IKnowevents's Posts
Nairaland Forum › IKnowevents's Profile › IKnowevents's Posts
omenkaLives:Lolzzz this boy, it seems only ONE thing makes you happy in your merited miserable life, hatred for Igbo people. It's good sha. Be happy it's necessary for your health. |
mrvitalis:I know that when we are hateful human beings we ought to find every irrational reason to give for our infantile hatred. But don't you think that most of the stupid lies you are spewing here is getting seriously puerile and shows a bit of your foolishness? |
4. Chaina Gosiwapụtara Ike Ha N’ụwa Dum Ụdị ike Chaina na-akpa ugbu a, agwa gị na ha nwere ike ime ya n’afọ iri atọ gara aga, i gaghị ekweta ma ọlị. Ya bụ obodo na-agbanwe dị ka obodo nwere ike ime ihe ọ bụla na mba ụwa dum, site n’atụmatụ ha ji eso mba ụwa dum ugbu a. Ya bụ mbọ ịbụ ejesịaọgwụ na mba ụwa bụ nke ha na-eme na ngalaba nile. N’afọ gara aga, ha jikere ịkpọga mmadụ n’ọnwa, nanị mba Amerịkà mere nke ahụ ihe karịrị afọ iri anọ gara aga. Kemgbe ahụ o nweghị ndị ọzọ nwere ike ya. Ha gara n’ihu tinye onyokomita iji chọpụta na o nwere ndụ ọzọ dị n’okpuru anyanwụ anyị (Aliens). Iji hụ na azụmahịa ha na ihe ha na-arụpụta zuru mba ụwa dum ọnụ, ha rụrụ ụzọ okporo igwe si obodo ha ruo mba London, ama m na i ghọtara ihe nke a pụtara? Abịa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo, anyị hụkwaziri ike ha. Ịmā na ọ bụ Chaina nyere nkwado iji chụpụ Mugabe n’ọchịchị na Zimbabwe? Jiri nke a mara ike ha nwere n’Afrika. Ego ha tinyegolu n’Afrika karịrị ijeli kwuru ijeli dọlà, nke a na-enyezi ha ike n’Afrika. Ugbu a, ha bụzi obodo nwere ike itinye mba Amerịkà aka n’ọnụ, n’atụghị ụjọ, Amerịkà itabi ha aka. N’afọ a, anyị ga-ahụ ka ike ha ga-abawanye, ọ kachasị n’Afrika na mba Eshia. www.odeniigbo.com |
3. Anapụrụ ISIS Alaeze Ha, Ma Chụpụ Ha N’obodo Nile Ha Ji Ọchịchị. N’afọ anọ gara aga, ka ISIS sepụtara isi ya iji we yie ụwa egwu. N’afọ ahụ ha kere obodo abụọ ọkara; Siria na Irak, ma weghara ọchịchị obodo ahụ. Ebe ahụ ka ha si wee gbasa aka iji memina ọtụtụ ndị n’aha “Allah”. Bido n’afọ 2016, ha bidoro inwete ihe mgbu dị iche iche, mgbe ndị agha obodo Siria, USA na Kod jikọrọ aka ọnụ igbuso ha agha. N’etiti afọ a gara aga, anapụrụ ha ebe ha ji mere isi obodo bụ Mosul n’Irak. N’ọnwa Ọktọba, isi obodo ha di na Siria bụ Rakaa, pụnarịrị ha n’aka. N’ọnwa ahụ kwa ka a chụpụrụ ha kpamkpam na Irak. N’ọnwa Nọvemba, a napụrụ ha obodo ikpeazụ ha ji na Siria bụ Albu Kamal. Ka ọ dị ugbu a, e tiela ha mmanwụ n’isi. Anyị kwetere na ha na-agbazi rịkọrịkọ ọnwụ ugbu a, ma nnukwu nsogbu na-esepụta isi na mba Arab maka mmeri a emeriri ISIS, nsogbu ga-adị egwu na 2018. Mba Siria na Irak, na-akwado igbuso onwe ha agha ugbu a ISIS nyere ha efe. Ọ bụrụ na-akpachaghị anya, ya bụ agha ga-eri isi ọtụtụ ndị ma tikọọ ọtụtụ obodo isi ọnụ, ọ kachasị mba Saudi Arabia na-achọ ibe Irak ọdụdụ. www.odeniigbo.com |
2. Mba Dị n’Afrịka Gbara Ndị Ọchịchị Aka Ike Ha Ụgbọ Nwa Mkpi O nwere onye na-amaghị Mugabe? Ọchịchị ya na Zimbabwe tọrọ ọtụtụ ndị na-agụ edemede a ugbu a, nke a bụ maka na ọ chịala obodo ahụ ihe ruru afọ iri atọ na asaa (37). Echiche ya bụ na ọ ga-achịgide ganye n’ọnwụ, nwunye ya eweghara mgbe ọ nwụrụ. O nweghị onye na-agbayasi echiche ya a, ganye mgbe nchụpụ ya mere onye ọ bụla voom n’anya, amaghị m na Mugabe aghọtala ihe mere mgbe ahụ we ruo ugbu a. Na Gambia, ndị obodo ji mbinye aka gbaa Yayaha Jammeh ụgbọ nwa mkpi, ma o fere isi kpakakpaka na o naghị apụ, ganye na ihe ka nte abịakwute nte n’ụlọ. Nke a bụ na ọnọdụ ndị ECOWAS iji ndị agha ha nye ya ọsọ. Adama Barrow, onye nwere mgbe ọ bụ onye nche ụlọ ahịa weghara ọchịchị obodo. Nke ahụ mere ya afọ iri abụọ na abụọ kemgbe e mere nhọpụta onye ọchịchị obodo na Gambia n’ụzọ kwesiri ekwesi. N’Angola, Jose Dos Santos nyere ogbo ya bụ Joao Luorenco ike ọchịchị ka o wee nwe ike ịla ezumike nka ka ọ chịsịrị obodo ahụ ihe ruru afọ iri atọ na asatọ! Joao tụgharịrị napụ ezi na ụlọ ya ike nile ha nwere n’obodo ahụ. N’afọ a, ka anyị ga-ama na ihe nile ndị ahụ a ga-abara Afrika uru, ka ọ bụ ịnapụ oke azụ, nye ya busu ka o chekwa. www.odeniigbo.com |
1. USA Kwupụtara Na Jerusalem Bụzi Isi Obodo Izrel, Na Echiche UN Gbasara Ya. Ka ọnwa gara aga gbara ụbọchị nke isii, Trump onye isi obodo Amerịkà, mara ọkwa nke wetere ọmajijiji n’ụwa ndị ụka Alakụba na n’obodo dị iche iche. Ya bụ ọkwa bụ na ha ga-ebido ịhụ Jerusalem dị ka isi obodo Izrel, na ha ga-egosipụtakwà nkwenye ha site na ịrụ embasi ha na Jerusalem nso nso a. Ọkwa ahụ tupu ọ na-apụsị Trump n’ọnụ, wetere ngagharị iwe n’ọtụtụ mba ndị Arab. Nke a bụ maka na ndị Ụka Alakụba na-ekwupụta na Jerusalem bụkwu obodo nsọ ha. UN na nzukọ ha mere n’afọ 1947, kwupụtara na o nweghị mba ụwa nwe Jerusalem, mana ndị Izrel ekwenyeghị na nke a ma ọlị. N’ihi ọkwa a Trump mara, ndị UN kpọrọ nzukọ ha n’ọkụ n’ọkụ iji tụọ votu maka ọnọdụ UN gbasara ime Jerusalem isi obodo Izrel. Na ya bụ nzukọ, obodo otu narị na iri abụọ na asatọ (128) kwụnyere UN n’ikwupụta na Jerusalem agaghị abụ isi obodo Izrel, Naijiria so na ya, ebe obodo itoolu kwụ Amerịkà n’azụ, obodo iri atọ na ise atụghị ya votu. Ka emechara nke a, Netanyahu onye ọchịchị Izrel kwuru na emere elu, emere ala na Jerusalem bụ isi obodo ha, na ha agaghị ege ntụziaka UN ntị. Mba Amerịkà ji ikikere ha nwere na UN, we katọọ mbinye aka obodo ndị ahụ agbasoghị ha n’azụ. Ya bụ na ha na-aga n’ihu na nkwenye ha ime Jerusalem isi obodo Izrel. Ọtụtụ obodo ndị Arab, gụnyere Tọkị, Iran, Palestain foro ntutu taa kwuo na ha ga-agba ya bụ atụmatụ mgba n’ụzọ abụla ụzọ iji gbochie ya. Ndị ụka Alakụba nwekwaziri nkwenye nke ahụ, obodo Maleshia na-eme ngagharị iwe kwa ụbọchị maka nke a. Atụmatụ a nwere ike ịbụ n’afọ a ka anyị ga-ahụ isi ya, ma mara amala na ọ ga-ata isi ọtụtụ ndị. www.odeniigbo.com |
In our bid to promote the reading and writing of our indigenous Nigerian languages, we present this. Ekele dịrị Chukwu na onye ọ bụla na-agụ ihe nke a batara n’afọ 2018. Ndụ bụ isi, ihe nile ndị ọzọ ga-eso ya. Taata iji nabata onwe anyị n’afọ ọhụrụ, anyị ga-elekwasị anya n’ihe ise dị nnukwu mkpa mere n’afọ gara aga, ọ kachasị ndị bụ ude asụrụ na mba nụ ya na mba. Ndị ụzụ ha ga-emetụtakwa anyị n’ụzọ pụrụ iche n’afọ 2018. Ka anyị gbapụ ọsọ, ogologo okwu adịghị n’ụka mgbede. www.odeniigbo.com |
removetheturban:So many people eating, enjoying and feeding people with ignorance. Do you know that Santa is from a Latin word Sancta, meaning, HOLY? You don't celebrate Christmas? Beautiful, fine and good. Allow people celebrating to celebrate. Maybe as god wey you be, tens of billions of christians that have been celebrating and will continue to celebrate it are in your hell ba? |
GavelSlam:It goes without saying that you are correct. Btw, I believe we just communicated like HUMAN beings now and it's beautiful, will love your communication here to start being devoid of tribalistic slurs. It might be difficult for you to achieve, but one comment at a time. I believe if you can change gradually and stop giving every issue tribal angle, some like minded individuals from both sides might borrow a leaf. It makes Nairaland a bore to go through and more of a childish platform. Thanks in anticipation of either acceptance or insults. God bless. |
GavelSlam:Go to Ifite Awka, go to Commissioner's Quarters... they are even lucky for four days of no light. Some areas are much unlucky, seeing cumulatively 12hrs of light in a WEEK. And paying bills like say na dem de support the National Grid! |
Hmmmm and in Awka here we still have four days of no light in every week! |
Beautiful. Whether it adds or removes anything from the happenings in the state, that's a moot issue. It's good to imbibe the culture of responsibility amongst the children. Which child wouldn't like to be in such spotlight? Btw there is a lot of sad fellows in this Nairaland spreading venom and hatred as if their lives depends on it. In one of the threads about this topic the sort of outpour of hatred they showcased there is unfathomable. Potential psychopaths full here. |
aribisala0:Yoruba will rule for the next one million years in Nigeria. In fact Nigeria presidency is going to be Yoruba hereditary right. Hope you're now fully satisfied and can sleep better? |
omenka:Lolzzz this boy the way Igbo news de do you for body is not here. It's good to see you happy once more. I can visualise the evil grin on your face as the news keep dripping in, you become your happiest self when the talk becomes of death befalling them from the hands of the military. Be happy dear, to hate is not a vice for the fainthearted. Rejoice in your old found hatred, rejoice boy. |
Nutase:Just to keep the record straight. I realised many comments here are borne out of unidentified hatred. We have seen several videos, and images of Kanu moving around with his wife here in the East. The wife has been seen meeting with women wing of IPOB. Actually those reports are here in Nairaland, supposedly you might have seen them and made some spiteful comments too. She marches with the husband. The parents and siblings reside there in Abia. Do you want him to bring in his neighbours from London too to Aba? Let's be factual in our comments and not turn the facts upside down. Now tell me what else you want? Or you want his children to march around with the adults? Because Nutase needs to be convinced? Just setting records straight, devoid of ANYTHING. |
No matter how you try to tie up the truth, with time it will untie itself. OP and Co always trying to lie against the truth. Manufacture a new lie bro, the truth has already untied itself on this one. |
Lol months of hardwork from the London vacation. Na market, and naira buying power will tell us recession don end, not analysis. We adapted to recession. |
momentusjay:Daalu. Achobeghi m ikweta na anyị enweghị ịhụnanya maka onwe anyị. Ihunanya nwere ike idi, kama na anya ukwu na achom nke onwe ekweghi anyi jiko aka onu mee ihe itunanya maka odimma nke ala anyị. |
Ya gaziere onye ukwu na onye nta! Egbe bere, ugo bere... |
Na ngwụsị, ihe aga-eme eme karịrị akarị, mana ọsọ enweghị mbido anaghị enwe ọgwụgwụ. Ihe dị n’ala steeti Ebonyi na-eche anyị bụ aja dị n’ala, na ha na-akọpụta nri abụghị akụkọ, osikapa Abakaleke dịbara kemgbe ihe karịrị afọ atọ gara aga, keduzi ihe kpatara na kama ọ ga-agaba n’ihu, ọ bụrụla ihe ncheta? Nnukwu ụlọọrụ ama ama nwee ngalaba ha n’ala Igbo ọ bụ arụ? Ihe nile ndị a ịbata n’ala anyị bụ site na otu anyị si tụ okwe anyị. Ka anyị ga ala Jamani na Izrel mụta ihe na mmepe ha, Izrel i na-ahụ ugbu a bụ nnukwu ikpa ihe dịka afọ iri isii gara aga, obodo ahụ chakere maka na ndị na-achị achị nwere echiche mmadụ, nwee ike ihụ ihe ga-eme echi, nanị ihe ndị nke anyị na-ahụ bụ gbagam akaụnt ha ga-ada. O nweghị ihe mmadụ chere echiche nke ọma ma bido nke anaghị enwe ngwụsị. Kedu ihe ga-egbochiri anyị inwete ezi ọganihu n’ala Igbo? Ụfọdụ ga-asị na gọọmenti etiti agaghị akwado ihe ndị a, ajụjụ m abụrụ kedu uru gọọmenti etiti baara anyị na ọ bụrụ na ha achọghị ọganihu anyị? Ego abụghị ya ji ọrụ n’ụdị ihe ndị a, maka na ndị ji ego achụ ego ma uru ha ga-erite na ha tụnye ego ha na ya. Ọ bụrụ na ndị gọvanọ anyị na ndị ọchịchị anyị enweghị ịhụnanya, ka anyị munye ya bụ ọkụ n’ime ha. Ka nhọpụta ndị ọchịchị anyị ugbu a bido igbado ụkwụ na ndị hụrụ ala Igbo n’anya, ndị tụnyegolu ọtụtụ ihe n’ala Igbo, ndị ma uru dị n’ala anyị, ndị omume ha na-egosi agụụ idozi ala anyị. Oge agaala mgbe okwu dị mma nze a taa ọjị, okwu adịghị mma nze ataa ọjị. Ka ozi a ruo ndị isi anyị aka. Kwado asụsụ Igbo; kwado Odeniigbo www.odeniigbo.com |
4. Briten, Amerịkà Na Chaina Inwe Ngalaba Embasi Ha N’ala Igbo(Consulate). E kee ihe nile nọ na ahịa ‘Main Market” ụzọ abụọ, otu ụzọ atụọla ụkwụ na Chaina, otu ụzọ n’ụzọ ise na-echu ya ka mmiri maka ibute ahịa ha. I gaa n‘ụlọọrụ ebe nnochite anya ndị Amerịkà na Briten dị na Legọsụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri na-achọ visa ebe ahụ bụ ndị Igbo. Anyị na-agafe ikpa asaa na mmiri n’asaa na anyị na-aga Legọsụ màọbụ Abuja ịga weta visa ndị a. Legọsụ dịrị ndị ọdịda anyanwụ nke Naijiria nso, Abuja dịịrị ndị mgbagọ ugwu nso, ebe anyị nwere ọtụtụ ndị si n’ala Igbo aga obodo ndị a, o ruru anyị ịgba mbọ ime ka ha nwee ngalaba ha n’ala Igbo. Amaghị m ihe kpatara na anyị anụbeghị nkata maka nke a? Ndị gọvanọ ise anyị nwere kpọọ nke a ihe, ma sòchie ya n’ọkụ n’ọkụ, ụmụnnaa anyị ga-ahụ na onweghị ihe nyịrị omume! Steeti Enugwu pụrụ inabata ha atọ, ha nwekwuru ọdụ ụgbọelu na-aga obodo oyibo. Kedu ihe anyị na-eche kemgbe afọ iri isii gara aga? Onye ọbụla ekọnọmi doro anya ma NNUKWU mkpa na NNUKWU ihe ụdị ihe a ga-ebute n’ala Igbo. www.odeniigbo.com |
3. Ọkụ Eletrik. Nanị ihe abụọ ka EEDC dị mma ya, ịnakọ ụgwọ ọkụ ma ọkụ adị ma ọdịghị, ya na ihụ na ọchịchịrị gbachiri ebe nile kwa mgbe. NEPA ka ha mma ugbu a. Ọtụtụ ụlọọrụ ma nke ukwu ma nke nta emechisiela, maka mbọ ndị EEDC na-agba. Amaghị m na ndị gọvanọ anyị ama maka ahụhụ nke ya bụ ụlọọrụ na-ewetara anyị n’ala Igbo a? Achọghị m ikwu maka wuru wuru chawapụtara ka anyanwụ tupu ha eweta ikikere ikesa ọkụ n’ala Igbo. Ndị gọvanọ anyị oge eruola mgbe ụnụ ga-esibe mmadụ mmadụ kwụsị isi mmụọ mmụọ ma chọwa ụzọ dị iche iche anyị ga-esi wee merie ike ọchịchịrị n’ala anyị a, ọkụ dịba, nke ọma, onye ngwọrọ ga-agba egwu n’ala a, ọtụtụ aka ọrụ ga-achawapụta. Atụmatụ ewepụtara maka ọkụ ịdị kwadaa n’ahịa Arịarịa dị mma, ka anyị nyocha ya ma webata ya n’ọtụtụ ebe ọkachasị ebe nwere ọtụtụ nnukwu ụlọọrụ. Ihe aga-eme maka ikwalite ọnọdụ inwebe ọkụ karịrị akarị, ihe ọ fọdụrụ bụ ibido mebe ha. www.odeniigbo.com |
2. Ikwalite Ọdụ Ụgbọ Elu Nke Enugwu, Imo Na Nke Anyị Na-Ele Anya Ya n’Anambra. Anyị ma mgba ọtụtụ gbara iji gbochi ime ọdụ ụgbọelu nke Enugwu ka ọ bụrụ maka ịga mba ofeesi. Anyị makwazi na ọ bụ otu ọnwa ka eji mee nke Kaduna ka o ruo ogo iji na-anabata ụgbọelu obodo oyibo n’afọ a. Chee echiche maka nke a. Mbọ nile a gbara maka nke Enugwu dị ka ọ nara n’iyi n’ihu ndị ọchịchị ndị Igbo? O nwere ihe e mere anyị n’anya? Kedu ihe mere na we ruo ugbu a anyị etibeghị ebe ahụ ka mmanwụ Ijere, kụọ ekwe mee ka ndị nile si ala Igbo agbaga Legọsụ maka ịba ụgbọelu bido were nke ahụ kpọba ihe? Gịnị mere na wee ruo ugbu a na ọ bụ nanị ụlọọrụ njem ụgbọelu abụọ na-arụ ọrụ ebe ahụ? Ọ dị anyị ka o na-enweghị ihe a ga-eme ka ọtụtụ chube ebe ahụ ka mmiri? Ka ọ bụ na odoghị anyị anya ụmị ego dị n’akwado ebe ahụ nke UKWU? Ọtụtụ na-esi Enugwu banye ụgbọala gaa Legọsụ ịba ụgbọelu, anyị e meela ebe ahụ ka o lekasịa ka akwa nwa mgbi. Anyị akpọọla ala Igbo komkom, ụmụaka ewere anyị sibe nri aja! www.odeniigbo.com |
1. Ikpocha Ọbụala Nke Oshimiri Naịja. Nke a bụ ihe gọọmenti nile chigolu Naijiria ji eto ndị Igbo akpịrị, ịpụta ihe ya nwere ike ịbụ na afọ narị atọ na anyị chebe gọọmenti etiti. Ha nile ma uru ikpochasị aja oshimiri Naịja dị nyere ala Igbo, o ga-eme ka anyị chakee. Ma ruo ugbu a, ihe yiri shovel abanyebeghị ebe ahụ iji mee ka nke ahụ nwee isi. Kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ, nanị okwu maka ya ka a ka na-ekwu. O na-agba anya mmiri na ndị nile chịrị ala Igbo ma mkpa nke a dị, ma mee ihu na anya ka a aga-asị na ọ baghị uru. Ihe dị na ya ga-eri NNUKWU ego, mana ya bụ ọrụ ga-abụ ori anyụ, ihe ọbụla o riri ọ ga-agbọpụta ya afọ ole ma ole ma arụsịa ya. Gọọmenti etiti agaghị eme ka o nwee isi, ndị ụlọ omebe iwu ọkachasị ndị si n’ọdịda anyanwụ achọghịdị iji ntị ha anụ ya. Oge eruola mgbe steeti ise dị n’ala Igbo ga-ejikọ aka ọnụ, chọọ nnukwu ụlọọrụ na-ahụ maka ikpocha na ịrụ ebe ọdọ ụgbọmmiri, ha nile ebinye aka, nwee ezi nkwekọrịta nke ga-abara anyị uru maka ikpochasị aja dị n’ala oshimiri Naịja. E kpochasịa ya bụ ebe, gọọmenti ala Igbo ga-eji ezigbo atụmatụ labata ndi Igbo nwere ụgbọ na-ebubata ibu ka ha tinyebe isi ebe ahụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri na-ebubata ahịa na Legọsụ tinye isi ebe ahụ, mmanwụ ga-agba n’ala Igbo. E mee nke a ihe ruru otu afọ, ọbụghị n’akwụkwọ ka anyị ga-agụtaba uru ọ bara, onye isi ga-ahụ ya. Gụọ maka ụzọ mmiri (canal) nke Panama na Suez, arụrụ ha abụọ tupu o nwee ihe dị ka Naijiria, e mee ihe dị otu ahụ na steeti Imo màọbụ na Abịa, uru ya ga-adigide ụwatụwa. www.odeniigbo.com |
Ka m jụkwa, o nwere ihe gbochiri ndị Igbo ikwalite ma dozie ala Igbo na Naijiria? O nwere iwu machiri ndị gọvanọ ala Igbo ijikọ aka ọnụ, wepụta atụmatụ tinye ya n’eserese, ihe nile ha chọrọ ka ọ gazie n’ala Igbo, tinye oge ma wepụta obi ha ihụ na ọ mịtara mkpụrụ? Ndị Awụsa jikọrọ aka ọnụ kwuo na ọ bụ ọchịchị ka ha chọrọ, nnukwu ọrụ gọọmenti nile dị n’Abuja, na ọrụ kakị nile, wee ruo ugbu a ọchịchị obodo a dị ha n’aka, ma ha ewepụtara onye isi obodo ma ha ewepụtaghị ya, onye ọbụla na-eku ha ka akwa. Ndị Yoruba e foro ntutu taa, kwuo na kama ihe dị na Legọsụ ga-abata ala anyị, ka nke anyị nwere bata Legọsụ. Obasanjo kaba ahụ mee ka steeti ya bụrụ isi obodo ọtụtụ ụlọọrụ site n’ime ka ọ dị mfe iwebata gasị maka nnukwu ụlọọrụ ọbụla tinyere isi ebe ahụ, ha si otu a jide ego karịa ma ndị na-amịpụta mmanụ, wee ruo ugbu a anyị na-echu obodo ha ka mmiri. Nanị ihe ndị ọchịchị ala Igbo dị mma ya bụ i na-eti “Wan Naijiria” ya na igosi ndị Awụsa na ha ka hụ ha n’anya karịa ndị Igbo bụ ụmụnne ha, ga jụọ ese. Kedu ihe anyị ga-eji n’aka ugbu a kwuo na ọ bụ “Igbo Ajenda” n‘abụghị ndị ọchịchị anyị ihulata ala debe isi ka e bo ha ibu arụ Naijria. Abụmonye Igbo anaghị enye ha ngala. Gbagaam oge eruola mgbe anyị ga-ejikọ aka ọnụ kwalite ala Igbo, ihe ahụ anyị na-achọ n’uko elu, ka anyị hulata ala nwete ya n’uko ala. Oge eruola mgbe anyị ga-ewepụ olileanya anyị na gọọmenti etiti, anyị a ga-eche ha ruo afọ narị abụọ? Ndị gọvanọ anyị na ndị ọchịchị ga-etinye anya na mmiri mee ihe ndị a, na ọbụrụkwa na ike ọrụ ga-adịnwu ha. www.odeniigbo.com |
African Language Time. Hope the moderators here give permissions to discuss issues using our different native languages, it will fuel linguistics interest and pride in ones root. Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Ala Igbo Anaghị Enwekebe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọ Ha Kwesiri Ijikọ Aka Mee. Izuụka a ihe abụọ batara m n’isi ide. Nke izizi bụ ọnọdụ ala Igbo nọ na ya, enweghị ike nke ndị gọvanọ anyị ijikọ aka ọnụ kwalite ma bulie ala Igbo elu, ọkachasị n’ihe gbasara ezi achụmnta ego, nnukwu ụlọọrụ, ezi okporo ụzọ na ezi ọchịchị wdg. Ihe ọzọ batakwaziri m n’isi bụ ịchaka EEDC nke Emeka Ọfọ nwe ji anyị eti n’ala Igbo. Ụgwọ ọkụ anyị na-akwụzi nọ ọdụ ka ọ bụ onyinye ka anyị na-enye ha maka ezi ọchịchịrị nke ha na-enye anyị kwa mgbe. Anaghị afọnye aka abụọ n’ọnụ, ya bụ ka anyị were otu, debe nke ọzọ maka echi. Mgbe ọ bụla m si ala Igbo ga ihe dị ka Legọsụ mà ọ bụ Abuja, ihe na-agba m n’isi na-akarị akarị. Otu n’ime ha bụ ọtụtụ ndị Igbo bijuru ọkachasị na Legọsụ, na ijụ onwe m ihe kpatara nke a. Ụgbọala na-esi ala anyị aga Legọsụ kwa ụbọchị karịrị narị atọ, ụbọchị ọ bụla ego karịrị nde kwuru nde si ala anyị apụ maka isu ọhịa n’ala ọzọ, maka ịchọ ihe anyị kwesiri inwe n’ala anyị. Gịnị mere na ahịa ahụ anyị na-aga Legọsụ agbapụta, njem obodo oyibo anyị si Legọsụ apụ, visa anyị na-aga ịchọ na Legọsụ, ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị ga-apụrịrị n’ala anyị ga Legọsụ mà ọ bụ Abuja inwete, gịnị mere na ha abụghị ihe ndị anyị nwere ike inwete n’ala anyị na-ataghị ahụhụ ghaa ikpa asaa na mmiri asaa ịga weta ha? Ọ bụ iwu na anyị ga na-agbarịrị okporo ụzọ ihe karịrị awa asaa kwa mgbe tupu ọtụtụ ihe ndị a e ruo anyị aka? Anyị emeela ihe dị otu a ihe karịrị afọ iri isi, ndị gọvanọ nile anyị nwere ma ndị ochie, ndị omebe iwu ma nke ukwu na nta si ala Igbo, anaghị eche echiche maka ikwalite ala Igbo n’ozuzu oke ya. Ha nile na-agba mbọ nanị maka akpa ha, ebe ọtụtụ n’ime ha na-agba mbọ nke ukwu iji gosi na ha hụrụ Naijiria n’anya karịa ala Igbo(omume ndị e meriri n’agha na-achọ nnabata) ma chefuzie na ogoli na-esi n’ụlọ mara mma we pụta ezi. Gịnị mere na ndi gọvanọ ochie steeti ise anyị nwere ebighị n’ala Igbo ugbu a? Nke chịsịa, o kwanaa Abuja mà ọ bụ Legọsụ, ụfọdụ n’ime ha ụmụ ha amaghị ama nna ha. Nleta ka ha na-eleta ala Igbo, ihe ndị ọzọ ahụ ha debere n’obodo ndị ọzọ na-echu ha ụra, kedu otu mkpụrụ ihe gbochiri ha iwebata ha nile n’obodo ha chịrị na ya? Ntutu isi ha aga-efopucha na ha weta nnukwu ụlọ ọrụ nke ọtụtụ n’ime ha ji ego steeti we kwalite n’ala Igbo? I gụkọọ akụnụba ha na ụlọ ọrụ ha nwere n’ala Igbo na nke ha nwere n’obodo ndị ọzọ, i ga-achọpụta na nke ha nwere ebe a bụ ka e wee sịkwa. Ihe ndị a bụ iji gosi enweghị ịhụnanya na mmadụ anaghị echepụrụ ala ya ezi echiche. Ndị nke na-achị ugbu a, chee aka ghọrọ otu ha ga-esi mee voom na ọchịchị ha gasịa. http://www.odeniigbo.com/articles.php?id=326 |
Tonymegabush1:Hope you don't mind? It is Sapientia FM, Latin word meaning, wisdom. Daalu |
