Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,953 members, 7,817,795 topics. Date: Saturday, 04 May 2024 at 07:53 PM

K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha (12824 Views)

Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) / Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha / A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 9:38am On Oct 12, 2016
Na mbụ anyị chetara na mgbe anyị bụ ụmụaka, na agwụgwa bụ ihe anyị ji egwu egwu. Ugbu a, m gaghị echeta ikpeazụ m nụrụ ka mmadụ kwuru, “Gwam Gwam Gwam”, ọzọ. O bụrụla ihe mgbe ochie ndị ugbu a amaghịzị maka ya. Ya mere n’Odeniigbo ga-akpọtekwa ya n’ụra.
Agwụgwa dịbara gbooo, ọ dị kemgbe mmadụ bidoro kọba akụkọ ifo. O nweghị omenala màọbụ ndị nọ n’ụwa a na-enweghị nke ha. Ma ndị ọcha ma ndị isi ojii. Ha nile nwere agwụgwa. Ọ na-adị n’ụdị ajụjụ ajụrụ mmadụ, ọ ga-agbagwoju anya tupu azata ya. Ọ na-eme ka mmadụ chebaa echiche nke ọma makana ajụjụ ahụ gbasaara ihe gbara mmadụ òkìrìkiri. Nwatakịrị na-azata agwụgwa nke ọma, na-enwe amamihe, na-echemi echiche ime.

Ọ na-abụkwa ihe eji egwuri egwu, ụmụaka na-eji ya ama aka. Onye jụọ ibe, ibe ya ajụkwa ya. A na-emegide nke a ganye na-amara onye ike ga-agwụ site na-ịda ya màọbụ ichefu ihe ọzọ o ga-ajụ. Nke a na-eme ụbụrụ mmadụ a na-ahọ nkọ ka agụba. Onye a na-ajụ na-eche echiche maka azịza nke ajụrụ ya, ma na-echekwa maka nke ọ ga-ajụ.

Taata m ga-ewepụta agwụgwa iri nke ndị Igbo, m jụọ ha ịmara na-ịga azanwu ha. Azịza ha ga-abịa na ngwụsị ederede a. Mba mba, m gaghị aza ha, onye mara ha ya za. 
1. Gwam gwam gwam ozu liri onwe ya?

2. Gwam gwam gwam ihe bụ nke gị, ma mmadụ nile kara gị nwere ya?

3. Gwam gwam gwam nwa mara mma anaghị eku n’ahụ?

4. Gwam gwam gwam nkụ dị na mba na-eyere mba nri?

5. Gwam gwam gwam anụ dị gị n’ọnụ anaghị ata ata?

6. Gwam gwam gwam nwa so gị were baa ọhịa ma o soghị gị pụta?

7. Gwam gwam gwam okoro chị ụta na-agba ezighị ezi?

8. Gwam gwam gwam nwoke ọcha a na-ama ụra n’ahịa?

9. Gwam gwam gwam ihe na-eji ụkwụ anọ aga n’ụtụtụ, abụọ n’ehihie, atọ n’abalị?

10. Gwam gwam gwam okoro na-echere gị aka mgba n’ihu be gị?

Ọ bụrụ na isi na-aghọ gị nkọ zaa ha ka anyị mara. Ihe nile anyị na-ede ka anyị kaba ahu na-eji Igbo Izugbe.

www.odeniigbo.com ebe asụsụ Igbo na-akpọtụ!!!

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by Young03(m): 9:48am On Oct 12, 2016
if I bite tongue say I de read this

I won't forgive u
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by shuggah(m): 10:22am On Oct 12, 2016
ya kpotu ba... igbo amaka

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 10:25am On Oct 12, 2016
Young03:
if I bite tongue say I de read this


I won't forgive u

Lolzzz if you are Igbo person, practice makes perfect. If not an Igbo, I no fit help the situation oooh
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 10:26am On Oct 12, 2016
shuggah:
ya kpotu ba... igbo amaka

ka i kwuru ka o di.
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by BossLadyF(f): 10:37am On Oct 12, 2016
Oh Gawd! Please I need interpretation oh
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 10:58am On Oct 12, 2016
BossLadyF:
Oh Gawd! Please I need interpretation oh

Before weekend might start posting tutorials in education section.

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by soonest(f): 9:10am On Oct 22, 2016
Myklangelo, isi na Anu m oku.
Aziza m:

3. Onwa

5. Ire

6. Nsi

8. Akpu (utara)

9. Mmadu
Ukwu ano mgbe o kabu nwa na-egbe igbe
Ukwu abuo mgbe o bidoro gawa ije
Ukwu ato mgbe o jizi mkpo aga na agadi

10. Potopoto (Akpiti).

Chai! Echefuchagom agwugwa ndia. Mmadu a kago. Biko lele ya gwam Ole m nwetara.
Igbo bu igbo, ekele kwam unu.
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 9:29am On Oct 22, 2016
soonest:
Myklangelo, isi na Anu m oku.
Aziza m:

3. Onwa

5. Ire

6. Nsi

8. Akpu (utara)

9. Mmadu
Ukwu ano mgbe o kabu nwa na-egbe igbe
Ukwu abuo mgbe o bidoro gawa ije
Ukwu ato mgbe o jizi mkpo aga na agadi

10. Potopoto (Akpiti).

Chai! Echefuchagom agwugwa ndia. Mmadu a kago. Biko lele ya gwam Ole m nwetara.
Igbo bu igbo, ekele kwam unu.


Lol, Nne isi di gi nko! I nwetere ndi I zara beeluso nke ato. Aziza ya bu: oku!

Daalu

2 Likes

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by AjaanaOka(m): 3:44pm On Oct 22, 2016
Ka m nwaa.

1. Aso/Onu mmiri

2. Aha gi.

4. Asusu

7. Akpi.
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 8:09pm On Oct 22, 2016
AjaanaOka:
Ka m nwaa.

1. Aso/Onu mmiri

2. Aha gi.

4. Asusu

7. Akpi.

Onye nna ka i bu! Iji ha.
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by soonest(f): 8:18pm On Oct 22, 2016
1. Gwam gwam gwam ihe kuru aka baa ohia

2. Gwam gwam gwam oti nwata ihe n'ihu nne ya

3. Gwam gwam gwam Ihe kuru mmiri laa elu

4. Gwam gwam gwam ihe were nsi ewu ria elu

5. Gwam gwam gwam Ibe ji zuru oha onu

Ngwa, myklangelo puta n'ogbo
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by Nobody: 5:27am On Oct 23, 2016
soonest:
1. Gwam gwam gwam ihe kuru aka baa ohia

2. Gwam gwam gwam oti nwata ihe n'ihu nne ya

3. Gwam gwam gwam Ihe kuru mmiri laa elu

4. Gwam gwam gwam ihe were nsi ewu ria elu

5. Gwam gwam gwam Ibe ji zuru oha onu

Ngwa, myklangelo puta n'ogbo
ka mu onye mu nwa nke gi.

1. Ukpaka

2. Aki bekee

3. Aguu

4. Pawpaw

5. Nkea Tara akpu ri nne,ka mu nye onye ozo ohere ka o za nya. grin

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by Nobody: 5:35am On Oct 23, 2016
Gwam gwam gwam

1. Gwam duu gwam yoo?

2. Gwam ihe chiri eze racha ntu?

3. Gwam ihe anuru ka odara ma anughi ka
Egburu ya?

3. Gwam nwa agbaho ara ano?

4. Gwam ife no n'azu uno nne gi na agbo gi Taa?
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by myklangelo(m): 8:22am On Oct 23, 2016
soonest:
1. Gwam gwam gwam ihe kuru aka baa ohia

2. Gwam gwam gwam oti nwata ihe n'ihu nne ya

3. Gwam gwam gwam Ihe kuru mmiri laa elu

4. Gwam gwam gwam ihe were nsi ewu ria elu

5. Gwam gwam gwam Ibe ji zuru oha onu

Ngwa, myklangelo puta n'ogbo

Hahaha i gbaniri nke oma, Herringbone zara nke oma.
Ibe ji zuru uwa onu bu ONWA.
Kedu ihe nrite m?

2 Likes

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by soonest(f): 11:46am On Oct 23, 2016
herringbone:
Gwam gwam gwam

1. Gwam duu gwam yoo?

2. Gwam ihe chiri eze racha ntu?

3. Gwam ihe anuru ka odara ma anughi ka
Egburu ya?

3. Gwam nwa agbaho ara ano?

4. Gwam ife no n'azu uno nne gi na agbo gi Taa?

1. Isi akwu na igu ya

2. Ube

3. Egbe eluigwe
Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by soonest(f): 11:48am On Oct 23, 2016
herringbone:
ka mu onye mu nwa nke gi.

1. Ukpaka

2. Aki bekee

3. Aguu

4. Pawpaw

5. Nkea Tara akpu ri nne,ka mu nye onye ozo ohere ka o za nya. grin


O bu nna gi muru gi.

myklangelo:

Hahaha i gbaniri nke oma, Herringbone zara nke oma.
Ibe ji zuru uwa onu bu ONWA.
Kedu ihe nrite m?

Nna I mana o gi bu Okammuta anyi nwere ebea. Daluu

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by Nobody: 5:07pm On Oct 23, 2016
soonest:


1. Isi akwu na igu ya

2. Ube

3. Egbe eluigwe
I gbariri mana I nweteghi nke ato. USA ya bu isi Ukwa.

Dum! Ukwa adagbu kwala gi,.

1 Like

Re: K'anyị Lebanye Anya Na Agwụgwa Igbo(riddles) Tara Akpụ, Maa Kọwaa Uru Ha by MiminwaGod: 2:12pm On May 21, 2023
Please my people in the house, I need an urgent Igbo riddles answers in Igbo and the translations; 1. Gwam tiño tiñoriño. 2. Gwam odi uru enweghi okpukpu 3. Gwam agbogho otu nturu ime. 4. Gwam osisi naabo toro na mba, a hu anyu gbuo otu, mana a hughi anya gbuo nke ozo.

(1) (Reply)

4 Popular Cultural Festivals In Africa / Somali/ethiopian/eritrean women and how they are viewed / What Does "Na Wa O" Mean In English

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 29
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.