Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,435 members, 7,819,580 topics. Date: Monday, 06 May 2024 at 06:26 PM

Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture - Culture (3) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture (23303 Views)

The Importance Attached To The 2nd Child(orlu) In Igbo Culture. / Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. / Showcasing Igbo culture (2) (3) (4)

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply) (Go Down)

Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 11:07pm On Oct 14, 2011
NRI PRIEST:

Andre nwannem, daalu soo. Mana kam gwa gi ofu ife. Igbo nile nwelu ndi gulu akwukwo ma nwe kwaa ego. Oteela mu ji na agu ife nile ina ede ebea,nakwa obi anuli juputalum maka na enwelu onye di ka gi ebea!
Nya bu na ekpele mu na isi gi na ezi na ulo gi bu na chukwu g a eme ka gi, umu gi na umu umu gi bulu ndi eji eme onu na okpulu anyanwu!!!
Gi bu Andre Uwe site tata bu oke osisi eji ama atu na ALAIGBO NILI !!!
Henceforth,everybody should address Andre Uwe as"oke osisi". So, says the man from Nri lineage.

Ka Chineke mezie okwu. Chi dube gi nwanne m.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 11:10pm On Oct 14, 2011
freecocoa:

oh nwanne'm de mee o,

Onye Awka obuna no ika,nekwe ikpele'm na ana.

Biko freecocoa iwe ewe na gi mana ndi be unu ana asu ''de eme''? Nnem Ochie (ka chukwu gozie nkpuru obi ya) bu onye Awka mana achoputaram na olu asusu igbo ya (nke ndi Awka) ona asu nwere ka osiri yi e nke ndi Ugbawka (Nkanu) ebe ya bu Nnem Ochie nuru ''Di'' (Nnam ochie)? A jurum Nnem Ochie ka oka di ndu ma olu asusu igbo obodo abuo nu (Ugbawka na Awka) onwere ka ha siri yi e onwe ha, osim na ha abuo yiri. Inu nu go ebe onye si Ugbawka suru olu asusu igbo ya? O di gi ka ha eyiri onwe ha?
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 11:15pm On Oct 14, 2011
Na alaIgbo, o buru na e buputara onye Igbo nri ka o rie, tupu o rie nri ahu, o ga-ekelegodu onye ahu butere nri ahu ekele maka nri ahu o butere. O richakwaa nri ahu, o ga-ekelekwa onye ahu nke oma site n'isi ya daluu, ma obu anwula di ka any sii ekwu na Isinweke, ma obu imeela, ma o bu mma mma di ka ndi Ndoki sii asu.
IGBO AMAKA.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by NRIPRIEST(m): 11:16pm On Oct 14, 2011
@all4naija,nobody asked u to crawl dowm where the vultures are feasting!!
Ur comments here reminds me of a certain son of a LovePeddler and an agbero!!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 11:17pm On Oct 14, 2011
NRI PRIEST:

@all4naija,nobody asked u to crawl dowm where the vultures are feasting!!
your comments here reminds me of a certain son of a LovePeddler and an agbero!!!
That should be your family! a.s.s.h.o.l.e!representing yourself as vulture!Jeez! That guy is insane!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 11:18pm On Oct 14, 2011
Bandit C.:

Biko freecocoa iwe ewe na gi mana ndi be unu ana asu ''de eme''? Nnem Ochie (ka chukwu gozie nkpuru obi ya) bu onye Awka mana achoputaram na olu asusu igbo ya (nke ndi Awka) ona asu nwere ka osiri yi e nke ndi Ugbawka (Nkanu) ebe ya bu Nnem Ochie nuru ''Di'' (Nnam ochie)? A jurum Nnem Ochie ka oka di ndu ma olu asusu igbo obodo abuo nu (Ugbawka na Awka) onwere ka ha siri yi e onwe ha, osim na ha abuo yiri. Inu nu go ebe onye si Ugbawka suru olu asusu igbo ya? O di gi ka ha eyiri onwe ha?
Igbo gi rijuru afo. De eme nwannem.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by freecocoa(f): 11:25pm On Oct 14, 2011
Bandit C.:

Biko freecocoa iwe ewe na gi mana ndi be unu ana asu ''de eme''? Nnem Ochie (ka chukwu gozie nkpuru obi ya) bu onye Awka mana achoputaram na olu asusu igbo ya (nke ndi Awka) ona asu nwere ka osiri yi e nke ndi Ugbawka (Nkanu) ebe ya bu Nnem Ochie nuru ''Di'' (Nnam ochie)? A jurum Nnem Ochie ka oka di ndu ma olu asusu igbo obodo abuo nu (Ugbawka na Awka) onwere ka ha siri yi e onwe ha, osim na ha abuo yiri. Inu nu go ebe onye si Ugbawka suru olu asusu igbo ya? O di gi ka ha eyiri onwe ha?
iwe ayaro ewe'm nwanne'm,Anyi na asu de mee,anu nu ro'm ka onye nkanu na asu asusu fa,mana onwere ife nchoputara na asusu igbo nke bu na,asusu igbo na eyikorita onwe ya.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by AndreUweh(m): 11:33pm On Oct 14, 2011
freecocoa:

iwe ayaro ewe'm nwanne'm,Anyi na asu de mee,anu nu ro'm ka onye nkanu na asu asusu fa,mana onwere ife nchoputara na asusu igbo nke bu na,asusu igbo na eyikorita onwe ya.
Ezi okwu.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by NRIPRIEST(m): 11:34pm On Oct 14, 2011
@Andre, ndi idemmili na asikwa deme ma obu ndeje.
@all4naija, I knwo u dont know what the vultures represent cause u aint IGBO and nobody invited u here in the first place !!so,my question is why are u here
Please, leave and let them vultures feast!!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nymphnode(m): 11:37pm On Oct 14, 2011
Yeah! Perfect time to say ka chi fo
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 11:41pm On Oct 14, 2011
NRI PRIEST:

@Andre, ndi idemmili na asikwa deme ma obu ndeje.
@all4naija, I knwo u dont know what the vultures represent cause u aint IGBO and nobody invited u here in the first place !!so,my question is why are u here
Please, leave and let them vultures feast!!!
Yes, I did it on purpose to spite at somebody who dare belittled my mentor, Wole Soyinka ! The person knows himself very well!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 11:50pm On Oct 14, 2011
Andre Uweh:

Igbo gi rijuru afo. De eme nwannem.

De' Uweh, d'alu.

Biko nu, ka'mu ju kwa ajuju o; o ga abu na ihere na eme umu igbo be anyi no na ebe a ka o'gini? Kedu ka osiri buru nmadu isii ka o bu asaa na akpakorita ke ngbe emepere atumatu nke a ka na akpakorita kwa luo kita. Anyi nwere umuigbo otutu na ebea, kedu ebe ha noo. Biko umunne mu, gosi nu uwa na anyi ka ma asusu anyi ma hukwa ya na anya nke ukwu. Dee nu ihe gwa anyi otu ubochi di na ebe unu si, o buru go di ofu okwu. Nyelu nu aka bunie asusu na omenala igbo enu.

E bi go mu ala bekee aro iri mana aka mu na asu olu asusu Nkanu be anyi ma mu su ba igbo. O na enye kwa mu obi anuli isu igbo ngbo obuna n'nwere ofele isu ya.

Unu ekwe kwa na ka ndi iro chia anyi ochi biko.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Beync(f): 11:58pm On Oct 14, 2011
Ndi igbo ekenem unu,
Onabu ndi obodo anyi fu ka mmadu neme ihe dimma maobu neme nkeoma, anyi naemesi ya obi ike, nasi ya ' Jide nke iji'
Anamasi ndi nakwado asusu anyi ebe a 'unu jidenu nke unuji, unu neme nkeoma, anyi sokwa unu na azu'.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by ifyalways(f): 12:05am On Oct 15, 2011
O na abu m bunye Nna m ukwu(di m) nri.O richa,ekele ya na abu"Onye siri nri esika,onye riri eri erika,Odoziaku m imela" .

Igbo amaka.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by NRIPRIEST(m): 12:24am On Oct 15, 2011
@Ifyalways, ada ndigbo imeka,nwannem. Ibu ezigbo nwanyi oma, na eme ka obi di di gi uto oge obula, maka na di bu ugwu nwanyi. O na abu nnam richaa nri nnem siri osi nne isika!!
Umuigbo, rie nu,nuo nu, ma kachaa nu !!!
.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 12:35am On Oct 15, 2011
ndi be anyi ekele mu unu,




biko umu igbo unu esozina ndia ako onu oge obula, mpkali nna afu na nairaland aa akiligo oo biko nu zee nu ha tupu ha echuo anyi afa niru ndi uwa nile,


omalicja egwu EKPEYE rivers state




https://www.youtube.com/watch?v=koxYanBnUJ0
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by HighChief4(m): 12:40am On Oct 15, 2011
Igbo bu Igbo ekele mu unu. Nke onye chiri ya zere. Daalu nu umu afo Igbo. Okwa iru ofe ka eji ama ka aga emetekwu garri. Ekele kwa mu unu ozo ndi oma
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by itsik(m): 1:03am On Oct 15, 2011
ndi orlu no ebe a, kedu ka unu mere
''in orlu tone'' ndu uzu ulo ibe m, ele onye hu chineke gozghiri ofuma , were nye ya uche i de ihe ru oteh, ngwa mee kele unu na olu anyi

ole oteh unu mere
ndu okeneme no nga, unu orukwa mma ooo!!!!
unu orukwa mmaa ooooo
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by stagger: 1:09am On Oct 15, 2011
I thank the OP for starting this thread. Of the three major Nigerian languages, I think (I maybe wrong though) that Igbo language is the one that has been hardest hit. I travel a lot and living in Northern Nigeria, I see how Northerners speak Hausanchi with a degree of completeness. A bit like that too for the Yorubas.

Unfortunately, even my Igbo friends who I can say are fluent in the language can hardly make five sentences without some English words coming in.
Kudos for the attempts at preserving the language.

I na gbali rinne. Daalu!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Beync(f): 1:14am On Oct 15, 2011
its ik:

ndi orlu no ebe a, kedu ka unu mere
''in orlu tone'' ndu uzu ulo ibe m, ele onye hu chineke gozghiri ofuma , were nye ya uche i de ihe ru oteh, ngwa mee kele unu na olu anyi

ole oteh unu mere
ndu okeneme no nga, unu orukwa mma ooo!!!!
unu orukwa mmaa ooooo

Emezilam ichisi ochi ike biko
Ibu ezigbo enye uzoulo igwagi eziokwu
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 1:16am On Oct 15, 2011
stagger:

I thank the OP for starting this thread. Of the three major Nigerian languages, I think (I maybe wrong though) that Igbo language is the one that has been hardest hit. I travel a lot and living in Northern Nigeria, I see how Northerners speak Hausanchi with a degree of completeness. A bit like that too for the Yorubas.

Unfortunately, even my Igbo friends who I can say are fluent in the language can hardly make five sentences without some English words coming in.
Kudos for the attempts at preserving the language.

I na gbali rinne. Daalu!

you people dont give at all with your ignorant statements .
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Nobody: 1:16am On Oct 15, 2011
edited
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by aljharem3: 1:31am On Oct 15, 2011
DRlulu:

edited

Kedu smiley

ur signature is cracking up grin grin grin grin
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by ak47mann(m): 1:55am On Oct 15, 2011
igbo mmamanu,ya gazie onye obula ka anyi jisie ike na asusu igbo oga adili anyi mma,
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Galaxy7: 2:33am On Oct 15, 2011
Nke onye chiri ya zerunu o!,owutesirim ike n'm abaghi na oge
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by Galaxy7: 2:41am On Oct 15, 2011
Ndi Igbo ji ekele kporo ihe nke ukwu,Ha na ebu uzo were ekele kpokue ndi Ichie n'uzo ututu tupu ha amalite ubosi.
Nwafo igbo obula azuru nke oma mara n'obu oke na oru diri ya ikele okenye ya ma sopurukwa ya
kama,obu ihe nwute na ndi igbo ufodu hapuziri njiri mara ha gbasowezie obgo ohuru nke akporo ogbo komputa
ma were omenala ha kechie n'isi akwa.
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by toboy: 8:06am On Oct 15, 2011
ndewo ndi igbo ibem.o na-adikwanu mma i kwuo n'ihe na-ato uto ,i kwuonu ka o si ato. Obi di mu polina polona makana a na mu enwe añuri oge obula umu igbo gbakoro onu.lee nu otu ndi nsukka si ekele, n'ututu anyi na-asi ututu oma,n'abali anyi asi 'ka chi foo',onye igwara azaa 'k'oboo' mgbe obula ihuru mmadu n'uzo maobu mgbe mmadu biara be gi , anyi na-asi 'deje' nakwa 'alua'.anaekelekwa 'deje oru' ma ihu onye na-aru oru. Ufodu akuku nsukka na-asikwa 'dáàru'. Mana ekele kachisi puta ihe bu ''deje''.nsukka deje nu o!!!,alua nu!!
!, maje nu!!, atama be unu akuru unu nsoo!!!. Ndewo nu!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by toboy: 8:07am On Oct 15, 2011
ndewo ndi igbo ibem.o na-adikwanu mma i kwuo n'ihe na-ato uto ,i kwuonu ka o si ato. Obi di mu polina polona makana a na mu enwe añuri oge obula umu igbo gbakoro onu.lee nu otu ndi nsukka si ekele, n'ututu anyi na-asi ututu oma,n'abali anyi asi 'ka chi foo',onye igwara azaa 'k'oboo'  mgbe obula ihuru mmadu n'uzo maobu mgbe mmadu biara be gi , anyi na-asi 'deje' nakwa 'alua'.anaekelekwa 'deje oru' ma ihu onye na-aru oru. Ufodu akuku nsukka na-asikwa 'dáàru'. Mana ekele kachisi puta ihe bu ''deje''.nsukka deje nu o!!!,alua nu!!
!, maje nu!!, atama be unu akuru unu nsoo!!!. Ndewo nu!!
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by toboy: 8:22am On Oct 15, 2011
freecocoa:

iwe ayaro ewe'm nwanne'm,Anyi na asu de mee,anu nu ro'm ka onye nkanu na asu asusu fa,mana onwere ife nchoputara na asusu igbo nke bu na,asusu igbo na eyikorita onwe ya.
iwe ayaro ewe m,asusu ndi anambra?,eziokw ka ikwuru,igbo na-asu n'olu n'olu mana akwa ukwara oburu otu.soso asusu igbo mu anaghi anu bu igbo abakiliki. Soso asusu ahu nyiri mu ighota
Re: Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture by cejo(m): 9:43am On Oct 15, 2011
Umu nnem,ile kpa unu ri. Awom nwa afor OWERRI-(Owerri wu okemba).Ekelekwalam onye mere ka anu olu umu igbo na NL.Ashim nde ewo. Bia tanu Ugba n nmee owerri.

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply)

Man Undergoes Spiritual Cleansing In A River To Become A Chief In Bayelsa.Photos / Django Unchained = Inappropriate And Awkward? / Edo Colonized Yorubaland Not Vice Versa.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 47
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.