Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,158,110 members, 7,835,748 topics. Date: Tuesday, 21 May 2024 at 02:19 PM

Ka M Lewe Ụwa M - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Ka M Lewe Ụwa M (465 Views)

Amb. Oji Ngofa Takes Message Of Hope To The Ancient Lewe And K-dere Community / Shege-Ka-Fasa: Northern Nigeria Security Outfit Launched (Photos) / Northern Groups Back Amotekun, Demand ‘Operation Shege Ka Fasa’ (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 8:52am On Sep 29, 2019
KA M LEWE ỤWA M

Achụọla m ọkpara
Chụọ igurube
E gwuola m mmiri ukwu
Gwuokwa nke nta
Sọsọ ka m hụ na m pụrụ ndụ

Leenụ ndị mụ na ha so bido njem
Ha agaruola kemgbe zuwe ike
'Ebe onye ọsọ rụrụ onye ije ga-eru ya'
Bụ sọ nkasị obi m na-enye onwe m
Mana kedụ mgbe oge nke m ga-eru?

Chịma akpụọla ụlọ
Emeka na-akwazi ezigbo ụgbọala
Ọkwa Chike akpọrọla nwanyị mee ihe isi ya
Ọgbọ m abachaala uru
Kedụ onye ọfọrọ ma ọ bụghị m?

Anwaala m oke m
Mana onweghi ụzọ kwere ọgịga
Ọgwụla sọ otu oghere ka m nwere
Ịka obi tinye aka n'ihe ọjọọ
Ma otu obi agaghị ekwe m

M were ọbara gwọta ego
Kedụ onye ga-eri ya bụ ego?
M were apata m chụta ego
Ọ bụ ihe ọma ka m meere onwe m?
Chai!!! Ụwa m ntọọọ!!!

Agaghị m akwụsị ịgba mbọ
M lewe ndị ọzọ anya, m danye n'olulu
Ụkwa ruo oge ya ọdaa
Ka m ghara ịṅụ ngwo na nkwu na-abịa
Ugo m gbuzuo, ọ ga-achakeriri

Ụwa a bụ onye na nke ya.

Odee:
Ugochukwu Benedict Alugwe
Satọdee, Sepụtemba 28, 2019. 6:05pm.

1 Like

Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:06am On Sep 29, 2019
Ndewo, igbaliri nke ukwuu. Ndi Igbo n' atu ilu si n' oge chineke ka mma. Biko chere oge nke gi.

1 Like

Re: Ka M Lewe Ụwa M by gidgiddy: 9:15am On Sep 29, 2019
stansaintly:
KA M LEWE ỤWA M

Achụọla m ọkpara
Chụọ igurube
E gwuola m mmiri ukwu
Gwuokwa nke nta
Sọsọ ka m hụ na m pụrụ ndụ

Leenụ ndị mụ na ha so bido njem
Ha agaruola kemgbe zuwe ike
'Ebe onye ọsọ rụrụ onye ije ga-eru ya'
Bụ sọ nkasị obi m na-enye onwe m
Mana kedụ mgbe oge nke m ga-eru?

Chịma akpụọla ụlọ
Emeka na-akwazi ezigbo ụgbọala
Ọkwa Chike akpọrọla nwanyị mee ihe isi ya
Ọgbọ m abachaala uru
Kedụ onye ọfọrọ ma ọ bụghị m?

Anwaala m oke m
Mana onweghi ụzọ kwere ọgịga
Ọgwụla sọ otu oghere ka m nwere
Ịka obi tinye aka n'ihe ọjọọ
Ma otu obi agaghị ekwe m

M were ọbara gwọta ego
Kedụ onye ga-eri ya bụ ego?
M were apata m chụta ego
Ọ bụ ihe ọma ka m meere onwe m?
Chai!!! Ụwa m ntọọọ!!!

Agaghị m akwụsị ịgba mbọ
M lewe ndị ọzọ anya, m danye n'olulu
Ụkwa ruo oge ya ọdaa
Ka m ghara ịṅụ ngwo na nkwu na-abịa
Ugo m gbuzuo, ọ ga-achakeriri

Ụwa a bụ onye na nke ya.

Odee:
Ugochukwu Benedict Alugwe
Satọdee, Sepụtemba 28, 2019. 6:05pm.

Okwu nkasi obi grin grin

1 Like 1 Share

Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:36am On Sep 29, 2019
Ndị chọọ i le ọgwụ na malay mor na southy, ka fa kpata ego ọsịsọ, bia ka unu gụọ ifa.
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:41am On Sep 29, 2019
Ardar:
Ndị chọọ i le ọgwụ na malay mor na southy, ka fa kpata ego ọsịsọ, bia ka unu gu ifa.
nwannw m, ana m akwadobe ibanye Indonesia, mana Ihe a m guru ugbu a akasachala m obi.
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:47am On Sep 29, 2019
Frankdoz5:
nwannw m, ana m akwadobe ibanye Indonesia, mana Ihe a m guru ugbu a akasachala m obi.

Agala ebe ahụ ịre ọgwụ o
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:47am On Sep 29, 2019
Biko umunne m on were ihe m choro iju unu. O nwere onye choro I banye obodo Tunisia nke di na mgbago ugwu Africa? O nwere onye nwere contact obodo ahu?
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:52am On Sep 29, 2019
Ardar:


E je kwa na ebe áhu je gbụ ọgwụ o
tufiakwaaaa! Chineke napu ekwensu Ike. Onyisi ala ndi Indonesia bu jaja widodo bu ekwensu ana ahu anya, o naghi emere ndi buru ogu ebere. Biko ana m eje ebe ahu I ga gu akwukwo dokinta.
Re: Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 9:55am On Sep 29, 2019
Frankdoz5:
Biko umunne m on were ihe m choro iju unu. O nwere onye choro I banye obodo Tunisia nke di na mgbago ugwu Africa? O nwere onye nwere contact obodo ahu?

Ọ bụrụ na-onweghi onye inwere ebeaghu biko tụgharikwa uche nko oma tupu i hapu nsọụkwụ.

Ndigbo tụrụ ilu si "ike nkwụcha abughị nwoke ụjọ
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:56am On Sep 29, 2019
Frankdoz5:
tufiakwaaaa! Chineke napu ekwensu Ike. Onyisi ala ndi Indonesia bu jaja widodo by ekwensu ana ahu anya, o naghi emere ndi buru ogu ebere. Biko ana m eje ebe ahu I ga gu akwukwo dokinta.

Ọ dị mma
Re: Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 10:06am On Sep 29, 2019
Ardar:


Ọ dị mma

Ada bekee, ya gaziere gi. Igbo kwuru okwu si "n'okenye anaghị anọ n'ulo ewu anwua n'ogbiri"

Frank, ị ga achọta ihe ị chọ maka na ebe nwata n'ebe akwa arụ aka, ọbụrụ na nne ya anọghị ya nna ya ga anọriri ya
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 10:11am On Sep 29, 2019
stansaintly:


Ada bekee, ya gaziere gi. Igbo kwuru okwu si "n'okenye anaghị anọ n'ulo ewu anwua n'ogbiri"

Frank, ị ga achọta ihe ị chọ maka na ebe nwata n'ebe akwa arụ aka, ọbụrụ na nne ya anọghị ya nna ya ga anọriri ya
iseeeee! O ga adikwuru unu nile mma o.
Re: Ka M Lewe Ụwa M by mcbreeze: 10:40am On Sep 29, 2019
Nwanne jisie ike. O ga adiri gi na mma.

(1) (Reply)

59 National Inspiring Quotes – Happy 59th Independence Day Nigeria / Independent Day Celebration In One LGA In Akwa Ibom In Pics / Minimum Wage: Labour Threatens Nationwide Strike From October 16

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 17
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.