Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,012 members, 7,817,981 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 01:35 AM

Ndị Nando Eguzobela Emeneka Maka Ụlọ Ọgbakọ Etiti. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Nando Eguzobela Emeneka Maka Ụlọ Ọgbakọ Etiti. By Izunna Okafor (435 Views)

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor / Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ndị Nando Eguzobela Emeneka Maka Ụlọ Ọgbakọ Etiti. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 9:46pm On Apr 13, 2018
By Izunna Okafor.

Ndị obodo Nando n'okpuru ọchịchị Anambra East ewerela otu olu kwekọrịta ma eguzobe maazị Obinna Emeneka ka ọ bụrụ onye nnọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra 'East' na 'West' n'ụlọ nnọchite anya etiti n'ahọ 2019.
Nguzobe a bụ nke weere ọnọdụ na mmemme pụrụ iche a chịkọbara iji nabata ta bụ nwa amadi, bụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado Anambra 'East' n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra.
Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ na be nwa amadi ahụ ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ nke gụnyere ndị Ojiana Nando, ndị Irunaanọ Nando, òtù ụmụwaanyị, ndị ntorobịa, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ dị iche iche e ki okwu ha agba izù, bụ ndi juputara ebe ahụ gbịm n'ọnụ, iji wee gosipụta ka obi dị ha banyere ha bụ nguzobe.
N'okwu ha na mmemme ahụ, ndị ndu obodo, nke gụnyere maazị Ifeanyị Ọgụejiọfọ, maazị Ajamma Donatus na onye ndu ndị ntorobịa n'obodo ahụ, bụ maazị Chidozie Ameke, kelere, too ma kwupùrú maazị Emeneka maka ọrụ ọma dị iche iche ọ rụpụtagoro, ọbụnadị dịka onye nnọchi anya ha n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, ọ kachasị n'iwelatara ha ọrụ mmepe dị iche iche, ịkwadò ndị ntorobịa, nakwa ikwuchite ọnụ ndị mpaghara Ọmambala n'ụlọ ọgbakọ ahụ. Ha wee kọwaa na nke ahụ gosiri nnọọ na ya bụ nwa amadi zuru ka e mee, ọbụnadị n'ịnọchite anya ha n'ụlọ nnọchi anya etiti.
Na mbụ n'okwu ya, onyeisi oche Ojiana Nando, bụ Chiifu Matthew Esedo, bụ onye kwụpụtara maka nkwekọrịta na nguzobe ahụ, weere nnọọ oge wee kpọpụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ya bụ onye omebe iwu dọtaara ndị ọgbọ nta nkwado ya, ma sị na nke ahụ bụ ụdị a hụbeghị kemgbe, bụzị nke mere ha jiri sị ka ọ gaara ha ụlọ nnọchi etiti.
Na nzaghachi, isi a hụrụ kwaba ya bụ okpu, bụ maazị Emeneka gosipụtara obi ụtọ ya na ndị nke ya na-enwe ọñụ n'isi ya maka ọrụ ya n'ụlọ omebe iwu steeti Anambra.O kwekwara nkwa na dịka ha guzobeworo ya maka ọkwa ahụ dị elu, na ọ ga-agazị ịkpọtụrụ ndị dị iche iche o kwesiri ịkpọtụrụ na mpaghara Anambra 'East' na 'West', ma kwupụtakwa ezi olile anya o nwere na ọ ga-aga nke ọma.

2 Likes 1 Share

(1) (Reply)

Should Father Bath With Their Son / Pastor Commands Congregation To UnCloth And Wave Pants In The Air (VIDEO) / NEW Upcoming Iphone 12 Price In Canada

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 7
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.