Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,195,585 members, 7,958,814 topics. Date: Thursday, 26 September 2024 at 02:39 AM

PDP Ga-eturu Ugo N'ekiti -- Onye Amụma Nathaniel. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / PDP Ga-eturu Ugo N'ekiti -- Onye Amụma Nathaniel. By Izunna Okafor (422 Views)

Tracy Chapele-Ugo Bags Father’s Chieftaincy Title In Urhoboland / A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

PDP Ga-eturu Ugo N'ekiti -- Onye Amụma Nathaniel. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 8:57am On Jan 23, 2018
Written By Izunna Okafor
      Onyeisi Ụka "Living Christ Gospel Church" n'ala Naịjiria na mba ofesi bụ nnukwu ụkọchụkwu (Dọkịnta) Nathaniel F. Olorunsola ebuola amụma nke ya ma kwuwaa hooha na ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ na otu ndọrọ ga-esonye na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme na steeti Ekiti n'ahọ a; mana ọ bụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP ga-eturu ugo na ya bụ nhọpụta.
       O kwuru na Chineke gwara ya na nhọpụta ahụ ga-esi ike ma kpụrụkwa ọkụ n'ọnụ n'ihi ọtụtụ ndị ga-apụta ịnaghara gọvanọ steeti ahụ bụ Ayodele Fayose ọkwa ọchịchị, tinyekwuoro mbuso agha dị iche gọvanọ ahụ ga-enweta site n'aka gọọmenti etiti; mana n'ime ihe niile ahụ, na Fayose ga-eturu ugo n'ihi na Chineke ga-eji ya wee kwara mgwa ọrụ n'ụzọ pụrụ iche na mpaghara ndịda anyanwụ ala anyị n'ogoogo gọọmenti etiti n'agbata ahọ 2019 na 2025.
       N'ebe o metụtara steeti Osun, bụkwa ebe a ga-eme nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ, onye amụma Nathaniel kwuru na Chineke gwara ya na APC ga-eme ọtụtụ ihe dị iche iche iji wee turu ugo, mana otu ndọrọ ndọrọ PDP ga-eturu ugo ma ọ bụrụ na ha jikọta onwe ha, kpesie ekpere ike ma rụsiekwa ọrụ ike.
        O kwukwara na Chineke gwara ya na ihe ga-akara onyeisi ala anyị bụ Muhammadu Buharị mma bụ iji nwayọ rịtuo n'ọkwa ọchịchị ahụ ma wepukwa uche n'ihe gbasaara ịzọ ọkwa ọzọ n'ahọ 2019, maka na ọ ghaghị ịda pịatapịa n'ihi ajọ ọnọdụ ahụike ya; ma sịkwa na otu PDP ga eguzosi ike ma gbanyekwa mgbọrọgwụ n'ihi na ọtụtụ ndị gbahapụgoro otu ndọrọ ndọrọ ahụ ga-alaghachite azụ, na-agbanyeghị na a ga-enwe ndị kwe na ndị ekweghị n'ihe gbasaara onye ga-eji aha otu ndọrọ ndọrọ ahụ wee zọọ ya bụ ọkwa.
         N'ebe Atiku  Abụbaka nọ, ya bụ nnukwu ụkọchukwu sị na nwa amadi ahụ bụ Atiku, kwesiri ịgbasi mbọ ike n'ihi na mmụọ ya na-agwa ya na ọtụtụ ndị gọvanọ PDP ga-achọ ka ọ bụrụ onye bụgoro gọvanọ ga-eji aha otu ahụ wee zọọ ọkwa onyeisi ala, bụkwazị nke na-egosi na Atiku ga-agasi mbọ ike iji nweta ihu ọma.
        O bukwazịrị amụma na ọtụtụ ndị ga-achọ ịzọ ọkwa onyeisi ala, ọkwa gọvanọ ma ọ bọ ọkwa Sineeti ga-anwụ ọnwụ ike ma ọ bụ e gbufuo ha, ma ọ bụrụ na ha akpachaghị anya, ma mekwa ka a mara na ahọ a bụ 2018 ga-abụ ahọ ọma nyere ndị na-erubere iwu Jehova isi ma na-emekwa ndụmọdụ Ya.

1 Like 1 Share

(1) (Reply)

Is This True Or False? Im Trying To Find Myself. / Suggest The Best Co-working Space For Creatives In Lagos / How To Deal With Addictions.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 11
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.