Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,235 members, 7,818,790 topics. Date: Monday, 06 May 2024 at 03:37 AM

Anambra Etinyela Ọtụtụ Ego Na Mmepe Ime Ime Obodo - Nnacheta. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Anambra Etinyela Ọtụtụ Ego Na Mmepe Ime Ime Obodo - Nnacheta. By Izunna Okafor (562 Views)

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor / Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Anambra Etinyela Ọtụtụ Ego Na Mmepe Ime Ime Obodo - Nnacheta. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 5:43pm On Mar 16, 2018
By Izunna Okafor

A kọwaala steeti Anambra dịka steeti na-atụnye ọtụtụ ego na-ada ụda n'ịkwalite mmepe ime ime obodo nakwa mmepe ọdụ ahịa n'ihi ezi uru nke ahụ bara. Kọmishiona steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi, bụ Ogbuehi Tony-Nnacheta mere ka a mara nke a oge ha mechara obere nzukọ ndị isi, bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọ ọrụ Jerome Udọjị dị n'Ọka bụ isi obodo steeti ahụ. O mere ka a mara na ọchịchị steeti ahụ n'okpuru ndu gọvanọ Willie Obianọ etinyela ego ruru ijeri naịra iri asaa na mmepe ime obodo na ahịa na steeti ahụ, ma sịkwa na ka ọ dị ugbu a, na obodo iri na abụọ arụchapụbeghị agba nke mbụ nke atụmatụ ọrụ mmepe ime ime obodo ahụ ọchịchị Obianọ tụpụtara. O kwuru na nke ahụ bụ n'ihi ụfọdụ obere nsogbu dapụtara n'ime obodo ndị ahụ, o wee kpọkuzie obodo dị otu ahụ ka ha mee ngwa ngwa rụchapụ agba nke mbụ ahụ iji wee tozuo okè ịnara ego maka agba nke abụọ nke ya bụ ọrụ mmepe. O kwuru na obodo dị iri anọ na ise amalitela agba nke abụọ nke ọrụ ahụ ebe obodo iri atọ na anọ ka na-akpụ ka esu n'akụkụ nke ha, ma sị na e nyekwara ahịa iri isii na atọ a ma ama na steeti ahụ nde naịra iri n'otu n'otu iji wee họrọ ma rụọ ihe ha chọrọ. N'ebe o metụtara ngalaba mmụta na ọnọdụ agụm akwụkwọ na steeti ahụ, maazị Nnacheta kwuru na Anambra abụrụla steeti kacha eme nke ọma n'ule na asọm mpi dị iche iche n'ala Naịjiria na mba ofesi ma bụrụkwa ebe e nwere ogoogo igwu ojoro dị naanị pasentị atọ. O kwukwara na nwata akwụkwọ ọbụla na steeti ahụ jiri nzere ogoogo mbụ bụ First Class wee pụta na mahadum bụkwa onye a ga-enye ọrụ ozigbo ozigbo, dịka o siri bụrụ mmasị ọchịchị nọ na steeti ahụ ugbu a iwe ọtụtụ ndị mmadụ n'ọrụ nkụzi na steeti ahụ. Na nchịkọta, o kwukwara na ọchịchị steeti ahụ eweputala otu usoro a ga-eji wee na-agba ogige n'ụlọ, malite n'Amansea wee ruo n'isi akwa ohimiri Naịja nke Ọnịsha, ma kpokuzie ndị ọbụla rụnyere ihe na mpaghara ebe ahụ ka ha mee ngwa kụkpọsịa ihe ndị ahụ n'ihi na gọọmenti steeti ahụ ejikerela iyibe steeti ahụ uwe ọhụụ magburu onwe ya.
Re: Anambra Etinyela Ọtụtụ Ego Na Mmepe Ime Ime Obodo - Nnacheta. By Izunna Okafor by OyiboUgbo04: 11:32am On Mar 17, 2018
Nwanne ndewo, Edemede gi masilu m nke ukwuu, obulu na inwelu efu, biko kpotulu mobu igwa izo m ga esi nweta gi. acholu m ka anyi kpaa.

(1) (Reply)

Ikorodu Oro Day: No Restriction Of Movement For Females - Police / Cave Girl Was Half Neanderthal, Half Denisovan / Cattle Keeping Tribal System Failed To Protect Against Imperialism

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 9
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.