Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,194,223 members, 7,953,855 topics. Date: Friday, 20 September 2024 at 07:50 AM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. (3023 Views)
Ndi Anambra Ka Anyi Gbakobanu Ebea Mata Onwe Anyi! Anambra Obodo Dike! / Ekele (greetings, Well-wishing, Compliments, Regard, Salutation) In Igbo Culture / Celebrating Ndi-igbo (2) (3) (4)
Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by dempeople(m): 7:23am On Jan 01, 2012 |
Umunne m ndigbo, aka m di n'elu. Ekele diri onyenwe anyi na-aro ofuru nke 2012. Ka Chineke meree unu ogo na aro ofuru a. Asim ka m nye unu onu! @Nnaanyi Eziachi, nna ochie anyi ekenekwa gi. Anyi anaghi afuzi gi na Nairaland mana anyi mara na aru di gi mma. Aka m gbatiri agbati ma dikwa n'elu. @Onlytruth, nwa n'etiri ndigbo mkpu, anu a na-agba egbe, o jiri odudu were na-achu mgbo, nwanne ekelekwa m gi na okwa enyere gi bu Eze Ndiigbo Nairaland. I kajara akaja. Gaba n'iru nighi n'obu ubochi uka ka nne gi muru gi. @Andre uweh, ochi agha kara aka, nwa chinemere, otimkpu ndigbo, aka m di n'elu ma na-ekenekwa gi Mazi. @Dede1, nwoke ike, ochiagha ndiigbo niile, nwoke ji okwu bekee n'onu, Ikemba Bekee, aka m di n'elu. Maazi, anyi kenekwaaaaa. @Afam4eva, Nwa di ogo, nwa na-ejere ndigbo ozi, akunwata kara aka, aka m atokirigo n'elu ma na-ekelekwa gi. @Odumchi, nwa di mma, otimkpu omenala ndigbo, isi uzo n'omenala ndigbo, aka m atokirigo n'elu ma na-ekelekwa gi. @Ezeuche, ochiagha ndigbo, isi uzo ndi Arochukwu, nwoke n'ekelekwa gi. Daalu nwanne. Aka m di n'elu. @Obiagu, agu nwoke, onye ndigbo ji eme onu, nwoke amuru ubochi uka, daalu. Gwam m mgbe m ga ewetu aka m maka na-otokirigo n'elu. @Chyz, Isi uzo ndigbo, agu eji eje mba, aka m di n'elu, nwakaibeya, Okwesirieze ka i bu nwanne. @ChinenyeN, Ikemba ndigbo na-abia steti, onu na-ekwuru ndigbo okwu, ochi agha ndigbo, aka m dikwa n'elu. @ak47mann, eze bu eze, agu na-atagbu ndi iro nke ndigbo, aka m di n'elu mazi. I kajara akaja. @Ngodigha, ochi agha, mma agha, otimkpu ndigbo, okwesirieze bu aha Ngodigha. Aka m di n'elu. @asha80, agaba ndigbo, nwoke daalu nke ukwu, ana m ekele. Aka m di n'elu. @Aloy_emeka, agaba ndigbo, nwoke di mma, ekelekwa m gi. Onye chi chiri eze, aka m di n'elu. @Igbo boy, ochi agha ndigbo, nwoke na-ejelu ndigbo ozi, Igbo Boy onye ndigbo ji eme onu, gaba n'iru na ikwesiri eze. Aka m di n'elu. @Chino11, aku na atakasi ndi iro ndigbo, nwoke di nma, agumba, ekele m gi. Daalu nke ukwu. Aka m di n'elu. @Abagworo , nwakaibeya bukwanu abagworo nke ndigbo kporo isi uzo. Abagworo nwa mama, aka m di n'elu in short loyalty m enwero part 2. [size=18pt]@Ndi niile nchezoru[/size], a na m asi ka Chineke meluunu ogo ma gozie unu niile. Udo di. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by Gboliwe: 7:33am On Jan 01, 2012 |
udo diri gi ma diri kwa anyi niile |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by AndreUweh(m): 5:36pm On Jan 01, 2012 |
Dem-People Udo diri gi. I mere ofuma. Ka afo a buru ihe mmeri n'ebe umuIgbo noo. Ka m ji oherea kele kwa: ONLYTRUTH,EZEIGBO NAIRALAND ODUMCHI-NA AROCHUKWU HIGH CHIEF REALCHANGE, ORI KA EZE, ANAM EKELE. OBIAGU1-AGU NA ECHE MBA NA ANABRA STETI GRAFIKDON-NWAEKWULOBIA ZURU KA EMEE IFYALWAYS-NWADA MARA MMA BLISS FOR LIFE-NWADA OBI OMA FREECOCOA-NWADA HURU UMUIGBO NA ANYA MBATUKU NWA NGWA NA EJERE IGBO AGHA AK47MAN-NNUKWU NMANWU CHINENYE-NWA NGWA NWERE AKO NA UCHE CHYZ-NWA ANIOMA BU ODENIGBO EZEUCHE-NWA ARO OKEIGBO POINT-B NWA UMUAHIA UDEZUE-NWA AWKA OGBURU OZU NA HIGH SEA NCHARA-ONYE OMA NA ABIA STATE DEDE1-ONWA NA ETIRI OHA NA MBAITOLU IKEDURU TOSHMAN-OKE DIBIA NA ISIALA MBANO AFAM4EVER-OKPU UZU NA OKUNANU, ENUGU GBOLIWE-NWANYI MARA MMA, ANYAEJI AHU UZO NDI NWAYI NAIRALAND. EL-GUPO-AKU NWATA PRESI-ELECT-OME UDO AGABA-AKWAAKWURU REDSUN-EGWUATU1 NAALAIGBO ALOY-EMEKA-IGBO NO UZO IJE GENBUHARI--SANU DE ZUA,INA KWANA MIKEANSY-OMEREOHA NA IMO STETI NAIJAKING-IGOGBU NDI ENUGWU OGBUEFI1 NA OBODO NDI IKA WESLEY80 NA OBODO NDI UKWUANI, ICHIZURU ECHIZU NA ABOR. EZEAGU NAOBODO AGBOR-IKENGA DIKE ABAGWORO NA OBODO UGUTA-ONYE OGA ADIRIMMA ASHA80 NA OBOWU-NWANNE DE SAM MBAKWE. NRI PRIEST-NWA NAEJERE IGBO OZI CHINO NA AWKA ONE-NAIRA NA ASABA MANNYFOR LIFE IGBO-BOY-ONU NA EKWURU NDIGBO NA RIVAS STATE. HOUVEST-ONYE ANA AKA UKA YA NA ALAIGBO. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by Gboliwe: 6:15pm On Jan 01, 2012 |
Andre Uweh:nkea tooro m ochi nke ukwu. Abum nwanya, aburom nwoke. Freewilly, odunnu, richyblack,ujujoan, amaka1,ogidiboy, mamagee bukwa good ambasadors. Tukwe ha afa biko. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by AndreUweh(m): 6:59pm On Jan 01, 2012 |
Gboliwe:Biko gbahara. Kam kelekwa Igbo ndi oma dika: Richyblack-Nwa Ogbo na Bende, Biko, teta na ura. Ote go kwa. Onye nwe anyi nonyere gi. Mama-gee-asampete nwanyi, biko na akpo inyanga. Ujujuan-Nwanyi nganga, I bu nwa Chi na emere. Trottle, Ada Igbo bi na Jos, Onye nwe anyi gbo gi. Ngodigha-Ochiri ozuo na Igbuzo, Delta state. Igbo bu ofu. deme. Freewilly-Nwanyi Chukwu kere ubochi Sunday, o ga adiri gi mma. Amaka1-Onwe gi onye o bu gi na ya, i bu unopposed. Ogidiboy-Dike na Idemili-ga n'iru. Deme. Metalgong-Ogene dike na Anambra, nwere ya nwayoo. Nuzo-Igogbu eji ahu uzo na Ebonyi state-eze ebu na afo. Paddy-lo- Onye army-I bu nna. Aerosapien-nara ekele,omenimo. Macjive-Aguiyi, i sokwa nandi kara aka. Willy-willy associate Igbo-we will not let you down Odunu-associate Igbo, I bu ezigbo enyi Ndigbo, it shall be well with you. Biko chetaram ndi ozo Anyi ebuka. Akwa hakwuru na Igbo bu 35% of nairaland. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by Gboliwe: 7:30pm On Jan 01, 2012 |
lasinoh,frosbel, jennykadry,cold,cantell |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by NRIPRIEST(m): 9:49pm On Jan 01, 2012 |
Umunnem, anam ekene unu ezigbo aro ofuu oma. Ogonogo ndu na isi Eze -Igbo nl, Onlytruth! Mu bu Eze mmuo Nri na achu aja di oke onu na isi Umuigbo nine no ebea nakwa ezi na uno fa. Anam asi ka ife di ebube mee na ezi na uno unu nine. Chukwu gozie Eze Onlytruth. Andre Uweh Ezeuche Ifymgeobuna nwanyi Odu aka Mbatuku Ak47mann Odumchi High chief Ada ide Freecoccoa Chyz Romeo Igboboy Ezeagu Pazienza Vicenzo Ogidiboy ChinenyeN Okija juju Abagworo Obiagu and some that i couldt remenber now. Olisebuluwa mezuolu unu ife nine be mkpa gi. Happy new year to you all! |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by AndreUweh(m): 10:02pm On Jan 01, 2012 |
Gboliwe:Chineke gozie unu nile. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by odumchi: 1:22am On Jan 02, 2012 |
Hewu! Nna, Dem_People imara aga aza etu ava o! Ekelere diri gi iwu ezigbo nwa avo Igbo, agu! Umunnem nochagba na thread a, owu inyi kachasi me o! Inyi nile wu ngozi Chukwu nyerere ali Igbo, Inyi wu ndi m'ji aga mba, Inyi wu anya na agbara oha aka ebe, Inyi wu ndi m'ji akpa nganga! Chukwu ga agozi ay dum na Ava ovuru ay na abai. O ga ewgara ay oganivu, azi ike, umumaihe, yana mkpa obi ay za na ike na amara Chineke. Iseee. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by ChinenyeN(m): 7:14pm On Jan 03, 2012 |
So, aha m nokwa n'ebea n'eziokwu? Ok. Ka m mee nke m. Igbo n'eziokwu, ndoro ndoro n'akuku, m na-ekele unu niile. N'ezie, o nweghi ndi ozo mu na ha so ma o bughi ununwa. Ka afo ohurua gaziere unu niile. Ihe ojoo niile nke na-eme na Naija agaghi erute unu na ezi na ulo unu. Nkea bu ekpere m n'eziokwu n'eziokwu. Chukwu Nonyere Unu Niile. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by Dede1(m): 8:36pm On Jan 07, 2012 |
Dem_people na Andre Uweh chukwu gozie ezi na olu unu. Chukwu mee ka nwa tiie unu akii n’ikpere. Chukwu nonyere Umu Igbo niile. |
Re: Ndi Be Anyi, dem-people Na-ekele Unu. by Onlytruth(m): 10:19pm On Jan 15, 2012 |
Igbo, ,mma mma nu! Igbo kwe nu ! Kwe nu !! Kwezuo nu !!! Ana m ekele umu oma Igbo nile no na ebe a, na ndi Igbo nile no na Nairaland. Ana m ekele kachasi ezigbo nwa afo Igbo Dem-people maka atumatu oma ime ka umu Igbo nile mara onwe ha n'ebe a. Biko nu, onye aha ya na adibeghi n'ebe a, biko jisie ike debanye ya nihi na anyi ga ebido imekosi ihe onu oge ufodu, ka ndi iro anyi wee mara na anyi zuru ka emee! Nke ozo dikwa mkpa bu ka onye Igbo obula dere m email na ezendigbo_nl@hushmail.com. Nke ahu bu email Eze Igbo Nairaland site na afo ruo na afo. Aga m ahanye ya n'aka Eze Igbo ga abia ma ochichi m bie na December afo a. O di nnukwu mkpa ka onye obula dere m email, ka m were ya mee "mailing list" maka okwa gbasara Ndi Igbo. Aga m emepe "thread" maka ya na oyibo na ebe a na ebe ndi ozo na Nairaland. O ga adiri umu Igbo mma nime afo a. Isee! Igbo kwezuo nu! Ndu di n'eziokwu 1 of Igboland, Eze Ndigbo Nairaland. |
(1) (Reply)
Anyone In The House From Ora-owan West/east LGA Edo / The Moment Ooni Of Ife And Oba Of Lagos Greet Each Other At Tinubu Colloquium / Back To Sender( Agbelepota Todaju)
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 38 |