Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,809 members, 7,817,346 topics. Date: Saturday, 04 May 2024 at 10:41 AM

Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr (466 Views)

UGIE EWERE Festival, Please Lovely Edo Brethren,what Does It Signify / National Light Ewere Oke Mmemme Cheta Ọgbụgba Ahọ Anọ Onyeisi Ha N'ọkwa / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr by IzunnaOkafor(m): 4:06pm On Jan 10, 2020
Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụụ n'Ụkpọr bụ isi obodo okpuru ọchịchị Nnewi South na nso-nso a, dịka ndị obodo ahụ jiri óke ọñụ wee merùbe ụbọchị Ụkpọr nke ahọ 2019.

Ya bụ mmemme omenahọ bụ nke dọtàrà ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ sitere ebe dị iche iche wee bịa, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye onyinye nkwanye ùgwù nyégára ụfọdụ ndị Ụkpọr mepụtagòrò ihe dara ụda na ngalaba agbambọ ha dị iche iche.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi oche 'Ụkpọr Improvement Union' (U.I.U), Maazị Emmanuel Nwachukwu mère ka a mara na mmemme ahụ na-enye ha bụ ndị Ụkpọr òhèrè pụrụ iche iji zukọọ dịka ụmụnne, wee kparịta ụka n'ihe gbasaara ya bụ obodo, dịka o siri metụta otu ha siri mee kwà ahọ ọbụla, ya na otu a ga-esi kwàlitekwu ọnọdụ mmepe obodo ahụ na ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ ya.

Ọ kpọpụtàsịrị ụfọdụ ihe dị iche iche e mepụtàgòrò n'obodo ahụ n'ime ọchịchị ya, nke gụnyere: ịhụ na a na-enwe ọkụ latiriiki gbàà-nyụụ (n'Ụkpọr), inwòghàrị na ịgbanwe Ahịa Nkwọ-Ọha ka ọ zabazie 'Ukpor Daily Market' (UDM); iwu ụlọ ahịa karịrị anọ na ọdụ ahịa karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ, tinyere akụrụngwa e ji enyere ndụ aka, bụ nke a rụrụ site n'okpuru atụmatụ ọrụ nkwàlite mmepe ime-ime obodo, nke Gọvanọ Obianọ sìtére na ya wee na-enye obodo dị iche iche ego iji họrọ ma rụọ ihe gụrụ ha.

N'ihe gbasaara onyinye nkwanye ùgwù ahụ e nyèrè ụfọdụ Ndị Ukpọr ụbọchị ahụ; Maazị Nwachukwu kọwàrà na nke ahụ bụ ótù ụzọ ha tụpụtàrà isi na-akwayere ụmụafọ obodo ahụ ùgwù, bụ ndị mepụtàgòrò ihe dara ụdà na ngalaba agbambọ ha dị iche iche, nke gụnyere ngalaba ọrụ oyibo, iji ego achụ ego, ngalaba mmụta, ngalaba azụmahịa na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ Maazị Moses Okezie Okafọr, bụkwa onye enyemaka pụrụ iche nyegara Gọvanọ steeti Kogi, kpọkùrù ndị obodo ahụ ka ha na-agbasòsi udo na ịhụnanya ike dịka a hụghị ebule ma sị elina dike n'ihe gbasaara ịkwàlìtè ọnọdụ mmepe obodo ọbụla na agamnihu ụmụafọ ya.

Ka ọ na-enyefe ụfọdụ ndị mmadụ onyinye nkwaye ùgwù ahụ, nnukwu onye ọbịa pụrụ ichè na mmemme ahụ, bụ Maazị Ben Ahanotu, bụ onye ọ bụ naanị ya nwètàrà nkwanye ùgwù ahụ n'ahọ 2018, kwupùùrù mmadụ iri na ise ọhụụ ahụ natara ya bụ nkwanye ùgwù, ma dụọ ndị enwetaghị ka ha jisiekwa ike n'ọrụ ọma ha, n'ihi na o nwere ike ịbụ ogè nke ha mgbe ọzọ.

Ọ rịọkwazịrị ndị Ụkpọr, ọ kachasị ndị bi na mbà dị iche iche ka ha na-echetakwa na ọ na-abụ àkụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya, ma rịọ ha ka ha jisie ike na mbọ ha na-agba ma gharakwa ichezọ na o nwèrè ebe ha sìrì pụta.

N'ozi mmechi ya, onyeisi oche òtù ọrụ haziri ya bụ mmemme, bụ Maazị Odịlị Ujubụọñụ kèlèrè isi ọchịchị U.I.U, maka inye ha òhèrè iji jeere obodo ha na ụmụ Ụkpọr ozi, ọbụnadị dịka o kèlèrè ndị tụnyere ụtụ n'ụzọ dị iche iche, iji hụ na ya bụ mmemme gara siriri-wèrèrè. O kwèzịrị nkwà ịga n'ihu n'ịtụnye ụtụ nke ya na mmepe obodo ahụ, na n'iji obi ya niile jeere ya bụ obodo ozi oge ọbụla a kpọkùrù ya.

Mmemme ụbọchị ndị Ukpọr nke ahọ 2019 dọtàrà ime ógbè iri ise na anọ dị n'obodo ahụ, ma dọtakwa ọtụtụ ndị dị iche e ji okwu ha agba ìzù, nke gụnyere eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Felix C.N. Ọnyịmadụ, onye jibụrụ ọkwa dịka ọkà okwu ụlọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ; Onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' bụ Maazị Chieloka Okoye; tínyéré nwa amadi ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwàzịrị na mmemme ahụ gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, rie ọtụtụ nri e jiri mara ndị Igbo, ma mekwazie ọtụtụ ihe nkiri dị iche iche mere ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

1 Like

Re: Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr by chimezieeze98: 8:07am On Jan 15, 2020

(1) (Reply)

Benin Voodoo Masquerade / You're Not A Real Yoruba If...... / Preserve Igbo Language, Culture: Amanuke Monarch, Igwe Dennis Ezebuilo Charges

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.