Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,337 members, 7,815,671 topics. Date: Thursday, 02 May 2024 at 04:18 PM

Iri Ji Ọhụụ Abagana Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Iri Ji Ọhụụ Abagana Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor (602 Views)

Eze Chukwuemeka Eri, Aka Ji Ovo Igbo Leads Community To Omambala River / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor / Ịkpọ Ji Enugwu-ukwu Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Iri Ji Ọhụụ Abagana Nke Afọ 2017. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 1:22am On Aug 19, 2017
Written By Izunna Okafor

Ọ bụ ihe oke ọñụ na mkpori dị egwu ma bụrụkwa oge igosipụta ịma mma nke ọnatarachi ndi Igbo,  ka ndi obodo Abagana  nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra nuputara n'igwè maka mmemme iri ji ọhụụ nke ya bụ obodo.
Dịka ọ bụ omenala zuru ala Igbo ọnụ, iri ji ọhụụ n'obodo bụ eze a ma na  a ga-echirịrị ma bụrụkwa ichi a ma na a ga-egbu, kwa afọ ọbụla, tupuu ndi ọbụla kpọrọ onwe ha ezi ụmụ afọ Igbo amalite isi ma ọ bụ iri ji ọhụụ na be ha dị iche iche.
       Ya bụ mmemme nke afọ a n'Abagana dọtara imirikiti mmadụ, ndi a maara aha ha nakwa ọtụtụ ndi e ji okwu ha agba izu, ndi sitere n'ebe dị iche iche n'ala Naịjiria nakwa na mba ofesi.
       Ka ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, Maazị Nwachukwu Anakwenze, bụ onye isi otu jikọtara ndi Anambra bi na mba Yụnaịted Steeti nke Amerika (USA) ma bụrụkwa onye ọrụ dọkinta bi na mba ahụ, kwuputara na ebumnobi ya bụ mmemme bụ iji gosi ụwa na ndi Igbo bụ agbụrụ Chukwu gọziri ma bụrụkwa ndi nwere ọnatarachi na omenala bụ ọka ibe na mba ụwa. O kwuputara na ndi Igbo bụ ndi na-agbasi mbọ ike, na-ejepụ ejepụ, na-akpa nwanne, ma na-elerukwa ndi ọbịa anya nke ọma.
      Maazị Nwachukwu, bụkwa Onoowu nke Abagana sị na ọ bụ ndi Igbo a tọọrọ n'oge a na-azụ ahịa óhù (slave trade) bụ ndi tọrọ ntọ ala mmepe nke mba Amerika ma sikwa na ọ bụ nke a mere ndi Amerika jiri rụọ ebe ndebe ihe ọkpụ (museum) na mba ahụ iji wee kwanyere ndi Igbo ugwu. Mmemme ahụ ka o kwupakpara n'ezie na ọ bụ oge iji nọkọọ ọnụ dịka ụmụnne wee kpaa ma kpee ekpere maka uto na ọganihu nke obodo ahụ, steeti Anambra, ndi Igbo nakwa ala Naịjiria n'izugbe.
      N'okwu nke ya, eze ọdịnala nke obodo ahụ, bụ igwe Patrick     Mbamalị kelere n'ụzọ pụrụ iche ndi niile bịara ya bụ mmemme, ọkachasị ya Onoowu banyere ezi mbọ ha niile iji wee kwalite ọdịmma nke obodo ahụ na nke ndi Igbo na mba ụwa. Ọ nọkwazịrị n'oge ahụ kpee ekpere maka ahụ isike na ọdịmma nke igwe mmadụ ahụ na ụmụ afọ igbo nọ na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu.
         Eze ọdịnala Ifite Dunu, Igwe Emeka Iloụnọ bụ onye bịara ya bụ mmemme kwuputara n'ezie na omenala bụ ejiri mara ndi, ma rịọkwa arịrịọ ka ndi Igbo n'ụwa niile jigidesie omenala ha ike ma na-akwalitekwa ọkachasị asụsụ Igbo iji hụ na ọ nwughị ma ọ bụ funahị ha dịka òtu UNESCO buru n'amụma.
        Ndi ọzọ kwuru okwu na ya bụ mmemme gụnyere maazị Ben Ụgha, bụ onye isi otu na-ahụ maka ọdịmma nke Abagana, onye D.P.O  ndi uwe ojii n'Abagana bụ Ọkaiwu Dan Uke, onye gabụrụ ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra n'oge gara Họnọrebụụl George Ike-Okoye nakwa ụfọdụ ndi ọzọ.

Ịgba egwu ọdịnala dị iche iche nakwa igosi ihe ngosi dị iche iche e jiri mara Igbo so n'ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ. Ihe ndi ọzọ merekwara ka mmemme ahụ zaa aha ya bụ: iwa na ikesa ji ọhụụ ahụrụ ahụ, bụ nke e jiri mmanụ akwụ, ụkpaka, ose nakwa akwụkwọ ụtazị mara abụba wee chọọ mma, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi, nke e jiri gbanyere ya ụgbọ nwamkpi

(1) (Reply)

Gender Equality / “I Should Have Been Corrected With Kid Gloves” – Bra Less Akwa Ibom Teen Queen C / Much Ado About Totemism In Igboland

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 13
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.