Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,502 members, 7,819,822 topics. Date: Tuesday, 07 May 2024 at 01:10 AM

GỌGAN Akpọkuo Ụmụ Nigeria Ka Ha Kwàdo Buharị Nke Ugboro Abụọ - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / GỌGAN Akpọkuo Ụmụ Nigeria Ka Ha Kwàdo Buharị Nke Ugboro Abụọ (345 Views)

Mme Nke Annang- Akut Owo Annang Akut Owo Uko! / What Is The Meaning Of Ka In Kabiesi / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

GỌGAN Akpọkuo Ụmụ Nigeria Ka Ha Kwàdo Buharị Nke Ugboro Abụọ by IzunnaOkafor(m): 4:56pm On Dec 11, 2018
Izunna Okafor Dere Akụkọ A

Òtù a kpọrọ "Good Governance Ambassadors of Nigeria" (GOGAN), bụ òtù nnọrọ onwe akpọkuola ụmụafọ Nigeria ka ha kwàdo onyeisi ala, bụ Maazị Muhammadụ Buharị maka ọchịchị ya nke ugbòrò abụọ.
Onyeisi ndị otu a na steeti Anambra bụ Maazị Johnbosco Ọnụnkwọ kpọrọ oku a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị otu ahụ karịrị puku abụọ n'ọnụ ọgụgụ nuputara n'igwè wee mee ngagharị iji gosìpụta nkwàdo ha nye onyeisi ala Buharị, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee malite nhazi achụm nta nkwàdo a kpọrọ 'Buhari Unity Band'. Ọ kọwara Buharị dịka nwoke maara nke ekwe na-akụ n'ihe gbasaara ọchịchị obodo, kwuo na o wulitela ọnọdụ mmepe ala anyị n'ụzọ pụtara ihe, kwàlite ọnọdụ akụnụba ala anyị, ma mepùtela ọtụtụ ihe a hụrụ anya n'ala n'ime ihe erubeghị ahọ anọ o jiri bànye n'ọkwa ọchịchị.
Maazị Ọnụnkwọ mere ka a mara na ala Nigeria nọ n'ajọ ọnọdụ tupuu ọchịchị Buharị wee bàta n'ọgbọ, mana ugbu a, ya bụ onyeisiala egosila n'ezie na ọ bụ ọka ibè n'ịhe gbasaara ịchị ezi ọchịchị na ịhazi ọnọdụ akụnụba. Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche nke ọchịchị Buharị meputagoro n'ime ahọ atọ n'ọkàrà, nke gụnyere: ibu agha megide mpụ na aghụghọ, ibu agha megide ọnọdụ enweghị ezi nchekwa, inye steeti dị iche iche ego he ga-eji kwụchàpụ ụgwọ ha ji ndị ọrụ ha, ịrụ àkwà mmiri Naịja nke abụọ, inye ntụzi aka ka e kpochaa ala Ogoni, inye ụmụakwụkwọ nri n'ụlọ akwụkwọ praịma kwa ụbọchị, iwepùta na ịkwàdò amụmà N-Power, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o meputagoro.
Ọ sị na ebumnobi njèm nkwàdo ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ mara na o kwèsiri ka a kwàdo ọchịchị Buharị nke ugboro abụọ maka ihe ndị ahụ o mepùtagòrò; wee kpọkukwazie ụmụafọ Nigeria na ụmụ Igbo nọ n'ebe dị iche iche ka onye ọbụla kwàdo ya bụ ọchịchị nọ ugbu a n'ala anyị ka o wee rụrụ ọrụ ọma ya gaa n'ihu, maka na ụzọ dị mma, a gaa ya ugboro abụọ.
N'ajụjụ ọnụ a gbara ya, otu onye n'ime ndị soro wee bịa ya bụ njèm nkwàdo, ma bụrụkwa onye selitere isi n'òtù GOGAN, bụ maazị Paul Iwuchukwu kọwara ya bụ atụmatụ dịka nke magburu onwe ya, n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị Buharị meputagòrò n'ime ahọ atọ na ọkara ọ nọgoro, ma sị na ya bụ njem nkwàdo ga-enye aka ịkọwara ndị mmadụ ụfọdụ ihe ndị ahụ, ka ha wee kwụsị igè àsịrị dị iche iche ụfọdụ ndị mmadụ na-akụgbarị, ma mara na ya bụ onyeisi ala Buharị rụrụ ọrụ nke ọma n'ezie ma kwesikwa ka a kwàdo ya n'ozuzu òkè ka o wee chịa nke ugboro abụọ.

(1) (Reply)

Learning Korean Character(hangeul) And Language / Alaafinofoyo Arrived The Ground Of Ojude Ode Oba 2019 Video / Why Are People Just Shouting Mad, Lunatic, Mental, Psychia, Craze Everywhere?

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 10
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.