Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,150,604 members, 7,809,206 topics. Date: Friday, 26 April 2024 at 05:18 AM

Ịkpọ Ji Enugwu-ukwu Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ịkpọ Ji Enugwu-ukwu Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor (398 Views)

Enugwu Ukwu In Anambra Where Pythons & Human Beings Live In Harmony / Eze Chukwuemeka Eri, Aka Ji Ovo Igbo Leads Community To Omambala River / New Laws Guiding Burial In Enugwu-Ukwu Community (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ịkpọ Ji Enugwu-ukwu Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 7:32am On Aug 13, 2017
Mmemme ịkpọ ji obodo Enugwu-Ukwu nke afọ 2017 ewerena ọnọdụ n'ụzọ pụrụ iche na ya bụ obodo. Dika ọ bụ ihe a na-eme kwa afọ ọbụla, ịkpọ ji so n'otu n'ime omenala pụrụ iche e jiri mara obodo Enugwu-Ukwu, nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka n'ime Steeti Anambra . Ọ bụ ahụghị ebule ma sị elina dike ma bụrụkwa ihe mbụ na mbụ ndi Enugwu-Ukwu na agbụrụ Ụmụnri gbaa gburu gburu ga-emerịrị tupuu amalite ibuputa ma ọ bụ ire ji ọhụụ na Nkwọ Enugwu-Ukwu.
         Ịkpọ ji nke afọ a bụ nke pụkarichara iche ma bụrụkwa nke malitere na mgbaru a gbaruru n'ahịa Nkwọ Enugwu-Ukwu, wee si na ya gaa n'obu Ụmụnri ebe a nọrọ wee kesaara ụmụ ada sitere n’ime ogbe dị iche iche n'obodo ahụ ji ọhụụ, ma bụrụzie nke binwuuru ọkụ n'obi igwe Enugwu-Ukwu, bụ igwe Ralph Ekpeh.
         Ka ọ na-agwa imirikiti ndi mmadụ ndi bịara mmemme ahụ okwu, Igwe Ralph Ekpeh, bụ onye kpere ekpere maka ogologo ndụ, udo, ahụ isi ike na ọganiru nke Enugwu-Ukwu na Ụmụnri, steeti Anambra nakwa ala Naịjiria n'izugbe, kelere onye kpọrọ ji nke afọ a, bụ Ọzọmkpu Uche Nworji maka ịnabata ịkpọ ji ịke afọ a ma kpọọkwa ya n'ụzọ dara ụda nke ukwu, na-agbanyeghị na ọ nọ na Saụtụ Africa e wee mee ya bụ mmemme.
Ya bụ igwe nọzịkwara n'oge ahụ wee kpọkuo ọhaneze ndi Enugwu-Ukwu nakwa ndi ọzọ selitere isi ka ha ñomiri mmụọ ịputa apụta na isonye n'ihe a na-eme, nke ya bụ nwa amadi kpọrọ ji nke afọ a.
Ya bụ mmemme dọtara ọtụtụ ndi mmadụ ndi sitere n'ebe dị iche iche nakwa ọtụtụ oke mmadụ ndi bụkwa ụmụafọ obodo Enugwu-Ukwu, nke gụnyere Onoowu Enugwu-Ukwu bụ Ọzọmkpu Dennis Anaekwe, osote Onoowu bụ Ọzọmkpu Clement Nwafọr, otu onye gabụrụ ụlọ ọgbakọ ukwu sineeti nke ala anyị Maazị Ikechukwu Abana, onye isi na ọga kpata kpata nke ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, Nze Uche Nwọrah, tinyere ndi ọzọ

(1) (Reply)

Wives, Don't Call Your Husbands "Daddy". / Boy Set Ablaze Over Missing Phone In Enugu / .A

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 8
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.