Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,153,159 members, 7,818,519 topics. Date: Sunday, 05 May 2024 at 05:50 PM

O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A (632 Views)

TCN: Free Electricity Is Mere Propaganda / Rivers APC Reacts To Supreme Court Judgment, Calls It Mere Academic Exercise / Talk Of Cabal Running Buhari’s Govt Is A Mere Myth – Tinubu (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(m): 12:02pm On Aug 12, 2017
Ọtụtụ ihe mere n’izu a, ọ kachasị ihe mwute na ihe akụkọ enweghị ọgwụgwụ, ka anyị lebanye anya n’ụfọdụ n’ime ha anya, ma kpakwazie maka ha.

1. Ogbugbu E Gburu Ọtụtụ Ndị Bịara Ụka N’ụlọ Ụka Ndị Katọlik n’Ọzụbụlụ.
Nke a enyeghị ọnụ okwu, mgbe m nụrụ maka ya, ọ dara m na ntị ka ihe na-eme na steeti Bọrọnụ. N’ụtụtụ ụbọchị ụka ka anyị nụrụ na ndị osochiegbu gara n’ụlọ ụka ịchọ otu nwa amadi a kpọrọ “Bishọpụ”, ka ha ruru na ya bụ ebe, ha ahụghị ya, ha wee kpoghe ọnụ egbe ha, were ajọ ọnụma dulaa ihe ruru mmadụ iri na ise mmụọ. Ihe mgbo egbe tụrụ karịrị iri ise. N’ezie ekwensu gara ụka ụbọchị ahụ... nkịta nyụrụ nsi n’elu ekwu aja. Wee ruo ugbu a, anyị amabeghị ndi mere ya bu ihe, nanị akụkọ karịrị otu narị di iche iche nke na-akọwa ihe kpatara ya bụ ihe ka anyị ji aka.


www.odeniigbo.com

1 Like

Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(m): 12:03pm On Aug 12, 2017
2. Charlie Boy Tetere Ụra Ụtụtụ Wee Mara Na Buhari Bụ Ekwu Ọzọ Eme Ọzọ.

Charlie Boy bụ okenye ama ama maka ikwu ihe ọ bụla dị ya n’obi, o sokwazi na ndị nyere ọchịchị Buhari nnukwu nkwado, ndị hụrụ ya na mbu dị ka onye nzọpụta nke obodo Naijiria. Mana ikuku kupụrụ ya akwa mgbochi dị ya n’ihu n’izu a. O bidoro otu na atụmatụ, “Our Mumu Don Do” na mbido afọ a, mana o ji ya bụ atụmatụ bido ngagharị iwe nke ọ kpọrọ, “Resume or Resign” nke o ji agwa Buhari na ọ bụ nanị ihe abụọ bụ ihe cheere ya n’ihu. Ya bido ọrụ mà ọ bụ ya rituo n’ọchịchị. Kedu kwanụ ka imi na anya dị ya kemgbe o bidoro ya bụ ngagharị iwe? Ndị ụlọ omebe iwu ukwu kwuru na o jighị onwe ya aka, ndị uwe ojii a gbara ya ikuku ike ma gbaa ụfọdụ ndị otu ya egbe, ndị ji ike ọchịchị na-akọchasị ya, bọpụta ihe ọjọọ nile o megoro kemgbe nne mụrụ ya iji mebie ma kwụsị ya bụ atụmatụ inwuru ọkụ.


www.odeniigbo.com
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by myklangelo(m): 12:04pm On Aug 12, 2017
3. Ụfọdụ Ndị Mgbago Ugwu Bidoro Iwepụta Abụ Nkọcha, Nkwutọ Na Akpọmasị Maka Ndị Igbo

N’izu a, anyị hụrụ abụ ndị Awụsa na-ekesasị nke ha ji akọcha ma na ekwụtọ ndị Igbo nile. Na ya bụ ajọ abụ, ha na-agwa onwe ha na nsogbu nile dị n’ime ndụ ha bụ ndị Igbo kpatara ya. Ha gwakwaziri ndị be ha ka gbuo ndị Igbo nile nọ n’akụkụ ha. Ọbụghị tata ka ndị Igbo hụbara Awụsa na ụta, ọbụghị tata ka anyị mara maka akpọmasị abụrụ dị iche iche na Naijiria nwere n’ebe ibe ha nọ, mana ugbu a, mmanụ peturol ka ana-awụnyezi n’ọkụ ikuku gasị. Ama m na ha ji nke ahụ akwado maka ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktọba.

Kedu ihe ndị ọzọ dị nnukwu mkpa mere n’izu a nke m agụnyeghị? Depụta ha ka anyị nile mara maka ya. Tinyekwuzie olu gị na nke anyị kwuru maka ya.
Ka izuụka ọhụrụ kara nke gara aga mma n’ụzọ nile.

www.odeniigbo.com

1 Like 1 Share

Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by Nobody: 12:12pm On Aug 12, 2017
nwanne ndewo, jisie ike na edemede á .
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by Igboesika: 12:26pm On Aug 12, 2017
Chukwu gozie gi
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by ZeroUnity: 12:34pm On Aug 12, 2017
Nwanne umu Igbo nwere mmadu ebe ino...
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by prodigy24: 12:45pm On Aug 12, 2017
Omo see wetin google dey translate for your write up lol :' cry grin(

Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by ProWalker: 12:57pm On Aug 12, 2017
Mynd44
Lalasticala
OAM4J
Dominique
I don't think NL allows this sort of OP
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by Nobody: 1:10pm On Aug 12, 2017
Ya Gazie. O ga adiri anyi niile na mma.
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by ZombieTAMER: 1:17pm On Aug 12, 2017
ProWalker:
Mynd44
Lalasticala
OAM4J
Dominique
I don't think NL allows this sort of OP


Wetin concern you
Amebo
Re: O Tekwaara... Ụfọdụ Ihe Ndị Mere N’obodo A N’izuụka A by Ekwekwe1(m): 1:30pm On Aug 12, 2017
Nice one OP.
Though am an Izon boy, Igbo is my maternal home and I share same political sentiments with them.

1 Like

(1) (Reply)

Abuja And The Poor State Of Public Transport System / Small Chops Or 'Chop I Chop' - Suya & Asun Contractor As Seen In Lagos / Nigeria Will Burn If I’m Rearrested- Nnamdi Kanu Threatens FG

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 15
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.