Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,056 members, 7,818,167 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 09:22 AM

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Mbaa APC - Obianọ. By Izunna Okafor - Nairaland / General - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Mbaa APC - Obianọ. By Izunna Okafor (336 Views)

Rumu-obidient Nu Nigeria! Ha Chi Karu Ha Ga Eme! / Banky W's EME Wanted To Promote Me In A Sexy Way - Niyola / Victor Okafor 'eze Ego': The Story Of Nigeria’s King Of Money (2) (3) (4)

(1) (Reply)

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Mbaa APC - Obianọ. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 11:21pm On Dec 03, 2017
Izunna Okafor.

         Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ ekwuwaala hoohaa na o nweghị ihe ọbụla ga-eme ka ọ gbahapụ otu ndọrọ ndọrọ APGA, baa otu APC. 

        Gọvanọ Obianọ, onye nwetara mmeri dara ụda site n'ịbụ gọvanọ mbụ tuuru ugo n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti Anambra na nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ, kwupụtara mkpebi a, oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ka o zùtechara onyeisi ala bụ Muhammad Buharị n'Abụja.

     Ọ kọwara APGA dịka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị zuru ka e mee na dịka naanị otu pati nwere ihe ọ ga-ewe iji kwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ nakwa nke pụrụ iweta ezi mgbabwe zuru oke na ọganihu tọrọ atọ n'ala anyị.

       O kwuru na ọ dịghị mfe mmadụ maọbụ otu ndọrọ ndọrọ ọbụla ituru ugo n'okpuru ọchịchị niile dị na steeti ya, ma sị na ya onwe ya nwetara ụdị mmeri ahụ n'okpuru APGA n'ihi ezi ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na ya bụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ya onwe ya jiri ya wee zọọ ọkwa ahụ. O wee sị hoohaa na mmadụ anaghị ahụchaa ebe a na-echi ọzọ, gaba ebe a na-arụ agwụ.

 O mekwara ka a mara na ọbịbịa ọ bịara ịhụ onyeisi ala Muhammad Buharị bụ iji wee kelee ya maka imezu nkwa o kwere, bụ ịhụ na ntụli aka ahụ e mere na steeti ahụ gara nke ọma na n'ụzọ ghe anya oghe, na-enweghị mgbagachi ụzọ, maọbụ ịchakpo anya site n'aka gọọmenti etiti.

          Gọvanọ Obianọ jikwazịrị ohere ahụ wee too ndị Anambra maka nkwado ha nye ọchịchị ya na otu pati APGA, ma kwe ha nkwa na o nweghị ihe ga-eme ka ọ gharịpụ ha maọbụ laa azụ n'imezu nkwa niile o kwere ha.

(1) (Reply)

Itunes Gift Card Buyer In Exchange For Cash At A Good Rate / Buhari Extends Tenure Of Service Chiefs / UK Passports To Change Colour From Burgundy To Blue After Brexit..

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 7
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.