Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,813 members, 7,810,126 topics. Date: Friday, 26 April 2024 at 09:15 PM

Obianọ Ga-arụnyekwu Ọtụtụ Ụzọ N'awka - Ifejiọfọ. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Obianọ Ga-arụnyekwu Ọtụtụ Ụzọ N'awka - Ifejiọfọ. By Izunna Okafor (412 Views)

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor / Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Obianọ Ga-arụnyekwu Ọtụtụ Ụzọ N'awka - Ifejiọfọ. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 9:38pm On Apr 13, 2018
By Izunna Okafor

Ọchịchị steeti Anambra ekwuola na ọ ga-abàgide n'ịrụnyekwu ọtụtụ ụzọ n'Awka bụ n'isi obodo steeti ahụ iji mee ka mmä ya pụtawanyekwuo ihè.
Nke a bụ nke e mere ka a mara sịte n'ọnụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ịrụ okporo ụzọ, idozigharị ya na ịchọ ya mma, bụ maazị Marcel Ifejiọfọ, n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'ụlọ ọrụ ya dị n'Awka. O kwupụtara na ọchịchị Obianọ emepụtala ọtụtụ ihe dị iche iche na ngalaba niile nke steeti ahụ, rụọ ọtụtụ okporo ụzọ n'ebe dị iche iche, ma ka rụrụ na-aga n'ihu, kemgbe ahọ anọ gara aga, iji hụ na Anambra bụ e ji ama atụ n'ihe gbasaara ezi okporo ụzọ.
N'ebe o metụtara isi obodo steeti ahụ bụ Awka, maazị Ifejiọfọ mere ka a mara na ya bụ gọvanọ nwere mmasị pụrụ iche n'ịkwalite ma mee ka ọ kawanye mma, ọ bụnadị dịka ọ wepụtagoro atụmatụ nwogharị bụ ịgbà maka ya bụ isi obodo. O kwuru na a ga-arụnye àkwà n'ebe Regina Ceali nakwa mpaghara Esther Obiakọ iji wee belata ihe mberede okporo ụzọ na-emekarị n'ebe ndị ahụ, bụkwa nke tagoro isi ọtụtụ ụmụ mmadụ.
N'okwu dịkwa ka ibè ya, ọ sị na na ndị niile ji ọrụ ngô n'okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ na-arụ ya nke ọma na otu a tụrụ anya, dịka e siri chọpụta site n'ịga letagasị otu ọrụ si aga n'ebe ndị ahụ. O mekwara ka a mara na ndị ọrụ otu "Anambra State Road Maintenance Agency" (ARMA) nọkwa gidigbaa ma dị njikere ịhụ na o nweghị ebe ọbụla e nwere mkpọpu ma ọ bụ olùlù n'okporo ụzọ ọbụla, ma sịkwa na oge adịghị anya, na a ga-ebinye ndị ụlọ ọrụ ahụ ngwa ọrụ na akụrụngwa ndị ọzọ goteere ha.
Na nchịkọta okwu ya, ya kọmishọna kwuru na mgbe adịghị anya, na ọchịchị steeti ahụ ga-amalite ịrụ ụzọ dịgasị n'ime ime obodo, iji wee kwalite ọrụ ugbo na ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ npgasị na mpaghara ahụ.

3 Likes

(1) (Reply)

Gọọmenti Anambra Ga-enyocha Ọkụ Ọgbụgba Ahụ Dapụtara N'ahịa Nkwogbe / Chimamanda And Feminism / Festival Destinations You Should Not Miss This Summer

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 7
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.