Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,152 members, 7,818,482 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 05:01 PM

Ụlọ Ụka St. Philips Ọzụbụlụ Amalitekwa Ịka Ụka Ka Otu Izu Gachara. - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ụlọ Ụka St. Philips Ọzụbụlụ Amalitekwa Ịka Ụka Ka Otu Izu Gachara. (451 Views)

Ndị Nando Eguzobela Emeneka Maka Ụlọ Ọgbakọ Etiti. By Izunna Okafor / Tobi Philips Dating Ooni Of Ife, Adeyeye Enitan Ogunwusi? / The Real Interpretation And Meaning Of 7 Days (izu Asaa) In Igbo Calendar (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ụlọ Ụka St. Philips Ọzụbụlụ Amalitekwa Ịka Ụka Ka Otu Izu Gachara. by IzunnaOkafor(m): 1:05am On Aug 19, 2017
Written By Izunna Okafor

      Ka ọ gachara nnọọ otu izu ụka kpọmkwem ndi omekoome a maghị ndi ha bụ jiri wakpo ma were egbe sụọ ndi mmadụ kọtọkọtọ n'ụlọ ụka St. Philips (Katọlik) nke Ọzụbụlụ, nke dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti Anambra; ife ofufe nro malitekwara nnọọ na ya bụ ụlọ n'ụzọ pụrụ iche.
          Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na mkpamkpa dị egwu kpara na ya bụ ụlọ ụka n'abalị isii nke ọnwa Ọgọọstụ a, oge ndi obi kpọnkụ wụbatara ebe a na-efe ofufe nro dị nsọ nke elekere isii na ọkara ọnụ ụtụtụ wee were egbe dulaa ọtụtụ mmadụ mmụọ, bụ ndi nọ ebe ahụ akara chi ha ụka, ebe ọtụtụ natakwara mmerụ ahụ dị iche iche.
Mana n'ihi na a sị na agaghị eji mgbagbu ghara ọgụ, ndi na-efe ofufe na ya bụ ụlọ nsọ jiri nnọọ obi ọcha na obi ịchọ ala eze Chineke wee pụtakwa n'ụbọchị ụka gara aga ma sonye n'ofufe e fere n'ụlọ ụka ahụ iji wee kpeere Chi ha ma chọkwa ala eze eluigwe.
         Na mbụ n'ụbọchị Satọdee ka onye Boshọọpụ nke ụka Katọlik na Dịọsisi Nnewi bụ Bishọọpụ Hillary Ọdịlị Okeke gara gọzie ma dookwa ya bụ ụlọ ụka nsọ, n'iji kwadobe maka ya bụ aja maasị. Ọbụnadị ndi uwe ojii ka a hụkwara n'ogige ụlọ ụka hụ ka ha na-arụ ọrụ ha iji hụ na e nwere ezi nchekwaṅtọrọ atọ na gburugburu ahụ niile.
          N'okwu Chukwu ya na ofufe nro ahụ, bụ nle malitere n'elekere iteghete nke ụtụtụ ma bụrụkwa nke hibere isi n'ịnọgidesi ike na Chukwu'; onye ụkọchukwu Mọnsaịnọ Patrick Ezebata dụrụ ma gbakwa ndi niile bịara ụka ahụ ume ka ha nwee ntụkwasị obi n'ebe Chineke nọ, nọgidesie ike na Ya ma gharakwa ikwe ka ihe ọbụla kewapụ ha pụọ n'ebe Chineke nọ. O kwuru na onye nọgidesiri ike ruo ọgwgwụ ihe niile na a ga-azọpụta ya.
Onye ụkọchukwu nke ya bụ ụlọ ụka kelere ndi sonyere na ofufe ahụ ma gwa ha ka ha jigide okwukwe ha n'ihi na Chukwu Nna adịghị arahụ ụra.
        Otu ọ dị, ndi Dịọsisi nke ụka Katọlik na Nnewi anọrọnarịị n'izu ụka gara aga wee gbaa n'anwụ aha mmadụ iri na atọ ndi ahụ e gburu n'ihe ọdachi ahụ, nakwa ndi nwetara mmerụ ahụ dị iche iche. Ndi nke tụfuru ndụ ha gụnyere:
1.  Maazị Cyprian Ikegwụọnụ
2.  Maazị Hyacinth Ọramadike
3.  Oriakụ Cecilia Ewin
4.  Oriakụ Eunice Akanigbo
5.  Oriakụ Rose Okoye
6.  Oriakụ Añụlịka Ọbụnadike
7.  Oriakụ Uchenna Ọbụnadike
8.  Obere Nwaada Anthonia Ụfọndụ
9.  Obere Nwaada Ọlụchukwu Uhelu
10. Obere Nwaada Christiana Igbeja
11. Oriakụ Udeze Pauline
12. Oriakụ Victoria Ụzọkwe,  na
13. Oriakụ Florence Nweke.

Ndi nke natara ṅmmerụ ahụ gụnyere:

1. Ikegwuọnụ Caroline 
2. Nwakile Anthonia 
3. Okoye Ọdịnaka
4. Okoye Patricia
5. Isaac Chinedu
6. Ọramadike Chinagọrọm 7. Ọramadike Chinecherem
8. Udegbunam Chidịmma
9. Ndulue Samuel
10. Udegbunam Ọbiageli
11. Ugochi Obiajụlụ
12. Chukwueloka Chineze
13. Ọramadike Chiọma
14. Azụka Basil
15. Ọramadike Chiamaka 16. Uchechukwu Chukwueloka 17. Nwanya Ngọzị
18. Ngwuta Chinemelụm 19. Asọmba Chukwudum
20. Nnudule Leonard
21. Mụọmah Michael,  na
22. Ọramadike Favour.
Mmadụ ndi a bụkwa  di nọ n'ụlọ ọgwụ dị iche iche anara ọgwụgwọ, ebe ụfọdụ n'ime ha bụkwa ndi natachagoro ọgwụgwọ ma laakwa na be ha dị iche iche.
            Dịọsiisi ahụ sitekwara n'ozi ahụ wee mee ka ọhaneze mara na ha emegheena akara ụlọ ọba ego maka ịtụkọta ego ọrụ obi ebere iji nyere ndi ahụ ọnọdụ ahụ metụtara aka, ma na-arịọzịkwa ndi mmadụ nakwa otu dị iche iche ndi o metụrụ n'obi na ndi ọrụ obi ebere na-amasị, ka ha doo tụnye ihe ọbụla siri ha n'obi pụta iji wee kwado ya bụ enyemaka.
Akara ụlọ ọba ego ahụ bụ:

Aha:   CDN OZUBULU CASUALTIES CHARITY FUND

Ụlọ Ọba Egọ:  U.B.A.

Akara: 1020519192 

         Bishọọpụ Odịlị Okeke, bụ onye zipuru ya bụ ozi mekwara ka a mara na a ga-ahazi ego ọbụla a tụtara banyere nke ahụ nke ọma ma jirikwa ya rụọ ọrụ e jiri tụkọba ya.
          N'otu izu ahụ kwa ka osote aka na-achị anyị, bụ Maazị Yemi Osibanjọ nọrọ wee ziga ndi nnọchite anya na steeti ahụ, n'aha gọọmenti etiti, iji wee bugara ụmụ afọ steeti ahụ ozi nkasi obi nke gọọmenti banyere ihe anya mmiri ahụ. Ndi nnọchite anya mmadụ ise ahụ nke onye nọ n'isi ya bụ Maazị Chris Ngige bụ onye minista na-ahụ maka ọrụ n'ala anyị ma bụrụkwa nwa afọ steeti ahụ,  bụ ndi a nabatara nke ọma, ha na ozi ha, site n'aka osote gọvanọ steeti ahụ bụ Dọkịnta Nkem Okeke n'aha gọvanọ Willie Obianọ.
Ndi ahụ kwezịkwara nkwa na gọọmenti etiti ga-akwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ onye ọbụla ọnọdụ ya ekweghị ngwọta na Naịjiria, bụ onye e bupuru na mba ofesi maka inye ya ọgwụgwọ.

(1) (Reply)

Obaship:ibadan Should Not Be Turned Into Battleground,ccii Warns / Ibadan Family Heads Ask Olubadan To Begin Installation Of New Baales, Mogajis / Why Does The NFL Make The Most Money

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 14
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.