Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,590 members, 7,809,139 topics. Date: Friday, 26 April 2024 at 12:59 AM

Ndị Eziowelle Akwaa Akwa N'ihi Óké Ụtụ Akwamozu - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Eziowelle Akwaa Akwa N'ihi Óké Ụtụ Akwamozu (460 Views)

A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe / N1 Million Burial Levy In Eziowelle, Idemili Anambra: Community Members Cry Out / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ndị Eziowelle Akwaa Akwa N'ihi Óké Ụtụ Akwamozu by IzunnaOkafor(m): 11:55am On Jul 07, 2018
Igbo News Written By Izunna Okafọr

Ndị obodo Eziowelle dị n'okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ nke steeti Anambra akwaala arịrị n'ụzọ onye ntị ochi ga-anụ ya, banyere oke ụtụ a na-amanye ha ka ha tụọ tupuu ha enwee ike ịkwa ozu onye nke ha nwụrụ anwụ.
Ha kwara arịrị a n'igosipụta obi mwute ha banyere otu ndị ọchịchị obodo ahụ si tie iwu na onye ọbụla onye nke ya nwụrụ ga-akwụrịrị ego dị otu nde Naịra dịka ụtụ akwamozu tupuu ọ malite ịkwa ya bụ ozu.
N'ihi nke a, ọtụtụ n'ime ndị obodo ahụ ka a hụrụ ka ha nupụtara ma were otu olu na-ekwu na ihe nke ahụ jọgburu onwe ya, n'ihi na o meela ka ọtụtụ ndị mmadụ daa ogbenye ọnụ ntụ n'ihi na ha kwara ozu, ebe ụfọdụ ndị mmadụ jigoro maka nke ahụ gbahapụ ozu ndị nke ha n'ụlọ nchekwa ozu n'ihi otu akwamozu sizị añụ ego ka mmiri n'obodo ahụ.
Ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'obodo ahụ, nke maazị Felix Okafọr na Emeka Akụkwe bụ ndị duuru ha wee pụta kwuru na arụrụ ala ahụ bụ nke malitere kemgbe ahọ atọ gara aga ọchịchị nọ ugbu a n'obodo ahụ siri bata n'ọkwa ọchịchị, bụ nke Titus Akudo nọ n'isi ya.
Ha mekwara ka a mara na otu ihe ahụ metụrakwara ndị na-achọ ịrụ ụlọ ebe obibi ha, n'ihi na tupuu mmadụ ọbụla arụọ ụlọ n'obodo ahụ, ọ ga-ebugodu ụzọ ga kwụọ ndị ọchịchị obodo ahụ otu nde Naịra, tupuu ọrụ ewee malite.
Dịka ha siri kwuo, nke ka nke bụ na onye ọbụla ozu dara n'isi ya ma ọ kwụghị ụgwọ ahụ tupuu kwaba ya, ma ọ bụ onye chọrọ ịrụ ụlọ ma o bughị ụzọ ga nye ha otu nde Naịra, ndị ọchịchị ahụ ezipu ndị agboro ka ha wakpo onye ahụ n'ike, họọ ya aka ururu họrọ ogbe ogiri ma ghasasịakwa ihe ọ na-eme.
Ha kpọkuzịrị gọọmenti steeti Anambra n'okpuru ndu gọvanọ Willie Obianọ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma memilaa npụ na aghụghọ ahụ kpamkpam

1 Share

(1) (Reply)

For Forget 2019 Election In Our Land - Biafran / Tiv Bans Traditional Marriage Festivities, Peg Expenses At N100,000 / Bangla New Year Celebrated In Nigeria With Colour & Festivity (pictures)

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 9
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.