Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,054 members, 7,814,624 topics. Date: Wednesday, 01 May 2024 at 04:27 PM

Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? (10191 Views)

Buhari; Ndigbo Nile Biko Bianu O. / Laws Of Igboland (Iwu Obodo) / Celebrating Ndi-igbo (2) (3) (4)

(1) (2) (Reply) (Go Down)

Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Hendarl(m): 2:28pm On Mar 30, 2010
Ndi Igbo ndi m huru na-anya,biko gbakotanu ka anyi kwukorita obodo anyi si bia. Ibum onye Awka ka i bu onye Enugu ka i bu onye Abia. Kwuputa ebe isi bia.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by davmor(m): 2:50pm On Mar 30, 2010
Obi bu m so noo anuri. Aha obodo m bu Agu-obodo 2 n'ime Ebonyi Steti. Aha igbo m bukwanu Ibeabuchi. Biko ka anyi ga n'iru-oooo!
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Promisee(m): 3:24pm On Mar 30, 2010
davmor:

Obi bu m so noo anuri. Aha obodo m bu Agu-obodo 2 n'ime Ebonyi Steti. Aha igbo m bukwanu Ibeabuchi. Biko ka anyi ga n'iru-oooo!
@Ibeabuch nwnnem,igbaligo,daalu oo. Mu onwem bu onye Enugu-Ukwu nke di na anambara steti,aham bukwanu Uchenna. Biko kedu obodo ino,makana anyi bu ndi igbo na agba mbo nke ukwuu karichaa ihe n'ile bu mmadu Chineke kere eke n'okpuru anyanwu. Anyi ga na aga n'iru ooo!
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by okenwa(m): 12:20pm On Mar 31, 2010
umu nnam dalu nu, onye nkanu-east ka mu bu.enugu state. na ga ni iru
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by davmor(m): 2:20pm On Mar 31, 2010
Nwafu ala dalu, ndewo. Obukwanu n'ime Onitsha ka m no. Ya bu, na akuku Mr.Bigs n' ogologo New Market Road Onitsha. Kedukwanu ebe gi onwe gi no?
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Omenuko(m): 5:23pm On Apr 01, 2010
Ndeeeewo!! Ndi madu no ebe a, aka m di n'elu, abu m onye Imo steti. Aha obodo m bu Umuobioma (o di n'ime obodo Ozara). Obodo m di n'akuku obodo Awo mama (n'nukwu obodo). Aha m bu Onyekachukwu. Ndiigbo na-aga n'ihu.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by bigfrancis21: 9:54pm On Nov 20, 2013
Bikonu, ka a akponite thread anunwa.

Afa Igbo m bu Emeka. A bu m onye Enugwu-ukwu.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 9:29am On Dec 07, 2013
Afa m bu Ngozi, a bu m onye nkanu west na Enugu state

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by bigfrancis21: 10:22am On Dec 07, 2013
ngozievergreen: Afa m bu Ngozi, a bu m onye nkanu west na Enugu state

Daalu Ezigbo Ada Igbo.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Afam4eva(m): 3:07pm On Dec 07, 2013
Afam bu Afam. Abum onye Amaechi-Awkunanaw na Nkanu, Enugu state.

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by TabletMan: 10:04pm On Dec 07, 2013
Afam bu Chibuzo, abum onye osumenyi nke di na okpuru ochichi nnewi south LGA. Udo diri unu .

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by seeker88(m): 7:13pm On Dec 08, 2013
.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 9:11am On Dec 09, 2013
Inyi eji ava m eme ngen? grin
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by bigfrancis21: 6:00pm On Dec 09, 2013
odumchi: Inyi eji ava m eme ngen? grin

Oyi m oma, kee ife bu afa I? cheesy
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 4:09am On Dec 10, 2013
bigfrancis21:

Oyi m oma, kee ife bu afa I? cheesy

Ihe m za n'ive adii mkpa, kama I gbuo ava m mkpirisi o buru "Emeka". Mbunu mu na gi bu ogbo. I maralan ebe m za, k'o m kwulagara gi e odo? cool
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by bigfrancis21: 8:11am On Dec 10, 2013
odumchi:

Ihe m za n'ive adii mkpa, kama I gbuo ava m mkpirisi o buru "Emeka". Mbunu mu na gi bu ogbo. I maralan ebe m za, k'o m kwulagara gi e odo? cool

Ife m na-aza ebe a adiro mkpa, kama I gbusisi afa m mkpulu mkpulu o bulu Emeka. Mbu, mu na I bu Ogbo. I malugo ebe m no, ka o kwuolu gi ya ozo? grin grin

Ihe ke atala akpu daa. cheesy

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 11:30am On Dec 10, 2013
odumchi:

Ihe m za n'ive adii mkpa, kama I gbuo ava m mkpirisi o buru "Emeka". Mbunu mu na gi bu ogbo. I maralan ebe m za, k'o m kwulagara gi e odo? cool
Hmmm.
Kedu ka unu si di edetewu olumba unu?
Olumba nkanu adighi na a b ch d!
I ma ndewu ya.

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 7:13pm On Dec 10, 2013
bigfrancis21:

Ife m na-aza ebe a adiro mkpa, kama I gbusisi afa m mkpulu mkpulu o bulu Emeka. Mbu, mu na I bu Ogbo. I malugo ebe m no, ka o kwuolu gi ya ozo? grin grin

Ihe ke atala akpu daa. cheesy

'Ebe m za' pusara 'Ebe m si'. Kafee ihe a I nwesagbara e. Nsogbu adii ma olu lol.

ngozievergreen:
Hmmm.
Kedu ka unu si di edetewu olumba unu?
Olumba nkanu adighi na a b ch d!
I ma ndewu ya.

Wedanu obi, onye anya uvu. Okwu ali m di uto di egwu. I choro m zi gi aga aza asu e? grin
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 8:15pm On Dec 10, 2013
odumchi:





Wedanu obi, onye anya uvu. Okwu ali m di uto di egwu. I choro m zi gi aga aza asu e? grin
Kedu ka mu siri buru onye Anya ufu?
biko Dee Igbo izugbe ka m Mara ihe I na ako.
Asusu obodo m dikwa uto ri nne mana o nyighi Igbo izugbe ma ncha.
Eg

thing-ihe - i*e
Asterexis ahu, ihe nochiri anya ya na asusu obodo m bu ime ka I na afu ikuku/ma o bu I na afunyu oku.
Na a b ch d, o nweghi mkpolu did otu ahu.
Ihe o putara bu na mu dewe asusu m, o bughi ihe niile di mu n'obi ka mu ga na-ede.

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 11:36pm On Dec 10, 2013
ngozievergreen:
Kedu ka mu siri buru onye Anya ufu?
biko Dee Igbo izugbe ka m Mara ihe I na ako.
Asusu obodo m dikwa uto ri nne mana o nyighi Igbo izugbe ma ncha.
Eg

thing-ihe - i*e
Asterexis ahu, ihe nochiri anya ya na asusu obodo m bu ime ka I na afu ikuku/ma o bu I na afunyu oku.
Na a b ch d, o nweghi mkpolu did otu ahu.
Ihe o putara bu na mu dewe asusu m, o bughi ihe niile di mu n'obi ka mu ga na-ede.


Ihe a I na-ekwu edoghi m anya. Kedu nke bu na otu m si ede olumba mu adighi nma. O bu na I maghi na Igbo Izugbe adighi omimi otu olumba ufodu si diri? I maghi na Igbo Izugbe enweghi nsunimi (nasalization) di ka ufodu Olumba nwere? I maghi na Olumba di iche iche na enwe a b ch d nke onwe ha? Biko, agwala m ihe a ozo.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 7:23am On Dec 11, 2013
odumchi:


Ihe a I na-ekwu edoghi m anya. Kedu nke bu na otu m si ede olumba mu adighi nma. O bu na I maghi na Igbo Izugbe adighi omimi otu olumba ufodu si diri? I maghi na Igbo Izugbe enweghi nsunimi (nasalization) di ka ufodu Olumba nwere? I maghi na Olumba di iche iche na enwe a b ch d nke onwe ha? Biko, agwala m ihe a ozo.

.
Gugharia ihe m dere..
Onye shiri gu efukwa n'onu be unu?
I haworu ihe mu fuoru GU kpaade ihe ozo.
E mere mu gu giyi?
Izhi wee?
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 2:32pm On Dec 11, 2013
ngozievergreen:

.
Gugharia ihe m dere..
Onye shiri gu efukwa n'onu be unu?
I haworu ihe mu fuoru GU kpaade ihe ozo.
E mere mu gu giyi?
Izhi wee?

Guma m gulaga? Ebe I choghi ikwuru m ivu olu, hapuwan.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Emvin(m): 4:38pm On Dec 11, 2013
Aham bu Aham. Abum onye umuahia nke di na Abia steti

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 6:55pm On Dec 11, 2013
odumchi:

Guma m gugharia? Ebe I choghi ikwuru m ivu olu, hapuwan.
A hawokwamu he nwoke!
Ka mu shiri gu deede na ihe m ka anu, gu na e gbereshi.
Mu deedehunu nke m.
Haayenu
Na gboo.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 9:49pm On Dec 12, 2013
igbo bu igbo ka cha nu,Aham bu ifeanyi, Aha obodo mu bu mbaukwu nke di na okpuru ochichi awka south nke di n" ime steeti Anambra
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 7:18am On Dec 13, 2013
ngozievergreen:
A hawokwamu he nwoke!
Ka mu shiri gu deede na ihe m ka anu, gu na e gbereshi.
Mu deedehunu nke m.
Haayenu
Na gboo.

Ewela iwe. Wetuo obi.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 8:43am On Dec 13, 2013
odumchi:

Ewela iwe. Wetuo obi.
cheesy[quote author=odumchi]

hahahaha.
Kedu onye siri gi na iwe na ewe m?
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Psychedelia(m): 10:19am On Dec 13, 2013
Aha'm wu Chukwuedu. Awum nwa Bende, Abia, mana a zuu'm na Owerre, Imo. Ya kpatara Igbo nke'm n'asu wu nke ndi Owerre.

1 Like

Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 10:45am On Dec 13, 2013
ngozievergreen: cheesy

Lol ekwesiri igbara m ya afa tupu m amara na o na-akpasu gi iwe? Udo diri.
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by geni(f): 12:51am On Dec 14, 2013
Umunne m ndewo nu.Awu m onye Ubomiri no na Owerri.Mgboto Owerri mana ana alum na Onitsha.I wotara ya?ka emeshia
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by Nobody: 7:09am On Dec 14, 2013
odumchi:

Lol ekwesiri igbara m ya afa tupu m amara na o na-akpasu gi iwe? Udo diri.

Iwe anaghi ewe m o.
ihe o putara bu na I ghotaghi ihe m ma Ede.
E dere m ihe ndi ahu n'olu MBA m.
Ya mere mu ji edekari Igbo izugbe
Re: Sösö Ndi Igbo: Biko Gini Bu Aha Obodo Gi Na Aha Igbo Gi? by odumchi: 11:22am On Dec 15, 2013
ngozievergreen:
Iwe anaghi ewe m o.
ihe o putara bu na I ghotaghi ihe m ma Ede.
E dere m ihe ndi ahu n'olu MBA m.
Ya mere mu ji edekari Igbo izugbe

Mgbe ufodu, ihe ekwe ede na olumba abughi na achoghi ka ndi madu mara ihe ana-ekwu, kama o na ide na olumba na-eme ka onye obula gbadee anya muta okwu ibe ya. Mu na madu suwa na Olumba anyi, o na abara mu na ya uru maka anyi esi otu ahu mutatuzie kwa Igbo. Ikwuru gi eziokwu, o masiri m ukwuu oge ahu I bidoro dewa Olumba gi. O ka m is hu ya.

Na agbenyeghi ihe a niile, ebee ka I is na Nkanu West? Otu enyi m bu onye Awkwunawnaw na Nkanu, nne ya buru onye Udi. Amaghi m ma o na-asu okwu be nne ya ka o bu be nna ya, kama ihe ahu I dere adaghi ka ihe obula m nuturu mbu.

(1) (2) (Reply)

Why Must Nigerians Abroad Marry Nigerians? / What Is The Meaning Of “ezemo?” / King Jaja Of Opobo

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 34
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.