Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,194,246 members, 7,953,925 topics. Date: Friday, 20 September 2024 at 09:02 AM

Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 (452 Views)

Akuko Ifo maka agha IDU NA OBA ... / Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 by IzunnaOkafor(m): 4:00pm On Jan 10, 2020
Si n'aka Izunna Okafor



Ndị obodo Akwaihedị dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra egùzobela ma gosi ọhanaeze ọmarịcha ụmụ agbọghọ atọ tuuru ugo n'asọmpi mma a chịkọbara na nso-nso a, maka ụmụ agbọghọ obodo ahụ, bụkwa ndị ọhụụ e kpùbèrè okpu dịka ụmụada obodo ahụ maka ahọ 2020, site n'asọmpi nwaada kacha maa mma n'obodo ahụ, nke nwa bekee kpọrọ "Miss Akwaihedị Beauty Pageantary."

N'okwu ya bànyere mmemme ahụ, onyeisi oche òtù ọrụ haziri ya, bụ Maazị Elochukwu Paul Mbagwụ kọwàrà na ebumnobi nke ahụ bụ iji kpọkplọta ụmụafọ obodo ahụ ọnụ, ọ kachasị ndị ntorobịa, ịzụlite ha ka ha bụrụ ezi ndị ndu, ịkwàlite mmepe obodo, ịkwalite omenala na ọnatarachi ndị Igbo, ya na mmekọrịta mmadụ na ibè ya.

N'okwu ọ gwàrà Ka Ọ Dị Taa, onye tuuru ùgò dịka ọká ibè n'asọmpi ahụ, ma bụrụkwa onye e kpùbèrè okpu dịka Nwaada Akwaihedị 2020, bụ nwaada Angela Chinwendụ Udunwa kwùrù na ọ bụ site n'ịgba mbọ ya na amara Chineke ka o jiri nweta mmeri ahụ, sịkwazie na ọ ga-eji ọkwa ọhụrụ ya ahụ wee rụọ ọrụ obi ebere na ọrụ imepùrù mmadụ,
ma bàgidekwa n'atụmatụ ịkụzuri ụmụagbọghọ bànyéré ihe égwù na ọghọm dị iche iche dị na mmadụ elekọtaghị nsọ ya anya nke ọma dịka nwaanyị.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onye gbara onye nke abụọ n'asọmpi ahụ, ma bụrụkwa onye tuuru ùgò dịka Ihu Omenala Akwaihedi, bụ nwaada Peace Uche Orizu kwùrù na ya ga-eji ọkwa ahụ tụpụta, bàgide ma sonyekwa n'atụmatụ ọrụ dị iche iche ga-enye aka n'ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo, ọ kachasị n'ebe ndị ntorobịa nọ; ebe ògbò gbárá onye nke atọ ma bụrụkwa onye tuuru ùgò dịka Ihu Njèm Nlegharị Anya Akwaihedi, bụ nwaada Veronica Chichi Okoli kwère nkwà iji ọkwa ọhụụ ya ahụ wee kwàlite njem nlegharị anya n'Awkaihedị, Àkụ Ruo Ụlọ, nakwa mmepe obodo ahụ n'izugbe.

Ka ha na-ekwe nkwà ịga n'ihu n'ijigidesi ùgwù ahụ dịịrị ha, obodo, ha na ọkwa ahụ ha jì ike; ọmarịcha ụmụagbọghọ atọ a tòrò Chineke nna, bụ onye ha kọwara na ọ bụ naanị ya na-enye mmeri, ma kelekwazie Ndị Akwaihedị, ndị chịkọbàrà na ndị kwadoro ya bụ ihe mmemme, tinyere ndị soro wee sọọ ya bụ mpì nakwa ndị ọzọ tụnyere ụtụ n'otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ mmemme gàrà sam sam.

Ka ha na-akọwapụta na ha na-akpa nkàtà ịkwalitewu na ịgbasawanyekwu ihe mmemme ahụ n'ọdịnihu; ụfọdụ ndị soro mee ka ọ gaa nke ọma, bụ Maazị Thankgod Udogu na Maazị Christian Egwuiyi kọwàra na mmemme ahụ etòóla o jiri màlite n'obodo ahụ; kama na e nwòghàrịrị ma webàtasịa ụfọdụ ihe ọhụụ na ya, bụkwazị nke mere ka ọ nọrọ n'ogoogo dị elu, kawanye mma, ma bụrụkwazie eji ama àtụ.

Re: Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 by Snipper007: 4:11pm On Jan 10, 2020
Umu oma wink
Re: Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 by chimezieeze98: 8:01am On Jan 15, 2020

(1) (Reply)

Obi Of Onitsha, His Royal Majesty Nnaemeka Achebe Clocks 79 Years / What Are The Things You Know About Yoruba People? / Who Can Name The Chiefs Title Of Onitcha, Uhobo, Isoko, Itshekiri, Agbor

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 10
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.