Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,812 members, 7,820,862 topics. Date: Tuesday, 07 May 2024 at 11:31 PM

UCHENNA (an Igbo Novel) - Literature - Nairaland

Nairaland Forum / Entertainment / Literature / UCHENNA (an Igbo Novel) (2082 Views)

Lighthouse In Amazon (Complete Novel) / The Brand Of Cain (A Complete Novel) (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

UCHENNA (an Igbo Novel) by Nobody: 1:37pm On Dec 18, 2014
Chi efuola...........
Ndi igbo n'eku na mberede nyiri dike,mana mu onwe'm n'eku na mberede ka eji ama dike.
Akuko a bu maka otu nwokorobia aha ya bu Uchenna,onye obodo Umuna no na orlu nime Imo steeti.
O ga mmasi'm ma o buru na Unu ga ekwe guo Edemede a,ma nwe mmasi na ya.
Dalu nu

1 Like

Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by Nobody: 2:05pm On Dec 18, 2014
Uchenna! Uchenna!''obiageli kporo nwa ya nwoke ebe o dina na oche na rahu Ura.
Uchenna mepere anya ya,hu nne ya,ujo abata nime ya.
''gini ka i neme ebe a?'' o juru
ujo banyere ya abughi obere ujo nihi na oteela nne ya nwuru, o ruola onwa ise.
O jiri aka hisa anya ya.
''Uchenna abialam i kporo gi,uwa a i no nime ya adighi gi mma,bia kanyi laa'' nne ya kuru.
O malitere bewe akwa.
''hapum aka,hapum aka...achobeghim i laa be mmuo.i nwuola,hapum kam biri ndu m''Uchenna tiri mkpu ma mapu n'iro.
O bido gbawa oso,o na gba,o n'ele anya na azu.
Onye huru ga o na gba oso ga eche na ara abiala ya.



O kusiri n'ukwu oroma,ebe a ka o no n'ezu ike.
''onye ma onye nwanyi ahu bu,onye ahu gwa kwa ya na ya hapum aka oo'' ihe a bu ihe o n'eku na obi ya.
O maghi mgbe maazi chukwudi kusiri n'akuku ya n'ele ya anya.
''ihe a obughi nwa okafor?'' maazi chukwudi juru onwe ya.
''nke o no ebe a,n'eku ume ka onye gbara oso ndu,udo odikwa?''
o fere n'isi ma garuo ya nso.
''Uchenna? Gini ka i no ebe a eme?''
o mejuru nwokorobia mmadu ujo,uchenna chere na obu nne ya ozo,o gbapugo oso ma lee anya na azu hu na obu maazi chukwudi.
Ume eruo ya ala,o laghachita.
''maazi ehihe oma,i mepurum ujo''
maazi fere n'isi ''uchenna gini kpatara mgbem kporo gi aha i bido gbawa oso?''
uchenna lee anya n'elu,lee anya n'ala. O maghi ihe o ga eku
Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by ruffhandu: 11:24am On Jan 26, 2015
Chinweblinkz:
Chi efuola...........
Ndi igbo n'eku na mberede nyiri dike,mana mu onwe'm n'eku na mberede ka eji ama dike.
Akuko a bu maka otu nwokorobia aha ya bu Uchenna,onye obodo Umuna no na orlu nime Imo steeti.
O ga mmasi'm ma o buru na Unu ga ekwe guo Edemede a,ma nwe mmasi na ya.
Dalu nu

Chinwe, kedu?
A si m ka m were ohere a gbaa gi ume, ma kelekwa gi. I n'agbali nke-ukwuu.
Ndi Igbo si na nwanta mee nke-oma, a jaa ya.
Kama, a si m ka m ruoro gi aka n'ihe m huputara.
I kwesiri i de "n'ekwu", karia 'n'eku'.
Ozo, i kwesiri i de 'O ga-amasi m', karia i de 'o ga mmasi'm'.

O ga-adi mma ka m kwupute na abughi m onye nkuzi asusu Igbo, mmuta k'anyi no.
Ji sie ike.

1 Like

Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by Nobody: 11:46am On Jan 26, 2015
Obi dim uto na enwerem onye di ka gi =ruffhandu.
Mana achoputaram na adibeghim kwado maka edemede igbo.
Amutabeghim ufodu ihe m kwesiri muta na ya.

Dalu kwa
Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by ruffhandu: 11:55am On Jan 26, 2015
Chinweblinkz:
Obi dim uto na enwerem onye di ka gi =ruffhandu.
Mana achoputaram na adibeghim kwado maka edemede igbo.
Amutabeghim ufodu ihe m kwesiri muta na ya.

Dalu kwa

O di mma. Jisie ike.
Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by JojoBlue(f): 11:53am On Feb 07, 2015
Nna, biko gawa n'ihu. Obi di m uto nke ukwu mgbe m huru aka oru gi a. Chineke gbaa gi ume.
Re: UCHENNA (an Igbo Novel) by Nobody: 5:37pm On Feb 07, 2015
Dalu Enyim,mana biko abughim nwoke.
Biko ga na 'SIGNATURE' m tinyerem.
Dalu kwa
JojoBlue:
Nna, biko gawa n'ihu. Obi di m uto nke ukwu mgbe m huru aka oru gi a. Chineke gbaa gi ume.
Dalu Enyim,mana biko abughim nwoke.
Biko ga na 'SIGNATURE' m tinyerem.
Dalu kwa

(1) (Reply)

Short Story''the Angel And The Monk'' / Crime Thriller E-books Wanted / My Warri Boyfriend-a Short Story

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 22
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.