Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,146 members, 7,815,016 topics. Date: Thursday, 02 May 2024 at 04:49 AM

IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. - Literature - Nairaland

Nairaland Forum / Entertainment / Literature / IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. (901 Views)

Brodaaaa Anyi (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 9:39pm On Apr 05, 2017
Ô na-abu ô buru n' aluwa ôgu ma abaghi mba, ô buru akwùkwù, maka n' ô nye nna ya zigara ohi n' eji ukwu agbawa uzo.

Onye na-eme sô omume omume n' ebe sô obube obube n' ihi na onye mgbo turu nna ya n' isi na-eji iteona eme okpu.

Nwannem nwaafô igbo biko ka anyi suô igbo, tinye ilu nke gi ebea ka anyi kwalite asùsù igbo
Ndewonu!
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by obianuju95: 9:47pm On Apr 05, 2017
agha amara okwa ya anaghi eri ngworo mana na uwa ugbua,agha amara Okwa ya eriela ngworo chokwa iri ndi ji ukwu
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by Nobody: 9:48pm On Apr 05, 2017
Onye nsi n'akpa na ebuuzo awa ohia
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by obianuju95: 9:48pm On Apr 05, 2017
OnowuNdiigbo:
Ô na-abu ô buru n' aluwa ôgu ma abaghi mba, ô buru akwùkwù, maka n' ô nye nna ya zigara ohi n' eji ukwu agbawa uzo.

Onye na-eme sô omume omume n' ebe sô obube obube n' ihi na onye mgbo turu nna ya n' isi na-eji iteona eme okpu.

Nwannem nwaafô igbo biko ka anyi suô igbo, tinye ilu nke gi ebea ka anyi kwalite asùsù igbo
Ndewonu!
Ezigbo Nwannem kedu ka imere
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by Rtopzy(f): 9:51pm On Apr 05, 2017
Kedu Ku unu di?
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by nuelsylves(m): 10:20pm On Apr 05, 2017
obianuju95:
agha amara okwa ya anaghi eri ngworo mana na uwa ugbua,agha amara Okwa ya eriela ngworo chokwa iri ndi ji ukwu

Achị gbula m onwe m n' ọchị ooo. grin
Ịlụ gịa dịkwa egwu.

Mana ihe ị kwụrụ bụ eziokwu.
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by nuelsylves(m): 10:32pm On Apr 05, 2017
Nwafọ Igbo ọbụla na enweghị Igbo kiiboodu (keyboard) n' ekwe ntị ya, ga na Google play store downloaduo "SwiftKey keyboard". Ọ ga enyere gị aka nke ukwuu.
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by Nobody: 10:47pm On Apr 05, 2017
Ndi Igbo Kwe nu !
Rie nu !
Ñuo nu !!
Bie nu !!!
Kelee nu !!!!
Kwezuo nu !!!!!

Obi tokariri m ihe mmanu añu na ato, oge m huru ma guokwa edemede a, Ka anyi kwadonu asusu anyi n'ezie n'ihi na onye na amaghi ebe mmiri bidoro mawa ya anaghi ama ebe o noro kwusi ima ya.

Anyi oga enwecha nkwa na akwa aka n'obi ? Mbanu ! Tufiakwa !! Chukwu aju.

Anyi agaghi ahapu asusu anyi ga suwa nke ebitere ebite.

Ala Igbo na Ndi Igbo mara mma nke ukwu, Oga ekwekwa anyi ghota na odighi mma nwa agbogho machaa mma ewere akpa ejiri yoo akpu duoro ya akwa.

Chineke gozie anyi nile, Iseeee !!!!

Daalu nu
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by Nobody: 10:54pm On Apr 05, 2017
Umu nnem, ke egwu? ? grin
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by Nobody: 10:54pm On Apr 05, 2017
obianuju95:
agha amara okwa ya anaghi eri ngworo mana na uwa ugbua,agha amara Okwa ya eriela ngworo chokwa iri ndi ji ukwu

Egwu dikwa oooo, ebere na emetecharam ndi a ji asusu rbitere ebite mere asusu, mana Nwanyi Otele ukwu ga achoputa ihe omere onwe ya mgbe oso suru n'ahia.

Ha noro mewe oyibo, ebe okacha ewe iwe bu na ha amakwughi oyibo asu nke oma.

Asi na Osikapa na akacha agu Nwa ogbenye
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 11:54pm On Apr 05, 2017
obianuju95:
agha amara okwa ya anaghi eri ngworo mana na uwa ugbua,agha amara Okwa ya eriela ngworo chokwa iri ndi ji ukwu
Nwanne m ihe ikwu bu eziokwu, uwa anyi nô n' ime ya juputara na ndi ekweghi ekewe.
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 11:56pm On Apr 05, 2017
obianuju95:
Ezigbo Nwannem kedu ka imere
Adim mma ezi nwada, kama na Ochichi Buhari a n' emetuta m nke ukwuu
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 11:58pm On Apr 05, 2017
nuelsylves:
Nwafọ Igbo ọbụla na enweghị Igbo kiiboodu (keyboard) n' ekwe ntị ya, ga na Google play store downloaduo "SwiftKey keyboard". Ọ ga enyere gị aka nke ukwuu.
Nkeahu bu maka ndi ji android maobu Iphone, anyi bu ndi ji Nokia enweghi usoro olileanya

1 Like

Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 12:02am On Apr 06, 2017
booscy:


Egwu dikwa oooo, ebere na emetecharam ndi a ji asusu rbitere ebite mere asusu, mana Nwanyi Otele ukwu ga achoputa ihe omere onwe ya mgbe oso suru n'ahia.

Ha noro mewe oyibo, ebe okacha ewe iwe bu na ha amakwughi oyibo asu nke oma.

Asi na Osikapa na akacha agu Nwa ogbenye

Eww! Nna a i bu ezigbo nwaafô igbo. Chineke gbaa gi ume, ndewo!

1 Like

Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 7:27am On Apr 06, 2017
Ô na-abu Ebule laa azu, ô buru ogu, maka na nti dike n' aso ajo okwu. onye were Di ya mere enyi nwoke ga-ewere enyi ya nwoke mere di, n' ihi n' ô bu akwuna kawa nka, ka ô n' amata uru nwa n' aba. Ejighi akpata atufuo abu ogaranya. Ô na- abu egbuo n' iwe, elie na ônuma. kwa ubochi ngwere arigoro elu ma si ebe ahu daa, ma echi n' oga alaghachi, bikonu o bu ka ô dawa n' ala mere o ji arigoro elu?
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by DebbieLaw(f): 8:05am On Apr 06, 2017
Ekenem unu,umunnem n nnam Na Christi, asim kam jiri ohere a kele ndi no Na ogbako a ma kelekwa ndi/onye mepere mgbako a...Cha! Cha!! Cha!!! Igbo mmamma nu! Asusu igbo gaa adiriri!
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 10:11am On Apr 06, 2017
DebbieLaw:
Ekenem unu,umunnem n nnam Na Christi, asim kam jiri ohere a kele ndi no Na ogbako a ma kelekwa ndi/onye mepere mgbako a...Cha! Cha!! Cha!!! Igbo mmamma nu! Asusu igbo gaa adiriri!

Ndeewo Nnam, jiri nwayo were oche nodu ala maka n' anyi nile ga-ejiko aka ônu kwalite ogbako a.
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by chidozeze(m): 2:22pm On Apr 06, 2017
Ụmụ nne m kedụ ka unu mere?
Re: IGBO FORUM (ka Anyi Sùô Igbo. by OnowuNdiigbo(m): 3:48pm On Apr 10, 2017
Ah! Ah! I though this forum will stay long, why this unexpected stop of posting here?
Mtcheeew! I for not create this group. I didn't expect it to end this way!

(1) (Reply)

STORYBAZE; Make Money Posting, Writing And Reading Stories For Free / The Honeymoon / Book Publishing

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 19
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.