Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,156,396 members, 7,830,022 topics. Date: Thursday, 16 May 2024 at 03:09 PM

Obianọ Bụ Dịke N'ọrụ - Emeka Sibeụdụ. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Obianọ Bụ Dịke N'ọrụ - Emeka Sibeụdụ. By Izunna Okafor (438 Views)

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor / Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Obianọ Bụ Dịke N'ọrụ - Emeka Sibeụdụ. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 5:30pm On Mar 16, 2018
By Izunna Okafor


A kọwaala gọvanọ Willie Obianọ dịka dịke n'ọrụ na ezi onye ndu
nhazi na ọchịchị doro anya.
Onye jibụ ọkwa osote gọvanọ steeti Anambra n'oge gara aga bụ Chiifu
Emeka Sibeụdụ nyere nkọwa ahụ n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'obodo ya
bụ Ụmụnze dị n'okpuru ọchịchị Orumba Sawụtụ, banyere mmemme idu Obianọ
n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ, bụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kwupuru chi ya
ezi okwu, si hooha na ya bụ gọvanọ gbara mbọ ka nwoke ma rụpụtakwa
ọtụtụ ihe a hụrụ anya n'ọchịchị ya nke mbụ.
O kwuru na Obianọ eweghachikwala ntụkwasị obi ahụ ndị mmadụ
nwere n'ọchịchị onye kwuo uche ya site n'ọtụtụ ihe dị iche ọ rụpụtara
na mnwogharị o wetagoro na ngalaba niile nke steeti ahụ dịka ịrụ
ọtụtụ okporo ụzọ, iwulite ọnọdụ akụnụba, ọrụ ugbo, nchekwa, agụm
akwụkwọ, ọnọdụ ahụike, ịdọta ihe mwunye dị iche iche na ọtụtụ ihe ndị
ọzọ a na-ahụ anya o mepụtasịrị na ngalaba dị iche iche.
Dịka o siri kọwaa, ochịchị gọvanọ Obianọ nke mbụ magburu onwe ya
na mma ma bụrụkwa nke gbaara ya ezi aka ebe merr o jiri wee nweta ụdị
mmeri a hụtụbeghị n'ala Naịjiria kemgbe e jiri gwube okwe ndọrọ ndọrọ
na ya. O kwuru na ya bụ agụ nwoke nhazi akụnụba doro anya esitela
n'iweta ezi ọnọdụ akụnụba dị mma na ịdọta ihe mwuye site na mba ofesi
na ebe dị iche iche, wee kwalite ọnụ ego a na-enweta n'ime steeti a,
kewapụta ọtụtụ ohere ọrụ nye ụmụafọ steeti ahụ ma mee steeti ahụ ka ọ
bụrụ ebe e ji ama atụ n'ala anyị.
O bunyezịrị gọvanọ Obianọ na osote ya bụ dọkịnta Nkem Okeke ụkpa
ekele, dịka a ga-anọ n'ụbọchị taa wee merube mmemme ịsị ha chịrị gaba
n'ihu, ma kpọkuziekwa ụmụafọ steeti Anambra ka ha gaa n'ihu n'inye ha
nkwàdo zuru oke, ọ kachasị ugbu a ha na-ebughara oche ịba n'agba nke
abụọ, ka ha wee nwee ike imezupụta nkwa niile ha kwere ndị Anambra,
dịka ha mere n'ọchịchị ha agba nke mbụ.

1 Like

(1) (Reply)

Group Promotes Beauty Pageant In Anambra Communities.... / Do U Agree With This? Add Your Opinion / Should Father Bath With Their Son

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 24
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.