Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,195,546 members, 7,958,677 topics. Date: Wednesday, 25 September 2024 at 08:30 PM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) (693 Views)
“imo State People Are The ‘yorubas Of Ala Igbo’” / Best Capital Of Ala Igbo / Who Are Eke, Orie,afo Na Nkwo: Agwu, Amadioha, Ogwugwu And Ala? (2) (3) (4)
(1) (Reply)
Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) by IzunnaOkafor(m): 8:53am On Jan 29, 2019 |
Izunna Okafọr Ala Naịjiria ebegbuo onwe ya n'akwa Anya mmiri anya mmiri ebe niile Akwa ụtụtụ, akwa ndeeri na akwa arịrị Ọnye ga-azọ ala anyị ? Chi ọbụbọ were aka ekpe were dupụta ya ụra Chi ọjọọ ewere akwa arịrị dúbàà ya Ihe na-ebenụ aka na-ebekwa Onye ga-azọ ala anyị ? Naịjiria bụ nne chị ụmụ Ndị ọchịchị bụ di bi ụlọ Nne na nwa ebegbuo onwe ha n'akwa Agụụ, anya mmiri, akwa arịrị ebe niile Onye ga-azọ ala anyị ? Lekene nwaanyị na mma ya Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie afọ ya Ma di ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya Wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi Onye ga-azọ ala anyị ? Ezi na ụlọ ya nọ n'ọgbaghara Ma di ya adịghị emezị ka nwoke Egbe ebukọchaala ụmụ ya na Benue, Dapchi na Chibok Ma di ya ekwughị ihe ọbụla ma ọlị Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme Onye ga-azọ ala anyị ? Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ọnụ nri Ụmụka nọzịkwa n'agụụ, ọbụnadị n'ikpo nri ha nwèrè Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ na-erughị eru Anya mmiri ejugokwa ọgọdọ ya Onye ga-azọ ala anyị ? Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n'ọmà ahịa Chaị ! Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n'akwa !! Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya elele Ùgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya aka Onye ga-azọ ala anyị ? Ala Naịjiria na-achọ dí ọzọ ugbu a Ndị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala ya N'ihi ezughị oke n'ihe e ji nwoke eme Nke bụ isi anaghị echètekwuzịkwa onwe ya N'ihi ụbụrụ ịta nchara Na ihe a gwọrọ agwọ so ya Onye ga-achị ala anyị ? Iwe eweela ụmụ ya ndị okenye Ha ji achọrọ nne ha di ọzọ n'oge Naanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụ Ma e wepuchaa úgwùmágànà na ndị otu ya. A jụọ m ụnụ, onye ga-azọ ala anyị ? Gị onwe gị sòrò bụrụ nwa ya Mụ onwe m sòrò bụrụ nwa ya Ngịga dị n'ọkụ abụghị nkè azụ Ọ bụrụ nkè anụ Ụmụnne m a jụọ m ụnụ ọzọ Onye ga-alụ mma anyị ? Oke ji na àbàlà ọ na-azọ ihu ọba ? Ngwa jikere ma chemie echiche nke ọma Ka i wee sòró anyị zaa ajụjụ ahụ n'oke ụbọchị ahụ Onye ga-achị ala anyị ? © Izunna Okafọr
|
(1) (Reply)
We (humans) Are Nothing But Maggot Food...this Photo Will Shock You!! / Ivie (coral Beads) / Happy New Year Ethiopia!
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12 |