Welcome, Guest: Join Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 2,424,214 members, 5,440,286 topics. Date: Tuesday, 25 February 2020 at 05:19 AM

Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo (4954 Views)

Names Of Some Animals In Central Igbo Language (asụsụ Igbo Izugbe) / Asụsụ Igbo Ga-adịrịrị: A Call To Promote The Reading And Writing Of Igbo Languag / Ndi-igbo Who Can Tell The True Name Of This Drink...? Omenala Igbo Must Not Die (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo by scholti: 12:26am On Dec 07, 2015
Ebere Dominic Chibuzor
Ngalaba Asụsụ Igbo, Kọleeji Ọzụzụ Ndị Nkụzị Gọọmenti Etiti Dị Na Kano.
dominozion@yahoo.com

Ụmi Edemede
Ọtụtụ mgbe, imeriime ụmụ afọ Igbo anaghị eji asụsụ Igbo ebido ikwu okwu. Tụmadị ndị nne na nna ha rụrụ ọrụ bekee n’obodo ndị mepere emepe na mpụga ala Igbo. Ọtụtụ n’ime ha ji asụsụ a gwara ogwa akọwapụta uche ha. Maka ụmụaka ndị dị etu a, ohere ọzọ ha nwere ịmụta asụsụ na omenala Igbo bụzị n’ụlọakwụkwọ. E ruo n’ ụlọakwụkwọ, ọ naghịkwa adịịmfe n’ihi na ha na-amụzị asụsụ Igbo dị ka asụsụ nke abụọ. Ọnọdụ a wee bụrụ nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Ụta adịghịrị ụdị ụmụaka ndị a n’ihi na ọ bụ asụsụ nwata na-anụkarị na gburugburu ebe obibi ya ka ọ na-ebu ụzọ amụta. Ọ bụ nke a kpatara o ji dị oke mkpa ịchọ ụzọ a ga-esi chọpụta ma gbochie ihe ndọlaazụ niile na-egbochi ezi agamnihu n’ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo n’ụlọakwụkwọ tụmadị na Kọleeji ebe a na-azụpụta ndị ga-akụzịasụsụ ndị a. N’ime nke a, ihe nchọcha a gbasoro usoro nchọcha nkọwasi na nnyocha ya. Ihe nchọcha a gosipụtara na enweghị mmasị so bụrụ nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Ọ kwadoro usoro nkụzị ga-akwalite mmasị ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ ụ nke ga-eme ka asụsụ, tụmadịasụsụ nne nọrọ n’ogo kwesịrị ya n’ọmụmụ ihe. N’ikpeazụ, a chịkọtara ihe niile a rụtụrụ aka n’edemede ma site na ya wepụta ndụmọdụ na mmechi zuru oke.


1.0. Ndubanye
Asụsụ bụ nnukwu ihe onyinye Chineke nyere mmadụ. N’ihe okike niile, ọ bụ sọọsọ mmadụ ka Chineke nyere onyinye a. Ọ bụ asụsụ ka mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta nke ga-eme ka e nwee nghọta n’isiokwu a na-ekwu maka ya. Dị ka Emenanjọ (2009) si kọwaa ya:
Onye chọrọ irịọ ihe, ọ bụ asụsụ ka o ji egosi ya. Onye chọrọ izipụta anụrị ma ọ bụ iwe dị ya n’obi, ọ bụ asụsụ ka o ji eme ya. Chekene ka ụwa ga-adị ma a sị na asụsụ adịghị, Redio na Tiivi agaghị aba uru ọ bụla(p. 3)

Asụsụ mbụ nwa ga-amụta dị oke mkpa. Ọmụmụ asụsụ na-enye mmadụ nghọta pụrụ iche gbasara omenala na ewumewu ndị nwe asụsụ. Nke a kpatara okporo atụmaatụ iwu e hiwere maka mmụta n’ala Naịjịrịa (NPE 1981), ji sie ọnwụ sị
…To achieve the objectives (of pre-primary education), Government will ensure to it that the medium of instruction in the primary schools is initially the mother-tongue or the language of the immediate community and, at a later stage, English (pp. 10-13).
Ihe a na-akọwa ebe a bụ na iji mejụpụta ebumnobi mmụta ọtaakara, Gọọmenti ga-agbasi mbọ ike ịhu na a ga-ejiriri asụsụ nna nwata kụziere nwa ihe na mbido ọmụmụ ihe n’ụlọakwụkọ ọtaakara, ma afọ atọ gasịa, sị werezịa Bekee. Atụmaatụ a gakwara n’ihu kwuo na ọ banye ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ọ ga-amu otu asụsụ ala Naịjịrịa ọzọ tinyere asụsụ e ji kuo ya mmiri. Atụmaatụ a magburu onwe ya. Ma ruo kwa taa, ọgaghị n’anya ya n’anya ya.

N’ime asụsụ niile nọ n’ala Naịjịrịa, bụ nke Emenanjọ (2003) sị na o ruru ihe dị ka narị abụọ ruo narị ise, asụsụ Igbo bụ otụ n’ime anọ ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ọmụmụ asụsụ Igbo alaala azụ nke ukwuu karịa asụsụ ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n’ala Naịjịrịa (Awụsa,Yoruba, Fulfulde). Ọtụtụ ụmụ Igbo jiri asụsụ dị ka Bekee a gwakọtara ya na Igbo bido ikwu okwu, ebe ndị ọzọ na-asụ Pijin. Ihe ọtụtụ na-aghọta n’ asụsụ Igbo akarịghị, ‘Bịa ebe a!’, ‘Gịnị bụ aha gị?’, ‘Ọbụ gịnị?’ mọbụ ‘Anụ ọfịa!’ na ‘Mechie ọnụ gị!’ Nchọpụta ụfọdụ ndịọkammụta mere, dị ka nke Ohiri-Aniche (2002) gosịpụtara na ụzọ iteghete n’ime narị ụmụaka Igbo anaghị anụ asụsụ Igbo ma ọlị. Ihe a a na-ekwu abụghị maka sọọsọ ụmụaka, ọtụtụ ndị nne na nna amachaghị asụ Igbo ọfụma, dị ka n’iji Igbo kwuo ahịrịokwu anọ maọbụ ise n’etinyeghị Bekee, ma ya fọdụzịa ụmụ ha.

Oge a chọrọ iji asụsụ ala Naịjịrịa atọ gbara ọkpụrụkpụ (Igbo, Awụsa, na Yoruba) edepụta okporo iwu ndị na-achị ala anyị ma kesara ya ọhaneze, ọtụtụ ndị nnọchite anya anyị n’ụlọ nzukọ ome iwu Naịjịrịa so na ndị mbụ gbara ya bụ atụmatụ ụkwụ. Ụfọdụ ji ọnụ ha gwa ndị nta akụkọ na ha agaghị enwe ike ịgụpụta ndepụta a ma ọbụrụ na e jiri asụsụ Igbo dee ya. Ọ bụ nke a kpatara o ji dị mkpa ịkwalite ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ anyị ha, bido n’ Ọtaakara ruo na Mahadum.

Ọmụmụ asụsụ Igbo bịara dị mkpa karịchaa na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị n’ihi na ọ bụ ebe a ka a na enye nwataakwukwo ọzụzụ n’ụzọ kasị mma e si akuzi ihe, ọ kachasịasụsụ, Omenala, Ewumewu, na Ụtọasụsụ Igbo. Ọ bụ ha ka e kwesiri ihi aja n’ukwu n’ihi na ha nweta ezi ọzụzụ, usoro nkụzị ha ga-enye aka ma mee ka ụmụakwụkwọ na-enwe mmasi n’ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Abịa na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị, e nwere ụdị kụrịkụlụm abụọ e ji akụzịasụsụ Igbo. Nke mbụ bụ maka ndị na-amụ asụsụ Igbo dị ka asụsụ mbụ (A1), ebe nke abụọ bụ ndị na-amụ ya dị ka asụsụ nke abụọ ha (A2). Ọ bụ ya mere onye ọ bụla chọrọ ọganihu ndị Igbo na asụsụ Igbo ji achọ ụzọ a ga-esi kwalite nkụzị na ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụakwụkwọ gụrụ asụsụ Igbo na Mahadum anaghị enwe ọzụzụ zuru oke n’okporo nkụzị.

N’edemede a, mgbe ọ bụla anyị na-ekwu maka ‘asụsụ’ Igbo, ebumnuche anyị gụnyere omenala na ewumewu ndị Igbo. Asụsụ na omenala mba na-aga aka na aka. Ihe kpatara nke a bụ na Omenala nọ dị ka uwe e ji chọọ asụsụ mma, nke na nwa ọ bụla ma asụsụ nna ya ma kwa omenala nna ya, nke amaghịnna ya agaghị ama omenala nna ya. Ọtụtụ ndị ma ihe a na-akọ na sayensi asụsụ kwekọtara na asụsụ bụ ejirimara kachasị ibe ya na ndụ mmadụ ma ọ bụ obodo, (Whorf, 1956, na Kammelụ, 2006, p. 100). Mba ọ bụla asụsụ ha furu, omenala ha efuola; nke omenala ha furu, ihe ahụbaama ha efuola.

2.0. Mbọ Ndị A Gbarala
(a). Agbaala mbọ dị iche iche iji wulite ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo na Kọleji ọzụzụ ndị nkụzị. Otu n’ime ha bụ nhiwe e hiwere otu jikọtara ndị nkụzị asụsụ Igbo, na gburugburu ala Naịjịrịa afọ ole na ole gara aga, nke a enyela aka mee ka ndị nkụzị na-agakọta kwa afọ iji tụlee okwu ndị a kpụ n’ọnụ ma chepụta ụzọ ndị ga-enye aka bute agamnihu.

(b). Ọzọkwa, site na ntụziaka ndị N.C.C.E., e meela ka ngalaba asụsụ na omenala Igbo nọrọ n’ogo nnọọronwe na ọtụtụ Kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị, ya bụ ikewapụta ya site na ngalaba asụsụ ala Naịjịrịa. Ọnọdụ a mere ka ndị nkụzị asụsụ Igbo nwee ike gbanahụ ụfọdụ ihe mkpagbu a na-ahụ ebe e bukọtara asụsụ Naịjịrịa niile n’otu ngalaba, nyekwa ha ikikere ịhazi onwe ha n’ụzọ kwesiri ekwesi.

(ch). Otu akụkụ ọmụmụ asụsụ Igbo tara akpụ bụ njem nleta ala Igbo. Njem ọmụmụ ihe izu isii a na-eri ego buru ibu. Iji belata ihe nramahụ dịịrị ụmụakwụkwọ n’ịchọta ego ha ji eme njem nleta na ọmụmụ ihe gbasara ala Igbo, a na-ekesara ụmụakwụkwọ akwụkwọ leta ha ga-eji nata enyemaka site n’aka nne na nna, ikwu na ibe nakwa ọchịchị steti na nke ime obodo ha.

(d). Inwe mmasị dị oke mkpa n’ihe ọ bụla mmadụ na-eme. Iji kwalite ogo mmasị ụmụakwụkwọ nwere n’ọmụmụ asụsụ Igbo, ndị nkụzị asụsụ Igbo kwekọtara na a ga-ewebata egwu na ọchị n’ọmụmụ ihe. Abịa n’ụfọdụ Kọleeji ndị nọ n’ugwu Awụsa, enweela otu egwu ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo, ma na-emekwa ụbọchị ncheta omenala Igbo kwa afọ. Emume a metụtara ejiji, nri, na egwuregwu Igbo, nke na-eme ka ụmụakwụkwọ na enwewanye mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo.

3.0. Ihe Ndọlaazụ Ndị Ọzọ
(a). Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ihe agbanwoola kamgbe otu Ọmụmụ asụsụ Igbo (ISA) bidoro ibuso ihe ndọlaazụ ndị a agha. N’agbanyeghị mbọ niile ndị a a gbarala iji kwalite ọmụmụ asụsụ Igbo, ihe na-ebenụ ka na-ebe. Ihe kpatara nke a bụ na ọtụtụ ndị Igbo enwebeghị mmasị zuru oke n’ebe asụsụ ha nọ. Nsogbu a kacha njọ ebe ụmụagbọghọ na-eje akwụkwọ nọ. Ọ dị mkpa ime ka ha mata na onye ọ bụla na-asụ asụsụ ndị ọzọ ma leghara nke ya anya na-eme onwe ya ohu ndị ahụ ọ na-asụ asụsụ ha, (Chinagorom, 2006, p. 60)

(b). A bịa n’ụfọdụ ụlọakwụkwọ, nsogbu ndị ọzọ dị kwa. Enwechaghị ndị nkụzị a zụrụ ọfụma na okporo nkụzị asụsụ. Ndị isi kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị steeti nwe nọ na Kano kwụsịrị ọmụmụ asụsụ Igbo n’afọ 1998 n’ihi na ha enwetaghị ndị nkụzị ga-akụzịrị ụmụakwụkwọ asụsụ Igbo. Enwetaghị ndị nkụzị zuru oke na-abụkarị nsogbu n’ụlọakwụkwọ ndị no na mpụga ala Igbo tụmadị ugwu Awụsa.

(ch). Ngwa nkụzị zuru oke kọrọ ụkọ n’ọtụtụ kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị tụmadị ndị e ji akụzị omenala. Nke a metụtara ma kọleeji ndị gọọmenti etiti nwe ma nke ndị steeti. Ngwa nkụzị ndị a gụnyere apịmaapị dị iche iche dị ka umu Okpesi, Ikenga, Ekpo, Ọfọ, dgz. Ọ bụghịkwa kọleeji niile nwezuru ngwa egwu ọdịnala ndị Igbo.

(d). Akamgba ọzọ chere amụmamụ Igbo bụ nsogbu ndekọ na ndesa ya bụ nsogbu ọtọgrafị. Ndị ọkammụta dị iche iche ewepụtala ụzọ ha chere kasị mma n’odide asụsụ Igbo ma n’ezie enwebeghị nkwekọrịta zuru oke na ndekọ na ndesa imeriime mkpụrụokwu.

(e). Ihe ọzọ ka bụ nsogbu nye amụmaamụ Igbo bụ nkesa akwụkwọ ọgụgụ Igbo. Inweta akwụkwọ Igbo na-ara ahụ n’akụkụ Naịjịrịa ụfọdụ dị ka n’ugwu Awụsa. Abịa kpọmkwem n’obodo Kano nakwa Katsina, akwụkwọ Igbo ndị a na-ahụkarị n’ahịa bụ nke ndị sekọndịrị. N’ajụjụ ọnụ a jụrụ ụfọdụ ndị na-ere akwụkwọ n’obodo abụọ ndị a, ha kọwara na ọ na-ete aka tupu ha erepụ akwụkwọ ndị e dere maka ụlọakwụkwọ ndị dị elu. Ha kwetara na ha na-erepu nke ndị sekọndịrị tụmadị na mbido tam ọ bụla. Site na azịza a ndị na-ere akwụkwọ nyere, otu ihe doro anya bụ na ọnụọgụgụ ndị na-amụ asụsụ Igbo pere mpe n’ụlọakwụkwọ ndị dị elu ma na kano ma na Katsina.

(f). Na nchọcha Kammelụ (2006, p. 98) depụtara gbasara ọnọdụ amụmamụ Igbo na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị ndị nọ n’ọdịda anyanwụ ala Naịjịrịa, ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo na-agba anya mmiri. Nchọcha Kammelụ a gosịpụtara na abịa na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị asaa nọ n’ọdịda anyanwụ ala Naịjịrịa, ọnụọgụgụ ụmụ Igbo debatara aha na ngalaba asụsụ Igbo enweghị oge ọ karịrị mmadụ iri na gburugburu kọleeji niile nọ n’akụkụ Naịjịrịa ahụ n’ime afọ iri nchọcha a gbadoro ụkwụ.

(g). Ohiri-Aniche, (2006, p. 47) gosịpụtara na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị pere mpe karịa ndị no na ngalaba Awụsa, Frenchị, Yoruba, na Ingilishi. A na-agụ ole ghara ibe ya, a bịa na kọleeji Alvan Ikokwu dị n’Owere kpọm kwem na akụkụ asụsụ Igbo, sọọsọ ụmụakwụkwọ iri nọ na kilaasị ndị na-apụ apụ, n’ime mmadụ iri a, sọọsọ isii na-agbasi mbọ ike.

4.0. Ụzọ A Pụrụ Ịgbaso
(a). Inwe mmasị dị oke mkpa n’ihe ọ bụla mmadụ na-eme. Ọ na-enye mmadu agbamume n’ọmụmụ asụsụ weta ịhụnanya na alụmdi ma na-ebute mmepe na ọganihu n’obodo. Ụzọ kachasị mma iji mee ka mmụọ ụmụ Igbo nọ na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị na anụ ọkụ n’ihe gbasara asụsụ Igbo bụ site n’iwebata asọmmpi asụsụ na omenala Igbo nke a ga-erite ego gbara ọkpụrụkpụ na ya. E nwere ike I hiwe nke a na mbido afọ ọ bụla. A ga eme ka ndị nta akụkọ gosị asọmmpi a n’onyonyo Tiivi na Redio ka ọ kpụọ ọkụ n’ọnụ.

(b). Ọzọkwa, iji kwalite mmasị ha n’ọmụmụ Igbo, ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo na kọleeji anyị ha kwesịrị ka a na- akwụ ha nchọnchọ ego ha ga-eji nyere onwe ha aka n’ụlọakwụkwọ. Ụdị enyemaka a ga-adọta mmụọ ụmụ Igbo nọ na ngalaba ndị ọzọ.

(ch). Ọdịkwa mkpa ikwalite ọnụọgụgụ ngwa e ji akụzị ihe na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị site n’ime ka gọọmenti ala Naịjịrịa gbaa mbọ hụ na eweghachitere ụmụ ihe ọkpụ anyị ha bụ


nọ ugbu a na-ezu ike n’ụlọ nlere muzium ndị ọcha. Nke a ga-eme ka ngwa nkụzị omenala Igbo zuwanye oke.

(d). Ọ bụghị naani I weghachi ndị furu efu, a ga-akwụsị ọgbụgba ọkụ ndị otu ụka dị iche iche na-agba ụmụ ihe ọkpụ ndị fọdụrụ n’ala Igbo.

Nchịkọta na Mmechi
N’ihe ndepụta a, nke gbadoro ụkwụ na ụzọ a pụrụ ịgbaso iji mwulite asụsụ na omenala Igbo n’ogo ọpụrụiche na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị, a kọwapụtara uru asụsụ bara mere o ji dị mkpa ị kwado ya, nakwa ọnọdụ ọjọọ asụsụ Igbo nọ n’etiti asụsụ ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n’ala Naịjịrịa. Ndepụta a egosịpụtala ụfọdụ mbọ ndị a gbarala iji tọghapụ ọmụmụ asụsụ Igbo n’ọgbụ ji ya. Ọtụtụ n’ime mbọ ndị a gbadoro ụkwụ n’iwulite mmasị ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo. Nchọcha a mere ka a mata ihe ndọlaazụ ndị ka fọdụrụ na kọleeji ọzụzụ ndị nkụzị nakwa ụzọ a ga-esi buso ha agha. Ndị ọchịchị kwesịrị iji asụsụ Igbo agwa ndị ha na-achị okwu dị ka ndị Awụsa na Yoruba si eme. Ụmụokorobịa kwesịrị iji Igbo anọrị mgbe. N’ikpeazụ, iji mee ka asụsụ Igbo bụrụ ọkaibe e ji ohere a akpọlite ndị Igbo n’ụra ka asụsụ anyị gharakwa ifunarị anyị. Ọrụ a chọrọ mgbakọ aka onye ọ bụla, ọkachasị ndị ọnụ na-eru n’okwu. Onweghị mkpụrụokwu Igbo na-eme ihere, ụtara bụ ụtara ofe bụ ofe, onye ọ bụla tinye aka na ihe fọrọ otu agwụla agwụ.

--------------------
Ebe o si: Journal of Institute for Nigerian Languages
--------------------------------------------------------------------------


Edensibia
Chinagorom, L.C., (2006). Asụsụ Igbo na Ọganihu Ala Igbo. Journal of Igbo Studies, vol. 1. Pp. 59 - 64.
Emenanjo, E.N. (2003). How many Nigerian languages are there? Issues on the definition and identification of language in O.M. Ndimele, (ed) Four decades in the study of languages and linguistics in Nigeria: A Festschrift for Kay Williamson. Aba: NINLAN: Pp.89-100.
Emenanjo, E.N. (2009). Nchịkọta Asụsụ na Ụtọasụsụ Igbo Izugbe. Lagos: Longman.

Federal Republic of Nigeria, (1981). National Policy on Education.

Kammelụ, N.C. (2006). A decade of Igbo studies: A survey of colleges of education in the south-west of Nigeria. Journal of Igbo Studies, Vol.1, 2006.
Ohiri-Aniche, C. (2002). Nnyefega asụsụ Igbo n’aka ụmụaka. Paper presented at an Igbo seminar for Ogbalu foundation and the Nigerian publishers, U.N.N. JUNE, 2002.
Ohiri-Aniche, C. (2006). Nkụzị na Omụmụ Asụsụ Igbo Kemgbe Afo Ndi 1990. Journal of Igbo Studies, vol.1. Pp.44 – 50.
Whorf, B.L., (1956). Language: Thought and Reality. Selected writings of Benjamin Lee Whorf. J.B. Caroll (ed.). Massachusettes: MIT Press.

Ebe o si: Journal of Institute for Nigerian Languages

1 Like 1 Share

Re: Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo by Anthonyoz(m): 12:55am On Dec 07, 2015
Abum ezigbo nwa ala igbo .
Igbo kwenu!! Biafra kwezoonu !!! Isee!! Isee!!! Isee!!!! Umuchineke anyi ga enwe ndu ogologo ma anyi nilee kwekurita na biafra.udo dirigi ,n olu bem anam asi uno ala na deeejnuoo!!! Majee .

2 Likes

Re: Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo by Nobody: 7:34am On Dec 07, 2015
Edemede a adabaala na ịhe anyị na-akpa na threadi nke ọzọ akpọrọ, instruction in Igbo. Ozo dị ka ibe ya bụ na, ọ ga adịkwa mma ma anyị soro tinye uche, na ikuzi nsibidi n'ụlọ akwụkwọ Igbo anyị.

1 Like

(1) (Reply)

Akwa Ibom @30, Orange Is Our Color, Color Yourself With The Color Me Orange App / Can You Name Your Son Adolf Hitler ? / Attah Of Igala Didn’t Invoke Thunder On Fulani Herdsmen – Palace Source

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2020 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 136
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.