Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,195,251 members, 7,957,609 topics. Date: Tuesday, 24 September 2024 at 03:42 PM

Ndị Ịgbo - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Ịgbo (2188 Views)

(2) (3) (4)

(1) (Go Down)

Ndị Ịgbo by fingard02k(m): 10:13am On Apr 10, 2009
Ndị Ịgbo kwenu, ụmụnnem na ụmụnna, nwoke na nwanyi, anam ekene onye ọbuna nọọ eba n'obi ọcha.Afam bu Ịfeanyị abu onwe Ọka.biko nu k'anyi were eba mara onwe anyi,kwado ala anyị,kwanyite asụsụ na kwa omen'ala anyi.BIKO achọrọ BEKEE/OYỊBO sọ Ịgbo Ịzugbe ka achọrọ,ka anyi wee n'ahọta onwe anyi. Daalụ kwanu
Re: Ndị Ịgbo by asha80(m): 10:18am On Apr 10, 2009
Re: Ndị Ịgbo by Nobody: 2:54pm On Apr 10, 2009
ndewoo
ihe ikuru bu eziokwu.
Re: Ndị Ịgbo by Abagworo(m): 7:19pm On Apr 10, 2009
@fingard02k.ihea i choro ikota wee wu ihe na ebute nkewa n'al'igbo.kawururu chefuo igbo izugbe ahu ka nyeowula deme igbo nna osiri choo.deemenuo! kwenuo!
Re: Ndị Ịgbo by Abagworo(m): 7:20pm On Apr 10, 2009
@fingard02k.ihea i choro ikota wee wu ihe na ebute nkewa n'al'igbo.kawururu chefuo igbo izugbe ahu ka nyeowula deme igbo nna osiri choo.deemenuo! kwenuo!
Re: Ndị Ịgbo by grafikdon: 9:22pm On Apr 10, 2009
Abagworo, ekweghi m na Igbo Izugbe na eweta nkewa n'ala Igbo. Nke ahu abughi ezioukwu ma oli. Obu na imaghi na onwere ndi abughi ndi Igbio choro imu asusu anyi? Isu Igbo izugbe anapughi onye obula olu mba mana uru obara bu na ogaghi eweta ogbaghara n'ime ndi biara ohuru na asusu anyi. cool

Enweghi m nsogbu obula na isu Igbo izugbe maka na mu na ndi Oka(Awka) noro, asuba mu olu ndi oka, Muna ndi Ekwulobia noro, asuba mu olu ndi Ekwulobia. Obukwa etu ahu ka oga adi ma mu na ndi Nanka, Agulu, Oko, Igbo-Ukwu, Isuofia, Uga na Ndi Newi noro. Ana m asu olumba nke masiri m, mana oburu mu na ndi si Enugwu, Abia, Imo, Ebonyi, Delta, Rivers noro, asuba mu Igbo Izugbe ka onye obula were ghota (Isi na nkea bu asi, aga m asuru gi ime Ekwulobia na Ime Awka, mgbe ahu ka iga aghota uru Igbo Izugbe bara grin grin)


Ngwa Abagworo, orue n'omume (Onye agbana Oso*Olumba* grin)


Achoro m ka ikowaara mu ihe ndi a edere n'okpuru. . .


1. Olu mba (Ekwulobia/Nanka/Oko)

"Abagworo, niihi mma Ekwu, Jee Ibenihi gbujite mgbajara wete ye kanwa"

2. Olu mba (Awka)

"Abagworo, Nee mma, Jee nonyi gbujite anachu patiya ika"

Ngwa Abagworo, achoro m ka ikowara anyi Igbo indi a ndere, cheta na ha n'ile n'ekwu otu ihe. . . grin
Re: Ndị Ịgbo by asha80(m): 9:41pm On Apr 10, 2009
@grafikdon

shocked shocked shocked

Igbo izugbe di nma ooo embarassed
Re: Ndị Ịgbo by ChinenyeN(m): 2:16am On Apr 11, 2009
grafikdon:

Achoro m ka ikowaara mu ihe ndi a edere n'okpuru. . .


1. Olu mba (Ekwulobia/Nanka/Oko)

"Abagworo, niihi mma Ekwu, Jee Ibenihi gbujite mgbajara wete ye kanwa"

2. Olu mba (Awka)

"Abagworo, Nee mma, Jee nonyi gbujite anachu patiya ika"

Ngwa Abagworo, achoro m ka ikowara anyi Igbo indi a ndere, cheta na ha n'ile n'ekwu otu ihe. . . grin

Hmm. . . I have my own understanding of the above, but I'm not all too sure about it because written and spoken Igbo are not the same thing. So I'm unsure if what I'm hearing in my head, when I read it, is the same as what I would be hearing if it were being said to me.
Re: Ndị Ịgbo by fingard02k(m): 9:58am On Apr 14, 2009
Biko nu,umunwoke anyi na umunwanyi anyi kedu ndi ka hu ego n'anya

(1)

Was Haile Sellasie Divine? / Nairalanders: What Are Your States Of Origin? / Benue Youth Cultural Carnival With Pics

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 16
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.