Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,466 members, 7,816,090 topics. Date: Friday, 03 May 2024 at 04:12 AM

Gọọmenti Anambra Eguzobela Kọmitii Udo Maka Nsogbu Agụleri Na Ụmụeri - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Gọọmenti Anambra Eguzobela Kọmitii Udo Maka Nsogbu Agụleri Na Ụmụeri (464 Views)

Akuko Ifo maka agha IDU NA OBA ... / Ndị Akwaihedị Ahọpụtala Ụmụada Ọhụụ Maka Ahọ 2020 / Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Gọọmenti Anambra Eguzobela Kọmitii Udo Maka Nsogbu Agụleri Na Ụmụeri by IzunnaOkafor(m): 11:40am On May 05, 2018
Written By Izunna Okafor

N'iji weta udo tọrọ atọ na nsogbo ahụ na-adapụta n'etiti obodo Agụleri na Ụmụeri nke steeti Anambra, gọọmenti steeti ahụ eguzobela kọmittii mmadụ iri na asatọ mejupụtara iji wee leba anya na nke ahụ.
Kọmitii udo ahụ bụ nke e guzobere n'isi ngwụcha izu ụka gara aga, ma bụrụkwa nke e siri n'obodo abụọ ahụ wee họpụta ndị mejupụtara ya, tinyekwuoro ndị ndu obodo abụọ ahụ.
N'okwu ya ka e guzobechara otu ahụ, eze ọdịnala obodo Agụleri, bụ Igwe Christopher Idigo kwuru na ọñụ jupụtara ya obi banyere nke ahụ n'ihi na o teela aka o jiri tụba anya ihe dị otu ahụ dịka ụzọ isi weta nsogbu ahụ n'isi njedobe. O kpọkuzịkwara kọmitii ahụ ka leba anya na nsogbu niile na-adata n'etiti obodo abụọ ma tụwasịa ha ọnụ n'otu n'otu, karịa ikpokọta ha niile ọnụ dịka otu nsogbu, n'ihi na ọ bụ naanị site n'ụzọ dị otu ahụ ka a pụrụ isi bie nsogbu niile ahụ ọdụ n'otu n'otu.
N'aka nke ya, eze ọdịnala Ụmụeri, bụ Igwe Sa Ben Emeka kelere ọchịchị steeti Anambra maka ezi nzọpụ ụkwụ ahụ, ma kọwaa obodo abụọ ahụ dịka ụmụnne ekwesighị ịhụta nsogbu ọbụla n'etiti ha. Ọ kpọkuru ndi ntorobịa obodo abụọ ahụ ka onye ọbụla mịnye mmà ya n'ọbọ ma gbaso ịchọ udo. Ọ dụzịkwara ha ka ha sonyesie ike n'atụmatụ ịkụziri ndị ntorobịa ọrụ aka na inye ha nkwado zuru oke, bụ nke ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ ji n'aka na steeti ahụ.
Na mbụ n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka ha mechara nguzobe ahụ, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị Anambra East, bụ maazị Pius Ifeadị toro Chineke na obodo abụọ ahụ abịakọtala ọnụ maka ịchọ udo banyere oke nsogbu ahụ dịgoro n'etiti ha kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, bụkwa nke bigoro ha aka ọjọọ n'ụzọ dị iche iche. O jizịkwara ohere ahụ wee kpọkuo ma rịọ ndị ntorobịa ndị ntorobịa obodo ndị ahụ ka ha ñomie ezi nzọ ụkwụ nke ndị bụ nna ha, bụ ndị hụtara ịgbaso udo dịka naanị ụzọ a pụrụ isi weta ajọ ọnọdụ ahụ n'isi njedobe.
Ndị ọzọ gosipụtara afọ ojuju ha na obi ụtọ ha banyere nguzobe ahụ gụnyere onyeisi ọchịchị obodo Ụmụeri, bụ Chiifu Pius Okonkwọ, ndị isi oche otu kọmittii udo ahụ, bụ Chiifu Raph Ịgwah na Chiifu Samuel Umeadị, bụkwazị ndị kpere ma gosipụta ezi olile anya ha na ezi nzọpụ ụkwụ ahụ ga-amịta ezi mkpụrụ dịka a tụrụ anya.

1 Like

(1) (Reply)

Who Will Liberate Africa / Matrilineal Communities In Nigeria / What Was Life Like In Ancient Egypt

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 8
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.