Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,834 members, 7,810,208 topics. Date: Friday, 26 April 2024 at 11:55 PM

Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha (551 Views)

Akuko Ifo maka agha IDU NA OBA ... / Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha by IzunnaOkafor(m): 6:41am On Jul 26, 2018
Izunna Okafor dere akụkọ a


Dịka oge udummiri binwurugoro ọkụ ugbu a, ụmụafọ Ebenatọ, dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ akpọkuola gọọmenti n'ogo dị iche iche ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi oke mbize ahụ na-ebi obodo ahụ aka ọjọọ kemgbe ahọ kwuru ahọ ahọ, ma bụrụkwa nke a maara dịka Ibo Ebenator.
Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ ọkammụta Anthony Okechukwu kpọrọ oku a ụnyaahụ n'ajụjụ ọnụ a gbara ya banyere ajọ ọnọdụ mbize ahụ na otu o si agbasawanye n'ihi oke mmiri ozuzo ahụ kwọsịrị nso nso a.
Ọkammụta Okechukwu, kọwara ọnọdụ mbize ahụ dịka nke na-akawanye njọ kwa ụbọchị, ọ kachasị n'oge udummiri a a nọ n'ime ya, nke mezịrị na ụbọchị ọbụla mmiri zobere, ndị obodo ahụ achịrị uche n'aka maka na mbize ahụ ebibiela ma gakwa n'ihu na-ebibi ọtụtụ ihe dị iche iche. Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe mbize ahụ bibigoro, nke gụnyere ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ bi na mpaghara ahụ, ama egwuregwu ụlọ akwụkwọ "Central School" (nke mezịrị ka ụmụakwụkwọ na-agụ ebe ahụ nọrọ n'ajọ ọnọdụ na-atakasị anya), okporo ụzọ na àkwà dị iche iche, ọtụtụ osisi bara uru, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ya bụ nwa amadi, bụ onye mere ncheta ụbọchị ọmụmụ ya ụbọchị Nwenezidee kpọkuzịrị ma rịọ gọọmenti n'ogo dị iche iche nakwa ndị nnọchi anya obodo ahụ n'ọgbọ nta nkwaṅàdo dị iche iche ka ha doo doo doo gbatara ha ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ n'ihi na ya bụ ajọ ọnọdụ akarịala ha ma na-eyizịkwa ha egwu nke ukwuu.

1 Like

Re: Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha by Orubebe01: 6:48am On Jul 26, 2018
I bu ezigbo nwa afo.

(1) (Reply)

One Oba One Wife! Some Traditions Belong To The Dark Ages - Oba Adewunmi Fasiku / Scissors Sentence In Urhobo (irhieta R'utujere Evun Urhobo) / A Brief Profile Of The Igbo People Of Jamaica You Need To Know

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 9
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.