke ga-eme ka a chụpụ ya n'ọrụ, kwụsị ya n'ọrụ ma ọ bụ si ya jee zuo ike."

Nkebi asatọ nke Akwụkwọ Iwu Ụlọ Akụ Etiti nke afọ puku abụọ na asaa kwuru na Onye Isi Ala ga-ewepụ Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti ma ọ bụrụ na ụzọ abụọ n'ime ụzọ atọ ka n'ọnụ ọgụgụ nke ndị Ụlọ Ome Iwu ala anyị akwado mwepụ ahụ."

Oge ọlụ Emefiele dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti ka a na-atụ anya ga-abịa n'isi njedebe na ụbọchị atọ nke ọnwa Junu, afọ puku abụọ na iri na iteghete - ya bụ afọ ise dịka a họpụtachara ya. 

Ozi ọzọ ruru anyị aka kwuru "na akụkọ ahụ nke na abụghị eziokwu agbasala rinne dịka ọ fọdụrụ nanị ọnwa atọ ka oge ọlụ ya zuo." 

TheCable chọpụtara na Emefiele gara ọlụ n'ụbọchị Monday, na ọ dịghị akwụkwọ ozi ọ bụla ụlọ ọrụ Gọvanọ ahụ nwetara. 

E nwere ike ị họpụtakwa Emefiele ọzọ dịka Gọvanọ Ụlọ Akụ Etiti ma ọ bụrụ na ọ masị Onye Isi Ala na Ndị Ụlọ Nzukọ Ome Iwu. 

Nkebi iri nke Akwụkwọ Iwu Ụlọ Akụ Etiti kwuru na "a ga-ahọpụta Gọvanọ na ndị osote gọvanọ ịrụ ọrụ afọ ise n'oge mbụ na onye ọ bụla n'ime ha tozukwara okè ka ahọpụta kwa ya ọzọ n'afọ na-akarighi afọ ise."

Akwụkwọ Mgbasa Ozi, Vanguard, Ụbọchị ise nke ọnwa March, afọ puku abụọ na iri na iteghete.

1 Like

(1) (Reply)

Ohanaeze Lagos Bickers Over Ooni’s Comment On Origin Of Igbo. / We Are All Osus / I Dont Get This Rejoicing Whenever A Nigerian Lady Hooks Some Species Of Men

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.