Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,195,297 members, 7,957,755 topics. Date: Tuesday, 24 September 2024 at 07:16 PM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo (4749 Views)
Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo / Kedu Ihe Na Eme Ndi Igbo Na Nairaland? (2) (3) (4)
(1) (Reply)
Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by scholti: 12:28pm On Dec 07, 2015 |
Agụmagụ Igbo dịka Ngwaọrụ n’ịkwalite Ezi Nchekwa na Nkwụsiike Ọhaobodo Nkoli Mercy Nnyigide http://www.ajol.info/index.php/ujah/article/viewFile/113333/103050 Ụmị Edemede Ka Naịjirịa nwerechara onwe ya n’afọ 1960, olileanya ọtụtụ ụmụamala ya bụ na ihe ga-adịzị mma. Mana ka oge na-aga, a chọpụtara na ihe na-akawanye njọ. Usoro ọchịchị dị iche iche dapụtara. Ndị amị na ndị nkịtị achịala mana ọnọdụ gara n’ihu na-akawanye njọ. O bu ihe doro anya na ọchịchị ha bụ nke nchịgbu na fọnfọju akpa. N’agbanyeghị na Chineke ji akụnaụba na ngozi dị iche wee chọọ Naịjirịa mma, agụụ ka na-afịọ ụmụ ya ọnụ; iheegwu na oke ụjọ na-eme oge niile; ọtụtụ nne na nna anaghị akwụnwuziri ụmụ ha ụgwọ akwụkwọ; ndị ntorobịa gara mahadum enweghịkwa ọrụ. Ajọ ọnọdụ dị etu a na-ebute ọgbaaghara n’obodo ma na-etinyekwa ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na mpụ dị iche iche dịka izu ohi, ịtọrọ mmadụ, igbufu mmadụ, ịkwafu ọbara mmadụ dịka mmiri, dgz. Ọ bụ ihe ndị a kpalitere mmụọ omenchọcha ịchọpụta ụzọ dị iche iche agụmagụ Igbo, ọ kachasị abụ ederede Igbo ga-esi nye aka n’ibelata ajọ ọnọdụ a ma weta udo na ezi nchekwa ma kwalitekwa nkwusiike nke ohaobodo. N’ime nke a, a tụlere abụ ederede Igbo dị iche iche iji chọpụta echiche ndị odeeabụ Igbo gbasara ọnọdụ ọchịchị obodo Naịjirịa nakwa aro na ụzọ dị iche iche ha tụpụtara a ga-esi wee belata ajọ ọnọdụ a, ka e wee nwee ike kwalite ezi nchekwa na ọganiihu obodo Naịjirịa. Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobo Abstract After the Nigerian independence in 1960, the expectation of many of her citizens was that things would be better. But as time went on, it was observed that things were becoming worse. Different systems of government emerged. The military and civilians ruled but situation went forth to be bad. It was obvious that their governance was bad and characterized with selfish interest. Notwithstanding that God blessed Nigeria with many resources; her citizens are still suffering from hunger; terrible things always happen; many parents could no longer afford their childrens’ school fees; youths that graduated from the university are unemployed. This kind of unhealthy situation brings about social instability and encourages some Nigerian to engage in different crimes like robbery, kidnapping, extra judicial killings, and murder of different kinds, etc. it is against this background that the researcher hopes to examine different ways the Igbo literature, especially the Igbo written poetry could help to control this ugly situation and bring about good security and also promote social stability. The study analyzed some written Igbo poems in order to observe the position of some Igbo poets concerning the situation of governance in Nigeria and their contributions on how to improve it, so as to promote good security and progress in Nigeria. Mkpọlite Agụmagu nwere nghọta abuọ. Uzoma Nwadike kọwara na nghọta nke mbụ, bụkwa nghọta izugbe, bụ na agụmagụ bụ ihe ọ bụla dị n’ụdị edereede. N’ihi nke a, ihe amụmamụ ọ bụla dịka sọm, akụkọala, dgz, nwere agụmagụ nke ya. Nghọta nke abụọ agụmagụ nwere pụrụ iche bụ nke kọwara ya dịka ọrụ nka nke e sitere na ya wee na-akowapụta ma na-ahụ ndụ. (80). N’ịga n’ihu, agụmagụ dịka ihe ọmụmụ bụ ọrụ nka nke e chepụtara echepụta, ma jiri asụsụ nka chọọ ya mma, nke e si UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 176 na ya egosipụta ma na-ahu ndu. O nwere ike ịdị n’ụdị ekwurunọnụ maọbụ ederede. Agụmagụ nwere nnukwu ngalaba atọ ndị a: akụkọ, ejije na abụ. Agụmagu Igbo malitere n’oge gboo mgbe ndị Igbo malitere ndụ ha. Ụdị agụmagụ e nwere n’oge ahụ bụ nke ọdịnala. E deghị ụdị agụmagụ a ede; ọ bụ naanị ọnụ ka e ji agụpụta ya. Ọ na-esi n’aka ndị nna nna wee fere n’aka ụmụ ụmụ ha. Ka oge na-aga, mgbe ndị ọcha bịara n’ala Igbo, ha wepụtara igwe e ji ebiputa akwụkwọ. Ọ bụ oge ahụ ka ndị odee maliteziri depụtawa ma bipụtawakwa ụfọdu akwụkwọ agụmagụ ederede. Agbụrụ maọbụ obodo dị iche iche nwere ụzọ dị iche iche ha si akatọ ọchịchị nchịgbu ma na-ebuso akparamagwa ọjọọ dị iche iche agha. Ụfọdụ obodo kwenyere n’iji egbe na mma wee chụọ mpụ na arụrụala na-aga n’ọha obodo ọsọ. Mana ndị odee, ndị na-eti egwu, ndị na-emepụta ejije, dgz. naesite n’ọrụ nka ha were akatọ akparamagwa ọjọọ dị iche iche na-aga n’ọha obodo. Ha na-esite n’ọrụ nka ha wee na-arụtụ aka n’ihe dị iche iche na-eme na gburu- gburu ha dịka: ndọrọndọrọ ọchịchị, agụmakwụkwọ, ahụike, nchekwa, ọnọdụ akụnaụba, dgz. Mbọ ha na-agba bụ ka e site n’ọrụ nka ha wee kwalite udo, nchekwa, nkwusiike na ọganiihu obodo. Nchekwa pụtara ilekọta akụnaụba maọbụ ndụ anya nke ọma, n’ekweghị ka mkpagbu ọbụla bịakwasị ya. E lee anya ka ihe si kwụrụ n’obodo Naịjirịa taa, a ga-achọpụta na e nweghị ezi nchekwa na ya. Mpụ, arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị isi ọchịchị na ndị a na-achị achị naakpa ekweghị na ala ga-adị mma. Ịmaatụ, site n’ihe dịka n’afọ 2002, ndị otu a na-akpọ Boko Haram malitere ibute nnukwu ọgbaaghara n’ala Naịjirịa. Ha na-akwafuzi ọbara ụmụ mmadụ ka mmiri. Ọzọ, n’afọ 2012, e gbusịrị ụfọdụ ụmụ okorobịa Naịjirịa na-agụ akwụkwọ na Mahadum Port Harcourt n’ụzọ ezighị ezi. Ọnọdụ ndị a bụ ihe ịgba anya mmiri nye ụmụ Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 177 Naịjirịa Ihe ndị a niile na-egosi na e nweghị ezi nchekwa n’ala Naịjirịa taa. Na ngalaba atọ agụmagụ nwere: iduuazị, ejije na abụ, edemede a ga-agbado ụkwụ n’abụ ederede Igbo. N’edemede a, a họọrọ ma tulee abụ ederede Igbo anọ iji gosipụta echiche, ozi na aro ndị odee ha na-atunye gbasaara ka ihe si kwụrụ n’ala Naịjirịa taa; ọ kachasị etu o si metụta ịkwalite nchekwa na ọganiihu obodo. Abụ ndị a họọrọ gụnyere: “Ụkọ n’uju” na “Arịrịọ” n’Ụtara Ntị nke ‘Nolue Emenanjo (n.d), “Naịjịrịa bụ enyi mba” n’ Uche bụ Afa nke Goddy Onyekaonwu bigharịrị n’afọ 2003, na “Naịjịrịa” n’Ije Ụwa nke Nkechinyere Okediadi bipụtara n’afọ 2003. Ihe kpatara e ji wee gbado ụkwụ n’abụ bụ na abụ bụ ngalaba agụmagụ kacha enye ndị odee ohere pụrụ ịche n’izipụta echiche na mmetụtaobi ha gbasara ka ihe si kwụrụ n’obodo. N’ịkwado nke a, Emmanuel Jenkwe kọwara na abụ bụ ngalaba agụmagụ bakarịrị uru n’ịkatọ maọbụ ịkwatu ndị ọchịchị nchigbu (165). Nnyocha Agụmagụ N’ebe a, ọ dị mkpa ka e nyetụ nkọwa gbasara abụ. Ọtụtụ ndị ọkammụta n’ihe ọmụmụ agụmagụ enyela nkọwa dị iche iche gbasara abụ. Na nkọwa nke ya, C. Ekwealor kọwara abụ dịka ngalaba agụmagụ na-ejikarị enyookwu (nhụrụnuuche) na ndanusoro arụ ọrụ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ihe na-emebe abụ bụ nkaasụsụ e jiri dee ya (26). Nkọwa a dabara adaba n’ihi na a bịa n’abụ, ndị odee na-ahọrọ okwu n’ụzọ ọ ga-esi wee naemetụta ọgụụ na mmụọ mgbe ọ na-agụ ya. Nke a na-egosi na nkaasụsụ a na-ewebata n’abụ na-adị iche n’ụdị nkaasụsụ e ji ezipụta ngalaba agụmagụ ndị ọzọ. N’echiche nke ya, Nwadike kọwara na abụ bụ ọrụnka nke e tinyere n’asụsụ dị ọgọ, hazie n’usoro pụrụ iche, bịa nwee echiche miri emi na mmetụta n’ahụ na n’obi (72). Nkọwa a na-egosikwa na nkaasụsụ e ji ede abụ na-apụ iche. UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 178 Ihe ọzọ gbara elu na nkọwa a bụ na a na-ede abụ n’ụzọ o si emetụta na mmụọ. Ihe ndị a dị iche na ngalaba agụmagụ ndị ọzọ. Nchọpụta na-egosi na e nwere ihe ndị mebere abụ Igbo. Ihe ndị ahụ dịka Asoonye Ụba- Mgbemena si rụtụ ha aka bụ: echiche, asụsụ, ndanusoro na mmetutaobi (vii). Ọ bụ ihe anọ a a kpọrọ aha n’elu jikọrọ ọnụ mebe abụ Igbo. Ya bụ, na abụ agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na ihe anọ a adịghị na ya. N’edemede abụ, ndị odee na-ejikarị ikpe akwara ngwaọrụ. Gịnị bụ ikpe? N’echiche ya, Nwadike kọwara na ikpe bụ; Nkọrọmọọnụ nke e sitere n’ụzọ egwu na amụ, ekwuechezọ, akaje, emu, mkparị na oyiri ha ndị ọzọ wee na-akatọ mọọbụ na-agba n’anwụ, ajọ ihe na ajọ omume na nzuzu. Ikpe anaghị eji mba, ọgụ na mgba, okwu na ụka mọọbụ esemokwu aga. Mgbe ụfọdụ a na-apụta ihe, kwuo hooha ihe a chọrọ ikwu, ma mgbe ụfọdụ kwa, a ‘na-ekpu ekete n’isi gwa eze’ ihe a chọrọ ịgwa ya (106) . Ikpe bara nnukwu uru. Dịka Nwadike si kowaa, Ikpe na-arụ orụ dịka ihe e ji agbazi omume gbagọrọ agbagọ ndị mmadụ na-eme. E ji ikpe eme ka ọhanaeze guzosie ike n’akparamagwa ha maka na onye mewechaa ka ọ sọrọ ya, obodo eree ka ogiri. Ya bụ, na ihe ndị na-akpọlite ikpe n’ọhaobodo bụ ajọ akparamagwa ndị mmadụ na usoro ihe ụfọdụ na-adabachaghị adaba. Mgbe ọbụla okpeikpe kpere ikpe, ọ na-ajalite ọhanaaeze ka ha soro katọọ ihe ọjọọ. Ọ na-eme ka onye mọọbu otu na-eme ajọ ihe mịkpulaa ka ọhaobodo nwee ezumike nke obi (107). Ọ bụ uru ndị a ikpe bara mere na e nwere ụdị abụ Igbo a naakpọ abụ ikpe. Ọ bụ ụdị abụ a ka ndị odeabụ na-ejikarị agba Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 179 ọtụtụ ihe na-eme n’obodo n’anwụ. Ha na-esitekwa na ya were akatọ akparamagwaa ọjọọ dị iche iche ndị mmadụ, gọọmenti, ndị isi ọchịchị, dgz. na-akpa. Ekwealor kọwara abụ ikpe dịka ụdị abụ e ji akatọ ihe ọjọọ dị iche na ndụ mmadụ maọbụ n’etiti ọhanaeze. Ọrụ abụ ndị a na-abụkarị ịhazi ndụ ụmụ mmadu site n’ịgba agwa ọjọọ n’anwụ (29). N’echiche nke ya, Nwadike kọwara na, a na-eji abụ ikpe akọtọ ajọ ihe dịka omume ọjọọ: nrafu, aghụghọ, arụrụala, nzuzu, ịgba asịrị, na ihe ndị ọzọ na-adịghị mma ụmụ mmadu na-eme. Oge ụfọdụ, a na-esite n’otito katọọ ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’emeghị ka onye ahụ mata kpọmkwem na a na-akọcha ya. Ọtụtụ oge, ndị egwu na-esite n’egwu ha katọọ ihe ọjọọ na-aga n’obodo (53). Abụ ndị a tulere n’edemede a dabachara n’abụ ikpe. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ọkammụta n’ihe ọmụmụ agụmagụ arụtụla aka na mmekọrịta dị n’etiti ndị odee abụ na ọhaobodo nakwa uru dị iche iche agụmagụ bara n’ịkwalite nchekwa na ọganiihu obodo. Nwachukwu –Agbada na Okodo atụleela nka dị iche iche nnukwu odee abụ bekee bụ Ezenwa -Ohaeto si wee jiri ụfọdụ abụ ikpe ya wee gbaa ọtụtụ akparamagwa ọjọọ dị iche iche ndị ọchịchị ala Naịjirịa na-akpa n’akwụkwọ abụ ya ọ kpọrọ I Wan Bi President na If To Say I Bi Soja. (8-9) na (156-7). N’akwụkwọ abụ ndị a, a ga-asị na Ezenwa-Ohaeto gbadoro ụkwụ n’usoro ọchịchị nchịgbu e nwere n’obodo Naịjirịa wee dee ha. Ebumnobi ode abụ ndị a bụ isite n’ọrụ nka ya wee katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị isi ọchịchị na-akpa ma meghekwa anya ọtụtụ mmadụ ka ha chọpụta ka ihe si kwụrụ n’ọhaobodo. Dịka ha si wee tulee abụ a a kpọrọ “If To Say I Bi Soja”, a ga-achọpụta na ode abụ a ji ikpe wee katọọ mpụ na arụrụala dị iche iche a na-ahụtazi n’etiti ndị soja ala Naịjirịa. Ọ bụ ihe doro anya na gọọmenti guzobere ndị soja dịka ndị na-ahụ maka nchekwa ndụ na akụnaụba ụmụ mmadụ. Mana n’abụ a, ode mere ka o doo ọhanaeze anya na ndị soja obodo ya ahapụla ọrụ kwesịrị ka ha rụọ ma bụrụzie ndị fonfonju akpa. Nke a bụ eziokwu maka na UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 180 e lee anya n’ihe na-eme n’ala Naịjirịa taa, ọ bụ ihe na-agba anya mmiri. Otu dị iche iche gọọmenti guzobere ka ha naechekwa ndụ bụzi ndị na-ala ndụ n’iyi n’eleghị anya n’azụ. Ọ bụ ọnọdụ dị etu a na-ebute ọgbaghara, oke egwu, ala adịghị mma n’obodo. Mmetụta ndị ode abụ na-abụkarị enyo e ji ahụ ụfọdụ ihe gbasara ndụ na ka ihe si kwụrụ n’ọhaobodo (Akporobaro 37-. Ka o sila dị, e nwekwara ndị odee abụ na-ede naanị ka ha wee zie ọhaobodo ozi dị mkpa (33). N’ịkwado nke a, Nonye Obi kwuru na agụmagụ nwere ikike ịgbanwe ndụ ọtụtụ mmadụ n’obodo (60). Ọ kọwakwara na agụmagụ naenyochapụta obodo ma na-akatọ akparamaagwa ọjọọ ụmụ mmadụ na-akpa (63). N’otu aka ahụ, May Okolie kwuru na ọ bụ ihe doro anya na agụmagụ ndị isi ojii na-aga n’ihu na-akụziri ha ihe dị iche iche dịka oke na ọrụ dịịrị ha n’ịweghachi ụwa ọhụụ mmadụ azụ (143-4) Ka Emenanjo, Onyekaọnwọ na Okediadi Si Ji Abụ Ha Gbaa Ka ihe sikwụrụ n’Anwụ N’“Ụkọ N’uju”, odeabụ a ji nhagideokwu wee ziputa aha abụ a iji gosi na ala adịghị mma n’obodo ya. E leghị anya, ode abụ a sitere n’abụ wee na-akowa ka ihe si kwụrụ n’ala Naịjirịa. Site n’aha e nyere abụ a - ụkọ n’uju, a ga-achọpụta na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ka nọ n’ezigbo ihe ụkọ n’agbanyeghị na akụnaụba gbọrọ kasaa n’obodo a. Na nkebi abụ nke mbụ, ode abụ a sitere n’ajụjụ nzaraonwe wee gosipụta mgbagwoju anya o nwere n’ihi ajo ọnọdụ ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na ya – Kedụ zi ka a ga-esi nọdụ n’anyịm Were asọ na-akwọ aka? Kedụ kwanụ ka a ga-esi nọdụ n’iyi Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 181 Kwere ncha ọ baa anyị n’anya? Na nkebi abụ a dị n’elu, anyịm na iyi na-anọchite anya akụnaụba e nwere n’ala Naịjirịa. Nezie, onye nọ n’anyịm ekwesịghị iji asọ akwọ aka. Onye nọkwanụ n’iyi ekwesighị ka ncha baa ya anya. Mana ode abụ a ji nkebi abụ a wee zipụta na ụmụ Naịjirịa na-ahụjụ anya nke ukwu n’agbanyeghị akụnaụba dị iche iche Chineke ji wee gozie obodo a. Na nkebi abụ nke abụọ ode abụ sị, Nkenu bi n’ala na-apịta mmanụ Karịa ọsa bitọ n’elu Onye jiri nwayọọ tulee ahịrị abụ abụọ, ọ ga-achọpụta na mpu na arụrụala, iri akaazụ, ịpụnara mmadu ihe ya n’ike na ihe arụ dị iche iche juru n’ala Naịjirịa, maka na o nweghị ka nkenu bi n’ala ga-esi na-apịta mmadụ karịa ọsa bitọ n’elu. Nkenu bụ anụmanụ na-ebi n’ala, ebe ọsa bụ anụmanụ na-ebi nelu osisi. A bịa n’ebe ihe na-aga nke ọma, o kwesịrị na ọ bụ ọsa ga naapịta mmanụ karịa nkenu n’ihi na ebe obibi ya bụ elu osisi, ọ kachasị n’elu osisi nkwụ. Mana odeabụ a ji ọnọdụ nkenu na ọsa a wee na-akọwara ọgụụ ma na-egosi na ala adịghị mma n’obodo a. 1 Like |
Re: Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by scholti: 12:30pm On Dec 07, 2015 |
Ngaba... E lee anya n’ahịrịabụ nke iri na isii wee rue na nke iri na asatọ, odee abụ a jikwa ajụjụ nzaraonwe wee gosipụta mgbagwoju anya o nwere gbasara ọnọdụ nchekwa nke obodo a: Kọọrọ m ihe kpatara na Mmadụ ga-enwe egbugbere Ma anwụ ana-ama ya n’eze? N’ahịrị abụ ndị a, ode ji egbugbere wee nọchite anya nchekwa. Ode abụ a na-akọwa na e nweghị ezi nchekwa UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 182 n’ala Naịjirịa, maka na o nweghị ka anwụ ga-esi na-ama onye nwere egbugbere ọnụ n’eze. Ebumnobi ode abụ a bụ ka ọ kọwaara ụmụ Naịjirịa na e nwere akụnaụba ga-ezu ilekọta onye ọbụla anya, mana ndị ọchịchị dị n’aka ekweghị ka onye ọbụla keta oke ruuru ya. Nke a mere na ọtụtụ mmadụ naahụsi anya n’obodo odeabụ. N’ “Arịrịọ”, odeabụ a ji ikpe, aghụghọ na arịrịọ wee tụnye aro ihe dị iche iche o chere ga-eweta udo, ezi nchekwa, nkwụsiike na ọganiihu obodo. Na nkebi abụ nke mbụ na nke abụọ, ode abụ rụtụrụ aka n’ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka: Ihe ndị mmadụ chọrọ abụghị okpokpo bekee na Igbo na-atọ ka ụtụ ihe ndị mmadụ chọrọ bụ mmiri a ga-aụ aụ na nri a ga-eri eri Ihe ndị mmadụ chọrọ abụghị ama bekee na-ejikarị ube Ihe ndị mmadụ chọrọ bụ ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ ụmụ ha n’akwụghị ụgwọ nọrọkwa ebe ahụ nweta ihe ndị isi, na-enwetara ụmụ ha n’akwụghị ụgwọ. Ihe dịịrị ọsa mma na-adịkwuri uze. (Emenanjo 30) Site n’ahịrị abụ ndị a, odee katọrọ okpokpo bekee na asụsụ Igbo na-atọ ka ụtụ ndị isi ji arafu ndị ha na-achị, ma rịọkwa ndị isi ka ha nye ndị ha na-achi ezigbo mmiri ọụụ, nri, ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ ụmụ ha ga-aga n’akwughị ụgwọ. N’eziokwu, ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọtụtụ ndị ọchịchị na-eleghara ihe kwesịrị ka ha mee anya ma na-achụ ikuku ọsọ. Mana ọ bụrụ na ndị isi na-agba mbọ ịhu na ha nyere ndị ha na-achị ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka dịka Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 183 odee abụ a rụtụrụ aka, a ga-ahụ na udo ga-adịrịrị n’obodo. Onye elu na onye ala ga-ejikọ aka ọnụ hụ na a kwalitere udo, ezi nchekwa na ọganiihu obodo. Arịrịọ na aro odeabụ a yitere otu arịrịọ ndị ntorobịa ala Naịjirịa rịorịọ onye isi ala, Dr Ebele Goodluck Jonathan ka ọ rịgooro n’ọkwa n’afo 2011. Mgbe onye isi ala jụrụ ha ihe ọ ga-emere ha ka ha wee nye aka kwalite udo, ezi mmekọrịta, nchekwa na ọganiihu nke obodo Naịjirịa, ha rịorịọ onye isi ala ka o nye ha ọkụ ma kwekwa ya nkwa na ọ bụrụ na o nwee ike inyenwu ha ọkụ, na ha ga-agba mbọ hụ na mpụ, arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche e ji mara ndị ntorobia gaabụzi akụkọ mgbe ochie n’ala Naịjirịa. Ọ dịziiri okeke na okafọ ịkọwa ma onye isi ala emezuru arịrịo a ndị ntorobịa rịorịọ ya. Nke a na-egosi na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị isi na-akpa bụ ihe kacha ebute ala adịghị mma n’obodo. “Naijirịa bụ enyi mba” odeabụ a ji aghụghọ, otito na egbeokwu wee katọọ ọnọdụ ọjọọ obodo Naịjirịa nọ na ya. Na nkebi abụ nke mbụ, odee abụ kọwara ka ihe si kwụrụ n’ala Naịjirịa. O gbasoro ụzọ ikpe wee katọọ ụdị ajọ ụzọ e nwere n’ala Naịjirịa. Na nkebi abụ nke abụọ, odee ji atụmatụokwu a naakpọ ekwuecheọzọ wee katọọ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa, ime mpụ na arụrụala na mkpagbu juru ala Naịjirịa. Site n’ahịrị abu ndị a na-esote, a ga-achọpụta na e nweghị ezi nchekwa n’ala Naịjirịa: Naịjirịa bụ Enyimba Obodo achọghị mmegbu Lee! Ọnwụ ụmụ akwụkwọ Ndị uwe ojii gbagbusiri Na Soweto Na-agba ya anya mmiri UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 184 N’ihi na a hubeghị Ihe dị otu a na ya. (Onyekaonwu, 2003) Onye ọbụla ji nwayọ wee gụọ ahịrị abụ ndị a dị n’elu nke ọma, ga-achọpụta na ode abụ a ji ha akatọ ka ihe si kwụrụ n’ala Naịjirịa. A tụrụ anya na oke na ọrụ ndị uwe ojii n’obodo ọbụla bụ ichekwa ndụ na akụnaụba ụmụ mmadụ. Mana a bịa n’ala Naịjirịa, a ga-achọpụta na ụfọdụ ndị uwe ojii so na ndị na-ala ndụ ụmụ mmadụ n’iyi n’ụzọ ezighị ezi. Ọnọdụ dị etu a bụ ihe jọgburu onwe ya. Odee abụ a mekwara ka a mata na ala Naịjirịa na obodo Soweto dịka ụmụ ejima n’ebe o metụtara ime mpụ na arụrụala. Ebumnobi odeabụ bụ ka o site n’abụ a gbaa mpụ na arụrụala juru ala Naịjirịa n’anwu, ka ụmụ Naịjirịa soro ya wee katọọ ajọ ọnọdụ ndị o zipụtara n’abụ ya ka udo wee dị n’ala Naịjirịa. N’“Naịjirịa”, odeabụ a ji ya wee zipụta echiche na mmetuta o nwere gbasara ala Naịjirịa. O ji nkebi abụ nke mbụ na nke abụọ wee kọwaa na Chineke ji ngọzị pụrụ iche we chọọ obodo Naịjirịa mma: Obodo mmanụ aụ Mmiri ara ehi na-eru n’ime ya Akụnaụba ka Eke ji chọọ gị mma Ala ọma bụkwa ugwu nye gị. (Okediadi 2003) N’ezie, Naịjirịa bụ otu obodo Chineke ji ụdị ngọzị dị iche iche wee chọ mma. Mana, n’ihi echekwaghị ngọzị ndị a nke ọma, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ahụsi anya n’ebe ọ dị ukwu. Ndị ọchịchị nchigbu ekweghị na ala ga-adị mma, Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 185 dịka ode abụ a si kwa arịrị na nkebi abụ nke atọ, nke anọ na nke ise: ….. Ndị ọchịchị nchigbu Ụnụ eteela ala anyị unyi n’ihu ….. Chei! ụnụ bụ anwụta Ụnụ amịkpọọla ụmụ mmadụ ọbara …. Ndị oke ọchịchọ! Ụnụ hiwere amụma dị iche iche Ọ bụ nke gịnị? Inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Onye ka o rukwaru aka? N’akpa ụnụ ka ha bachara Ndị ọchịchị nchigbu ndoonu! (Okediadi 20-1) Odeabụ a ji ahịrị abụ ndị a wee gosịpụta na ọ bụ ndị ọchịchị nchịgbu na-ebute ala adịghị mma n’obodo Naịjirịa. Ebumnobi ya bụ ka a katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị ọchịchị nchịgbu na-akpa, ka e wee chụọ ha ọsọ ụkwụ eru ala; ka udo na ọganiihu wee dị n’ala Naịjirịa. Ezi ndị ọchịchị bụ ndị naechekwa ndị ha na-achị nke ọma. Mana ode abụ a gosipụtara ndị ọchịchị nchịgbu Naịjirịa ka anwụ nta na-amịkpọ ọbara ndị ha na-achị. A bịa n’ala Naịjirịa taa, arụ na-atụzi ime, na-amụsa ụmụ ebe niile. A maghịzi ka a ga-esi kwọ onye ukwu wara. Mpụ, arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche juru elu na ala. E nweghị nchekwa maọlị. A na-akwafuzi ọbara ụmụ mmadụ ka mmiri. N’ezie, a maghị nke a ga-ekwu ghara ibe ya. UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 186 Nchịkọta, Nchọpụta na Aro Abụ niile a tụlere n’edemede a zipụtara ma rụtụchakwa aka ka ihe si kwụrụ n’obodo Naịjirịa taa. Ndị odee abụ ndị a sitere n’ụzọ ikpe na aghụghọ wee katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị isi ọchịchị na-akpa, nke na-ebute ọgbaaghara, ala adịghị mma, adịghị n’otu, enweghị ezi nchekwa na mmekọrịta. Ha gara n’ihu rụtụkwa aka n’ụzọ dị iche iche a gaagbaso wee nweta ezi nchekwa na ọganiihu n’obodo Naịjirịa. Nke a na-egosi na agụmagụ Igbo, ọ kachasị abụ ederede Igbo bụ nnukwu ngwaọrụ n’ịkwalite ezi nchekwa, mmekọrịta, nkwụsiike na ọganiihu obodo. Ka o sila dị, site n’edemede a, a chọpụtara na ọ dị ọtụtụ ozi na aro dị nnukwu mkpa ndị ode abụ Igbo na-atụnye site n’ọrụ nka ha; ọ kachasị etu o si metụta ụzọ dị iche iche a ga-agbaso wee nweta udo, ezi ọchịchị, mmekọrịta n’etiti ndị isi ọchịchị na ndị a na-achị achị, ezi nchekwa, nkwụsiike na ọganiihu obodo. N’ihi nke a, ọ dị nnukwu mkpa ka ndị ọchịchị na ndị a na-achị achị na-ewepụta ezigbo ohere wee na-agụ abụ Igbo ndị a iji chọpụtasịa ozi na aro ndị ahụ ma gbaa ezi mbọ na-etinye ha n’ọrụ. Nke a gaenye aka belata mpụ, arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche juru obodo a ma kwalite ezi mmekọrịta, udo, ezi nchekwa, nkwụsiike na oganiihu nke obodo Naịjirịa. Nkoli Mercy Nnyigide Ngalaba Ihe Omụmụ Igbo, Afrịka na Eshia Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka nkolimercy@gmail.com Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo 187 Nrụtụaka Akporobara, F. Introduction to Poetry. Ikeja: Princeton, 2008. Ekwealor, C. Agụmagụ Ederede Igbo. Nsukka: Paschal Communications, 2009. Emenanjo, Nolue. Ed. Utara Nti. Ibadan: Evans Brothers, 1979. Jenkwe, Emmanuel. “Poetry of Social Advocacy as a Tool for National Development”. Language and Literature in a Developing Country. Ed. Anasiudu, B. et al. Ibadan: Africana – First Publishers, 2007. 165. Nwachukwu-Agbada, J. “Ezenwa-Ohaeto, The Poet and National Development: Implications for African Literature of the Twenty-First Century”. African Literature and Development in the Twenty-First Century. Ed. Joy Eyisi et al. Owerri: Living Flames Resources, 2009. 8-9. Nwadike, Uzoma. Agụmagụ Ọdịnala Igbo (Igbo Oral Literature). Nimo: Rex Charles & Patrick, 2003. ________ Ntọala Agụmagụ. Nigeria: Ịfunanya Publishers, 1992. Obi, Nonyelum. “The Role of Literature in National Development”. African Literature and Development in the Twenty- First Century. Ed. Joy Eyisi et al. Owerri: Living Flames Resources, 2009. 61-3. Okediadi, Nkechinyere. Ije Ụwa. Enugu: Fulladu Publishers, 2003. Okodo, Ikechukwu. “The Contributions of Ezenwa Ohaeto to Literature Studies”. African Literature and Development in the Twenty-First Century. Ed. Joy Eyisi et al. Owerri: Living Flames Resources, 2009. 156-7. Okolie, May. “French Language, African Literature: A Perspective in Education for National UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities 188 Development”. Language and Literature in a Developing Country Ed. Anasiudu, B. et al. Ibadan: African – First Publishers, 2007. 143-4. Onyekaonwu, Goddy. Uche Bụ Afa. Onitsha: University Publishing Company, 2003. Uba – Mgbemena, Asoonye. Echiche. Ibadan: Gold Press, 2012. 1 Like |
Re: Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by Sabina042: 11:12am On Nov 17, 2019 |
Chukwu gọzie gị ezigbo onye nkụzi m |
(1) (Reply)
Some Igbo Words In Olaudah Equiano's Autobiography Book / Benin And Ife Never Had Any Connections more facts to this / Kwanzaa
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 63 |