Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,154,204 members, 7,822,058 topics. Date: Thursday, 09 May 2024 at 04:55 AM

Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much (3911 Views)

Why The Nigerian Man Needs To Start Planning For Christmas From September / Nigerians Love Prayers More Than Actions / What Is The Nwa Baby Ashawo Song By Flavour N'abania Talking About? (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 5:43pm On Dec 28, 2011
Okwanu mmadu nwe ogodo ewu nata.
Onye nzuzu na eche na ogu bu mgba.
ochi nti amghi na agha esula. ihe ndia bu okwu igbo.

Umu okorobia igbo, ugbua bu oge nke anyi ime ihe nna anyi ha na emero maka ihi obi ebere.
Onye obi ebere na anwukwa na agha. Ndia na agba bomb bukwanu mmadu dunyere ha.
obughikwa nu ndi okenye awusa na agba anyi bomb kama ndi ntorobia ha. ya mere olee ebe umu ntorobia anyi no?
Ifere megbuo umu ikorobia ndigbo. Ofeke amaghi mgbe ekere nkukwa.

Obi ebere na igba nkiti agaghi ebe ogua. ara ara ka eji egbo ogu ndi ara.

Biko oburu na onwere onye ma ka esi emepe website ya biko mepenu ofu maka ndi igbo na-abia online(nairaland).
ka-anyi site na ya kpaba ihe na otu anyi ga esi agba uzo owere mgba.

Oge eluokwalanu mgbe anyi ga ebido ikwu ihe anyi ga eme zoputa onwe anyi,karia isoro ndi Yoruba na ndi awusa
na ekwu otutu okwu ebea.

Lotakwa nu na buni buni ibu anyi danda. anyi bido ugbua mebe ya, oge na adighi anya anyi ga emeputa ihe site na aha chineke.
Onye nwere nti ya nuru. mgbe obula otu onye mepere website maka ihi nsogbu anyi. si gbasakwa ozi ahu nke oma
otu oga esi eru otutu nime anyi na abia na nairaland nti.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 5:51pm On Dec 28, 2011
Okuko nti chiri na-anu ihe n'ite ofe.

Ndi awusa n'egbusi ndibe anyi, ndi Yoruba kporo anyi asi nke ukwuu,
gini kpatara anyi enweghi njiri chere onwe. ndi jew no na udi onodu anyia
mana ha gbara mbo chekwara onwe ha nke oma, nani anyi gbara nkiti.

Ka anyi hapukwa inwe ntukwasi obi na ebe ndi amerika,jew na ndi UN no.
maka na ha agaghikwa azoputa anyi ma oruo.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 6:03pm On Dec 28, 2011
Ka anyi hapukwa ige nti n'okwu ndi pastors tribe ozo,

makana oruo onwekwaghi nke ga-aputa. fancha ga alakpukwa
mechie uka ha n'ugwu awusa.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by MADEMANN: 6:05pm On Dec 28, 2011
WE CHRISTIANS ALL OVER NIGERIA , WE RESPECT GOD ALMIGHTY , OUR PROUDLY COUNTRY NIGERIAN, NIGERIANS , IGBOS AND THE WHOLE WORLD.
BUT NOW WE SAYS ENOUGH IS ENOUGH FOR THE COWA.RDLY  BLOOD SUCKER VAMPIRES WHO HAS BEEN BOMBARDING OUR COUNTRY EVERY DAY-  SLAUGHTERING  INNOCENT PEOPLE INDISCRIMINATELY LIKE FOWLS , BURNING CHURCHES, DESTROYING PROPERTIES.

GET READY FOR UNEXPECTED ACTION NOW - RATATA RATATA RATATAAAAAAAAAA,

ALMIGHTY GOD LEADS.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by EzeUche(m): 6:14pm On Dec 28, 2011
Nigeria bidogo da ba!

Onye ga edu anyi? undecided
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by chuksikem(m): 6:16pm On Dec 28, 2011
@9ja voice

atumatu gi bu ezigbo ihe, ,mana ndi be anyi kwuru na ukpana okpoko gburu bu nti chiri ya,

Kedu ihe ndi be anyi ka na-eme n'úgwu awusa?anya mmiri juru mu anya maka na ndi igbo bu ezigbo ewu, n'agbanyero ihe ndi ugwu meere ndi nna nna anyi mgbe aluru civil war, still ufodu ndi igbo ka na-eje alu ulo,industry n'ugwu awusa, o bu ihe ihere na i jee otutu obodo nála igbo, o di ka ebe umu azi na-egwu egwu maka na indigenes ndi igbo e burugo ego ha jee ugwu awusa,lagos na mba ndi ozo jee luo industry,ulo na ihe ndi ozor ebe ahu, na akwu tax to govt ndi mba ozo, ha ewere ya na-edozi obodo ndi ozo ma hapu ala anyi o na-emebi,

O ihe nwute na kemgbe afo ole aluru river niger, a lubeghiro anyi ozor, the only bridge leading into the southeast, mana anyi nwere mmadu, i hukwara ka enugu and imo airport di??na-aso oyi n''anyi.

eziokwu ndi nna anyi have failed us , mana ubochi ndi boko turu bomb n'ala nayi, anyi amarazie mbe n'abo nke ka

ekeeleeeeeeeeeeeee m gi
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 2mch(m): 6:17pm On Dec 28, 2011
blah blah blah blah, twa twa twa twa. *yawns* tongue. Na today internet gangsters start. smiley. Una kedu! Make una continue with the plans, quite brave. lipsrsealed
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by EzeUche(m): 6:25pm On Dec 28, 2011
Ebe ka anyi si ebe a ga eje?
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by Chyz2: 6:25pm On Dec 28, 2011
EzeUche:

Nigeria bidogo da ba!

Onye ga edu anyi? undecided

Someone was given the challenge.Although, we may not agree in the way a particular group amongst the Igbo is trying to claim hegemony of all of Igboland, that is irrelevant, and we should put our wait behind that man.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by EzeUche(m): 6:34pm On Dec 28, 2011
Chyz*:

Someone was given the challenge.Although, we may not agree in the way a particular group amongst the Igbo is trying to claim hegemony of all of Igboland, that is irrelevant, and we should put our wait behind that man.

We need a more seasoned leader. Preferably someone with a military background. I have nothing but respect for Ralph Uwaurike.

Let us continue this convo in Igbo. Gini ka i chere?
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 6:41pm On Dec 28, 2011
@chuksikem

okwu gi doro anya, mana ihe mebiri emebi bu mmadu ga edozi ya.

oburu na anyi etetakwa n'ura ugbua,oka bukwa gboo.
ka anyi hapuzie itaba onye obula uta kama,ka anyi chebe
ihe anyi ga eme nwee mmeri.

note: Ka anyi gbakoo aka dere ndi ohaneze okwukwo ozi,kowara ha ka obidi anyi.
mu onwe mu bi na china,odaputa na nga alota be anyi jebe ije di n'aya,nga eme ya.

mana okwesiri ka anyi gbakoo aka onu. nani chineke mara ihe oji kpokota anyi onu na nairaland.
Okakwa mma okuko mmadu inwu na-ama nkita m karia nkita m inwu na-ama okuko onye ozo.

Umu igbo chi abokwala nu, ka anyi bidokwanu ugbua chuba ewu ojii. ka anyi gbakookwanu aka
wepu aka enwe n'ofe anyi tupu oburu aka mmadu.

onwekwaghi aka ndi amerika nyere anyi mgbe gara aga rukwa ugbua,
ha ekwebeghikwa ka icc leba anya na genocide nke agha anyi na naija. ya mere ka anyi teta nura.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by udezue(m): 6:49pm On Dec 28, 2011
Okwu unu ncha kwu oto. Onodu anyi bu ivhe nwute. Ndi-Igbo ka na ezuzu ezuzu. O bu na I nwu anwu na ugwu Awusa a marala anyi aru?

Ralph Uwazuruike wu nwoke onye oma mana o nweghi k'anyi ga esi merie ndi ekwensu n'a nuso ndi be anyi ogu ma o wu na anyi e nweghi egbe na ike I nu ogu. Ka anyi gedebe ndi uko Chukwu nti.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 7:00pm On Dec 28, 2011
Oburu ndi ofe mmanu ka ihea mere, afenifare na opc agago ibido gbaba egbe onu.
mana odizikwa m ka nke anyi okazi njo n'ihi na onweghizi onye na ekwuziri anyi ma ncha.

ohaneze kwesiri ikowara anyi ihe ha neme mobu anyi ejiri aka anyi zoba onwe anyi.
Nehemaiah echeweghi ezra,amos na hezekaiah tupu omalite. ka anyi bu ndi nagbako na nairaland malitezienu.

obuzikwa ndi igbo ka-ana ekwu maka ha ihea. keduzi ebe obi nzogbu nzogbu enyi mba enyi anyi dizi.
ka anyi hapu ichewe na osiri ike na omume kama ka anyi malite fuba mmeri chere anyi n'iru.

Okwanu nwanne mmadu ka ana egbusisi ihea,obu mgbe anyiforo ofu anyi aluba ogu, ugbua ka anyi ga eme ihe anyi choro ime.
Onwekwa ndi kam mara biko kuziere anyi ihe anyi ga eme na otu anyi ga esi.mu onwe m di njikere na udi obula.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 7:13pm On Dec 28, 2011
Onwere website bu nke onye igbo nwe anyiga esi na ya were malite? oburu na onwere onye ma ya kowara anyi.
bikonu umu nnem itu aka na ite uta bu maka ndi ume ngwu. ndi di ike na emegwata ihe emere ha.

umunna okwa nu otua ka-anyisi were bido gbugwatawa ndi awusa na onicha.
oburukwa na anyi amalite ebea na otu obi, mgbe na adighi anya nsogbu ndi awusa aburu ihe akuko.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by HighChief4(m): 7:19pm On Dec 28, 2011
Ihe mbu anyi kwesiri ime bu igba mbo hu na Ndigbo nile bi na ugwu awusa lotachara ala Igbo, makana uda egba daa tata ndi ugwu ga akpara ha ncha aka wee gbukpoo ha, unu ga amatakwa amata na ofu ndu(life) onye Igbo kariri ndu ndi awusa mmadu puku(one thousand). Ozokwa bu na anyi kwesiri ibido zuba ndi MASSOB na udi nke ndi soja(soldier). Enwerem olile anya na Uwazuruike ga edu anyi nke oma. Umu Igbo biko murunu anya ka azu
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by 9javoice1(m): 7:29pm On Dec 28, 2011
mmadu obula atukwasikwala obi na ndi uko chukwu anyi ga asi anyi jebe ogu. okakwa mma na anyi jebere ogu
ndi uko chukwu ana egbozi anyi ogu, afubeghikwa mu ebe igba nkiti gboro ogu.

aga m etinye egole obula nwere ifuna ihea gara na-anya ya. okwa mmadu ka ana agwa.
nani osisi nuru na aga egbu ya kwuru. umu igbo kulienu "whoever is weak in time of trouble is weak indeed" says the bible.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by doofanc: 8:03pm On Dec 28, 2011
you guys penchant for talking too much also precludes your being able to obey simple instructions?

PROPER ENGLISH LANGUAGE ONLY
Please use standard, proper, and clear English at all times when publicly discussing topics on the Nairaland Forum.  If you must use other languages, create a special topic for that language in the culture section.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by Onlytruth(m): 8:36pm On Dec 28, 2011
@9ja voice

Okwu gi nile kwo oto.

Nnanne, nnukwu nsogbo diri ndigbo. Ihe n'ewute m rinne bu na umu okorobia Igbo huru ego n'anya karia ndu ha. embarassed
Ha aghotaghi na onye nwuru anwu adighi eri ego! undecided

Lee anya ofuma na ala Igbo, i ga ahu na umu okorobia nile kwesiri i buru egbe wee luo ogu nzoputa Ndigbo, bu ndi nto (kidnappers), na ato ndigbo ibe ha.  cry

Na agbanyeghi ihe ndi a, enwere m okwukwe na ogaghi adi anya, Ndigbo ga ebido ime ihe ibe ha na eme.  cool
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by EzeUche(m): 8:40pm On Dec 28, 2011
See how a certain group (ofe mmanu) gets worried when we Igbos start conversing in our mother tongue.   grin
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by odumchi: 11:20pm On Dec 28, 2011
Nda ndi ayi ga atukwasi obi? O wu PDP kowu APGA? Ihe odo wukwa, nda aga ayi wu Ndi Igbo ga emekota aka ka ayi tii onye onhu na oche ochichi? Ihe ikpazi mchoro iju iyi wu na nda ndi Anya ruru ali ga emepuru any iha? M choro Ava wo.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by ChinenyeN(m): 11:26pm On Dec 28, 2011
Oge erubeghi Igbo.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by odumchi: 11:29pm On Dec 28, 2011
ChinenyeN:

Oge erubeghi Igbo.

Maka ngen orubeghi? Nda mgbe o ga eru?
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by ChinenyeN(m): 11:46pm On Dec 28, 2011
odumchi:

Maka ngen orubeghi? Nda mgbe o ga eru?
Igbo na-ekwu si "mgbe o jiri tete wu ututu ya". Oge erubeghi.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by samuelkanu: 11:54pm On Dec 28, 2011
Igbo ndewo! Biko anyi kwesiri inwe nzuko mepe forum ohuu nke igbo. Anyi kwesiri ijere igbo ozi ma oburo ya, anyi na-egbu oge. Ugbua bu oge unity, anyi ga-esite na 2012, aha ohuu nwe agenda na committee osiso. Oge adighi. Biko anyi choro volunteers maka atumatu a. Anyi kwesiri idozi obodo anyi, na-enyekwara ndigbo anyi aka. Ka anyi maliteooo. Onye obula nwere mmasi,biko dee email gi ka anyi site ebe ahu na ezuko. Ka anyi na-emekwa ya na nzuzo maka ndi ga ere anyi. Ndewonu
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by nedu210(m): 1:24am On Dec 29, 2011
@9ja voice, Nwa nnaa okwu gi amaka, ikwulu okwu ka nwoke, gboo ihe ewu na ata ka nwa ofoigbo nwujuru ala nne ya nke oma.  Mana ihe munwa na ekwu bu nke mbu 1. kedu ka anyu bu ndigbo ka eji jikoo aka onu welu ofu obi mee ihe ka umunne. 2. Kedu nu ihe enwelu ike ime ka ndi be anyi no na ugwu lota ala igbo. Umu nnem biko nu atumatu obuna anyi na atu ka anyi mala na, nani ifunanya na ebe umu nne anyi no ka anyi ga eji meria ajo ihe obuna kwuchilu anyi uzo. Ndewo nu.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by chuksikem(m): 1:50pm On Dec 29, 2011
@nedu

okwu gi amaka, mana ka m gwa gi eziokwu, ihunanya n'etiti ndi igbo bu ihe na adighi chacha, o bu ihe nwute na ndigbo ahughi onwe ha n'anya, mana ebe anyi n'alu olu, obu onye igbo bu supervisor mu, mana o dighi ihe o na-eme ihu na onye igbo ibe ya gbagotere n'okwa, u need to see ihe ndi ofe mmanu na-emere ibe ha, ariri egbue mu.

concerning ndi ka no n'ugwu awusa, nke ahu gbasara ha, ha choo ha nooro ebe ahu ka ndi ugwu gbuchasia ha, ogbasaghim, igbo kwuru si na ukpana okpoko gburu bu nti chiri ya, ekene m gi
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by pslm23(f): 6:09pm On Dec 29, 2011
Forgive me for not responding in Igbo. It took me approximately 10mins or more to read each postings  grin. It was real hard understanding everything but the full meaning is quite understood and I just want to say that I think the time has come! We need to come together and say ENOUGH! but say it loud enough so people will know we are serious and that we've had it with the senseless killings and blatant disregard of Eastern and Southern lives.

Even though I live in the US, it will never change my beliefs or my strong sense of cultural preservation. I weep each day I read about another killing perpertrated by the North. We are not moving target practices for these cowards who see nothing wrong in killing people that did them no wrong.

A wind of change is coming in 2012 and it is blowing furiously!

I just got the news today that the rest of my family living in  Abuja are preparing to move back to Awka/Aba within the coming weeks.

With God on our side, who can be against us. We are a warrior tribe and we should never forget that!
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by Andrew3(m): 8:06pm On Dec 29, 2011
doofanc:

you guys penchant for talking too much also precludes your being able to obey simple instructions?

mbayeev mbaam ve bume dedoo grin grin grin grin grin grin They lugubriously refuse to abide by the rules angry angry angry angry
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by LogicMind: 2:20pm On Jan 04, 2012
Can an Igbo man trust a fellow Igbo man. The day we can wholeheartedly respond "yes" to this question is the day we will conquer.
To the impatient i say : Nwayo Nwayo k'eji aracha ofe di oku.
Onye amaro ebe mmiri bidoro maba ya agaghi ama mgbe ojiri kwusi. Anyi gbaragha omenani anyi tinye isi n'uka. Uka jide ihe nine mebie. Si anyi
Abola obo, Anyi kwere.
Anula ogu. Anyi kwere.
Indi nnanna anyi amaghi ihe. Anyi kwere.
Hapu omenala. Anyi kwere (gini mere gi igbo ma obughi omenala?)
Anyi were ego anyi g'eji dozie obodo anyi achigara ukochukwu. Ukochukwu achigara Rome. Rome ewere dozie obodo ha.
Ewepu uka, Igbo agaghi ekwe k'ihe n'eme anyi ugbua mee anyi.

So it's either we go back to our roots and reconstruct or we continue acting like the religion brainwashed people that we are.
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by ezeagu(m): 3:29pm On Jan 04, 2012
odumchi:

Maka ngen orubeghi? Nda mgbe o ga eru?

Ọ wu ugbua wụrụ mgbe ndi Igbo juchara na ugwu awusa, naa kpa ngwonwo ahia ha, wụ mgbe ndi Igbo gi make-ise moves?
Re: Igbo's Start Planning/Actions And Stop Talking Too Much by odumchi: 3:19am On Jan 05, 2012
ezeagu:

Ọ wu ugbua wụrụ mgbe ndi Igbo juchara na ugwu awusa, naa kpa ngwonwo ahia ha, wụ mgbe ndi Igbo gi make-ise moves?

Ndakwan mgbe ay ga eme ukporo? O mgbe ndi nile bichagba na ugwu Awusa losara tam anyi asi ndi ive na guma "anyi choro ido ochichi?"

Mo ihe mu n'ekwu wu na ay bido osiso jikerewe. A na si "mgbe e mere, mgbe e mere" ay ga eme ihe a agafere ay aka. Abu odo amana abu ana wuru "2019, 2019". Igbo si na onye tesara osiso na aranhukwa osiso.

(1) (Reply)

Pics From My Trip To Ethiopia / The Most Common Names In Nigerian Tribes / Beautiful Pictures Of Nigerian Traditional Wedding Attires For Brides And Grooms

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 50
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.