Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,159,053 members, 7,838,659 topics. Date: Friday, 24 May 2024 at 07:24 AM

Unity: Atiku Abubakar's Democracy Day Message In Igbo Language. - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Unity: Atiku Abubakar's Democracy Day Message In Igbo Language. (384 Views)

President Tinubu's Democracy Day Message To Nigerians (Video) / APC Has Put A Knife To National Unity, Atiku Promises To Rebuild Nigeria. / Politics Of Oneness And Unity, Atiku and Tinubu Greets Each As Both Meet In The (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Unity: Atiku Abubakar's Democracy Day Message In Igbo Language. by KpakpandoIgbo: 8:03am On May 30, 2018
Nkwuputa Atiku Abubakar, GCON, Onye Bụburu Osoje Prezident nke Mbà Naijirịa Nweere Onwe Ya, Na Mmemme Ụbọchị Ọhakarasị na Tuuzdee, 29 May, 2018.

Ezigbo ndị Naijirịa ibe m, n'emume nke Ụbọchị Ọhakarasị a, ọ bụ nmasị m i soro unu ñụrịa ọñụ.

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba-ama na n'agbanyeghị mwakpo ọchịchị ọhakarasị a anyị jisiri ike nweta hụrụla site na ọtụtụ ike ndị na-emegide ọchịchị ọhakarasị, anyị agaala n'ihu na-azọ njem dịka otu ndị, dị kwa ka otu mbà.

Ikwesị ntụkwasị obi nke usoro ntụli-aka ọchịchị na Naijirịa na kwa ike gọọmenti ịza ajụjụ ọhaneze bụ ihe ndị dịkarịsịrị ntà i ji gosi obi ekele nye ndị ji ihe nile ha nwere chụọ aja ịhụ na ọchịchị ọhakarasị weere ọnọdụ na obodo anyị.

Njem nke Naijirịa ịnweta ọchịchị ọhakarasị bụ nke ọtụtụ ahụhụ so ya, bụ kwa nke weere ọtụtụ ndụ na kwa aka ọtụtụ ụmụibe, ọ bụ kwanụ ihe anyị n'aghaghị ime, dịka ndị n'eri uru aja ha chụrụ, ịhụ na anyi mere ka ọchịchị ọhakarasị anyi a gaa n'iru site na ntụli-aka kwụ ọtọ na kwa ime ka ụlọọrụ gọọmenti rụọrọ ọhaneze ọrụ.

Ọbụladị dịka anyị na eme mmemme a, ụmụibe ibe m, ka anyị wepụta oge kpọlaa uche azụ ma rie kwa uju maka ndị nile e gburu n'igbu-ọchụ n'enweghị isi na-aga n'iru n'akụkụ nile nke obodo ọma anyị a.

Ndị Naijirịa ndịa ka e gburu na ọgba aghara nke mkpochapụ na-aga n'iru nke ndị omempụ na eme gburugburu obodo anyị ma karịsịa na Borno na Yobe, na kwa ndagwurugwu Benue, gbatịa site na Adamawa gafee Taraba ma rue n'ebe Kogi na Benue jikọtara, ma gbakwụnye Nasarawa, Plateau, Ndịda Kaduna, na Zamfara. Ndị ọzọ kwa ka ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ntọrọ mmadụ, ndị na-achịgharị ehi, na ndị omempụ mbibi gburu. Ogbugbu a agaala n'ihu ọbụladị rue n'ebe okpukperechi dị nsọ ebe egburu ndị ụkọchukwu Alakụba na ndị nke Kraist na kwa ndị na-efe ofufe.

Mkwafu ọbara a agaala n'iru rue ogologo oge ma ọghaghị ịkwụsị. Na leta m zigara Ọgbakọ ndị Bishọp Katọlik na Naijirịa, m kwuru, m na-ekwugharị kwa ya ebe a, na ọ bụ nanị gọọmenti pụrụ ịkwụsị ogbugbu ndịa n'enweghị isi ma ọ bụrụ na anyị ga agbanarị nnukwu mbibi ọzọ nye udọ njikọta anyị n'esichaghị ike.

Akụkọ na-adịbeghị anya nke mbà Sọmalia, mbà Burundi na mbà Sentraal Afrịkan Repọblik, na ndị ọzọ, kwesịrị ịbụ ihe ịdọ-aka na ntị nye anyị nile, karịsịa nye ndị nọ na ọchịchị ndị ọrụ mbụ ha bụ nchekwa ọhaneze, mana ha adịghị njikere, na enye ọtụtụ ihe ngọpụ na emegide onwe ha ma na-atọ kwa ọchị, na-abagide ịrụ ndị ọzọ aka i ji duhie ọhaneze.

Ọchịchị ọhakarasị a nke anyị na eme emume ya taa bụ mkpụrụ nke ọrụ ụmụibe, ndị ụfọdụ nime ha ji ndụ ha chụọ aja. Dị ka ndị nketa nke nchepụta ọhakarasị a, ọ ga adị mma na anyị hụrụ na azụlitere ọhakarasị a, ọ bụghị nanị dịka usoro mgbānwe ọchịchị, kama dị ka ụzọ mwulite ọdị-mma ụmụ mmadụ.

Ihe ọma kacha mma banyere ọchịchị ọhakarasị bụ ikike ọ na ebokwasị ọhaneze. Ihe kachasị mkpà banyere ikike ahụ dị na ohere ọhaneze nwere ị gbaso usoro obibi ndụ zuru oke nke ga eme ka nwoke na nwanyị ọbụla nwee ike inweta nmeri na ihe nile ziri ezi ha na achụso. Nchepụta ọhakarasị anaghị adakọcha kpamkpam ya na echiche mpịazi na oghere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ kwanụ na oghere akụ na ụba.

Dịka anyị na aga n'iru dị ka otu mbà, ọ dị mkpà na anyị zaghachịrị dịka oge na agafe site na ichepụta ngwọta nye ụfọdụ nsogbu ndị na adọghachi anyị azụ. Taa, ọkpụkpọ oku kachasị n'ọnụ ndị anyị bụ mkpà ọ dị na gọọmenti ga anabata ihe gbasara ya ma rụọ ọrụ dịrị ya. Nsogbu anyị banyere enweghị nchekwa na kwa ikewasị akụ na ụba enwetala agba ọhụrụ n'afọ ole na ole gara aga, otu ahụ kwa ka ngwọta nye nsogbu ndịa siri chọọ ichè echiche kacha ọhụrụ.

Dịka obodo na agabiga ọtụtụ ntụli-aka ọchịchị n'ọnwa ndị dị n'iru, ọ dị mkpà na e doro ikwesị ntụkwasị obi nke usoro ntụli-aka anyị nsọ, nwee olileanya maka ntụli-aka ọchịchị nke mpụ na aghụghọ na adịghị. Ọchịchị ọhakarasị bụ nke na edozi onwe ya nanị ma e nwee nkwenye na usoro ntụli-aka.

Anyị eriela uju ọtụtụ mkpụrụ obi ndị Naijirịa n'ihi ihe iyi ọhaneze egwu rue na anyị ekwesịla ịmụta na ị sị nanị ọchịchị etiti bụrụ nnọọ ndị ọ dị n'aka ichekwa ọhaneze agaghị ezu. Ekpugheela akụ na ụba anyị rie nne n'iru ọnụ ahịa mmanụ mbàụwa na anọghị ofu ebe nke mere na anyị ekwesịla ịghọta mkpà ọ dị na anyị tinyere nnukwu ego na akụrụngwa eji ebi ndụ ma kepụta ohere ọrụ ọhụrụ nye ọhaneze site na imeghe akụ na ụba anyị. Nkewa na adịghị n'otu dị nime obodo anyị ha na kwa otù ndị anyị sonyere nke mere na anyị enweghịdị ike ịmalite ịchọ ogbugbo kachasị dị mkpà nye nsogbu anyị ebe ọ na anyị anaghị ekerita ihe dị ka otu ndị.

Ihe ndịa bụ ụfọdụ ihe ịma-aka anyị na-aghaghị ịmalite inyocha ngosipụta ha, ka ihe ịrịba-ama nke mmemme ọchịchị ọhakarasị anyị taa gosi na anyị ga eji obi gbasara agbasa na kwa akọnuche nsonye nke ọchịchị ọhakarasị n'ịchọ ngwọta nye ha.

Atiku Abubakar, GCON

(Waziri Adamawa)

Onye Bụburu Osoje Prezident nke Mbà Naijirịa Nweere Onwe Ya

Source:
https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=2061815414031700&id=2029395563940352

Kpákpándò National Coalition for Atiku.

(1) (Reply)

Joining Apc’ll Not Save You, Presidency Taunts Corrupt Politicians / 2019; Hon Ezenwa Onyewuchi's Senatorial Ambition, A Collective Task For The Re / Buhari Lied About When He Said The Nigeria Army Showed Restraint On Biafrans

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 15
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.