Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,155,824 members, 7,828,010 topics. Date: Tuesday, 14 May 2024 at 09:21 PM

Ezeobi Enwetala Nkwàdo Ndị Eze Ọdịnala Maka Nhọpụta Na-abịa Abịa - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ezeobi Enwetala Nkwàdo Ndị Eze Ọdịnala Maka Nhọpụta Na-abịa Abịa (325 Views)

Akuko Ifo maka agha IDU NA OBA ... / Native Doctor Commits Suicide In Front Of Shrine In Abịa / Corpse Of Igwe Henry Ekwueme, Eze Ndi Igbo In China Packaged; To Be Flown To Nig (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ezeobi Enwetala Nkwàdo Ndị Eze Ọdịnala Maka Nhọpụta Na-abịa Abịa by IzunnaOkafor(m): 12:28am On Jan 29, 2019
BestNaija BESTNAIJA
β522 User Photo ▼ � 6 Good night, Izunna Okafor. It's January 29th, 2019, 12:26 am. Inbox35
Go to:


Bestnaija ‹ General ‹ General Talks ‹ Ezeobi Enwetala Nkwàdo Ndị Eze Ọdịnala Maka Nhọpụta Na-Abịa Abịa
Ezeobi Enwetala Nkwàdo Ndị Eze Ọdịnala Maka Nhọpụta Na-Abịa Abịa - Bestnaija

Like Comments (0) Unfollow (4 views)

User Photo
#1 » by Izunna Okafor (β522) » 2 minutes ago

Izunna Okafor Dere Akụkọ A

Nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) apụta ịzọ ọkwa nnọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Nnewi South nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ maazị Paul Ụzọchukwu Ezeobi enwetala nkwàdo ndị eze ọdịnala ụfọdụ obodo dị iche iche mejùputara ya bụ ọgbọ nta nkwàdo.

Nke a bụ nke e mere ka ọ pụta ìhè na mkpọtụrụ nwa amadi ahụ kpọtụụrụ ndị eze ọdịnala ahụ, n'otu n'otu, iji mee ka ha mara ebumnobi ya, ma rịọkwa nkwàdo, ekpere na ngọzị ha dịka ọ na-abàgide na ya bụ ndọrọ-ndọrọ.

N'okwu ya dịka ya na ndị igwe ahụ na-akparịta n'ótù n'ótù, maazị Ezeobi kọwara na ebumnobi ya n'ịga nọchite anya ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ bụ iji wee wèta mgbanwe pụtara ìhè, zọta ma kesaara ndị ahụ òkè ruuru ha na uru dị iche iche dịịrị ha n'okpuru ọchịchị onye kwuo uche ya, bụ nke ha amaghị otu e si erisà ma na-ememìla kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, dọta mmepe ma nyekwa ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị nkwàdo kwesiri ha.

Ọ kwara arịrị banyere otu ihe esighị agacha otu o kwèsìrì n'ọgbọ nta nkwàdo ahụ, tinyere ọnọdụ nhịa ahụ dị iche iche ndị mmadụ na-agabìga na mpaghara ahụ n'ihi anọchiteghị anya ha n'ụzọ kwesiri ekwesi; ma rịọkwazie nkwàdo ndị eze ahụ na ndị ha na-achị, iji nweta ntúrú ùgò na ya bụ ịtụ akwụkwọ ga-ewere ọnọdụ mgbe adịghị anya.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu, eze ọdịnala obodo Ebenatọr, bụ Igwe Chinaewubeze Ezejibùrù na ògbò ya nke Ezinifite, bụ Igwe S.A.C. Obika tòrò maazị Ezeobi maka ịhụta mkpa ọ dị ịbịa kpọtụrụ ha, nke na-egosi na ọ bụ onye anya ruru ala na onye apụghị ịgbakụta ndị mmadụ na ndụmọdụ ha azụ n'ihe dị iche iche ọ na-abàgide.

Ha kọwara ya dịka nwaokorobịa zuru òkè n'ume na ọgụgụ isi ma nwekwa ihe ọ ga-ewe iji nye ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ ezi nnọchi anya a tụbara anya ya kemgbe ọtụtụ ahọ, ma kwupùtakwa nkwàdo ha nye ya n'ozuzu òkè, gọzie ma kpekwara ya ekpere na ya bụ ije ọ na-abàgide.

N'okwu dịkwa ka ibè ya, maazị Paul Ezeobi gakwara kpọtụrụ ndị ógbè Akala dị n'Ezinifite n'okpuru ọchịchị Nnewi South, bụ ebe ọ nọrọ wee kpọpụtasịa ma mee ka o doo anya, ihe dị iche iche ọ na-ezùbe imere ndị ọgbọ ntá nkwàdo ahụ ma o turu ùgò, nke gụnyere ịdọta ọrụ okporo ụzọ dịgasị iche iche, ịzụ na ịkwàdo ọtụtụ ndị ntorobịa n'ọrụ aka dị iche iche, ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụ ike, tinyere ihe ndị ọzọ ọ kpọpụtasịrị bụ mkpa ndị mpaghara ahụ na-agabìgasị, dịka nnyòcha o mèrè siri dị.

(1) (Reply)

How Do Caribbeans Help African Countries / Late Olowo A Colossus In Law, Peace Advocacy Says Gov. Akeredolu. / Ghana Music Awards Ends In Chaos As Shatta Wale Storms Stage

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.